1 Chronicles 29 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Devid gwara ọgbakọ Izrel niile okwu sị ha, “Nwa m Solomọn, onye Chineke họpụtara ịbụ eze nʼọnọdụ m, bụ nwantakịrị na-amachabeghị ihe. Ma ọrụ o nwere ịrụ dị ukwuu, nʼihi na ụlọ ukwu a abụghị mmadụ ka ọ dịrị, kama ọ bụ nye ONYENWE ANYỊ Chineke. 2 Ma nʼike m niile, agbalịala m wetachaa ihe niile a ga-eji wuo ụlọnsọ ukwu Chineke m ebe ha dị ukwuu: ọlaedo a ga-eji kpụọ ihe ọlaedo niile, ọlaọcha a ga-eji kpụọ ihe ọlaọcha niile, bronz a ga-eji kpụọ ihe bronz niile, igwe a ga-eji kpụọ ihe igwe niile, na osisi a ga-eji rụọ ihe osisi niile, nkume dị oke ọnụahịa ọniks, a ga-ahịọnye ahịọnye, na nkume dị oke ọnụahịa tọkwọisi, na nkume ndị ọzọ ụcha ha dị iche iche, na nkume ndị ọzọ mara mma, tinyere mabụl. 3 Ugbu a, nʼihi mmasị m nʼebe ụlọnsọ Chineke m dị, ana m enye akụ nke aka m niile, ya bụ ọlaedo na ọlaọcha m, iji ya nye aka, maka iwu ụlọnsọ ukwu Chineke m. Ihe ndị a ka m na-enye, tụkwasịkwa nʼelu ihe ndị ọzọ niile bụ nke m nyerela, nʼihi ụlọnsọ ukwu a: 4 bụ puku talenti ọlaedo atọ (ọlaedo e si Ọfịa bubata), na puku talenti ọlaọcha asaa nke a nụchara anụcha, nke a ga-eji machite ahụ ụlọ niile nke ụlọ ndị ahụ. 5 Maka ọrụ niile a ga-eji ọlaedo rụọ, na nke a ga-eji ọlaọcha rụọ, na ọrụ niile ndị ǹka ga-arụ. Ugbu a, onye jikeere iwere onwe ya nyechasịa ONYENWE ANYỊ nʼaka taa?” 6 Mgbe ahụ, ndịisi ezinaụlọ, na ndịisi ozi nke ebo Izrel niile, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi na-elekọta ọrụ eze, jiri obi ha niile nye onyinye. 7 Ha nyere maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke. Ha nyere puku talenti ọlaedo ise, na puku darik ọlaedo iri, nyekwa puku talenti ọlaọcha iri, na puku talenti bronz iri na asatọ, na narị puku talenti igwe. 8 Ndị niile nwere nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche webatara ya tinye ha nʼụlọakụ dị nʼụlọ nso ukwu ONYENWE ANYỊ, nke Jehiel onye Geshọn na-elekọta. 9 Ndị Izrel niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi otu ndịisi ha jiri wepụta obi nye onyinye, nʼihi na ha ji ọṅụ na obi ha niile nye ONYENWE ANYỊ onyinye. Eze Devid nʼonwe ya ṅụrịkwara ọṅụ nke ukwuu. 10 Nʼihu ọha Izrel niile, Devid kelere ONYENWE ANYỊ ekele sị,“Otuto dịrị gị ONYENWE ANYỊChineke nna anyị Izrelsite nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. 11 Gị onwe gị, ONYENWE ANYỊ nwe ịdị ukwu, na ike,na ịma mma, na ugwu eze, na ebube,nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị.Gị onwe gị, ONYENWE ANYỊ nwe alaeze.Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile. 12 Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa.Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile.Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dịibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike. 13 Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekelena-etokwa aha gị dị ebube. 14 “Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị. 15 Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya. 16 O, ONYENWE ANYỊ Chineke anyị, ihe niile ndị a anyị bukọrọ maka iji rụọra gị ụlọnsọ si nʼaka gị bịa. Ha niile bụkwa nke gị. 17 Amaara m, Chineke m, na ị na-anwale obi, na i na-enwekwa mmasị nʼihe ziri ezi. Ihe ndị niile ka m onwe m nyere site nʼafọ ofufu nakwa obi ziri ezi. Ma ugbu a, ahụla m ọṅụ ndị gị, bụ ndị nọ nʼebe a, ji were afọ ofufu nye gị onyinye ha. 18 Ya mere, gị ONYENWE ANYỊ, Chineke nna anyị Ebraham na Aịzik, na Izrel, biko, mee ka ụdị ọchịchọ a dịgide nʼime obi ndị gị ruo ebighị ebi, meekwa ka ha jiri obi ha niile gbasoo gị mgbe niile. 19 Nye nwa m Solomọn obi zuruoke nke ọ ga-eji debe iwu gị niile, ọchịchọ gị niile na ụkpụrụ gị niile, ya na mmụọ imezu ihe niile metụtara owuwu ụlọnsọ ukwu a nke m kwadooro ihe niile ndị a.” 20 Mgbe ahụ, Devid gwara ndị Izrel okwu sị, “Toonu ONYENWE ANYỊ Chineke unu!” Ha niile toro ONYENWE ANYỊ Chineke nna ha, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị na eze. 21 Nʼechi ya, ha wetara otu puku oke ehi, na otu puku ebule, na otu puku ụmụ ebule jiri ha chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja nsure ọkụ. Tinyere aja ihe ọṅụṅụ na ọtụtụ aja ndị ọzọ nʼebe ọ bara ụba nʼihi ụmụ Izrel niile. 22 Emesịa, ha jiri ọṅụ rie oriri, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ nʼihu ONYENWE ANYỊ.Ha nọkwa nʼebe ahụ nabata Solomọn, nwa Devid dịka eze nke ugboro abụọ, teekwa ya mmanụ nʼihu ONYENWE ANYỊ ka ọ bụrụ onye ọchịchị. Ha mekwara Zadọk onye nchụaja. 23 Ya mere, Solomọn nọkwasịrị nʼocheeze ONYENWE ANYỊ dịka eze, nʼọnọdụ nna ya Devid. Ọ bara ụba nke ukwuu. Ndị Izrel rubekwaara ya isi. 24 Ndịisi ọchịchị niile, na ndịisi Izrel niile, na ụmụ ndị ikom eze Devid niile kwupụtara nrube isi ha nye Solomọn, eze ọhụrụ. 25 ONYENWE ANYỊ mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula. 26 Devid nwa Jesi bụ eze ndị Izrel niile. 27 Ọ chịrị Izrel iri afọ anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem. 28 Ọ nwụrụ mgbe ọ ghọrọ ezigbo agadi. Ọ bụkwa onye biri ogologo ndụ, onye nwekwara akụnụba na nsọpụrụ. Solomọn nwa ya nwoke nọchiri ya dịka eze. 29 Ihe niile gbasara ọchịchị eze Devid, site na mmalite rụọ nʼọgwụgwụ, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ Samuel, onye ọhụ ụzọ, na nʼakwụkwọ Netan, onye amụma, na nʼakwụkwọ Gad onye ọhụ ụzọ. 30 Akụkọ ndị a gosiri ihe gbasara ọchịchị eze ya, na ịdị ike ya, na ihe niile mere ya, na ihe mere ndị Izrel, na ndị eze ndị mba ọzọ bi ha gburugburu.

In Other Versions

1 Chronicles 29 in the ANGEFD

1 Chronicles 29 in the ANTPNG2D

1 Chronicles 29 in the AS21

1 Chronicles 29 in the BAGH

1 Chronicles 29 in the BBPNG

1 Chronicles 29 in the BBT1E

1 Chronicles 29 in the BDS

1 Chronicles 29 in the BEV

1 Chronicles 29 in the BHAD

1 Chronicles 29 in the BIB

1 Chronicles 29 in the BLPT

1 Chronicles 29 in the BNT

1 Chronicles 29 in the BNTABOOT

1 Chronicles 29 in the BNTLV

1 Chronicles 29 in the BOATCB

1 Chronicles 29 in the BOATCB2

1 Chronicles 29 in the BOBCV

1 Chronicles 29 in the BOCNT

1 Chronicles 29 in the BOECS

1 Chronicles 29 in the BOGWICC

1 Chronicles 29 in the BOHCB

1 Chronicles 29 in the BOHCV

1 Chronicles 29 in the BOHLNT

1 Chronicles 29 in the BOHNTLTAL

1 Chronicles 29 in the BOILNTAP

1 Chronicles 29 in the BOITCV

1 Chronicles 29 in the BOKCV

1 Chronicles 29 in the BOKCV2

1 Chronicles 29 in the BOKHWOG

1 Chronicles 29 in the BOKSSV

1 Chronicles 29 in the BOLCB

1 Chronicles 29 in the BOLCB2

1 Chronicles 29 in the BOMCV

1 Chronicles 29 in the BONAV

1 Chronicles 29 in the BONCB

1 Chronicles 29 in the BONLT

1 Chronicles 29 in the BONUT2

1 Chronicles 29 in the BOPLNT

1 Chronicles 29 in the BOSCB

1 Chronicles 29 in the BOSNC

1 Chronicles 29 in the BOTLNT

1 Chronicles 29 in the BOVCB

1 Chronicles 29 in the BOYCB

1 Chronicles 29 in the BPBB

1 Chronicles 29 in the BPH

1 Chronicles 29 in the BSB

1 Chronicles 29 in the CCB

1 Chronicles 29 in the CUV

1 Chronicles 29 in the CUVS

1 Chronicles 29 in the DBT

1 Chronicles 29 in the DGDNT

1 Chronicles 29 in the DHNT

1 Chronicles 29 in the DNT

1 Chronicles 29 in the ELBE

1 Chronicles 29 in the EMTV

1 Chronicles 29 in the ESV

1 Chronicles 29 in the FBV

1 Chronicles 29 in the FEB

1 Chronicles 29 in the GGMNT

1 Chronicles 29 in the GNT

1 Chronicles 29 in the HARY

1 Chronicles 29 in the HNT

1 Chronicles 29 in the IRVA

1 Chronicles 29 in the IRVB

1 Chronicles 29 in the IRVG

1 Chronicles 29 in the IRVH

1 Chronicles 29 in the IRVK

1 Chronicles 29 in the IRVM

1 Chronicles 29 in the IRVM2

1 Chronicles 29 in the IRVO

1 Chronicles 29 in the IRVP

1 Chronicles 29 in the IRVT

1 Chronicles 29 in the IRVT2

1 Chronicles 29 in the IRVU

1 Chronicles 29 in the ISVN

1 Chronicles 29 in the JSNT

1 Chronicles 29 in the KAPI

1 Chronicles 29 in the KBT1ETNIK

1 Chronicles 29 in the KBV

1 Chronicles 29 in the KJV

1 Chronicles 29 in the KNFD

1 Chronicles 29 in the LBA

1 Chronicles 29 in the LBLA

1 Chronicles 29 in the LNT

1 Chronicles 29 in the LSV

1 Chronicles 29 in the MAAL

1 Chronicles 29 in the MBV

1 Chronicles 29 in the MBV2

1 Chronicles 29 in the MHNT

1 Chronicles 29 in the MKNFD

1 Chronicles 29 in the MNG

1 Chronicles 29 in the MNT

1 Chronicles 29 in the MNT2

1 Chronicles 29 in the MRS1T

1 Chronicles 29 in the NAA

1 Chronicles 29 in the NASB

1 Chronicles 29 in the NBLA

1 Chronicles 29 in the NBS

1 Chronicles 29 in the NBVTP

1 Chronicles 29 in the NET2

1 Chronicles 29 in the NIV11

1 Chronicles 29 in the NNT

1 Chronicles 29 in the NNT2

1 Chronicles 29 in the NNT3

1 Chronicles 29 in the PDDPT

1 Chronicles 29 in the PFNT

1 Chronicles 29 in the RMNT

1 Chronicles 29 in the SBIAS

1 Chronicles 29 in the SBIBS

1 Chronicles 29 in the SBIBS2

1 Chronicles 29 in the SBICS

1 Chronicles 29 in the SBIDS

1 Chronicles 29 in the SBIGS

1 Chronicles 29 in the SBIHS

1 Chronicles 29 in the SBIIS

1 Chronicles 29 in the SBIIS2

1 Chronicles 29 in the SBIIS3

1 Chronicles 29 in the SBIKS

1 Chronicles 29 in the SBIKS2

1 Chronicles 29 in the SBIMS

1 Chronicles 29 in the SBIOS

1 Chronicles 29 in the SBIPS

1 Chronicles 29 in the SBISS

1 Chronicles 29 in the SBITS

1 Chronicles 29 in the SBITS2

1 Chronicles 29 in the SBITS3

1 Chronicles 29 in the SBITS4

1 Chronicles 29 in the SBIUS

1 Chronicles 29 in the SBIVS

1 Chronicles 29 in the SBT

1 Chronicles 29 in the SBT1E

1 Chronicles 29 in the SCHL

1 Chronicles 29 in the SNT

1 Chronicles 29 in the SUSU

1 Chronicles 29 in the SUSU2

1 Chronicles 29 in the SYNO

1 Chronicles 29 in the TBIAOTANT

1 Chronicles 29 in the TBT1E

1 Chronicles 29 in the TBT1E2

1 Chronicles 29 in the TFTIP

1 Chronicles 29 in the TFTU

1 Chronicles 29 in the TGNTATF3T

1 Chronicles 29 in the THAI

1 Chronicles 29 in the TNFD

1 Chronicles 29 in the TNT

1 Chronicles 29 in the TNTIK

1 Chronicles 29 in the TNTIL

1 Chronicles 29 in the TNTIN

1 Chronicles 29 in the TNTIP

1 Chronicles 29 in the TNTIZ

1 Chronicles 29 in the TOMA

1 Chronicles 29 in the TTENT

1 Chronicles 29 in the UBG

1 Chronicles 29 in the UGV

1 Chronicles 29 in the UGV2

1 Chronicles 29 in the UGV3

1 Chronicles 29 in the VBL

1 Chronicles 29 in the VDCC

1 Chronicles 29 in the YALU

1 Chronicles 29 in the YAPE

1 Chronicles 29 in the YBVTP

1 Chronicles 29 in the ZBP