Romans 16 (BOICB)

1 Ana m eme ka unu mata nwanna anyị nwanyị, Fibi, onye na-ejere nzukọ ozi na chọọchị dị nʼobodo Senkria. 2 Biko nabatanụ ya nʼime Onyenwe anyị dịka o kwesiri ndị ya. Nyekwaranụ ya aka nʼụzọ niile unu nwere ike, nʼihi na o nyerela mụ na ọtụtụ ndị ọzọ aka. 3 Keleerenụ m Prisila na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs. 4 Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha. 5 Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha.Keleerenụ m ezi enyi m Epinetus. Nwoke a bụ onye buru ụzọ nabata Kraịst nʼobi ya, nʼakụkụ Eshịa niile. 6 Keleerenụ m Meri, onye rụsịrị ọrụ ike nʼetiti unu. 7 Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nʼụlọ mkpọrọ. Ndị ozi niile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst. 8 Kelekwaaranụ m Ampliatọs onye m hụrụ nʼanya nʼime Onyenwe anyị. 9 Keleenụ Ọbanọs, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ Kraịst, na Stakis ezi enyi m. 10 Otu a kwa, keleenụ Apelis onye anwapụtarala nguzosike ya nʼime Kraịst.Keleenụ ndị ezinaụlọ Aristobulọs. 11 Keleerenụ m Herodian onye ikwu m.Keleekwanụ ndị bi nʼụlọ Nasisọs. Ha bụ ndị nke Chineke. 12 Keleekwanụ Traịfina na Traịfosa ndị a na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike.Keleekwanụ Pesis, onye m hụrụ nʼanya na onye na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike. 13 Keleere m Rufọs onye Onyenwe anyị nʼonwe ya họpụtara, na nne ya, onye na-emekwara m ka nne. 14 Ana m ekele unu Asinkritọs, Flegọn, Hamis, Patrobas, Hamis na ụmụnna anyị niile ndị ha na ha nọ. 15 Keleerenụ m Filologọs, Juliya, Nerus na nwanne ya nwanyị. Keleekwanụ Olimpas na ndị nsọ niile ha na ha nọ. 16 Werenụ isurita ọnụ dị nsọ, kelerịta onwe unu.Nzukọ Kraịst niile nọ nʼebe a na-ekelekwa unu. 17 Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu. 18 Ndị dị otu a abụghị ndị ozi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ha na-arụ naanị nʼihi akpa ha. Ha maara otu e si eji ire ụtọ edufu ndị obi ha na-esighị ike. 19 Mmadụ niile anụla maka nrube isi unu na-erubere oziọma ahụ. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi unu. Achọrọ m ka unu bụrụ ndị maara ihe banyere ezi ihe, ka unu bụrụ ndị na-amaghị ihe nʼihe banyere ihe ọjọọ. 20 Mgbe na-adịghị anya, Chineke nke udo ga-azọpịa ekwensu nʼokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu. 21 Timoti onye so m na-arụkọ ọrụ, na Lusiọs, na Jesin na Sosipata, ndị ikwu m na-ekele unu. 22 Mụ onwe m bụ Tatiọs, onye dere akwụkwọ a, na-ekelekwa unu nʼaha Onyenwe anyị. 23 Gaiọs, onye na-ele mụ na nzukọ niile ọbịa nʼebe a, na-ekelekwa unu. Otu a kwa, ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ya na-ekelekwa unu.Erastọs, onye na-elekọta ihe ndị obodo a na nwanna anyị nwoke Kwatọs, na-ekelekwa unu. 24 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyeere unu niile. Amen. 25 Ana m enyefe unu nʼaka onye ahụ pụrụ ime ka unu guzosie ike site nʼoziọma m kwusaara unu, nakwa nkwupụta nke Jisọs Kraịst, dịka mkpughe nke ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ọtụtụ ọgbọ ndị gara aga siri dị. 26 Ma ugbu a, e kpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè site nʼihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ, ka ndị mba ọzọ niile maara ya dịka ihe Chineke ebighị ebi nyere nʼiwu ya si dị, ka ha mụta irube isi nke na-esite nʼokwukwe. 27 Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen.

In Other Versions

Romans 16 in the ANGEFD

Romans 16 in the ANTPNG2D

Romans 16 in the AS21

Romans 16 in the BAGH

Romans 16 in the BBPNG

Romans 16 in the BBT1E

Romans 16 in the BDS

Romans 16 in the BEV

Romans 16 in the BHAD

Romans 16 in the BIB

Romans 16 in the BLPT

Romans 16 in the BNT

Romans 16 in the BNTABOOT

Romans 16 in the BNTLV

Romans 16 in the BOATCB

Romans 16 in the BOATCB2

Romans 16 in the BOBCV

Romans 16 in the BOCNT

Romans 16 in the BOECS

Romans 16 in the BOGWICC

Romans 16 in the BOHCB

Romans 16 in the BOHCV

Romans 16 in the BOHLNT

Romans 16 in the BOHNTLTAL

Romans 16 in the BOILNTAP

Romans 16 in the BOITCV

Romans 16 in the BOKCV

Romans 16 in the BOKCV2

Romans 16 in the BOKHWOG

Romans 16 in the BOKSSV

Romans 16 in the BOLCB

Romans 16 in the BOLCB2

Romans 16 in the BOMCV

Romans 16 in the BONAV

Romans 16 in the BONCB

Romans 16 in the BONLT

Romans 16 in the BONUT2

Romans 16 in the BOPLNT

Romans 16 in the BOSCB

Romans 16 in the BOSNC

Romans 16 in the BOTLNT

Romans 16 in the BOVCB

Romans 16 in the BOYCB

Romans 16 in the BPBB

Romans 16 in the BPH

Romans 16 in the BSB

Romans 16 in the CCB

Romans 16 in the CUV

Romans 16 in the CUVS

Romans 16 in the DBT

Romans 16 in the DGDNT

Romans 16 in the DHNT

Romans 16 in the DNT

Romans 16 in the ELBE

Romans 16 in the EMTV

Romans 16 in the ESV

Romans 16 in the FBV

Romans 16 in the FEB

Romans 16 in the GGMNT

Romans 16 in the GNT

Romans 16 in the HARY

Romans 16 in the HNT

Romans 16 in the IRVA

Romans 16 in the IRVB

Romans 16 in the IRVG

Romans 16 in the IRVH

Romans 16 in the IRVK

Romans 16 in the IRVM

Romans 16 in the IRVM2

Romans 16 in the IRVO

Romans 16 in the IRVP

Romans 16 in the IRVT

Romans 16 in the IRVT2

Romans 16 in the IRVU

Romans 16 in the ISVN

Romans 16 in the JSNT

Romans 16 in the KAPI

Romans 16 in the KBT1ETNIK

Romans 16 in the KBV

Romans 16 in the KJV

Romans 16 in the KNFD

Romans 16 in the LBA

Romans 16 in the LBLA

Romans 16 in the LNT

Romans 16 in the LSV

Romans 16 in the MAAL

Romans 16 in the MBV

Romans 16 in the MBV2

Romans 16 in the MHNT

Romans 16 in the MKNFD

Romans 16 in the MNG

Romans 16 in the MNT

Romans 16 in the MNT2

Romans 16 in the MRS1T

Romans 16 in the NAA

Romans 16 in the NASB

Romans 16 in the NBLA

Romans 16 in the NBS

Romans 16 in the NBVTP

Romans 16 in the NET2

Romans 16 in the NIV11

Romans 16 in the NNT

Romans 16 in the NNT2

Romans 16 in the NNT3

Romans 16 in the PDDPT

Romans 16 in the PFNT

Romans 16 in the RMNT

Romans 16 in the SBIAS

Romans 16 in the SBIBS

Romans 16 in the SBIBS2

Romans 16 in the SBICS

Romans 16 in the SBIDS

Romans 16 in the SBIGS

Romans 16 in the SBIHS

Romans 16 in the SBIIS

Romans 16 in the SBIIS2

Romans 16 in the SBIIS3

Romans 16 in the SBIKS

Romans 16 in the SBIKS2

Romans 16 in the SBIMS

Romans 16 in the SBIOS

Romans 16 in the SBIPS

Romans 16 in the SBISS

Romans 16 in the SBITS

Romans 16 in the SBITS2

Romans 16 in the SBITS3

Romans 16 in the SBITS4

Romans 16 in the SBIUS

Romans 16 in the SBIVS

Romans 16 in the SBT

Romans 16 in the SBT1E

Romans 16 in the SCHL

Romans 16 in the SNT

Romans 16 in the SUSU

Romans 16 in the SUSU2

Romans 16 in the SYNO

Romans 16 in the TBIAOTANT

Romans 16 in the TBT1E

Romans 16 in the TBT1E2

Romans 16 in the TFTIP

Romans 16 in the TFTU

Romans 16 in the TGNTATF3T

Romans 16 in the THAI

Romans 16 in the TNFD

Romans 16 in the TNT

Romans 16 in the TNTIK

Romans 16 in the TNTIL

Romans 16 in the TNTIN

Romans 16 in the TNTIP

Romans 16 in the TNTIZ

Romans 16 in the TOMA

Romans 16 in the TTENT

Romans 16 in the UBG

Romans 16 in the UGV

Romans 16 in the UGV2

Romans 16 in the UGV3

Romans 16 in the VBL

Romans 16 in the VDCC

Romans 16 in the YALU

Romans 16 in the YAPE

Romans 16 in the YBVTP

Romans 16 in the ZBP