Psalms 93 (BOICB)
1 ONYENWE ANYỊ bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; ONYENWE ANYỊ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu;nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya. 2 Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie;ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị. 3 Oke osimiri niile amaliela elu, O ONYENWE ANYỊ;oke osimiri niile eweliela olu ha elu;ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ. 4 ONYENWE ANYỊ onye nọ nʼelu, dị ukwuukarịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme,ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri. 5 Ụkpụrụ gị niile, ONYENWE ANYỊ na-eguzosi ike;ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mmaruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.