Psalms 110 (BOICB)
undefined Abụ Ọma Devid. 1 ONYENWE ANYỊ gwara Onyenwe m okwu sị ya: “Nọdụ ala nʼaka nri mruo mgbe m ga-eme ndị iro gịihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” 2 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ;ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile. 3 Nʼụbọchị ị ga-ebu agha,ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị.Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe,bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gịdịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ. 4 ONYENWE ANYỊ aṅụọla iyi,ọ gaghị agbanwe uche ya:“Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi,nʼusoro Melkizedek.” 5 Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị.Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya. 6 Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ,ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile. 7 Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ;nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu.