Nehemiah 5 (BOICB)
1 Nʼoge ahụ, ụfọdụ ezinaụlọ bidoro itamu ntamu megide ndị Juu ibe ha. 2 Ụfọdụ na-atamu na-asị, “Anyị na ụmụ anyị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ bụrụ na anyị ga-eri nri dị ndụ, o kwesikwara ka anyị nwee ike ịzụrụ ọka.” 3 Ndị ọzọ na-asịkwa, “Anyị agbaala ubi anyị, ubi vaịnị anyị na ụlọ anyị nʼibe ka anyị nweta mkpụrụ ubi nʼoge ụnwụ.” 4 Ma ndị ọzọkwa na-asị, “Lee na anyị gbazitere ego anyị ji tụọ ụtụ isi eze maka ubi anyị na ubi vaịnị anyị. 5 Nʼagbanyeghị na ọ bụ otu anụ ahụ na ọbara ka anyị na ndị Juu ọzọ nwere, dịka ụmụ ha dị ka ụmụ anyị dịkwa, ma anyị emeela ka ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom bụrụ ndị ohu. Ụfọdụ nʼime ụmụ anyị ndị inyom abụrụlarị ndị ohu, ma anyị enweghị ike nke aka anyị, nʼihi na ndị ọzọ bụ ndị nwezi ala ubi anyị na ubi vaịnị anyị niile.” 6 Iwe were m nke ukwuu mgbe m nụrụ mkpu akwa ha na mkpesa ndị a. 7 Ya mere, mgbe m chesiri echiche banyere ya, e boro m ndị a na-asọpụrụ na ndị ọchịchị ebubo. A gwara m ha, “Unu na-anara ụmụnna unu ọmụrụnwa ego unu enyere ha.” Ya mere, a kpọrọ m nzukọ ọha mmadụ maka imegide ha. 8 Nʼụbọchị nzukọ ahụ, agwara m ha okwu sị, “Ọtụtụ nʼime anyị na-agbalị nʼụzọ niile ịhụ na anyị zụtaghachiri ụmụnna anyị ndị Juu bu ndị e resiri ndị mba ọzọ. Ma unu nọ nʼebe a na-agbalị ime ha ka ha ghọọ ndị ohu unu. Ruo ole mgbe ka anyị ga-anọgide na-agbapụta ha site nʼọnọdụ ibu ohu?” Ma ha niile ekwughị okwu ọbụla, nʼihi na ha enweghị ihe ha ga-ekwu. 9 Agwakwara m ha okwu ọzọ sị, “Ihe unu na-eme jọrọ njọ. O kwesighị ka unu tụọ egwu Chineke si otu a gbanarị nkọcha nke ndị iro anyị, bụ ndị mba ọzọ?” 10 Mụ onwe m na ụmụnna m na ndị na-ejere m ozi na-agbazinye ụmụnne anyị ego na ọka. Ma ka anyị kwụsị ịnara ọmụrụnwa. 11 Nyeghachinụ ha ala ubi ha niile ngwangwa, ma ubi vaịnị ha niile, ubi oliv ha niile, ụlọ ha niile na ọmụrụnwa nke unu na-anara ha nke bụ otu ụzọ nʼime narị nke ego, ọka, mmanya ọhụrụ na mmanụ. 12 Ha sịrị, “Anyị ga-enyeghachi ha. Anyị agakwaghị anara ha ihe ọzọ. Anyị ga-emezu ihe i kwuru.”Mgbe ahụ, akpọkọtara m ndị nchụaja, mee ka ndị ndu na ndịisi ozi ṅụọ iyi imezu nkwa ha. 13 Ayọgharịrị m ọnụ ọnụ uwe mwụda m sị, “Otu a ka Chineke ga-esi yọchapụ site nʼụlọ ha na ihe nweta ha onye ọbụla nke na-agaghị edebezu nkwa a.”Ndị niile zukọrọ kwere sị, “Amen.” Ha tokwara ONYENWE ANYỊ: Ha niile mekwara ihe ha kwere na nkwa. 14 Ọzọ, nʼime afọ iri na abụọ ahụ a họpụtara m ị bụ onyeisi ọchịchị na Juda, site nʼiri afọ abụọ nke ịbụ eze Ataksekses ruo nʼafọ iri atọ na abụọ ya, mụ na ụmụnne m esiteghị na nri a na-atụkọrọ onyeisi ọchịchị were ihe oriri ọbụla. 15 Ma ọ bụghị otu a ka o si dị na mbụ, nʼihi na ndịisi ọchịchị niile buru m ụzọ chịa boro ndị ahụ ibu arọ dị ukwuu. Ha na-anakọta site nʼaka onye ọbụla iri mkpụrụ ọlaọcha anọ, tinyere ihe oriri na mmanya ha na-ewebatakwa. Ọbụladị ndị na-enyere ha aka mekpakwara ndị mmadụ ahụ. Ma emeghị m otu a, nʼihi ịtụ egwu Chineke. 16 Kama, anọgidesiri m ike nʼọrụ iwugharị mgbidi ahụ, achịkọtara ndị ikom m niile nʼebe ahụ nʼihi ije ozi a. Ọ dịghịkwa ala anyị zụrụ. 17 Ma otu ọ dị, ndịisi Juu ọnụọgụgụ ha dị otu narị na iri na ise na-eri nri na tebul m, tinyere ndị na-abịakwute anyị site na mba ndị dị anyị gburugburu. 18 Ihe na-ezu nri a na-eri nʼụlọ m kwa ụbọchị bụ otu ehi na atụrụ isii gbara abụba, na ọtụtụ ọkụkụ, na ụdị mmanya dị iche iche a na-ebubata kwa ụbọchị iri ọbụla. Nʼagbanyeghị nke a, ọ dịghị mgbe ọbụla m nara site nʼaka ha ụtụ ihe oriri nke onye na-achị ala kwesiri inweta, nʼihi na ha onwe ha nọ na mkpa dị ukwuu. 19 Chineke m biko, echefula ihe m meere ndị a, gọzie m nʼụzọ nke gị.
In Other Versions
Nehemiah 5 in the ANGEFD
Nehemiah 5 in the ANTPNG2D
Nehemiah 5 in the AS21
Nehemiah 5 in the BAGH
Nehemiah 5 in the BBPNG
Nehemiah 5 in the BBT1E
Nehemiah 5 in the BDS
Nehemiah 5 in the BEV
Nehemiah 5 in the BHAD
Nehemiah 5 in the BIB
Nehemiah 5 in the BLPT
Nehemiah 5 in the BNT
Nehemiah 5 in the BNTABOOT
Nehemiah 5 in the BNTLV
Nehemiah 5 in the BOATCB
Nehemiah 5 in the BOATCB2
Nehemiah 5 in the BOBCV
Nehemiah 5 in the BOCNT
Nehemiah 5 in the BOECS
Nehemiah 5 in the BOGWICC
Nehemiah 5 in the BOHCB
Nehemiah 5 in the BOHCV
Nehemiah 5 in the BOHLNT
Nehemiah 5 in the BOHNTLTAL
Nehemiah 5 in the BOILNTAP
Nehemiah 5 in the BOITCV
Nehemiah 5 in the BOKCV
Nehemiah 5 in the BOKCV2
Nehemiah 5 in the BOKHWOG
Nehemiah 5 in the BOKSSV
Nehemiah 5 in the BOLCB
Nehemiah 5 in the BOLCB2
Nehemiah 5 in the BOMCV
Nehemiah 5 in the BONAV
Nehemiah 5 in the BONCB
Nehemiah 5 in the BONLT
Nehemiah 5 in the BONUT2
Nehemiah 5 in the BOPLNT
Nehemiah 5 in the BOSCB
Nehemiah 5 in the BOSNC
Nehemiah 5 in the BOTLNT
Nehemiah 5 in the BOVCB
Nehemiah 5 in the BOYCB
Nehemiah 5 in the BPBB
Nehemiah 5 in the BPH
Nehemiah 5 in the BSB
Nehemiah 5 in the CCB
Nehemiah 5 in the CUV
Nehemiah 5 in the CUVS
Nehemiah 5 in the DBT
Nehemiah 5 in the DGDNT
Nehemiah 5 in the DHNT
Nehemiah 5 in the DNT
Nehemiah 5 in the ELBE
Nehemiah 5 in the EMTV
Nehemiah 5 in the ESV
Nehemiah 5 in the FBV
Nehemiah 5 in the FEB
Nehemiah 5 in the GGMNT
Nehemiah 5 in the GNT
Nehemiah 5 in the HARY
Nehemiah 5 in the HNT
Nehemiah 5 in the IRVA
Nehemiah 5 in the IRVB
Nehemiah 5 in the IRVG
Nehemiah 5 in the IRVH
Nehemiah 5 in the IRVK
Nehemiah 5 in the IRVM
Nehemiah 5 in the IRVM2
Nehemiah 5 in the IRVO
Nehemiah 5 in the IRVP
Nehemiah 5 in the IRVT
Nehemiah 5 in the IRVT2
Nehemiah 5 in the IRVU
Nehemiah 5 in the ISVN
Nehemiah 5 in the JSNT
Nehemiah 5 in the KAPI
Nehemiah 5 in the KBT1ETNIK
Nehemiah 5 in the KBV
Nehemiah 5 in the KJV
Nehemiah 5 in the KNFD
Nehemiah 5 in the LBA
Nehemiah 5 in the LBLA
Nehemiah 5 in the LNT
Nehemiah 5 in the LSV
Nehemiah 5 in the MAAL
Nehemiah 5 in the MBV
Nehemiah 5 in the MBV2
Nehemiah 5 in the MHNT
Nehemiah 5 in the MKNFD
Nehemiah 5 in the MNG
Nehemiah 5 in the MNT
Nehemiah 5 in the MNT2
Nehemiah 5 in the MRS1T
Nehemiah 5 in the NAA
Nehemiah 5 in the NASB
Nehemiah 5 in the NBLA
Nehemiah 5 in the NBS
Nehemiah 5 in the NBVTP
Nehemiah 5 in the NET2
Nehemiah 5 in the NIV11
Nehemiah 5 in the NNT
Nehemiah 5 in the NNT2
Nehemiah 5 in the NNT3
Nehemiah 5 in the PDDPT
Nehemiah 5 in the PFNT
Nehemiah 5 in the RMNT
Nehemiah 5 in the SBIAS
Nehemiah 5 in the SBIBS
Nehemiah 5 in the SBIBS2
Nehemiah 5 in the SBICS
Nehemiah 5 in the SBIDS
Nehemiah 5 in the SBIGS
Nehemiah 5 in the SBIHS
Nehemiah 5 in the SBIIS
Nehemiah 5 in the SBIIS2
Nehemiah 5 in the SBIIS3
Nehemiah 5 in the SBIKS
Nehemiah 5 in the SBIKS2
Nehemiah 5 in the SBIMS
Nehemiah 5 in the SBIOS
Nehemiah 5 in the SBIPS
Nehemiah 5 in the SBISS
Nehemiah 5 in the SBITS
Nehemiah 5 in the SBITS2
Nehemiah 5 in the SBITS3
Nehemiah 5 in the SBITS4
Nehemiah 5 in the SBIUS
Nehemiah 5 in the SBIVS
Nehemiah 5 in the SBT
Nehemiah 5 in the SBT1E
Nehemiah 5 in the SCHL
Nehemiah 5 in the SNT
Nehemiah 5 in the SUSU
Nehemiah 5 in the SUSU2
Nehemiah 5 in the SYNO
Nehemiah 5 in the TBIAOTANT
Nehemiah 5 in the TBT1E
Nehemiah 5 in the TBT1E2
Nehemiah 5 in the TFTIP
Nehemiah 5 in the TFTU
Nehemiah 5 in the TGNTATF3T
Nehemiah 5 in the THAI
Nehemiah 5 in the TNFD
Nehemiah 5 in the TNT
Nehemiah 5 in the TNTIK
Nehemiah 5 in the TNTIL
Nehemiah 5 in the TNTIN
Nehemiah 5 in the TNTIP
Nehemiah 5 in the TNTIZ
Nehemiah 5 in the TOMA
Nehemiah 5 in the TTENT
Nehemiah 5 in the UBG
Nehemiah 5 in the UGV
Nehemiah 5 in the UGV2
Nehemiah 5 in the UGV3
Nehemiah 5 in the VBL
Nehemiah 5 in the VDCC
Nehemiah 5 in the YALU
Nehemiah 5 in the YAPE
Nehemiah 5 in the YBVTP
Nehemiah 5 in the ZBP