Romans 1 (BOICB)

1 Pọl, odibo Kraịst Jisọs, onye Chineke kpọrọ ka ọ bụrụ onyeozi ya na onye o kewapụtara ka o zisaa oziọma ya. 2 Oziọma a bụ nke ahụ Chineke kwere na nkwa nʼoge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya nke e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ. 3 Oziọma a metụtara Ọkpara ya, onye bụ nwa Devid site nʼọmụmụ nke anụ ahụ. 4 Onye esitere na Mmụọ nke ịdị nsọ họpụta ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼike nke mbilite nʼọnwụ, bụ Kraịst Jisọs, Onyenwe anyị. 5 Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara na ọrụ ị bụ onyeozi, ime ka ndị mba ọzọ nwee nrube isi nke okwukwe nʼetiti ha nʼihi aha ya. 6 Tinyere unu onwe unu ndị ahụ a kpọrọ ka ha bụrụ ndị nke Jisọs Kraịst. 7 Ya bụ, unu ndị Chineke hụrụ nʼanya bi na Rom, ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị nsọ: Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 8 Na mbụ, ana m ekele Chineke ekele nʼihi unu niile, site nʼaha Jisọs Kraịst. Nʼihi na a na-ekwusa ihe banyere okwukwe unu nʼụwa niile. 9 Chineke, onye m na-ejere ozi, nʼime mmụọ site na ikwusa oziọma nke Ọkpara ya, bụ onye akaebe na m na-echeta unu mgbe niile nʼekpere m. 10 Nʼekpere m oge niile, a na m arịọ ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee na site nʼike Chineke, aga m enwe ohere ịbịa leta unu. 11 Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nʼihi na achọrọ m ka unu keta oke nʼonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzosi ike nʼokwukwe. 12 Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume site nʼokwukwe anyị. 13 Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata na atụọla m atụmatụ ịbịa leta unu ọtụtụ mgbe (ma tutu ruo ugbu a e gbochiri m ịbịa), ka m nwee ike nweta mkpụrụ nʼetiti unu, dịka m nwere nʼetiti ndị mba ọzọ. 14 Nʼihi na abụ m onye ji ụgwọ nye ndị Griik na ndị mba ọzọ, nyekwa ndị maara ihe na ndị nzuzu. 15 Ya mere m ji dị njikere ikwusa oziọma nyekwa unu bụ ndị bi na Rom. 16 Nʼihi na ihere oziọma ahụ anaghị eme m, nʼihi na ọ bụ ike Chineke na-ewetara onye ọbụla kwere na ya nzọpụta, nye onye Juu na mbụ nakwa nye onye Griik. 17 Nʼihi na ọ bụ nʼoziọma ka e kpughere ezi omume Chineke, ezi omume nke na-esite nʼokwukwe ruo okwukwe. Dịka e siri dee ya, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.” 18 Nʼihi na e sitela nʼeluigwe kpughe ọnụma Chineke megide mmehie na ajọ omume niile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nʼajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ. 19 Nʼihi na ndị a maara ihe ha kwesiri ịmata banyere Chineke. Ha maara ya nʼihi na Chineke nʼonwe ya emeela ka o doo ha anya. 20 Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ. 21 Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị. 22 Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu. 23 Kama ife Chineke na-adịghị anwụ anwụ ofufe, ha weere otuto ha kwesiri inye ya nye ihe ndị ahụ ha jiri aka ha kpụọ. Ihe ndị a yiri mmadụ na-anwụ anwụ, na nnụnụ, na ụmụ anụmanụ, na ihe na-akpụ akpụ nʼala. 24 Nʼihi ya, Chineke hapụrụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ nye adịghị ọcha nke ịkwa iko, ha jikwa ahụ ha emerịta mpu nʼetiti onwe ha. 25 Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen. 26 Ọ bụ nke a mere Chineke jiri nyefee ha nʼaka agụụ anụ ahụ nke na-eme ihere. Nʼihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nʼụzọ na-ezighị ezi. 27 Ọzọkwa, kama ha na ndị inyom inwe mmekọrịta; ndị ikom ha họọrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta nke ha na ndị inyom kwesiri inwe. Nwoke na-edinakwuru nwoke ibe ya. Nʼụzọ dị otu a, ha natakwara ntaramahụhụ kwesiri ha nʼihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme. 28 Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chineke nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ niile nke ajọ echiche obi ha chepụtara. 29 Ha jupụtara nʼajọ omume na mmehie niile, anya ukwu na aghụghọ. Ha jupụtakwara nʼekworo, na igbu mmadụ, na esemokwu, na uche gbagọrọ agbagọ na ịkpọ asị. Ha bụ ndị na-ekwu okwu azụ, 30 na ndị nkwutọ na ndị kpọrọ Chineke asị, na ndị na-akparị mmadụ na ndị mpako na ndị na-anya isi. Ha na-atụpụta ụzọ ọhụrụ ime ihe ọjọọ, ha adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha. 31 Ha bụkwa ndị na-enweghị nghọta, ndị na-enweghị okwukwe, ndị obi ọjọọ na ndị na-enweghị obi ebere. 32 Ha maa na Chineke nyere iwu dị ike na ndị na-ebi ndụ dị otu a kwesiri ọnwụ, ma ha gara nʼihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalịkwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.

In Other Versions

Romans 1 in the ANGEFD

Romans 1 in the ANTPNG2D

Romans 1 in the AS21

Romans 1 in the BAGH

Romans 1 in the BBPNG

Romans 1 in the BBT1E

Romans 1 in the BDS

Romans 1 in the BEV

Romans 1 in the BHAD

Romans 1 in the BIB

Romans 1 in the BLPT

Romans 1 in the BNT

Romans 1 in the BNTABOOT

Romans 1 in the BNTLV

Romans 1 in the BOATCB

Romans 1 in the BOATCB2

Romans 1 in the BOBCV

Romans 1 in the BOCNT

Romans 1 in the BOECS

Romans 1 in the BOGWICC

Romans 1 in the BOHCB

Romans 1 in the BOHCV

Romans 1 in the BOHLNT

Romans 1 in the BOHNTLTAL

Romans 1 in the BOILNTAP

Romans 1 in the BOITCV

Romans 1 in the BOKCV

Romans 1 in the BOKCV2

Romans 1 in the BOKHWOG

Romans 1 in the BOKSSV

Romans 1 in the BOLCB

Romans 1 in the BOLCB2

Romans 1 in the BOMCV

Romans 1 in the BONAV

Romans 1 in the BONCB

Romans 1 in the BONLT

Romans 1 in the BONUT2

Romans 1 in the BOPLNT

Romans 1 in the BOSCB

Romans 1 in the BOSNC

Romans 1 in the BOTLNT

Romans 1 in the BOVCB

Romans 1 in the BOYCB

Romans 1 in the BPBB

Romans 1 in the BPH

Romans 1 in the BSB

Romans 1 in the CCB

Romans 1 in the CUV

Romans 1 in the CUVS

Romans 1 in the DBT

Romans 1 in the DGDNT

Romans 1 in the DHNT

Romans 1 in the DNT

Romans 1 in the ELBE

Romans 1 in the EMTV

Romans 1 in the ESV

Romans 1 in the FBV

Romans 1 in the FEB

Romans 1 in the GGMNT

Romans 1 in the GNT

Romans 1 in the HARY

Romans 1 in the HNT

Romans 1 in the IRVA

Romans 1 in the IRVB

Romans 1 in the IRVG

Romans 1 in the IRVH

Romans 1 in the IRVK

Romans 1 in the IRVM

Romans 1 in the IRVM2

Romans 1 in the IRVO

Romans 1 in the IRVP

Romans 1 in the IRVT

Romans 1 in the IRVT2

Romans 1 in the IRVU

Romans 1 in the ISVN

Romans 1 in the JSNT

Romans 1 in the KAPI

Romans 1 in the KBT1ETNIK

Romans 1 in the KBV

Romans 1 in the KJV

Romans 1 in the KNFD

Romans 1 in the LBA

Romans 1 in the LBLA

Romans 1 in the LNT

Romans 1 in the LSV

Romans 1 in the MAAL

Romans 1 in the MBV

Romans 1 in the MBV2

Romans 1 in the MHNT

Romans 1 in the MKNFD

Romans 1 in the MNG

Romans 1 in the MNT

Romans 1 in the MNT2

Romans 1 in the MRS1T

Romans 1 in the NAA

Romans 1 in the NASB

Romans 1 in the NBLA

Romans 1 in the NBS

Romans 1 in the NBVTP

Romans 1 in the NET2

Romans 1 in the NIV11

Romans 1 in the NNT

Romans 1 in the NNT2

Romans 1 in the NNT3

Romans 1 in the PDDPT

Romans 1 in the PFNT

Romans 1 in the RMNT

Romans 1 in the SBIAS

Romans 1 in the SBIBS

Romans 1 in the SBIBS2

Romans 1 in the SBICS

Romans 1 in the SBIDS

Romans 1 in the SBIGS

Romans 1 in the SBIHS

Romans 1 in the SBIIS

Romans 1 in the SBIIS2

Romans 1 in the SBIIS3

Romans 1 in the SBIKS

Romans 1 in the SBIKS2

Romans 1 in the SBIMS

Romans 1 in the SBIOS

Romans 1 in the SBIPS

Romans 1 in the SBISS

Romans 1 in the SBITS

Romans 1 in the SBITS2

Romans 1 in the SBITS3

Romans 1 in the SBITS4

Romans 1 in the SBIUS

Romans 1 in the SBIVS

Romans 1 in the SBT

Romans 1 in the SBT1E

Romans 1 in the SCHL

Romans 1 in the SNT

Romans 1 in the SUSU

Romans 1 in the SUSU2

Romans 1 in the SYNO

Romans 1 in the TBIAOTANT

Romans 1 in the TBT1E

Romans 1 in the TBT1E2

Romans 1 in the TFTIP

Romans 1 in the TFTU

Romans 1 in the TGNTATF3T

Romans 1 in the THAI

Romans 1 in the TNFD

Romans 1 in the TNT

Romans 1 in the TNTIK

Romans 1 in the TNTIL

Romans 1 in the TNTIN

Romans 1 in the TNTIP

Romans 1 in the TNTIZ

Romans 1 in the TOMA

Romans 1 in the TTENT

Romans 1 in the UBG

Romans 1 in the UGV

Romans 1 in the UGV2

Romans 1 in the UGV3

Romans 1 in the VBL

Romans 1 in the VDCC

Romans 1 in the YALU

Romans 1 in the YAPE

Romans 1 in the YBVTP

Romans 1 in the ZBP