Numbers 13 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Ziga ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa legharịa anya nʼala Kenan, ala ahụ m na-enye Izrel. Ziga mmadụ iri na abụọ, otu onyendu site nʼebo Izrel ọbụla.” 3 Ya mere, dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere ya si dị, Mosis zipụrụ ha site nʼọzara Paran. Ha niile bụ ndị ndu nʼetiti ụmụ Izrel. 4 Nke a bụ aha ha: Site nʼebo Ruben, Shamua nwa Zakua, 5 Shafat nwa Hori, onye si nʼebo Simiọn. 6 Kaleb nwa Jefune, onye si nʼebo Juda. 7 Igal nwa Josef, onye si nʼebo Isaka. 8 Hoshea nwa Nun, onye si nʼebo Ifrem 9 Palti nwa Rafu, onye si nʼebo Benjamin. 10 Gadiel nwa Sodi, onye si nʼebo Zebụlọn. 11 Gadi nwa Susi, onye sitere nʼebo Manase (ya bụ ebo Josef). 12 Amiel nwa Gemali, onye si nʼebo Dan. 13 Setua nwa Maikel, onye si nʼebo Asha. 14 Nabi nwa Vofusi, onye si nʼebo Naftalị. 15 Geuel nwa Maki, onye si nʼebo Gad. 16 Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ Mosis zipụrụ inyocha ala ahụ. (Ọ bụ nʼoge a ka Mosis gbanwere aha Hoshea nwa Nun, ka ọ bụrụ Joshua.) 17 Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu. 18 Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole. 19 Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike. 20 Letanụ otu ala ahụ dị. Ọ na-epupụta ihe ka ọ bụ ala ụkpa? Letanụ ma ha nwere ọtụtụ osisi ka ọ bụ na osisi adịghị nʼime ya. Gbalịanụ ka unu weta ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi dị nʼala ahụ.” (Ọ bụ oge mkpụrụ mbụ nke osisi vaịnị.) 21 Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat. 22 Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.) 23 Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl, ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig. 24 A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ. 25 Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi. 26 Ha lọtara bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel, na Kadesh nke dị nʼọzara Paran. Ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ otu ha si gaa nʼọgbakọ ụmụ Izrel niile. Gosikwa mkpụrụ osisi si nʼala ahụ. 27 Nke a bụ akụkọ ha kọọrọ Mosis, “Anyị ruru nʼala ahụ ị sị anyị gaa leta. Ọ bụkwa ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ndị a bụ mkpụrụ osisi si nʼala ahụ. 28 Ma ndị bi nʼobodo ahụ siri ike. Obodo ha buru ibu bụrụkwa nke e wusiri ike. Anyị hụkwara ụmụ ụmụ Anak nʼebe ahụ. 29 Ndị Amalek bi na Negev, ndị Het na ndị Jebus na ndị Amọrait bi nʼala ugwu ugwu. Ma nʼakụkụ osimiri Mediterenịan na ndagwurugwu mmiri Jọdan ka ndị Kenan bi.” 30 Ma Kaleb kwuru okwu mere ka obi sie ndị Izrel ike nʼoge a ha guzoro nʼihu Mosis sị ha, “Ka anyị gaanụ otu ihu nweta ala ahụ. Nʼihi na anyị nwere ike imeri ha.” 31 Ma ndị nledo ahụ soro ya gaa zara sị, “Anyị enweghị ike ibu agha megide ndị a; ha dị ike karịa anyị.” 32 Ndị a gbasara akụkọ ọjọọ nʼetiti ụmụ Izrel banyere ala ahụ ha gara ledoo. Ha sịrị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala na-eripịa ndị bi nʼime ya. Ndị niile anyị hụrụ nʼebe ahụ gbara nnọọ dimkpa 33 Anyị hụrụ ndị Nefilim nʼebe ahụ (ndị bụ ụmụ ụmụ Anak, ndị sitere na ndị Nefilim). Nʼanya anyị, anyị dịka ụkpana nʼebe ha nọ, otu a ka anyị dịkwa nʼanya ha.”

In Other Versions

Numbers 13 in the ANGEFD

Numbers 13 in the ANTPNG2D

Numbers 13 in the AS21

Numbers 13 in the BAGH

Numbers 13 in the BBPNG

Numbers 13 in the BBT1E

Numbers 13 in the BDS

Numbers 13 in the BEV

Numbers 13 in the BHAD

Numbers 13 in the BIB

Numbers 13 in the BLPT

Numbers 13 in the BNT

Numbers 13 in the BNTABOOT

Numbers 13 in the BNTLV

Numbers 13 in the BOATCB

Numbers 13 in the BOATCB2

Numbers 13 in the BOBCV

Numbers 13 in the BOCNT

Numbers 13 in the BOECS

Numbers 13 in the BOGWICC

Numbers 13 in the BOHCB

Numbers 13 in the BOHCV

Numbers 13 in the BOHLNT

Numbers 13 in the BOHNTLTAL

Numbers 13 in the BOILNTAP

Numbers 13 in the BOITCV

Numbers 13 in the BOKCV

Numbers 13 in the BOKCV2

Numbers 13 in the BOKHWOG

Numbers 13 in the BOKSSV

Numbers 13 in the BOLCB

Numbers 13 in the BOLCB2

Numbers 13 in the BOMCV

Numbers 13 in the BONAV

Numbers 13 in the BONCB

Numbers 13 in the BONLT

Numbers 13 in the BONUT2

Numbers 13 in the BOPLNT

Numbers 13 in the BOSCB

Numbers 13 in the BOSNC

Numbers 13 in the BOTLNT

Numbers 13 in the BOVCB

Numbers 13 in the BOYCB

Numbers 13 in the BPBB

Numbers 13 in the BPH

Numbers 13 in the BSB

Numbers 13 in the CCB

Numbers 13 in the CUV

Numbers 13 in the CUVS

Numbers 13 in the DBT

Numbers 13 in the DGDNT

Numbers 13 in the DHNT

Numbers 13 in the DNT

Numbers 13 in the ELBE

Numbers 13 in the EMTV

Numbers 13 in the ESV

Numbers 13 in the FBV

Numbers 13 in the FEB

Numbers 13 in the GGMNT

Numbers 13 in the GNT

Numbers 13 in the HARY

Numbers 13 in the HNT

Numbers 13 in the IRVA

Numbers 13 in the IRVB

Numbers 13 in the IRVG

Numbers 13 in the IRVH

Numbers 13 in the IRVK

Numbers 13 in the IRVM

Numbers 13 in the IRVM2

Numbers 13 in the IRVO

Numbers 13 in the IRVP

Numbers 13 in the IRVT

Numbers 13 in the IRVT2

Numbers 13 in the IRVU

Numbers 13 in the ISVN

Numbers 13 in the JSNT

Numbers 13 in the KAPI

Numbers 13 in the KBT1ETNIK

Numbers 13 in the KBV

Numbers 13 in the KJV

Numbers 13 in the KNFD

Numbers 13 in the LBA

Numbers 13 in the LBLA

Numbers 13 in the LNT

Numbers 13 in the LSV

Numbers 13 in the MAAL

Numbers 13 in the MBV

Numbers 13 in the MBV2

Numbers 13 in the MHNT

Numbers 13 in the MKNFD

Numbers 13 in the MNG

Numbers 13 in the MNT

Numbers 13 in the MNT2

Numbers 13 in the MRS1T

Numbers 13 in the NAA

Numbers 13 in the NASB

Numbers 13 in the NBLA

Numbers 13 in the NBS

Numbers 13 in the NBVTP

Numbers 13 in the NET2

Numbers 13 in the NIV11

Numbers 13 in the NNT

Numbers 13 in the NNT2

Numbers 13 in the NNT3

Numbers 13 in the PDDPT

Numbers 13 in the PFNT

Numbers 13 in the RMNT

Numbers 13 in the SBIAS

Numbers 13 in the SBIBS

Numbers 13 in the SBIBS2

Numbers 13 in the SBICS

Numbers 13 in the SBIDS

Numbers 13 in the SBIGS

Numbers 13 in the SBIHS

Numbers 13 in the SBIIS

Numbers 13 in the SBIIS2

Numbers 13 in the SBIIS3

Numbers 13 in the SBIKS

Numbers 13 in the SBIKS2

Numbers 13 in the SBIMS

Numbers 13 in the SBIOS

Numbers 13 in the SBIPS

Numbers 13 in the SBISS

Numbers 13 in the SBITS

Numbers 13 in the SBITS2

Numbers 13 in the SBITS3

Numbers 13 in the SBITS4

Numbers 13 in the SBIUS

Numbers 13 in the SBIVS

Numbers 13 in the SBT

Numbers 13 in the SBT1E

Numbers 13 in the SCHL

Numbers 13 in the SNT

Numbers 13 in the SUSU

Numbers 13 in the SUSU2

Numbers 13 in the SYNO

Numbers 13 in the TBIAOTANT

Numbers 13 in the TBT1E

Numbers 13 in the TBT1E2

Numbers 13 in the TFTIP

Numbers 13 in the TFTU

Numbers 13 in the TGNTATF3T

Numbers 13 in the THAI

Numbers 13 in the TNFD

Numbers 13 in the TNT

Numbers 13 in the TNTIK

Numbers 13 in the TNTIL

Numbers 13 in the TNTIN

Numbers 13 in the TNTIP

Numbers 13 in the TNTIZ

Numbers 13 in the TOMA

Numbers 13 in the TTENT

Numbers 13 in the UBG

Numbers 13 in the UGV

Numbers 13 in the UGV2

Numbers 13 in the UGV3

Numbers 13 in the VBL

Numbers 13 in the VDCC

Numbers 13 in the YALU

Numbers 13 in the YAPE

Numbers 13 in the YBVTP

Numbers 13 in the ZBP