Numbers 7 (BOICB)

1 Mgbe Mosis guzobesiri ụlọ nzute ahụ ọtọ, o tere ya mmanụ. Doo ya na ihe niile e ji chọọ ya mma nsọ. O tekwara ebe ịchụ aja mmanụ, doo ya nsọ, ya na ngwongwo ya niile. 2 Mgbe ahụ, ndị ndu Izrel, ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndị ndu ebo niile e tinyere ọrụ ịgụ ndị ahụ niile ọnụ wetara onyinye ha. 3 Ha wetara dịka onyinye ha nye ONYENWE ANYỊ ụgbọala isii ihe juputara nʼime ha, na ehi iri na abụọ. Ndị ndu abụọ ọbụla wetara otu ụgbọala, ma ha niile nʼotu na otu wetara otu ehi, otu ehi. Ha chere ihe ndị a niile nʼihu ụlọ nzute ahụ. 4 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 5 “Nabata onyinye ndị a niile, ka e jiri ha rụọ ọrụ ụlọ nzute, were ha nyefee ndị Livayị nʼaka, onye ọbụla dịka mkpa ọrụ ya si dị.” 6 Ya mere, Mosis nabatara ụgbọala ndị ahụ na ehi ndị ahụ, nyefee ha ndị Livayị nʼaka. 7 O nyere ụmụ Geshọn ụgbọala abụọ na ehi anọ, dịka ọrụ ha si dị. 8 Nye ụmụ Merari, ụgbọala anọ na ehi asatọ, dịka ọrụ ha si dị. Ha niile nọ nʼokpuru nlekọta Itama nwa Erọn, onye nchụaja. 9 Mosis enyeghị ụmụ Kohat ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ nʼisi mbụ aka ha ka ha ji ebu ihe nsọ ndị ahụ ha ketara ibu. 10 Ndị ndu ụmụ Izrel niile wetara onyinye ido nsọ nʼụbọchị e tere ebe ịchụ aja ahụ mmanụ ido ya nsọ. Ha wetara ha, debe ha nʼihu ebe ịchụ aja ahụ. 11 Nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ka onyendu ọbụla weta onyinye nʼụbọchị dị iche iche, otu onye, otu ụbọchị, maka ido nsọ nke ebe ịchụ aja ahụ.” 12 Ya mere, Nashọn nwa Aminadab onye si nʼebo Juda wetara onyinye nke ya nʼụbọchị nke mbụ. 13 Onyinye o wetara bụ:efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere abụọ ndị a ụtụ ọka a gwara mmanụ maka onyinye mkpụrụ ọka. 14 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 15 O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule nke gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 16 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 17 na ehi abụọ, na ebule ise, na mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Nashọn nwa Aminadab nyere. 18 Nʼụbọchị nke abụọ, Netanel nwa Zua, onyendu ebo Isaka wetara onyinye nke ya. 19 Onyinye o wetara bụ:otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 20 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 21 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 22 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 23 na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Netanel nwa Zua. 24 Nʼụbọchị nke atọ Eliab nwa Helọn onyendu ebo Zebụlọn wetakwara onyinye nke ya. 25 Onyinye o wetara bụ:otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 26 O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 27 O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 28 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 29 na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Eliab nwa Helọn wetara. 30 Nʼụbọchị nke anọ, Elizọ nwa Shedeua onyendu ebo Ruben wetara onyinye nke ya. 31 Onyinye o wetara bụ:otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 32 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 33 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 34 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 35 na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Elizọ nwa Shedeua nyere. 36 Nʼụbọchị nke ise Shelumiel nwa Zurishadai, onyendu ebo Simiọn butere onyinye nke ya. 37 Onyinye o wetara bụ:otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 38 O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 39 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 40 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 41 ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Shelumiel nwa Zurishadai nyere. 42 Nʼụbọchị nke isii, Eliasaf nwa Deuel onyendu ebo Gad butere onyinye nke ya. 43 Onyinye o wetara bụ:otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 44 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 45 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 46 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 47 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Eliasaf nwa Deuel nyere. 48 Nʼụbọchị nke asaa, Elishama, nwa Amihud, onyendu ebo Ifrem butere onyinye nke ya. 49 Onyinye o wetara bụ:otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 50 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 51 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 52 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 53 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Elishama nwa Amihud nyere. 54 Nʼụbọchị nke asatọ, Gamaliel nwa Pedazo onyendu ebo Manase nyere onyinye nke ya. 55 Onyinye o wetara bụ:otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 56 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 57 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 58 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 59 ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Gamaliel nwa Pedazo nyere. 60 Nʼụbọchị nke itoolu, Abidan nwa Gidiọn onyendu ebo Benjamin nyere onyinye nke ya. 61 Onyinye o wetara bụ:otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 62 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 63 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 64 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 65 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Abidan nwa Gidiọni nyere. 66 Nʼụbọchị nke iri, Ahieza nwa Amishadai, onyendu ebo Dan butere onyinye nke ya. 67 Onyinye o wetara bụ:otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 68 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 69 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 70 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 71 ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Ahieza nwa Amishadai nyere. 72 Nʼụbọchị nke iri na otu, Pagịel nwa Okran, onyendu ebo Asha butere onyinye nke ya. 73 Onyinye o wetara bụ:otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 74 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 75 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 76 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 77 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Pagịel nwa Okran nyere. 78 Nʼụbọchị nke iri na abụọ, Ahira nwa Enan, onyendu ebo Naftalị nyere onyinye nke ya. 79 Onyinye o wetara bụ:otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 80 O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 81 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 82 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 83 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.Nke a bụ onyinye Ahira nwa Enan nyere. 84 Ndị a bụ onyinye ndị ndu ụmụ Izrel wetara maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ:efere ọlaọcha iri na abụọ, na efere ọlaọcha ịkwọsa mmiri iri na abụọ, na efere ọlaedo iri na abụọ. 85 Ịdị arọ nke efere ọlaọcha ọbụla dị otu narị shekel na iri shekel atọ. Ịdị arọ nke efere ịkwọsa mmiri ọbụla dị iri shekel asaa. Ịdị arọ efere ọlaọcha niile ha wetara bụ puku shekel abụọ na narị shekel anọ, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. 86 Ịdị arọ nke otu nʼime efere ọlaedo iri na abụọ ndị ahụ ụda nsure ọkụ na-esi isi ụtọ juru nʼime ha bụ iri shekel, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. Ịdị arọ nke efere ọlaedo ndị ahụ niile bụ otu narị shekel na iri shekel abụọ. 87 Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile e wetara maka aja nsure ọkụ bụ: oke ehi iri na abụọ, na ebule iri na abụọ, na ụmụ ebule iri na abụọ gbara otu afọ, otu afọ, tinyere ihe niile ha wetara maka aja mkpụrụ ọka. E ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie. 88 Anụ ụlọ niile e ji chụọ aja udo bụ, iri oke ehi abụọ na anọ, na iri ebule isii, na iri mkpi isii, na ụmụ ebule iri isii ndị gbara naanị otu afọ, otu afọ. Ndị a niile bụ onyinye e nyere maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ. 89 Mgbe Mosis banyere nʼụlọ ikwu ahụ ka ya na Onyenwe anyị kparịa ụka, ọ nụrụ olu ahụ ka ọ na-agwa ya okwu site nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ nʼelu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ gwa ya okwu. Nʼụzọ dị otu a ka ONYENWE ANYỊ si gwa ya okwu.

In Other Versions

Numbers 7 in the ANGEFD

Numbers 7 in the ANTPNG2D

Numbers 7 in the AS21

Numbers 7 in the BAGH

Numbers 7 in the BBPNG

Numbers 7 in the BBT1E

Numbers 7 in the BDS

Numbers 7 in the BEV

Numbers 7 in the BHAD

Numbers 7 in the BIB

Numbers 7 in the BLPT

Numbers 7 in the BNT

Numbers 7 in the BNTABOOT

Numbers 7 in the BNTLV

Numbers 7 in the BOATCB

Numbers 7 in the BOATCB2

Numbers 7 in the BOBCV

Numbers 7 in the BOCNT

Numbers 7 in the BOECS

Numbers 7 in the BOGWICC

Numbers 7 in the BOHCB

Numbers 7 in the BOHCV

Numbers 7 in the BOHLNT

Numbers 7 in the BOHNTLTAL

Numbers 7 in the BOILNTAP

Numbers 7 in the BOITCV

Numbers 7 in the BOKCV

Numbers 7 in the BOKCV2

Numbers 7 in the BOKHWOG

Numbers 7 in the BOKSSV

Numbers 7 in the BOLCB

Numbers 7 in the BOLCB2

Numbers 7 in the BOMCV

Numbers 7 in the BONAV

Numbers 7 in the BONCB

Numbers 7 in the BONLT

Numbers 7 in the BONUT2

Numbers 7 in the BOPLNT

Numbers 7 in the BOSCB

Numbers 7 in the BOSNC

Numbers 7 in the BOTLNT

Numbers 7 in the BOVCB

Numbers 7 in the BOYCB

Numbers 7 in the BPBB

Numbers 7 in the BPH

Numbers 7 in the BSB

Numbers 7 in the CCB

Numbers 7 in the CUV

Numbers 7 in the CUVS

Numbers 7 in the DBT

Numbers 7 in the DGDNT

Numbers 7 in the DHNT

Numbers 7 in the DNT

Numbers 7 in the ELBE

Numbers 7 in the EMTV

Numbers 7 in the ESV

Numbers 7 in the FBV

Numbers 7 in the FEB

Numbers 7 in the GGMNT

Numbers 7 in the GNT

Numbers 7 in the HARY

Numbers 7 in the HNT

Numbers 7 in the IRVA

Numbers 7 in the IRVB

Numbers 7 in the IRVG

Numbers 7 in the IRVH

Numbers 7 in the IRVK

Numbers 7 in the IRVM

Numbers 7 in the IRVM2

Numbers 7 in the IRVO

Numbers 7 in the IRVP

Numbers 7 in the IRVT

Numbers 7 in the IRVT2

Numbers 7 in the IRVU

Numbers 7 in the ISVN

Numbers 7 in the JSNT

Numbers 7 in the KAPI

Numbers 7 in the KBT1ETNIK

Numbers 7 in the KBV

Numbers 7 in the KJV

Numbers 7 in the KNFD

Numbers 7 in the LBA

Numbers 7 in the LBLA

Numbers 7 in the LNT

Numbers 7 in the LSV

Numbers 7 in the MAAL

Numbers 7 in the MBV

Numbers 7 in the MBV2

Numbers 7 in the MHNT

Numbers 7 in the MKNFD

Numbers 7 in the MNG

Numbers 7 in the MNT

Numbers 7 in the MNT2

Numbers 7 in the MRS1T

Numbers 7 in the NAA

Numbers 7 in the NASB

Numbers 7 in the NBLA

Numbers 7 in the NBS

Numbers 7 in the NBVTP

Numbers 7 in the NET2

Numbers 7 in the NIV11

Numbers 7 in the NNT

Numbers 7 in the NNT2

Numbers 7 in the NNT3

Numbers 7 in the PDDPT

Numbers 7 in the PFNT

Numbers 7 in the RMNT

Numbers 7 in the SBIAS

Numbers 7 in the SBIBS

Numbers 7 in the SBIBS2

Numbers 7 in the SBICS

Numbers 7 in the SBIDS

Numbers 7 in the SBIGS

Numbers 7 in the SBIHS

Numbers 7 in the SBIIS

Numbers 7 in the SBIIS2

Numbers 7 in the SBIIS3

Numbers 7 in the SBIKS

Numbers 7 in the SBIKS2

Numbers 7 in the SBIMS

Numbers 7 in the SBIOS

Numbers 7 in the SBIPS

Numbers 7 in the SBISS

Numbers 7 in the SBITS

Numbers 7 in the SBITS2

Numbers 7 in the SBITS3

Numbers 7 in the SBITS4

Numbers 7 in the SBIUS

Numbers 7 in the SBIVS

Numbers 7 in the SBT

Numbers 7 in the SBT1E

Numbers 7 in the SCHL

Numbers 7 in the SNT

Numbers 7 in the SUSU

Numbers 7 in the SUSU2

Numbers 7 in the SYNO

Numbers 7 in the TBIAOTANT

Numbers 7 in the TBT1E

Numbers 7 in the TBT1E2

Numbers 7 in the TFTIP

Numbers 7 in the TFTU

Numbers 7 in the TGNTATF3T

Numbers 7 in the THAI

Numbers 7 in the TNFD

Numbers 7 in the TNT

Numbers 7 in the TNTIK

Numbers 7 in the TNTIL

Numbers 7 in the TNTIN

Numbers 7 in the TNTIP

Numbers 7 in the TNTIZ

Numbers 7 in the TOMA

Numbers 7 in the TTENT

Numbers 7 in the UBG

Numbers 7 in the UGV

Numbers 7 in the UGV2

Numbers 7 in the UGV3

Numbers 7 in the VBL

Numbers 7 in the VDCC

Numbers 7 in the YALU

Numbers 7 in the YAPE

Numbers 7 in the YBVTP

Numbers 7 in the ZBP