Psalms 9 (BOICB)

undefined Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid. 1 O ONYENWE ANYỊ, aga m esite nʼala ala obi m too gị,aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme. 2 Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị,aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu. 3 Ndị iro m na-alaghachi azụ,ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị. 4 I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi,nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi. 5 I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi,hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi. 6 Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m,I hopukwala obodo ha niile.Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ. 7 ONYENWE ANYỊ bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi. 8 Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe;jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile. 9 ONYENWE ANYỊ bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu. 10 ONYENWE ANYỊ, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ. 11 Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn.Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya. 12 Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe;ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya. 13 O ONYENWE ANYỊ, lee ka ndị iro m si akpagbu m!Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ, 14 ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gịnʼọnụ ụzọ ama niile nke ada Zayọn,nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị. 15 Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru;ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha. 16 Ihe e ji mara ONYENWE ANYỊ bụ ikpe ya ziri ezi;ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela 17 Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili;nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke. 18 Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa;olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu. 19 O ONYENWE ANYỊ, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ;ka e kpee mba niile ikpe nʼihu gị. 20 O ONYENWE ANYỊ! Mee ka ha maa jijiji nʼoke egwu;mee ka mba niile ghọta na ha bụ naanị mmadụ. Sela

In Other Versions

Psalms 9 in the ANGEFD

Psalms 9 in the ANTPNG2D

Psalms 9 in the AS21

Psalms 9 in the BAGH

Psalms 9 in the BBPNG

Psalms 9 in the BBT1E

Psalms 9 in the BDS

Psalms 9 in the BEV

Psalms 9 in the BHAD

Psalms 9 in the BIB

Psalms 9 in the BLPT

Psalms 9 in the BNT

Psalms 9 in the BNTABOOT

Psalms 9 in the BNTLV

Psalms 9 in the BOATCB

Psalms 9 in the BOATCB2

Psalms 9 in the BOBCV

Psalms 9 in the BOCNT

Psalms 9 in the BOECS

Psalms 9 in the BOGWICC

Psalms 9 in the BOHCB

Psalms 9 in the BOHCV

Psalms 9 in the BOHLNT

Psalms 9 in the BOHNTLTAL

Psalms 9 in the BOILNTAP

Psalms 9 in the BOITCV

Psalms 9 in the BOKCV

Psalms 9 in the BOKCV2

Psalms 9 in the BOKHWOG

Psalms 9 in the BOKSSV

Psalms 9 in the BOLCB

Psalms 9 in the BOLCB2

Psalms 9 in the BOMCV

Psalms 9 in the BONAV

Psalms 9 in the BONCB

Psalms 9 in the BONLT

Psalms 9 in the BONUT2

Psalms 9 in the BOPLNT

Psalms 9 in the BOSCB

Psalms 9 in the BOSNC

Psalms 9 in the BOTLNT

Psalms 9 in the BOVCB

Psalms 9 in the BOYCB

Psalms 9 in the BPBB

Psalms 9 in the BPH

Psalms 9 in the BSB

Psalms 9 in the CCB

Psalms 9 in the CUV

Psalms 9 in the CUVS

Psalms 9 in the DBT

Psalms 9 in the DGDNT

Psalms 9 in the DHNT

Psalms 9 in the DNT

Psalms 9 in the ELBE

Psalms 9 in the EMTV

Psalms 9 in the ESV

Psalms 9 in the FBV

Psalms 9 in the FEB

Psalms 9 in the GGMNT

Psalms 9 in the GNT

Psalms 9 in the HARY

Psalms 9 in the HNT

Psalms 9 in the IRVA

Psalms 9 in the IRVB

Psalms 9 in the IRVG

Psalms 9 in the IRVH

Psalms 9 in the IRVK

Psalms 9 in the IRVM

Psalms 9 in the IRVM2

Psalms 9 in the IRVO

Psalms 9 in the IRVP

Psalms 9 in the IRVT

Psalms 9 in the IRVT2

Psalms 9 in the IRVU

Psalms 9 in the ISVN

Psalms 9 in the JSNT

Psalms 9 in the KAPI

Psalms 9 in the KBT1ETNIK

Psalms 9 in the KBV

Psalms 9 in the KJV

Psalms 9 in the KNFD

Psalms 9 in the LBA

Psalms 9 in the LBLA

Psalms 9 in the LNT

Psalms 9 in the LSV

Psalms 9 in the MAAL

Psalms 9 in the MBV

Psalms 9 in the MBV2

Psalms 9 in the MHNT

Psalms 9 in the MKNFD

Psalms 9 in the MNG

Psalms 9 in the MNT

Psalms 9 in the MNT2

Psalms 9 in the MRS1T

Psalms 9 in the NAA

Psalms 9 in the NASB

Psalms 9 in the NBLA

Psalms 9 in the NBS

Psalms 9 in the NBVTP

Psalms 9 in the NET2

Psalms 9 in the NIV11

Psalms 9 in the NNT

Psalms 9 in the NNT2

Psalms 9 in the NNT3

Psalms 9 in the PDDPT

Psalms 9 in the PFNT

Psalms 9 in the RMNT

Psalms 9 in the SBIAS

Psalms 9 in the SBIBS

Psalms 9 in the SBIBS2

Psalms 9 in the SBICS

Psalms 9 in the SBIDS

Psalms 9 in the SBIGS

Psalms 9 in the SBIHS

Psalms 9 in the SBIIS

Psalms 9 in the SBIIS2

Psalms 9 in the SBIIS3

Psalms 9 in the SBIKS

Psalms 9 in the SBIKS2

Psalms 9 in the SBIMS

Psalms 9 in the SBIOS

Psalms 9 in the SBIPS

Psalms 9 in the SBISS

Psalms 9 in the SBITS

Psalms 9 in the SBITS2

Psalms 9 in the SBITS3

Psalms 9 in the SBITS4

Psalms 9 in the SBIUS

Psalms 9 in the SBIVS

Psalms 9 in the SBT

Psalms 9 in the SBT1E

Psalms 9 in the SCHL

Psalms 9 in the SNT

Psalms 9 in the SUSU

Psalms 9 in the SUSU2

Psalms 9 in the SYNO

Psalms 9 in the TBIAOTANT

Psalms 9 in the TBT1E

Psalms 9 in the TBT1E2

Psalms 9 in the TFTIP

Psalms 9 in the TFTU

Psalms 9 in the TGNTATF3T

Psalms 9 in the THAI

Psalms 9 in the TNFD

Psalms 9 in the TNT

Psalms 9 in the TNTIK

Psalms 9 in the TNTIL

Psalms 9 in the TNTIN

Psalms 9 in the TNTIP

Psalms 9 in the TNTIZ

Psalms 9 in the TOMA

Psalms 9 in the TTENT

Psalms 9 in the UBG

Psalms 9 in the UGV

Psalms 9 in the UGV2

Psalms 9 in the UGV3

Psalms 9 in the VBL

Psalms 9 in the VDCC

Psalms 9 in the YALU

Psalms 9 in the YAPE

Psalms 9 in the YBVTP

Psalms 9 in the ZBP