Psalms 89 (BOICB)

undefined Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. 1 Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya ONYENWE ANYỊ ruo mgbe ebighị ebi;aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile maramaka ikwesi ntụkwasị obi gị. 2 Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe. 3 Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ.Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị, 4 ‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebimeekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela 5 O ONYENWE ANYỊ, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile,na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ. 6 Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere ONYENWE ANYỊ?Onye yiri ONYENWE ANYỊ nʼetiti ndị mmụọ ozi niile? 7 Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu;ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu. 8 O ONYENWE ANYỊ Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị?Gị, O ONYENWE ANYỊ, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu. 9 Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ;mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ. 10 Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu;jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị. 11 Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa,ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. 12 Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda;Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị. 13 Aka gị ka e mejupụtara nʼike;aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu. 14 Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị;ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị. 15 Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ,ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O ONYENWE ANYỊ. 16 Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile;ha na-aṅụrị nʼezi omume gị. 17 Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha,site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu. 18 Nʼezie, ọta anyị bụ nke ONYENWE ANYỊ,eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel. 19 I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ,nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị:“Enyela m otu onye dị ike agha ike;Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m. 20 Achọtala m Devid ohu m,were mmanụ nsọ m tee ya. 21 Aka m ga-agba ya ume;nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike. 22 Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede;ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya. 23 Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya.Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi. 24 Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya,site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu. 25 M ga-edo aka ya nʼoke osimiri,dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile. 26 Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m,bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’ 27 Aga m eme ya nwa mbụ m,onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ. 28 Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi,ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa. 29 Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi,ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide. 30 “Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya,gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile, 31 ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya,hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu, 32 aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha,tikwaa ha ụtarị maka njehie ha; 33 ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ.Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m. 34 Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m.Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta. 35 Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebiena m apụghị ịghara Devid ụgha, 36 na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide. 37 Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa.E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” Sela 38 Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa,i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ. 39 Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbarai merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala. 40 Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu,i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa. 41 Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere.Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo. 42 I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu;mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ. 43 I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ,i nyereghị ya aka mgbe agha dara. 44 I meela ka ịma mma ya gwụsịa.Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala. 45 I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ.I ji ihere dịka akwa kpuchie ya. 46 Ruo ole mgbe ONYENWE ANYỊ, ka ị ga-ezonarị onwe gị?Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ? 47 Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa.Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile! 48 Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya,maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? Sela 49 O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị,nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi? 50 Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya,otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile. 51 O ONYENWE ANYỊ, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo,nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ. 52 Otuto dịrị ONYENWE ANYỊ ruo mgbe ebighị ebi.Amen na Amen.

In Other Versions

Psalms 89 in the ANGEFD

Psalms 89 in the ANTPNG2D

Psalms 89 in the AS21

Psalms 89 in the BAGH

Psalms 89 in the BBPNG

Psalms 89 in the BBT1E

Psalms 89 in the BDS

Psalms 89 in the BEV

Psalms 89 in the BHAD

Psalms 89 in the BIB

Psalms 89 in the BLPT

Psalms 89 in the BNT

Psalms 89 in the BNTABOOT

Psalms 89 in the BNTLV

Psalms 89 in the BOATCB

Psalms 89 in the BOATCB2

Psalms 89 in the BOBCV

Psalms 89 in the BOCNT

Psalms 89 in the BOECS

Psalms 89 in the BOGWICC

Psalms 89 in the BOHCB

Psalms 89 in the BOHCV

Psalms 89 in the BOHLNT

Psalms 89 in the BOHNTLTAL

Psalms 89 in the BOILNTAP

Psalms 89 in the BOITCV

Psalms 89 in the BOKCV

Psalms 89 in the BOKCV2

Psalms 89 in the BOKHWOG

Psalms 89 in the BOKSSV

Psalms 89 in the BOLCB

Psalms 89 in the BOLCB2

Psalms 89 in the BOMCV

Psalms 89 in the BONAV

Psalms 89 in the BONCB

Psalms 89 in the BONLT

Psalms 89 in the BONUT2

Psalms 89 in the BOPLNT

Psalms 89 in the BOSCB

Psalms 89 in the BOSNC

Psalms 89 in the BOTLNT

Psalms 89 in the BOVCB

Psalms 89 in the BOYCB

Psalms 89 in the BPBB

Psalms 89 in the BPH

Psalms 89 in the BSB

Psalms 89 in the CCB

Psalms 89 in the CUV

Psalms 89 in the CUVS

Psalms 89 in the DBT

Psalms 89 in the DGDNT

Psalms 89 in the DHNT

Psalms 89 in the DNT

Psalms 89 in the ELBE

Psalms 89 in the EMTV

Psalms 89 in the ESV

Psalms 89 in the FBV

Psalms 89 in the FEB

Psalms 89 in the GGMNT

Psalms 89 in the GNT

Psalms 89 in the HARY

Psalms 89 in the HNT

Psalms 89 in the IRVA

Psalms 89 in the IRVB

Psalms 89 in the IRVG

Psalms 89 in the IRVH

Psalms 89 in the IRVK

Psalms 89 in the IRVM

Psalms 89 in the IRVM2

Psalms 89 in the IRVO

Psalms 89 in the IRVP

Psalms 89 in the IRVT

Psalms 89 in the IRVT2

Psalms 89 in the IRVU

Psalms 89 in the ISVN

Psalms 89 in the JSNT

Psalms 89 in the KAPI

Psalms 89 in the KBT1ETNIK

Psalms 89 in the KBV

Psalms 89 in the KJV

Psalms 89 in the KNFD

Psalms 89 in the LBA

Psalms 89 in the LBLA

Psalms 89 in the LNT

Psalms 89 in the LSV

Psalms 89 in the MAAL

Psalms 89 in the MBV

Psalms 89 in the MBV2

Psalms 89 in the MHNT

Psalms 89 in the MKNFD

Psalms 89 in the MNG

Psalms 89 in the MNT

Psalms 89 in the MNT2

Psalms 89 in the MRS1T

Psalms 89 in the NAA

Psalms 89 in the NASB

Psalms 89 in the NBLA

Psalms 89 in the NBS

Psalms 89 in the NBVTP

Psalms 89 in the NET2

Psalms 89 in the NIV11

Psalms 89 in the NNT

Psalms 89 in the NNT2

Psalms 89 in the NNT3

Psalms 89 in the PDDPT

Psalms 89 in the PFNT

Psalms 89 in the RMNT

Psalms 89 in the SBIAS

Psalms 89 in the SBIBS

Psalms 89 in the SBIBS2

Psalms 89 in the SBICS

Psalms 89 in the SBIDS

Psalms 89 in the SBIGS

Psalms 89 in the SBIHS

Psalms 89 in the SBIIS

Psalms 89 in the SBIIS2

Psalms 89 in the SBIIS3

Psalms 89 in the SBIKS

Psalms 89 in the SBIKS2

Psalms 89 in the SBIMS

Psalms 89 in the SBIOS

Psalms 89 in the SBIPS

Psalms 89 in the SBISS

Psalms 89 in the SBITS

Psalms 89 in the SBITS2

Psalms 89 in the SBITS3

Psalms 89 in the SBITS4

Psalms 89 in the SBIUS

Psalms 89 in the SBIVS

Psalms 89 in the SBT

Psalms 89 in the SBT1E

Psalms 89 in the SCHL

Psalms 89 in the SNT

Psalms 89 in the SUSU

Psalms 89 in the SUSU2

Psalms 89 in the SYNO

Psalms 89 in the TBIAOTANT

Psalms 89 in the TBT1E

Psalms 89 in the TBT1E2

Psalms 89 in the TFTIP

Psalms 89 in the TFTU

Psalms 89 in the TGNTATF3T

Psalms 89 in the THAI

Psalms 89 in the TNFD

Psalms 89 in the TNT

Psalms 89 in the TNTIK

Psalms 89 in the TNTIL

Psalms 89 in the TNTIN

Psalms 89 in the TNTIP

Psalms 89 in the TNTIZ

Psalms 89 in the TOMA

Psalms 89 in the TTENT

Psalms 89 in the UBG

Psalms 89 in the UGV

Psalms 89 in the UGV2

Psalms 89 in the UGV3

Psalms 89 in the VBL

Psalms 89 in the VDCC

Psalms 89 in the YALU

Psalms 89 in the YAPE

Psalms 89 in the YBVTP

Psalms 89 in the ZBP