Psalms 123 (BOICB)
undefined Abụ nrigo. 1 Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị,gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe. 2 Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya,na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje,otu a ka anyị si na-elekwasị ONYENWE ANYỊ bụ Chineke anyị anya,ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere. 3 Meere anyị ebere, O ONYENWE ANYỊ, meere anyị ebere,nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha. 4 Nʼihi na nnagide anyị na-anagideịchị ọchị ndị nganga,na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.