Proverbs 6 (BOICB)

1 Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe,ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe, 2 ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru,onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya. 3 Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị;nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị:Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ yaenyekwala ya izuike ọbụla. 4 Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ,ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra. 5 Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta,maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya. 6 Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ.Mụta ihe site nʼụzọ ya niile. 7 Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha,maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha, 8 ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchịma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi. 9 Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ?Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie? 10 Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta,nwa ịchịkọba aka nta zuo ike, 11 ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi,ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe. 12 Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya,onye na-ejegharị na-ekwu okwu aghụghọ, 13 onye ji iro na-egbu ikuanya ya,jiri ụkwụ ya na-ekwu okwuna mkpịsịaka ya na-egosi ihe. 14 Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ,onye na-akpalikwa esemokwu mgbe niile. 15 Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede;nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya. 16 Ọ dị ụzọ ihe isii ONYENWE ANYỊ kpọrọ asị,e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ. 17 Anya dị nganga,ire na-ekwu okwu ụgha,aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ. 18 Obi na-echepụta nzube ọjọọ;ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe, 19 onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmirina onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna. 20 Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu,ahapụkwala iwu nke nne gị. 21 Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile,ka ị ghara ichefu ha. 22 Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị;mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị.Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka. 23 Nʼihi na iwu a bụ oriọna,Ihe ozizi a bụkwa ìhè,otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mbabụ ụzọ ezi ndụ, 24 idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ,sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ. 25 Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya,ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị. 26 Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta,ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi. 27 Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya,ma uwe ya ereghị ọkụ? 28 Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ? 29 Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya;o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ. 30 Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohika o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike. 31 Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa.Nʼagbanyeghị na nke a ga-eme ka o ree ihe niile o ji biri nʼụlọ ya. 32 Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya,nʼihi na ọ bụ onwe ya ka ọ na-ala nʼiyi. 33 A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya,ihere ya agaghị ekwe ihichapụ. 34 Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ;ọ gakwaghị enwe obi ebere nʼebe ọ nọ nʼụbọchị ọ ga-abọ ọbọ. 35 Ọ gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya.O nwekwaghị ihe a ga-enye ya pụrụ ime ka iwe ya dajụọ.

In Other Versions

Proverbs 6 in the ANGEFD

Proverbs 6 in the ANTPNG2D

Proverbs 6 in the AS21

Proverbs 6 in the BAGH

Proverbs 6 in the BBPNG

Proverbs 6 in the BBT1E

Proverbs 6 in the BDS

Proverbs 6 in the BEV

Proverbs 6 in the BHAD

Proverbs 6 in the BIB

Proverbs 6 in the BLPT

Proverbs 6 in the BNT

Proverbs 6 in the BNTABOOT

Proverbs 6 in the BNTLV

Proverbs 6 in the BOATCB

Proverbs 6 in the BOATCB2

Proverbs 6 in the BOBCV

Proverbs 6 in the BOCNT

Proverbs 6 in the BOECS

Proverbs 6 in the BOGWICC

Proverbs 6 in the BOHCB

Proverbs 6 in the BOHCV

Proverbs 6 in the BOHLNT

Proverbs 6 in the BOHNTLTAL

Proverbs 6 in the BOILNTAP

Proverbs 6 in the BOITCV

Proverbs 6 in the BOKCV

Proverbs 6 in the BOKCV2

Proverbs 6 in the BOKHWOG

Proverbs 6 in the BOKSSV

Proverbs 6 in the BOLCB

Proverbs 6 in the BOLCB2

Proverbs 6 in the BOMCV

Proverbs 6 in the BONAV

Proverbs 6 in the BONCB

Proverbs 6 in the BONLT

Proverbs 6 in the BONUT2

Proverbs 6 in the BOPLNT

Proverbs 6 in the BOSCB

Proverbs 6 in the BOSNC

Proverbs 6 in the BOTLNT

Proverbs 6 in the BOVCB

Proverbs 6 in the BOYCB

Proverbs 6 in the BPBB

Proverbs 6 in the BPH

Proverbs 6 in the BSB

Proverbs 6 in the CCB

Proverbs 6 in the CUV

Proverbs 6 in the CUVS

Proverbs 6 in the DBT

Proverbs 6 in the DGDNT

Proverbs 6 in the DHNT

Proverbs 6 in the DNT

Proverbs 6 in the ELBE

Proverbs 6 in the EMTV

Proverbs 6 in the ESV

Proverbs 6 in the FBV

Proverbs 6 in the FEB

Proverbs 6 in the GGMNT

Proverbs 6 in the GNT

Proverbs 6 in the HARY

Proverbs 6 in the HNT

Proverbs 6 in the IRVA

Proverbs 6 in the IRVB

Proverbs 6 in the IRVG

Proverbs 6 in the IRVH

Proverbs 6 in the IRVK

Proverbs 6 in the IRVM

Proverbs 6 in the IRVM2

Proverbs 6 in the IRVO

Proverbs 6 in the IRVP

Proverbs 6 in the IRVT

Proverbs 6 in the IRVT2

Proverbs 6 in the IRVU

Proverbs 6 in the ISVN

Proverbs 6 in the JSNT

Proverbs 6 in the KAPI

Proverbs 6 in the KBT1ETNIK

Proverbs 6 in the KBV

Proverbs 6 in the KJV

Proverbs 6 in the KNFD

Proverbs 6 in the LBA

Proverbs 6 in the LBLA

Proverbs 6 in the LNT

Proverbs 6 in the LSV

Proverbs 6 in the MAAL

Proverbs 6 in the MBV

Proverbs 6 in the MBV2

Proverbs 6 in the MHNT

Proverbs 6 in the MKNFD

Proverbs 6 in the MNG

Proverbs 6 in the MNT

Proverbs 6 in the MNT2

Proverbs 6 in the MRS1T

Proverbs 6 in the NAA

Proverbs 6 in the NASB

Proverbs 6 in the NBLA

Proverbs 6 in the NBS

Proverbs 6 in the NBVTP

Proverbs 6 in the NET2

Proverbs 6 in the NIV11

Proverbs 6 in the NNT

Proverbs 6 in the NNT2

Proverbs 6 in the NNT3

Proverbs 6 in the PDDPT

Proverbs 6 in the PFNT

Proverbs 6 in the RMNT

Proverbs 6 in the SBIAS

Proverbs 6 in the SBIBS

Proverbs 6 in the SBIBS2

Proverbs 6 in the SBICS

Proverbs 6 in the SBIDS

Proverbs 6 in the SBIGS

Proverbs 6 in the SBIHS

Proverbs 6 in the SBIIS

Proverbs 6 in the SBIIS2

Proverbs 6 in the SBIIS3

Proverbs 6 in the SBIKS

Proverbs 6 in the SBIKS2

Proverbs 6 in the SBIMS

Proverbs 6 in the SBIOS

Proverbs 6 in the SBIPS

Proverbs 6 in the SBISS

Proverbs 6 in the SBITS

Proverbs 6 in the SBITS2

Proverbs 6 in the SBITS3

Proverbs 6 in the SBITS4

Proverbs 6 in the SBIUS

Proverbs 6 in the SBIVS

Proverbs 6 in the SBT

Proverbs 6 in the SBT1E

Proverbs 6 in the SCHL

Proverbs 6 in the SNT

Proverbs 6 in the SUSU

Proverbs 6 in the SUSU2

Proverbs 6 in the SYNO

Proverbs 6 in the TBIAOTANT

Proverbs 6 in the TBT1E

Proverbs 6 in the TBT1E2

Proverbs 6 in the TFTIP

Proverbs 6 in the TFTU

Proverbs 6 in the TGNTATF3T

Proverbs 6 in the THAI

Proverbs 6 in the TNFD

Proverbs 6 in the TNT

Proverbs 6 in the TNTIK

Proverbs 6 in the TNTIL

Proverbs 6 in the TNTIN

Proverbs 6 in the TNTIP

Proverbs 6 in the TNTIZ

Proverbs 6 in the TOMA

Proverbs 6 in the TTENT

Proverbs 6 in the UBG

Proverbs 6 in the UGV

Proverbs 6 in the UGV2

Proverbs 6 in the UGV3

Proverbs 6 in the VBL

Proverbs 6 in the VDCC

Proverbs 6 in the YALU

Proverbs 6 in the YAPE

Proverbs 6 in the YBVTP

Proverbs 6 in the ZBP