1 Corinthians 9 (BOICB)

1 Abụghị m onye nwe onwe ya? Abụghị m onyeozi Kraịst? Ọ bụ na m ahụghị Jisọs Onyenwe anyị? Unu abụghị ihe ngosipụta ọrụ m rụrụ nʼime Onyenwe anyị? 2 Ọ bụrụ na m abụghị onyeozi nʼebe ndị ọzọ nọ, nʼebe unu nọ, abụ m onyeozi nʼeziokwu nʼihi na unu bụ akara nke ọrụ onyeozi m nʼime Onyenwe anyị. 3 Ihe ngọpụ m nye ndị ahụ na-enyocha m bụ nke a. 4 Ọ bụ na anyị enweghị ike iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ? 5 Ọ bụ na anyị enweghị ike iduru nwunye onye bụ onye kwere ekwe gaa ebe ọbụla anyị na-aga dịka ndị ozi ọzọ na-eme, na dịka ụmụnne Onyenwe anyị na Sefas na-emekwa? 6 Ọ ga-abụ naanị mụ na Banabas bụ ndị na-enweghị ike ịhapụ ịrụ ọrụ maka ihe anyị ga na-eri? 7 Olee onye agha unu maara nke na-esi nʼakpa ya akwụ onwe ya ụgwọ ọnwa? Ka ọ dị onye ọrụ ubi vaịnị unu maara nke na-adịghị eri mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta? Olee onye ọzụzụ atụrụ unu maara nke na-adịghị aṅụ mmiri ara e si nʼigwe atụrụ ọ na-azụ apịpụta? 8 Anaghị m ekwu ihe a nʼihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị niile nʼetiti ndị mmadụ? Akwụkwọ iwu, o kwukwaghị otu ihe ahụ? 9 Nʼihi na e dere ya nʼiwu nke Mosis, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.” Unu chere na ọ bụ naanị ehi ka Chineke bu nʼobi kwuo okwu a? 10 E, nʼihi anyị ka eji dee ya nʼakwụkwọ. Nʼezie, e dere ihe ndị a nʼihi anyị, nʼihi na onye rụrụ ọrụ nʼubi na onye na-azọcha mkpụrụ dị nʼubi ahụ, na-eme nke a nʼolileanya na o kwesiri iketa oke site na mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta. 11 Mkpụrụ anyị kụrụ nʼime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ụfọdụ nʼime akụnụba unu? 12 Ọ bụrụ na ndị ọzọ kwesiri iketa uru dị otu a nʼahụ unu, ọ bụ na anyị ekwesighị iketa karịa?Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọbụla, kama anyị na-agbalịsị ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nʼoziọma Kraịst nke anyị wetara. 13 Ọ bụ na unu amataghị na ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu na-esi nʼụlọnsọ ahụ na-eweta ihe ha na-eri? Ndị na-agbakwa odibo nʼebe ịchụ aja na-eketakwa oke nʼihe eji chụọ aja? 14 Nʼotu aka ahụ kwa, Onyenwe anyị ekwuola na ndị niile na-ekwusa oziọma ya ga-esi nʼoziọma eweta nri ha ga-eri dị ndụ. 15 Ma o nweghị mgbe m jirila ike ndị a m nwere irite uru nʼọrụ m nara ndị mmadụ ihe. Anaghị m ede nke a nʼakwụkwọ ka a na-ebutere m ihe onyinye. Nʼihi na ọ kaara m mma ka m nwụọ kama m ga-ekwe ka onye ọbụla mee ka ịnya isi m bụrụ ihe efu nʼihi ihe onyinye. 16 Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma. 17 A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka. 18 Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ. 19 Ọ bụ ezie na-abụghị m ohu onye ọbụla, ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ niile ka m nwee ike site nʼụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụobi nʼuru nye Kraịst. 20 Nʼebe ndị Juu nọọ, ana m eme dịka onye Juu, ka m nwee ike rite ndị Juu nʼuru. Nʼetiti ndị nọ nʼokpuru iwu, ana m emekwa dịka otu nʼime ndị nọ nʼokpuru iwu (nʼagbanyeghị na mụ onwe m anọghị nʼokpuru iwu), ka m si otu a nwee ike rite ndị nọ nʼokpuru iwu nʼuru. 21 Nʼebe ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nọ, emere m onwe m ka onye na-anọghị nʼokpuru iwu (ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe iwu Chineke na-achọ. Ana m emekwa dịka onye nọ nʼokpuru iwu Kraịst), ka m nwee ike rite ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nʼuru. 22 Nʼebe ndị na-adịghị ike nọ, ana m emekwa dịka ha, ka m nwee ike rite ndị na-adịghị ike nʼuru. Otu ọbụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike site nʼụzọ niile ọbụla zọpụta ụfọdụ. 23 Ana m eme ihe ndị a niile nʼihi oziọma, ma ka m nwekwa ike keta oke na ngọzị ya. 24 Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ. 25 Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi. 26 Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe. 27 Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka ọ bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara ị bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.

In Other Versions

1 Corinthians 9 in the ANGEFD

1 Corinthians 9 in the ANTPNG2D

1 Corinthians 9 in the AS21

1 Corinthians 9 in the BAGH

1 Corinthians 9 in the BBPNG

1 Corinthians 9 in the BBT1E

1 Corinthians 9 in the BDS

1 Corinthians 9 in the BEV

1 Corinthians 9 in the BHAD

1 Corinthians 9 in the BIB

1 Corinthians 9 in the BLPT

1 Corinthians 9 in the BNT

1 Corinthians 9 in the BNTABOOT

1 Corinthians 9 in the BNTLV

1 Corinthians 9 in the BOATCB

1 Corinthians 9 in the BOATCB2

1 Corinthians 9 in the BOBCV

1 Corinthians 9 in the BOCNT

1 Corinthians 9 in the BOECS

1 Corinthians 9 in the BOGWICC

1 Corinthians 9 in the BOHCB

1 Corinthians 9 in the BOHCV

1 Corinthians 9 in the BOHLNT

1 Corinthians 9 in the BOHNTLTAL

1 Corinthians 9 in the BOILNTAP

1 Corinthians 9 in the BOITCV

1 Corinthians 9 in the BOKCV

1 Corinthians 9 in the BOKCV2

1 Corinthians 9 in the BOKHWOG

1 Corinthians 9 in the BOKSSV

1 Corinthians 9 in the BOLCB

1 Corinthians 9 in the BOLCB2

1 Corinthians 9 in the BOMCV

1 Corinthians 9 in the BONAV

1 Corinthians 9 in the BONCB

1 Corinthians 9 in the BONLT

1 Corinthians 9 in the BONUT2

1 Corinthians 9 in the BOPLNT

1 Corinthians 9 in the BOSCB

1 Corinthians 9 in the BOSNC

1 Corinthians 9 in the BOTLNT

1 Corinthians 9 in the BOVCB

1 Corinthians 9 in the BOYCB

1 Corinthians 9 in the BPBB

1 Corinthians 9 in the BPH

1 Corinthians 9 in the BSB

1 Corinthians 9 in the CCB

1 Corinthians 9 in the CUV

1 Corinthians 9 in the CUVS

1 Corinthians 9 in the DBT

1 Corinthians 9 in the DGDNT

1 Corinthians 9 in the DHNT

1 Corinthians 9 in the DNT

1 Corinthians 9 in the ELBE

1 Corinthians 9 in the EMTV

1 Corinthians 9 in the ESV

1 Corinthians 9 in the FBV

1 Corinthians 9 in the FEB

1 Corinthians 9 in the GGMNT

1 Corinthians 9 in the GNT

1 Corinthians 9 in the HARY

1 Corinthians 9 in the HNT

1 Corinthians 9 in the IRVA

1 Corinthians 9 in the IRVB

1 Corinthians 9 in the IRVG

1 Corinthians 9 in the IRVH

1 Corinthians 9 in the IRVK

1 Corinthians 9 in the IRVM

1 Corinthians 9 in the IRVM2

1 Corinthians 9 in the IRVO

1 Corinthians 9 in the IRVP

1 Corinthians 9 in the IRVT

1 Corinthians 9 in the IRVT2

1 Corinthians 9 in the IRVU

1 Corinthians 9 in the ISVN

1 Corinthians 9 in the JSNT

1 Corinthians 9 in the KAPI

1 Corinthians 9 in the KBT1ETNIK

1 Corinthians 9 in the KBV

1 Corinthians 9 in the KJV

1 Corinthians 9 in the KNFD

1 Corinthians 9 in the LBA

1 Corinthians 9 in the LBLA

1 Corinthians 9 in the LNT

1 Corinthians 9 in the LSV

1 Corinthians 9 in the MAAL

1 Corinthians 9 in the MBV

1 Corinthians 9 in the MBV2

1 Corinthians 9 in the MHNT

1 Corinthians 9 in the MKNFD

1 Corinthians 9 in the MNG

1 Corinthians 9 in the MNT

1 Corinthians 9 in the MNT2

1 Corinthians 9 in the MRS1T

1 Corinthians 9 in the NAA

1 Corinthians 9 in the NASB

1 Corinthians 9 in the NBLA

1 Corinthians 9 in the NBS

1 Corinthians 9 in the NBVTP

1 Corinthians 9 in the NET2

1 Corinthians 9 in the NIV11

1 Corinthians 9 in the NNT

1 Corinthians 9 in the NNT2

1 Corinthians 9 in the NNT3

1 Corinthians 9 in the PDDPT

1 Corinthians 9 in the PFNT

1 Corinthians 9 in the RMNT

1 Corinthians 9 in the SBIAS

1 Corinthians 9 in the SBIBS

1 Corinthians 9 in the SBIBS2

1 Corinthians 9 in the SBICS

1 Corinthians 9 in the SBIDS

1 Corinthians 9 in the SBIGS

1 Corinthians 9 in the SBIHS

1 Corinthians 9 in the SBIIS

1 Corinthians 9 in the SBIIS2

1 Corinthians 9 in the SBIIS3

1 Corinthians 9 in the SBIKS

1 Corinthians 9 in the SBIKS2

1 Corinthians 9 in the SBIMS

1 Corinthians 9 in the SBIOS

1 Corinthians 9 in the SBIPS

1 Corinthians 9 in the SBISS

1 Corinthians 9 in the SBITS

1 Corinthians 9 in the SBITS2

1 Corinthians 9 in the SBITS3

1 Corinthians 9 in the SBITS4

1 Corinthians 9 in the SBIUS

1 Corinthians 9 in the SBIVS

1 Corinthians 9 in the SBT

1 Corinthians 9 in the SBT1E

1 Corinthians 9 in the SCHL

1 Corinthians 9 in the SNT

1 Corinthians 9 in the SUSU

1 Corinthians 9 in the SUSU2

1 Corinthians 9 in the SYNO

1 Corinthians 9 in the TBIAOTANT

1 Corinthians 9 in the TBT1E

1 Corinthians 9 in the TBT1E2

1 Corinthians 9 in the TFTIP

1 Corinthians 9 in the TFTU

1 Corinthians 9 in the TGNTATF3T

1 Corinthians 9 in the THAI

1 Corinthians 9 in the TNFD

1 Corinthians 9 in the TNT

1 Corinthians 9 in the TNTIK

1 Corinthians 9 in the TNTIL

1 Corinthians 9 in the TNTIN

1 Corinthians 9 in the TNTIP

1 Corinthians 9 in the TNTIZ

1 Corinthians 9 in the TOMA

1 Corinthians 9 in the TTENT

1 Corinthians 9 in the UBG

1 Corinthians 9 in the UGV

1 Corinthians 9 in the UGV2

1 Corinthians 9 in the UGV3

1 Corinthians 9 in the VBL

1 Corinthians 9 in the VDCC

1 Corinthians 9 in the YALU

1 Corinthians 9 in the YAPE

1 Corinthians 9 in the YBVTP

1 Corinthians 9 in the ZBP