Philippians 1 (BOICB)
1 Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Kraịst Jisọs, Na-edegara unu ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị nsọ niile nọ nʼụlọ nzukọ Kraịst Jisọs dị nʼobodo Filipai. 2 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 3 Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu. 4 Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ. 5 Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a. 6 Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs. 7 Ọ bụ ihe ziri ezi nʼebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu niile, nʼihi na unu dị m nʼobi. Ma m nọ nʼagbụ maọbụ na m na-echekwa oziọma, na mgbe m na-eme ka o guzosie ike, unu niile esorola m keta oke nʼamara ahụ. 8 Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs. 9 Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile. 10 Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst. 11 Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto. 12 Ugbu a ụmụnna m, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu niile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa oziọma na-aga nʼihu. 13 Nʼihi na ọ pụtala ihe nye ndị nche nke ụlọeze ahụ na onye ọbụla ọzọ, na ọ bụ naanị nʼihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m mkpọrọ. 14 Site na mkpọrọ a a tụrụ m, e meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bụrụ ndị nwere ezi ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị, nwekwa oke nkwuwa okwu, izisa oziọma ahụ na-atụghị egwu ọbụla. 15 Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ji ekworo na anya ụfụ na-ekwusa Kraịst, ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nʼọchịchọ obi ziri ezi. 16 Ndị ahụ ji ọchịchọ obi ziri ezi na-eme nke a nʼịhụnanya ebe ha matara na e tinyere m ebe a nʼihi izisa oziọma. 17 Ndị mbụ ahụ na-ekwusa Kraịst site nʼọchịchọ obi nke onwe ha, ọ bụghị site nʼezi obi, ebe ha na-eche na ha ga-akpalị nsogbu nye m nʼime mkpọrọ. 18 Gịnịkwa ka ogbochiri? Otu ọ dị, maọbụ nʼụzọ aghụghọ maọbụ nʼeziokwu, ihe dị mkpa bụ nʼụzọ ọbụla a na-ekwusa oziọma Kraịst, nʼihi nke a ka m na-aṅụrị ọṅụ.E, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe niile. 19 Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta. 20 Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ. 21 Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru. 22 Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ nʼanụ ahụ, nke a buuru m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ. 23 Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma. 24 Ma ọ pụtara ihe na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ nʼanụ ahụ. 25 Ebe nke a doro m anya, amara m na mụ na unu niile ga-aga nʼihu ịnọ maka ọganihu na ọṅụ nke unu nʼime okwukwe. 26 Ka mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, unu ga-enwebiga ọṅụ oke nʼime Kraịst Jisọs nʼihi m. 27 Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma, 28 na-atụghị ụjọ ihe ndị na-emegide unu ga-eme. Iguzosi ike unu ga-agbara ha ezi ama banyere ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha. Ma nʼebe unu nọ, ọ ga-abụrụ unu nzọpụta pụtara ihe nke sikwa nʼebe Chineke nọ bịa. 29 Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya. 30 Unu nọ na-agabiga ụdị ibu agha ahụ unu hụrụ na m gabigara, nke unu na-anụkwa na m ka nọ nʼime ya ugbu a.
In Other Versions
Philippians 1 in the ANGEFD
Philippians 1 in the ANTPNG2D
Philippians 1 in the AS21
Philippians 1 in the BAGH
Philippians 1 in the BBPNG
Philippians 1 in the BBT1E
Philippians 1 in the BDS
Philippians 1 in the BEV
Philippians 1 in the BHAD
Philippians 1 in the BIB
Philippians 1 in the BLPT
Philippians 1 in the BNT
Philippians 1 in the BNTABOOT
Philippians 1 in the BNTLV
Philippians 1 in the BOATCB
Philippians 1 in the BOATCB2
Philippians 1 in the BOBCV
Philippians 1 in the BOCNT
Philippians 1 in the BOECS
Philippians 1 in the BOGWICC
Philippians 1 in the BOHCB
Philippians 1 in the BOHCV
Philippians 1 in the BOHLNT
Philippians 1 in the BOHNTLTAL
Philippians 1 in the BOILNTAP
Philippians 1 in the BOITCV
Philippians 1 in the BOKCV
Philippians 1 in the BOKCV2
Philippians 1 in the BOKHWOG
Philippians 1 in the BOKSSV
Philippians 1 in the BOLCB
Philippians 1 in the BOLCB2
Philippians 1 in the BOMCV
Philippians 1 in the BONAV
Philippians 1 in the BONCB
Philippians 1 in the BONLT
Philippians 1 in the BONUT2
Philippians 1 in the BOPLNT
Philippians 1 in the BOSCB
Philippians 1 in the BOSNC
Philippians 1 in the BOTLNT
Philippians 1 in the BOVCB
Philippians 1 in the BOYCB
Philippians 1 in the BPBB
Philippians 1 in the BPH
Philippians 1 in the BSB
Philippians 1 in the CCB
Philippians 1 in the CUV
Philippians 1 in the CUVS
Philippians 1 in the DBT
Philippians 1 in the DGDNT
Philippians 1 in the DHNT
Philippians 1 in the DNT
Philippians 1 in the ELBE
Philippians 1 in the EMTV
Philippians 1 in the ESV
Philippians 1 in the FBV
Philippians 1 in the FEB
Philippians 1 in the GGMNT
Philippians 1 in the GNT
Philippians 1 in the HARY
Philippians 1 in the HNT
Philippians 1 in the IRVA
Philippians 1 in the IRVB
Philippians 1 in the IRVG
Philippians 1 in the IRVH
Philippians 1 in the IRVK
Philippians 1 in the IRVM
Philippians 1 in the IRVM2
Philippians 1 in the IRVO
Philippians 1 in the IRVP
Philippians 1 in the IRVT
Philippians 1 in the IRVT2
Philippians 1 in the IRVU
Philippians 1 in the ISVN
Philippians 1 in the JSNT
Philippians 1 in the KAPI
Philippians 1 in the KBT1ETNIK
Philippians 1 in the KBV
Philippians 1 in the KJV
Philippians 1 in the KNFD
Philippians 1 in the LBA
Philippians 1 in the LBLA
Philippians 1 in the LNT
Philippians 1 in the LSV
Philippians 1 in the MAAL
Philippians 1 in the MBV
Philippians 1 in the MBV2
Philippians 1 in the MHNT
Philippians 1 in the MKNFD
Philippians 1 in the MNG
Philippians 1 in the MNT
Philippians 1 in the MNT2
Philippians 1 in the MRS1T
Philippians 1 in the NAA
Philippians 1 in the NASB
Philippians 1 in the NBLA
Philippians 1 in the NBS
Philippians 1 in the NBVTP
Philippians 1 in the NET2
Philippians 1 in the NIV11
Philippians 1 in the NNT
Philippians 1 in the NNT2
Philippians 1 in the NNT3
Philippians 1 in the PDDPT
Philippians 1 in the PFNT
Philippians 1 in the RMNT
Philippians 1 in the SBIAS
Philippians 1 in the SBIBS
Philippians 1 in the SBIBS2
Philippians 1 in the SBICS
Philippians 1 in the SBIDS
Philippians 1 in the SBIGS
Philippians 1 in the SBIHS
Philippians 1 in the SBIIS
Philippians 1 in the SBIIS2
Philippians 1 in the SBIIS3
Philippians 1 in the SBIKS
Philippians 1 in the SBIKS2
Philippians 1 in the SBIMS
Philippians 1 in the SBIOS
Philippians 1 in the SBIPS
Philippians 1 in the SBISS
Philippians 1 in the SBITS
Philippians 1 in the SBITS2
Philippians 1 in the SBITS3
Philippians 1 in the SBITS4
Philippians 1 in the SBIUS
Philippians 1 in the SBIVS
Philippians 1 in the SBT
Philippians 1 in the SBT1E
Philippians 1 in the SCHL
Philippians 1 in the SNT
Philippians 1 in the SUSU
Philippians 1 in the SUSU2
Philippians 1 in the SYNO
Philippians 1 in the TBIAOTANT
Philippians 1 in the TBT1E
Philippians 1 in the TBT1E2
Philippians 1 in the TFTIP
Philippians 1 in the TFTU
Philippians 1 in the TGNTATF3T
Philippians 1 in the THAI
Philippians 1 in the TNFD
Philippians 1 in the TNT
Philippians 1 in the TNTIK
Philippians 1 in the TNTIL
Philippians 1 in the TNTIN
Philippians 1 in the TNTIP
Philippians 1 in the TNTIZ
Philippians 1 in the TOMA
Philippians 1 in the TTENT
Philippians 1 in the UBG
Philippians 1 in the UGV
Philippians 1 in the UGV2
Philippians 1 in the UGV3
Philippians 1 in the VBL
Philippians 1 in the VDCC
Philippians 1 in the YALU
Philippians 1 in the YAPE
Philippians 1 in the YBVTP
Philippians 1 in the ZBP