Numbers 10 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 2 “Kpụọ opi ọlaọcha abụọ, jiri ha na-akpọ mkpọkọta nzukọ ụmụ Izrel na ime ka ha mara mgbe mbuli ije nke ọmụma ụlọ ikwu ruru. 3 Mgbe a fụrụ opi abụọ ahụ, nzukọ Izrel niile ga-ezukọta nʼihu gị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. 4 Ma ọ bụrụ naanị otu opi ka a fụrụ, ọ bụ ndị ndu, ndịisi ikwu Izrel niile ga-ezukọta bịakwute gị. 5 Otu ụda opi ike ga-egosi na ebo Izrel niile mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebuli ije. 6 Opi ike ahụ daa ụda nke ugboro abụọ, ọ na-egosi na ndị mara ụlọ ikwu ha na ndịda ga-ebuli ije. Ịda ụda nke opi ike bụ ihe e ji amata na oge ibuli ije eruola. 7 Mgbe a ga-akpọkọta ndị Izrel niile a ga-egbu opi, kama ụda ya ga-adị iche. 8 “Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile. 9 Mgbe unu gara ibu agha nʼala unu imegide onye iro na-akpagbu unu, fụọnụ opi ike. Nke a ga-eme ka ONYENWE ANYỊ Chineke unu cheta unu, ma napụta unu site nʼaka ndị iro unu. 10 Unu ga-egbukwa opi ndị a nʼoge aṅụrị, nʼoge mmemme unu a kara aka, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ niile. Gbukwaanụ opi mgbe unu na-achụ aja nsure ọkụ unu, na aja udo unu niile. Ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta unu nʼihu Chineke unu. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu.” 11 Nʼụbọchị iri abụọ, nʼime ọnwa nke abụọ, nʼafọ nke abụọ, igwe ojii ahụ biliri site nʼelu ụlọ nzute nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. 12 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran. 13 Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka ONYENWE ANYỊ si nye Mosis iwu banyere ije ha. 14 Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha. 15 Netanel nwa Zua bụ onyendu usuu ebo Isaka. 16 Eliab nwa Helọn bụ onyendu usuu ebo Zebụlọn 17 Mgbe ahụ, e wedara ụlọ nzute ahụ. Ụmụ Geshọn na Merari buru ya, bilikwaa ije ha. 18 Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ruben biliri ije, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elizọ nwa Shedeua bụ onyendu ha. 19 Shelumiel nwa Zurishadai bụ onyendu usuu ebo Simiọn. 20 Eliasaf nwa Deuel bụ onyendu usuu ebo Gad. 21 Mgbe ahụ, ụmụ Kohat ndị bu ihe nsọ ndị ahụ niile, biliri ije ha. Tutu ha erute, e guzobere ụlọ nzute ahụ nʼebe o kwesiri ịdị. 22 Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ifrem biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elishama nwa Amihud bụ onyendu ha. 23 Gamaliel nwa Pedazo bụ onyendu usuu ebo Manase. 24 Abidan nwa Gidiọni bụ onyendu usuu ebo Benjamin. 25 Na ngwụsị usoro ahụ, usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Dan biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai. 26 Pagịel nwa Okran bụ onyendu usuu ebo Asha. 27 Ahira nwa Enan bụ onyendu usuu ebo Naftalị. 28 Nke a bụ usoro usuu ụmụ Izrel si bilie ije ha. 29 Mosis gwara Hobab nwa Reuel, nna nwunye ya onye Midia okwu sị, “Anyị ebiliela ije ịga ebe ahụ ONYENWE ANYỊ gwara anyị sị, ‘Aga m enye unu.’ Bịa ka ị soro anyị. Anyị ga-emezi gị nke ọma nʼihi na ONYENWE ANYỊ ekwela Izrel nkwa ọtụtụ ezi ihe.” 30 Ma ọ zara sị, “E e, agaghị m eso unu. Ana m alaghachi nʼala nke aka m ịlaghachikwuru ụmụnna m.” 31 Ma Mosis zara sị ya, “Biko ahapụla anyị nʼihi na ị maara ebe anyị nwere ike kwụsị zuo ike nʼọzara. Ị ga-abụrụ anyị anya anyị ji ahụ ụzọ. 32 Ọ bụrụ na i soro anyị, anyị ga-ekenye gị ihe ọma ọbụla ONYENWE ANYỊ ga-enye anyị.” 33 Ya mere ha sitere nʼugwu ONYENWE ANYỊ bilie ije. Jeekwa ije abalị atọ. Igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ na-aga ha nʼihu ụbọchị atọ ndị ahụ niile ịchọtara ha ebe ha ga-akwụsị zuo ike. 34 Igwe ojii ONYENWE ANYỊ dị nʼelu ha nʼehihie mgbe ha si nʼọmụma ụlọ ikwu ha bilie ije. 35 Mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ ahụ biliri ije, Mosis na-ekwu sị,“Bilie O ONYENWE ANYỊ,ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị;ka ndị iro gị niile site nʼihu gị gbalaga.” 36 Ma mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ bịara ebe izuike, Mosis na-ekwukwa sị,“Lọghachi O ONYENWE ANYỊ,bịakwute ọtụtụ mmadụ ndị a, bụ imerime puku ndị Izrel.”

In Other Versions

Numbers 10 in the ANGEFD

Numbers 10 in the ANTPNG2D

Numbers 10 in the AS21

Numbers 10 in the BAGH

Numbers 10 in the BBPNG

Numbers 10 in the BBT1E

Numbers 10 in the BDS

Numbers 10 in the BEV

Numbers 10 in the BHAD

Numbers 10 in the BIB

Numbers 10 in the BLPT

Numbers 10 in the BNT

Numbers 10 in the BNTABOOT

Numbers 10 in the BNTLV

Numbers 10 in the BOATCB

Numbers 10 in the BOATCB2

Numbers 10 in the BOBCV

Numbers 10 in the BOCNT

Numbers 10 in the BOECS

Numbers 10 in the BOGWICC

Numbers 10 in the BOHCB

Numbers 10 in the BOHCV

Numbers 10 in the BOHLNT

Numbers 10 in the BOHNTLTAL

Numbers 10 in the BOILNTAP

Numbers 10 in the BOITCV

Numbers 10 in the BOKCV

Numbers 10 in the BOKCV2

Numbers 10 in the BOKHWOG

Numbers 10 in the BOKSSV

Numbers 10 in the BOLCB

Numbers 10 in the BOLCB2

Numbers 10 in the BOMCV

Numbers 10 in the BONAV

Numbers 10 in the BONCB

Numbers 10 in the BONLT

Numbers 10 in the BONUT2

Numbers 10 in the BOPLNT

Numbers 10 in the BOSCB

Numbers 10 in the BOSNC

Numbers 10 in the BOTLNT

Numbers 10 in the BOVCB

Numbers 10 in the BOYCB

Numbers 10 in the BPBB

Numbers 10 in the BPH

Numbers 10 in the BSB

Numbers 10 in the CCB

Numbers 10 in the CUV

Numbers 10 in the CUVS

Numbers 10 in the DBT

Numbers 10 in the DGDNT

Numbers 10 in the DHNT

Numbers 10 in the DNT

Numbers 10 in the ELBE

Numbers 10 in the EMTV

Numbers 10 in the ESV

Numbers 10 in the FBV

Numbers 10 in the FEB

Numbers 10 in the GGMNT

Numbers 10 in the GNT

Numbers 10 in the HARY

Numbers 10 in the HNT

Numbers 10 in the IRVA

Numbers 10 in the IRVB

Numbers 10 in the IRVG

Numbers 10 in the IRVH

Numbers 10 in the IRVK

Numbers 10 in the IRVM

Numbers 10 in the IRVM2

Numbers 10 in the IRVO

Numbers 10 in the IRVP

Numbers 10 in the IRVT

Numbers 10 in the IRVT2

Numbers 10 in the IRVU

Numbers 10 in the ISVN

Numbers 10 in the JSNT

Numbers 10 in the KAPI

Numbers 10 in the KBT1ETNIK

Numbers 10 in the KBV

Numbers 10 in the KJV

Numbers 10 in the KNFD

Numbers 10 in the LBA

Numbers 10 in the LBLA

Numbers 10 in the LNT

Numbers 10 in the LSV

Numbers 10 in the MAAL

Numbers 10 in the MBV

Numbers 10 in the MBV2

Numbers 10 in the MHNT

Numbers 10 in the MKNFD

Numbers 10 in the MNG

Numbers 10 in the MNT

Numbers 10 in the MNT2

Numbers 10 in the MRS1T

Numbers 10 in the NAA

Numbers 10 in the NASB

Numbers 10 in the NBLA

Numbers 10 in the NBS

Numbers 10 in the NBVTP

Numbers 10 in the NET2

Numbers 10 in the NIV11

Numbers 10 in the NNT

Numbers 10 in the NNT2

Numbers 10 in the NNT3

Numbers 10 in the PDDPT

Numbers 10 in the PFNT

Numbers 10 in the RMNT

Numbers 10 in the SBIAS

Numbers 10 in the SBIBS

Numbers 10 in the SBIBS2

Numbers 10 in the SBICS

Numbers 10 in the SBIDS

Numbers 10 in the SBIGS

Numbers 10 in the SBIHS

Numbers 10 in the SBIIS

Numbers 10 in the SBIIS2

Numbers 10 in the SBIIS3

Numbers 10 in the SBIKS

Numbers 10 in the SBIKS2

Numbers 10 in the SBIMS

Numbers 10 in the SBIOS

Numbers 10 in the SBIPS

Numbers 10 in the SBISS

Numbers 10 in the SBITS

Numbers 10 in the SBITS2

Numbers 10 in the SBITS3

Numbers 10 in the SBITS4

Numbers 10 in the SBIUS

Numbers 10 in the SBIVS

Numbers 10 in the SBT

Numbers 10 in the SBT1E

Numbers 10 in the SCHL

Numbers 10 in the SNT

Numbers 10 in the SUSU

Numbers 10 in the SUSU2

Numbers 10 in the SYNO

Numbers 10 in the TBIAOTANT

Numbers 10 in the TBT1E

Numbers 10 in the TBT1E2

Numbers 10 in the TFTIP

Numbers 10 in the TFTU

Numbers 10 in the TGNTATF3T

Numbers 10 in the THAI

Numbers 10 in the TNFD

Numbers 10 in the TNT

Numbers 10 in the TNTIK

Numbers 10 in the TNTIL

Numbers 10 in the TNTIN

Numbers 10 in the TNTIP

Numbers 10 in the TNTIZ

Numbers 10 in the TOMA

Numbers 10 in the TTENT

Numbers 10 in the UBG

Numbers 10 in the UGV

Numbers 10 in the UGV2

Numbers 10 in the UGV3

Numbers 10 in the VBL

Numbers 10 in the VDCC

Numbers 10 in the YALU

Numbers 10 in the YAPE

Numbers 10 in the YBVTP

Numbers 10 in the ZBP