Zechariah 14 (BOICB)
1 Lee, ụbọchị ONYENWE ANYỊ na-abịa, mgbe a ga-ekesa ihe nkwata gị niile nʼetiti mgbidi gị. 2 Aga m achịkọta mba niile ka ha bịa Jerusalem ibuso ya agha. Ha ga-adọta obodo ahụ nʼagha, tụtụkọọ ihe dị nʼụlọ niile, dinaa ndị inyom nʼike. A ga-adọta ọkara ndị bi nʼobodo ahụ nʼagha, duru ha gaa mba ọzọ. Ma ọkara nke ọzọ ka ha ga-ahapụ. 3 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ ga-apụ ibuso ndị mba ọzọ ahụ agha, dịka o si ebu agha nʼụbọchị agha. 4 Nʼụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo nʼelu Ugwu Oliv, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem. Mgbe ahụ, Ugwu Oliv ga-ekewa abụọ, mee ka ndagwurugwu buru ibu dịrị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Nʼihi ya, ugwu ahụ ga-eke onwe ya abụọ. Otu akụkụ ga-adị nʼugwu, nke ọzọ ga-adị nʼụzọ ndịda. 5 Unu ga-esi na ndagwurugwu nke ugwu m ahụ gbalaga, nʼihi na ndagwurugwu ahụ ga-eru Azel. Unu ga-agbapụ dịka unu si gbapụ nʼoge gara aga, mgbe ala ọma jijiji ahụ, nʼoge Uzaya bụ eze Juda. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ Chineke m ga-abịa, ya na ndị nsọ ya. 6 Nʼụbọchị ahụ, ìhè anyanwụ agaghị adị, oyi agaghị adị, mkpụrụ mmiri agaghị adịkwa. 7 Ọ ga-abụ ụbọchị pụrụ iche, ụbọchị ehihie na abalị na-agaghị adịkwa. Ọ bụ ụbọchị nke naanị ONYENWE ANYỊ maara. Ma ìhè ga-adịkwa nʼoge anyasị. 8 Nʼụbọchị ahụ, mmiri na-enye ndụ ga-esi na Jerusalem na-asọpụta. Ọ ga-ekewa abụọ, ọkara ya ga-asọbanye nʼosimiri Nnu dị nʼihu anyanwụ ebe ọkara nke ọzọ ga-asọbanye nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Ha ga na-asọ nʼọkọchị na nʼudu mmiri. 9 Ma ONYENWE ANYỊ ga-abụ eze nʼelu ụwa niile. Nʼụbọchị ahụ, naanị otu ONYENWE ANYỊ ga-adị, naanị aha ya kwa ka a ga na-efe ofufe. 10 Ala niile, site na Geba ruo Rimọn, nke dị na ndịda Jerusalem ga-adị ka ọzara. Ma ọ bụ naanị Jerusalem ga-adị nʼebe lara elu. Ọ ga-adịkwa nʼọnọdụ ya site nʼọnụ ụzọ ama nke Benjamin ruo nʼebe ọnụ ụzọ ama nke Mbụ, ruo nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼAkụkụ, sitekwa nʼỤlọ elu Hananel ruo nʼebe a na-azọchapụta mmanya eze. 11 A ga-ebiju na ya na-enweghị nsogbu. A gaghị emebikwa ya ọzọ. Jerusalem ga-ebikwa nʼudo na-atụghị egwu. 12 Nke a bụ ọrịa ọjọọ nke ONYENWE ANYỊ ga-eji kụda mba niile buru agha megide Jerusalem. Anụ ahụ ha ga-ere ure mgbe ha ka guzo ọtọ. Anya ha ga-erekwa ure, ire ha ga-erekwa ure nʼọnụ ha. 13 Nʼụbọchị ahụ, ONYENWE ANYỊ ga-etinye ndị mmadụ oke ụjọ nʼobi. Oke ọgbaaghara ga-adị nʼetiti ha, ha ga-alụsokwa ibe ha ọgụ. 14 Ọ bụladị Juda ga-ebu agha na Jerusalem. A ga-akwakọrọ akụ ndị mba ọzọ dị ha nso, bụ ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha, na uwe mara mma. 15 Ọrịa ọjọọ dị otu a ga-adakwasị ịnyịnya niile, na ịnyịnya muul, na ịnyịnya kamel niile, na ịnyịnya ibu niile, na anụ niile dị nʼogige ndị agha ha. 16 Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ na mba niile ndị ahụ busoro Jerusalem agha, ga-abịa kwa afọ kpọọ isiala nye eze, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ka ha soro mee mmemme ụlọ Ikwu. 17 Ọ bụrụ na ndị ọbụla si na mba dị iche iche esoghị jee Jerusalem ife Eze ahụ, bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, ha agaghị enwetakwa mmiri ozuzo. 18 Ọ bụrụ na ndị Ijipt ajụ ịga soro ndị ọzọ ife ofufe ahụ, ha agaghị enweta mmiri ozuzo. ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ọrịa ọjọọ ahụ bịakwasị ha, dịka ọ siri bịakwasị mba ndị ahụ niile jụrụ iso mee mmemme ụlọ Ikwu. 19 Nke a ga-abụ ahụhụ dịrị ndị Ijipt, na ndị mba dị iche iche, ndị na-agaghị eso na mmemme ụlọ Ikwu ahụ. 20 Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-ede nʼahụ ataṅụ nke ịnyịnya niile na-anya nʼolu ha bụ nke a: “Ihe dị Nsọ nye ONYENWE ANYỊ.” Ite niile e ji esi nri dị nʼụlọ nke ONYENWE ANYỊ ga-adị ka efere nsọ ndị ahụ dị nʼihu ebe ịchụ aja. 21 Ite niile dị na Juda, na nʼime Jerusalem ga-adị nsọ nye ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile. Ndị niile bịara ịchụ aja ga-ewere ụfọdụ nʼime ite ndị a sie nri ịchụ aja ha. Nʼụbọchị ahụ kwa, a gaghị ahụ kwa ndị na-atụ mgbereahịa nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile.
In Other Versions
Zechariah 14 in the ANGEFD
Zechariah 14 in the ANTPNG2D
Zechariah 14 in the AS21
Zechariah 14 in the BAGH
Zechariah 14 in the BBPNG
Zechariah 14 in the BBT1E
Zechariah 14 in the BDS
Zechariah 14 in the BEV
Zechariah 14 in the BHAD
Zechariah 14 in the BIB
Zechariah 14 in the BLPT
Zechariah 14 in the BNT
Zechariah 14 in the BNTABOOT
Zechariah 14 in the BNTLV
Zechariah 14 in the BOATCB
Zechariah 14 in the BOATCB2
Zechariah 14 in the BOBCV
Zechariah 14 in the BOCNT
Zechariah 14 in the BOECS
Zechariah 14 in the BOGWICC
Zechariah 14 in the BOHCB
Zechariah 14 in the BOHCV
Zechariah 14 in the BOHLNT
Zechariah 14 in the BOHNTLTAL
Zechariah 14 in the BOILNTAP
Zechariah 14 in the BOITCV
Zechariah 14 in the BOKCV
Zechariah 14 in the BOKCV2
Zechariah 14 in the BOKHWOG
Zechariah 14 in the BOKSSV
Zechariah 14 in the BOLCB
Zechariah 14 in the BOLCB2
Zechariah 14 in the BOMCV
Zechariah 14 in the BONAV
Zechariah 14 in the BONCB
Zechariah 14 in the BONLT
Zechariah 14 in the BONUT2
Zechariah 14 in the BOPLNT
Zechariah 14 in the BOSCB
Zechariah 14 in the BOSNC
Zechariah 14 in the BOTLNT
Zechariah 14 in the BOVCB
Zechariah 14 in the BOYCB
Zechariah 14 in the BPBB
Zechariah 14 in the BPH
Zechariah 14 in the BSB
Zechariah 14 in the CCB
Zechariah 14 in the CUV
Zechariah 14 in the CUVS
Zechariah 14 in the DBT
Zechariah 14 in the DGDNT
Zechariah 14 in the DHNT
Zechariah 14 in the DNT
Zechariah 14 in the ELBE
Zechariah 14 in the EMTV
Zechariah 14 in the ESV
Zechariah 14 in the FBV
Zechariah 14 in the FEB
Zechariah 14 in the GGMNT
Zechariah 14 in the GNT
Zechariah 14 in the HARY
Zechariah 14 in the HNT
Zechariah 14 in the IRVA
Zechariah 14 in the IRVB
Zechariah 14 in the IRVG
Zechariah 14 in the IRVH
Zechariah 14 in the IRVK
Zechariah 14 in the IRVM
Zechariah 14 in the IRVM2
Zechariah 14 in the IRVO
Zechariah 14 in the IRVP
Zechariah 14 in the IRVT
Zechariah 14 in the IRVT2
Zechariah 14 in the IRVU
Zechariah 14 in the ISVN
Zechariah 14 in the JSNT
Zechariah 14 in the KAPI
Zechariah 14 in the KBT1ETNIK
Zechariah 14 in the KBV
Zechariah 14 in the KJV
Zechariah 14 in the KNFD
Zechariah 14 in the LBA
Zechariah 14 in the LBLA
Zechariah 14 in the LNT
Zechariah 14 in the LSV
Zechariah 14 in the MAAL
Zechariah 14 in the MBV
Zechariah 14 in the MBV2
Zechariah 14 in the MHNT
Zechariah 14 in the MKNFD
Zechariah 14 in the MNG
Zechariah 14 in the MNT
Zechariah 14 in the MNT2
Zechariah 14 in the MRS1T
Zechariah 14 in the NAA
Zechariah 14 in the NASB
Zechariah 14 in the NBLA
Zechariah 14 in the NBS
Zechariah 14 in the NBVTP
Zechariah 14 in the NET2
Zechariah 14 in the NIV11
Zechariah 14 in the NNT
Zechariah 14 in the NNT2
Zechariah 14 in the NNT3
Zechariah 14 in the PDDPT
Zechariah 14 in the PFNT
Zechariah 14 in the RMNT
Zechariah 14 in the SBIAS
Zechariah 14 in the SBIBS
Zechariah 14 in the SBIBS2
Zechariah 14 in the SBICS
Zechariah 14 in the SBIDS
Zechariah 14 in the SBIGS
Zechariah 14 in the SBIHS
Zechariah 14 in the SBIIS
Zechariah 14 in the SBIIS2
Zechariah 14 in the SBIIS3
Zechariah 14 in the SBIKS
Zechariah 14 in the SBIKS2
Zechariah 14 in the SBIMS
Zechariah 14 in the SBIOS
Zechariah 14 in the SBIPS
Zechariah 14 in the SBISS
Zechariah 14 in the SBITS
Zechariah 14 in the SBITS2
Zechariah 14 in the SBITS3
Zechariah 14 in the SBITS4
Zechariah 14 in the SBIUS
Zechariah 14 in the SBIVS
Zechariah 14 in the SBT
Zechariah 14 in the SBT1E
Zechariah 14 in the SCHL
Zechariah 14 in the SNT
Zechariah 14 in the SUSU
Zechariah 14 in the SUSU2
Zechariah 14 in the SYNO
Zechariah 14 in the TBIAOTANT
Zechariah 14 in the TBT1E
Zechariah 14 in the TBT1E2
Zechariah 14 in the TFTIP
Zechariah 14 in the TFTU
Zechariah 14 in the TGNTATF3T
Zechariah 14 in the THAI
Zechariah 14 in the TNFD
Zechariah 14 in the TNT
Zechariah 14 in the TNTIK
Zechariah 14 in the TNTIL
Zechariah 14 in the TNTIN
Zechariah 14 in the TNTIP
Zechariah 14 in the TNTIZ
Zechariah 14 in the TOMA
Zechariah 14 in the TTENT
Zechariah 14 in the UBG
Zechariah 14 in the UGV
Zechariah 14 in the UGV2
Zechariah 14 in the UGV3
Zechariah 14 in the VBL
Zechariah 14 in the VDCC
Zechariah 14 in the YALU
Zechariah 14 in the YAPE
Zechariah 14 in the YBVTP
Zechariah 14 in the ZBP