1 Chronicles 17 (BOICB)

1 Mgbe Devid nọsara ahụ nʼụlọeze ya, ọ sịrị Netan onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ dị nʼokpuru ụlọ ikwu.” 2 Netan zaghachiri Devid, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi, mee ya, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.” 3 Ma nʼabalị ahụ, okwu Chineke rutere Netan ntị, na-asị, 4 “Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru: Gị onwe gị agaghị ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi, 5 nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta Izrel ruo taa. Kama e sitela m nʼotu ọmụma ụlọ ikwu baa na nke ọzọ, sitekwa nʼotu ebe obibi gaa ebe nke ọzọ. 6 Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ndu ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?” ’ 7 “Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị, mee gị onye na-achị ndị m Izrel. 8 Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa. 9 Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha, ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ, 10 dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m eme ka ndị iro gị niile nọrọ nʼokpuru gị.“ ‘Ana m ekwupụtara gị na ONYENWE ANYỊ ga-ewuru gị ụlọ. 11 Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe ị gakwuru ndị nna nna gị ha, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, ọ ga-abụ otu nʼime ụmụ ndị ị mụrụ. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. 12 Ọ bụ ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ, aga m emekwa ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. 13 Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna, ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Agaghị m ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m mere onye bu gị ụzọ chịa. 14 Aga m eme ka ọ chịa ụlọ m na nʼalaeze m ruo mgbe ebighị ebi. A ga-emekwa ka ocheeze ya bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ” 15 Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị. 16 Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu ONYENWE ANYỊ, sị:“Onye ka m bụ, ONYENWE ANYỊ Chineke, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a? 17 O Chineke m, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị, ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị. Ma gị onwe gị ONYENWE ANYỊ Chineke na-ele m anya dịka a ga-asị na m bụ onye ọnọdụ ya dị elu karịchasịa nke ụmụ mmadụ niile. 18 “Gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị, nʼihi nsọpụrụ i nyere ohu gị? Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma, 19 O ONYENWE ANYỊ, nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ọ mata nkwa ndị a niile dị ukwuu. 20 “ONYENWE ANYỊ, ọ dịghị onye dịka gị, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị. 21 Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa ndị Chineke ha gara ịgbapụtara onwe ya ka ọ bụrụ otu ndị, na iji mere onwe gị aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt? 22 I mere ka ndị gị Izrel bụrụ ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Gị onwe gị kwa, ONYENWE ANYỊ, abụrụla Chineke ha. 23 “Ma ugbu a, ONYENWE ANYỊ, mee ka nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya bụrụ nke ga-eguzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị, 24 ka o nwee ike guzosie ike. Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-asị, ‘ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke na-achị Izrel, bụ Chineke Izrel.’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị Devid guzosie ike nʼihu gị. 25 “Gị onwe gị, Chineke m, e kpugheerela ohu gị na ị ga-ewuru ya ụlọ. Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere. 26 Gị onwe gị, ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke. I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a. 27 Ugbu a, ọ masịrị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ime ka ọ dịrị na-aga nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi na gị ONYENWE ANYỊ, agọziela ya. Ọ ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”

In Other Versions

1 Chronicles 17 in the ANGEFD

1 Chronicles 17 in the ANTPNG2D

1 Chronicles 17 in the AS21

1 Chronicles 17 in the BAGH

1 Chronicles 17 in the BBPNG

1 Chronicles 17 in the BBT1E

1 Chronicles 17 in the BDS

1 Chronicles 17 in the BEV

1 Chronicles 17 in the BHAD

1 Chronicles 17 in the BIB

1 Chronicles 17 in the BLPT

1 Chronicles 17 in the BNT

1 Chronicles 17 in the BNTABOOT

1 Chronicles 17 in the BNTLV

1 Chronicles 17 in the BOATCB

1 Chronicles 17 in the BOATCB2

1 Chronicles 17 in the BOBCV

1 Chronicles 17 in the BOCNT

1 Chronicles 17 in the BOECS

1 Chronicles 17 in the BOGWICC

1 Chronicles 17 in the BOHCB

1 Chronicles 17 in the BOHCV

1 Chronicles 17 in the BOHLNT

1 Chronicles 17 in the BOHNTLTAL

1 Chronicles 17 in the BOILNTAP

1 Chronicles 17 in the BOITCV

1 Chronicles 17 in the BOKCV

1 Chronicles 17 in the BOKCV2

1 Chronicles 17 in the BOKHWOG

1 Chronicles 17 in the BOKSSV

1 Chronicles 17 in the BOLCB

1 Chronicles 17 in the BOLCB2

1 Chronicles 17 in the BOMCV

1 Chronicles 17 in the BONAV

1 Chronicles 17 in the BONCB

1 Chronicles 17 in the BONLT

1 Chronicles 17 in the BONUT2

1 Chronicles 17 in the BOPLNT

1 Chronicles 17 in the BOSCB

1 Chronicles 17 in the BOSNC

1 Chronicles 17 in the BOTLNT

1 Chronicles 17 in the BOVCB

1 Chronicles 17 in the BOYCB

1 Chronicles 17 in the BPBB

1 Chronicles 17 in the BPH

1 Chronicles 17 in the BSB

1 Chronicles 17 in the CCB

1 Chronicles 17 in the CUV

1 Chronicles 17 in the CUVS

1 Chronicles 17 in the DBT

1 Chronicles 17 in the DGDNT

1 Chronicles 17 in the DHNT

1 Chronicles 17 in the DNT

1 Chronicles 17 in the ELBE

1 Chronicles 17 in the EMTV

1 Chronicles 17 in the ESV

1 Chronicles 17 in the FBV

1 Chronicles 17 in the FEB

1 Chronicles 17 in the GGMNT

1 Chronicles 17 in the GNT

1 Chronicles 17 in the HARY

1 Chronicles 17 in the HNT

1 Chronicles 17 in the IRVA

1 Chronicles 17 in the IRVB

1 Chronicles 17 in the IRVG

1 Chronicles 17 in the IRVH

1 Chronicles 17 in the IRVK

1 Chronicles 17 in the IRVM

1 Chronicles 17 in the IRVM2

1 Chronicles 17 in the IRVO

1 Chronicles 17 in the IRVP

1 Chronicles 17 in the IRVT

1 Chronicles 17 in the IRVT2

1 Chronicles 17 in the IRVU

1 Chronicles 17 in the ISVN

1 Chronicles 17 in the JSNT

1 Chronicles 17 in the KAPI

1 Chronicles 17 in the KBT1ETNIK

1 Chronicles 17 in the KBV

1 Chronicles 17 in the KJV

1 Chronicles 17 in the KNFD

1 Chronicles 17 in the LBA

1 Chronicles 17 in the LBLA

1 Chronicles 17 in the LNT

1 Chronicles 17 in the LSV

1 Chronicles 17 in the MAAL

1 Chronicles 17 in the MBV

1 Chronicles 17 in the MBV2

1 Chronicles 17 in the MHNT

1 Chronicles 17 in the MKNFD

1 Chronicles 17 in the MNG

1 Chronicles 17 in the MNT

1 Chronicles 17 in the MNT2

1 Chronicles 17 in the MRS1T

1 Chronicles 17 in the NAA

1 Chronicles 17 in the NASB

1 Chronicles 17 in the NBLA

1 Chronicles 17 in the NBS

1 Chronicles 17 in the NBVTP

1 Chronicles 17 in the NET2

1 Chronicles 17 in the NIV11

1 Chronicles 17 in the NNT

1 Chronicles 17 in the NNT2

1 Chronicles 17 in the NNT3

1 Chronicles 17 in the PDDPT

1 Chronicles 17 in the PFNT

1 Chronicles 17 in the RMNT

1 Chronicles 17 in the SBIAS

1 Chronicles 17 in the SBIBS

1 Chronicles 17 in the SBIBS2

1 Chronicles 17 in the SBICS

1 Chronicles 17 in the SBIDS

1 Chronicles 17 in the SBIGS

1 Chronicles 17 in the SBIHS

1 Chronicles 17 in the SBIIS

1 Chronicles 17 in the SBIIS2

1 Chronicles 17 in the SBIIS3

1 Chronicles 17 in the SBIKS

1 Chronicles 17 in the SBIKS2

1 Chronicles 17 in the SBIMS

1 Chronicles 17 in the SBIOS

1 Chronicles 17 in the SBIPS

1 Chronicles 17 in the SBISS

1 Chronicles 17 in the SBITS

1 Chronicles 17 in the SBITS2

1 Chronicles 17 in the SBITS3

1 Chronicles 17 in the SBITS4

1 Chronicles 17 in the SBIUS

1 Chronicles 17 in the SBIVS

1 Chronicles 17 in the SBT

1 Chronicles 17 in the SBT1E

1 Chronicles 17 in the SCHL

1 Chronicles 17 in the SNT

1 Chronicles 17 in the SUSU

1 Chronicles 17 in the SUSU2

1 Chronicles 17 in the SYNO

1 Chronicles 17 in the TBIAOTANT

1 Chronicles 17 in the TBT1E

1 Chronicles 17 in the TBT1E2

1 Chronicles 17 in the TFTIP

1 Chronicles 17 in the TFTU

1 Chronicles 17 in the TGNTATF3T

1 Chronicles 17 in the THAI

1 Chronicles 17 in the TNFD

1 Chronicles 17 in the TNT

1 Chronicles 17 in the TNTIK

1 Chronicles 17 in the TNTIL

1 Chronicles 17 in the TNTIN

1 Chronicles 17 in the TNTIP

1 Chronicles 17 in the TNTIZ

1 Chronicles 17 in the TOMA

1 Chronicles 17 in the TTENT

1 Chronicles 17 in the UBG

1 Chronicles 17 in the UGV

1 Chronicles 17 in the UGV2

1 Chronicles 17 in the UGV3

1 Chronicles 17 in the VBL

1 Chronicles 17 in the VDCC

1 Chronicles 17 in the YALU

1 Chronicles 17 in the YAPE

1 Chronicles 17 in the YBVTP

1 Chronicles 17 in the ZBP