1 Samuel 13 (BOICB)
1 Sọl gbara iri afọ atọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịkwara dịka eze nʼala Izrel iri afọ anọ na abụọ. 2 Sọl sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta puku ndị ikom atọ ka ha bụrụ ndị agha ya. Sọl na puku abụọ nọ na Mikmash nʼala ugwu ugwu Betel. Otu puku nọnyeere Jonatan na Gibea, nʼala Benjamin. Ndị ikom ndị fọdụrụ ka o zighachiri, onye ọbụla nʼụlọ ha. 3 Ma Jonatan busoro ndị agha Filistia nọ na Geba agha. Ndị Filistia nụkwara ihe banyere ya. Mgbe ahụ, Sọl nyere iwu ka e gbuo opi ike nʼala Izrel niile, kwuo sị, “Unu ndị Hibru niile, geenụ ntị.” 4 Ya mere, ụmụ Izrel niile nụrụ akụkọ ahụ nke kwuru sị, “Sọl ebusola ọmụma ụlọ ikwu ndị agha Filistia agha, nʼihi nke a, ndị Izrel niile abụrụla ndị a kpọrọ asị ugbu a nʼetiti ndị Filistia.” Ya mere, ndị agha Izrel niile pụtakwara soro Sọl gaa Gilgal. 5 Ndị Filistia nʼonwe ha chịkọtara ndị agha ha ibuso ndị Izrel agha. Ọnụọgụgụ ụgbọ agha ha dị puku atọ, ndị na-agba ịnyịnya ha nwere dị puku isii; ndị agha ha ndị ọzọ dị ukwu nʼọnụọgụgụ. Nʼezie, ha dị ukwuu dịka aja dị nʼọnụ osimiri. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mikmash nʼọwụwa anyanwụ Bet-Aven. 6 Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla. 7 Ndị Hibru ụfọdụ gafere Jọdan ruo nʼala Gad na Gilead.Nʼoge a, Sọl nọ na Gilgal, ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ. 8 Samuel gwararịị Sọl ka o chere ya ruo abalị asaa, ma mgbe abalị asaa zuru Samuel abịaghị Gilgal. Nʼoge a, ndị agha Sọl malitere na-agbasasị. 9 Ya mere, Sọl kwuru sị, “Wetaranụ m ihe aja nsure ọkụ na nke aja udo.” Sọl chụkwara aja nsure ọkụ ahụ. 10 Ngwangwa ọ na-achụcha aja ndị ahụ, Samuel rutere, Sọl pụrụ izute ya, na ikele ya. 11 Samuel sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere?”Sọl zara, “Mgbe m hụrụ na ndị a na-agba aghara aghara, na-esite nʼebe m nọ na-agbapụ, mgbe m lere anya lee, ma ahụghị m ka ị na-abịa dịka i kwuru, mgbe m hụkwara ndị Filistia ka ha nọ na Mikmash, na-akwado ibuso anyị agha, 12 echeere m, ‘Ugbu a, ndị Filistia ga-arịdakwute m ibuso m agha na Gilgal, ma arịọbeghị m ihuọma ONYENWE ANYỊ.’ Ya mere m, m jisie ike chụọ aja nsure ọkụ ahụ.” 13 Samuel sịrị Sọl, “Ị kpara agwa onye nzuzu. I debeghị ihe ONYENWE ANYỊ Chineke gị nyere gị nʼiwu idebe. A si na i mere nke a, ọ gaara eme ka alaeze gị guzosie ike nʼebe Izrel nọ ruo mgbe niile. 14 Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. ONYENWE ANYỊ achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe ONYENWE ANYỊ nyere gị nʼiwu.” 15 Samuel biliri hapụ Gilgal gaa Gibea nʼala Benjamin. Mgbe Sọl gụrụ ndị agha so ya, ọ chọpụtara na ha dị naanị narị isii. 16 Sọl na nwa ya nwoke Jonatan, na narị mmadụ isii ndị soo ha nọ na Geba nʼala Benjamin, ebe ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Mikmash. 17 Ụfọdụ nʼime ndị agha Filistia kere onwe ha ụzọ atọ site nʼụlọ ikwu ndị Filistia pụta; otu ụzọ chere ihu nʼụzọ Ofra nʼakụkụ Shual, 18 nke ọzọ chere ihu ịga Bet-Horon, nke atọ chee ihu nʼụzọ oke ala dị na Ndagwurugwu Zeboiim, nke dị ọzara nso. 19 Nʼoge ahụ, e nweghị ike ịchọta otu ọkpụ ụzụ nʼala Izrel, nʼihi na ndị Filistia sịrị, “Ma ọ bụghị otu a, ndị Hibru ga-akpụtara onwe ha mma agha maọbụ ùbe.” 20 Izrel niile na-ejekwuru ndị Filistia maka ịmụ ọgụ igwuze ala ha, maọbụ mma oge ha, maọbụ anyụike ha, maọbụ mma ha ji ewe ihe ubi. 21 Ihe ha na-akwụ maka ịmụ ọgụ igwuze ala, na mma oge ha bụ ụzọ abụọ nke shekel e kere ụzọ atọ, maka ịmụ anyụike, na ndụdụ, ya na ịpị ndụdụ e ji achị ehi bụ, otu ụzọ nke shekel e kere ụzọ atọ. 22 Nke mere na ahụtaghị mma agha maọbụ ùbe ọbụla nʼaka ndị agha Izrel nʼụbọchị agha ahụ, ma ọ bụghị naanị nke dị nʼaka Sọl na Jonatan. 23 Ugbu a ndị Filistia e kewapụtara iche a pụọla gaa nʼụzọ warawara dị na Mikmash.
In Other Versions
1 Samuel 13 in the ANGEFD
1 Samuel 13 in the ANTPNG2D
1 Samuel 13 in the AS21
1 Samuel 13 in the BAGH
1 Samuel 13 in the BBPNG
1 Samuel 13 in the BBT1E
1 Samuel 13 in the BDS
1 Samuel 13 in the BEV
1 Samuel 13 in the BHAD
1 Samuel 13 in the BIB
1 Samuel 13 in the BLPT
1 Samuel 13 in the BNT
1 Samuel 13 in the BNTABOOT
1 Samuel 13 in the BNTLV
1 Samuel 13 in the BOATCB
1 Samuel 13 in the BOATCB2
1 Samuel 13 in the BOBCV
1 Samuel 13 in the BOCNT
1 Samuel 13 in the BOECS
1 Samuel 13 in the BOGWICC
1 Samuel 13 in the BOHCB
1 Samuel 13 in the BOHCV
1 Samuel 13 in the BOHLNT
1 Samuel 13 in the BOHNTLTAL
1 Samuel 13 in the BOILNTAP
1 Samuel 13 in the BOITCV
1 Samuel 13 in the BOKCV
1 Samuel 13 in the BOKCV2
1 Samuel 13 in the BOKHWOG
1 Samuel 13 in the BOKSSV
1 Samuel 13 in the BOLCB
1 Samuel 13 in the BOLCB2
1 Samuel 13 in the BOMCV
1 Samuel 13 in the BONAV
1 Samuel 13 in the BONCB
1 Samuel 13 in the BONLT
1 Samuel 13 in the BONUT2
1 Samuel 13 in the BOPLNT
1 Samuel 13 in the BOSCB
1 Samuel 13 in the BOSNC
1 Samuel 13 in the BOTLNT
1 Samuel 13 in the BOVCB
1 Samuel 13 in the BOYCB
1 Samuel 13 in the BPBB
1 Samuel 13 in the BPH
1 Samuel 13 in the BSB
1 Samuel 13 in the CCB
1 Samuel 13 in the CUV
1 Samuel 13 in the CUVS
1 Samuel 13 in the DBT
1 Samuel 13 in the DGDNT
1 Samuel 13 in the DHNT
1 Samuel 13 in the DNT
1 Samuel 13 in the ELBE
1 Samuel 13 in the EMTV
1 Samuel 13 in the ESV
1 Samuel 13 in the FBV
1 Samuel 13 in the FEB
1 Samuel 13 in the GGMNT
1 Samuel 13 in the GNT
1 Samuel 13 in the HARY
1 Samuel 13 in the HNT
1 Samuel 13 in the IRVA
1 Samuel 13 in the IRVB
1 Samuel 13 in the IRVG
1 Samuel 13 in the IRVH
1 Samuel 13 in the IRVK
1 Samuel 13 in the IRVM
1 Samuel 13 in the IRVM2
1 Samuel 13 in the IRVO
1 Samuel 13 in the IRVP
1 Samuel 13 in the IRVT
1 Samuel 13 in the IRVT2
1 Samuel 13 in the IRVU
1 Samuel 13 in the ISVN
1 Samuel 13 in the JSNT
1 Samuel 13 in the KAPI
1 Samuel 13 in the KBT1ETNIK
1 Samuel 13 in the KBV
1 Samuel 13 in the KJV
1 Samuel 13 in the KNFD
1 Samuel 13 in the LBA
1 Samuel 13 in the LBLA
1 Samuel 13 in the LNT
1 Samuel 13 in the LSV
1 Samuel 13 in the MAAL
1 Samuel 13 in the MBV
1 Samuel 13 in the MBV2
1 Samuel 13 in the MHNT
1 Samuel 13 in the MKNFD
1 Samuel 13 in the MNG
1 Samuel 13 in the MNT
1 Samuel 13 in the MNT2
1 Samuel 13 in the MRS1T
1 Samuel 13 in the NAA
1 Samuel 13 in the NASB
1 Samuel 13 in the NBLA
1 Samuel 13 in the NBS
1 Samuel 13 in the NBVTP
1 Samuel 13 in the NET2
1 Samuel 13 in the NIV11
1 Samuel 13 in the NNT
1 Samuel 13 in the NNT2
1 Samuel 13 in the NNT3
1 Samuel 13 in the PDDPT
1 Samuel 13 in the PFNT
1 Samuel 13 in the RMNT
1 Samuel 13 in the SBIAS
1 Samuel 13 in the SBIBS
1 Samuel 13 in the SBIBS2
1 Samuel 13 in the SBICS
1 Samuel 13 in the SBIDS
1 Samuel 13 in the SBIGS
1 Samuel 13 in the SBIHS
1 Samuel 13 in the SBIIS
1 Samuel 13 in the SBIIS2
1 Samuel 13 in the SBIIS3
1 Samuel 13 in the SBIKS
1 Samuel 13 in the SBIKS2
1 Samuel 13 in the SBIMS
1 Samuel 13 in the SBIOS
1 Samuel 13 in the SBIPS
1 Samuel 13 in the SBISS
1 Samuel 13 in the SBITS
1 Samuel 13 in the SBITS2
1 Samuel 13 in the SBITS3
1 Samuel 13 in the SBITS4
1 Samuel 13 in the SBIUS
1 Samuel 13 in the SBIVS
1 Samuel 13 in the SBT
1 Samuel 13 in the SBT1E
1 Samuel 13 in the SCHL
1 Samuel 13 in the SNT
1 Samuel 13 in the SUSU
1 Samuel 13 in the SUSU2
1 Samuel 13 in the SYNO
1 Samuel 13 in the TBIAOTANT
1 Samuel 13 in the TBT1E
1 Samuel 13 in the TBT1E2
1 Samuel 13 in the TFTIP
1 Samuel 13 in the TFTU
1 Samuel 13 in the TGNTATF3T
1 Samuel 13 in the THAI
1 Samuel 13 in the TNFD
1 Samuel 13 in the TNT
1 Samuel 13 in the TNTIK
1 Samuel 13 in the TNTIL
1 Samuel 13 in the TNTIN
1 Samuel 13 in the TNTIP
1 Samuel 13 in the TNTIZ
1 Samuel 13 in the TOMA
1 Samuel 13 in the TTENT
1 Samuel 13 in the UBG
1 Samuel 13 in the UGV
1 Samuel 13 in the UGV2
1 Samuel 13 in the UGV3
1 Samuel 13 in the VBL
1 Samuel 13 in the VDCC
1 Samuel 13 in the YALU
1 Samuel 13 in the YAPE
1 Samuel 13 in the YBVTP
1 Samuel 13 in the ZBP