1 Timothy 5 (BOICB)

1 Abarala okenye mba nʼolu dị ike, kama jiri arịrịọ na nsọpụrụ gwa ya okwu dị ka ọ bụ nna gị. Na-agwa ụmụ okorobịa okwu dị ka ị ga-esi gwa ụmụnne gị ị hụrụ nʼanya okwu. 2 Na-emeso ndị inyom ndị bụ okenye omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche nʼịdị ọcha nʼebe o zuruoke. 3 Sọpụrụnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ndị na-ebi ndụ dị ka ndị di ha nwụrụ anwụ nʼeziokwu. 4 Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ. 5 Nwanyị di ya nwụrụ nʼezie, nke na-enweghị onye na-elekọta ya anya, atụkwasịla obi ya na olileanya na Chineke. Ọ na-anọgidekwa nʼekpere na arịrịọ ehihie na abalị. 6 Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nʼaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụrịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ. 7 Nye ha ihe ndị a dịka iwu, ka ha ghara ị bụ ndị a na-ata ụta. 8 Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ. 9 Nwanyị ọbụla di ya nwụrụ ga-aba nʼotu ndị di ha nwụrụ ga-abụ onye gbara iri afọ isii maọbụ karịa. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ naanị otu di. 10 Ọ ga-abụ onye mmadụ niile na-agbara ezi ama, nʼihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nʼụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, onye na-asa ụkwụ ndị nsọ na onye jikeere mgbe niile ime ihe ọma. 11 Ma o kwesighị ka e debanye aha ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nʼotu ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Nʼihi na mgbe ọchịchọ anụ ahụ jidesiri ha ike, ha ga-enupuru Kraịst isi, chọwa ịlụ di ọzọ. 12 Ụdị omume a ga-ewetara ha ikpe ọmụma, nʼihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ. 13 Wezugakwarị nke a, na ha amụta omume ịdị umengwụ, nʼaga nʼụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, kama ha na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha, na-akpa asịrị, na-ekwu okwu nzuzu, na-ekwu ihe ha ekwesighị ikwu. 14 Nʼihi nke a, ana m adụ ndị ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ ọdụ ka ha lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinaụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye iro ọbụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide anyị. 15 Ụfọdụ ndị mmadụ adahielarị ụzọ, soro ekwensu. 16 Ya mere, nwanyị ọbụla kwere ekwe, nke nwere nʼezinaụlọ ya ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, ya jisie ike gboro ha mkpa. Ọ dịghị mma ibogbu chọọchị nʼibu, ka o nwee ike iletazu ndị nọ nʼọnọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ nʼezie. 17 Nye ndị okenye, ndị na-achị nke ọma nsọpụrụ kwesiri ekwesi na ụgwọ ọrụ okpukpu abụọ, ọkachasị ndị na-adọgbu onwe ha nʼọrụ izi oziọma na nʼikuzi ihe. 18 Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka,” hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ, ọzọkwa, “Onye na-arụ ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya.” 19 Egela ntị nʼebubo ọjọọ ọbụla a na-ebo onye okenye karịakwa maọbụ na ndị akaebe abụọ maọbụ atọ gbara ama megide ya. 20 Ma ndị okenye ahụ nọgidere na-eme mmehie, kpọpụta ha baara ha mba nʼihu mmadụ niile, ka ndị ọzọ tụọ egwu gharakwa iso omume ha. 21 Ana m adọ unu aka na ntị nʼihu Chineke na nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼihu ndị mmụọ ozi a họpụtara, ka unu debe ụkpụrụ ndị a niile, nye onye ọbụla ntaramahụhụ nke ruru ya, elekwala onye ọbụla anya nʼihu. 22 Ebikwasịkwala onye ọbụla aka nʼisi ọsịịsọ ime ya okenye maọbụ onye na-eje ozi. Ekwela ka i keta oke na mmehie ndị ọzọ. Debe onwe gị ọcha. 23 Aṅụkwala naanị mmiri ọzọ, na-aṅụ ntakịrị mmanya maka afọ gị na nrịa nrịa nke na-arịa gị ọtụtụ mgbe. 24 Mmehie ụfọdụ mmadụ na-apụta ihe ma na-ebukwa ha ụzọ rụọ oche ikpe, ma ndị ọzọ ka a na-ahụta mmehie ha nʼoge ikpeazụ. 25 Otu a kwa, ọrụ ọma na-apụta ihe, ma ọ bụladị ndị na-apụtaghị ihe, apụghị izo ha ezo.

In Other Versions

1 Timothy 5 in the ANGEFD

1 Timothy 5 in the ANTPNG2D

1 Timothy 5 in the AS21

1 Timothy 5 in the BAGH

1 Timothy 5 in the BBPNG

1 Timothy 5 in the BBT1E

1 Timothy 5 in the BDS

1 Timothy 5 in the BEV

1 Timothy 5 in the BHAD

1 Timothy 5 in the BIB

1 Timothy 5 in the BLPT

1 Timothy 5 in the BNT

1 Timothy 5 in the BNTABOOT

1 Timothy 5 in the BNTLV

1 Timothy 5 in the BOATCB

1 Timothy 5 in the BOATCB2

1 Timothy 5 in the BOBCV

1 Timothy 5 in the BOCNT

1 Timothy 5 in the BOECS

1 Timothy 5 in the BOGWICC

1 Timothy 5 in the BOHCB

1 Timothy 5 in the BOHCV

1 Timothy 5 in the BOHLNT

1 Timothy 5 in the BOHNTLTAL

1 Timothy 5 in the BOILNTAP

1 Timothy 5 in the BOITCV

1 Timothy 5 in the BOKCV

1 Timothy 5 in the BOKCV2

1 Timothy 5 in the BOKHWOG

1 Timothy 5 in the BOKSSV

1 Timothy 5 in the BOLCB

1 Timothy 5 in the BOLCB2

1 Timothy 5 in the BOMCV

1 Timothy 5 in the BONAV

1 Timothy 5 in the BONCB

1 Timothy 5 in the BONLT

1 Timothy 5 in the BONUT2

1 Timothy 5 in the BOPLNT

1 Timothy 5 in the BOSCB

1 Timothy 5 in the BOSNC

1 Timothy 5 in the BOTLNT

1 Timothy 5 in the BOVCB

1 Timothy 5 in the BOYCB

1 Timothy 5 in the BPBB

1 Timothy 5 in the BPH

1 Timothy 5 in the BSB

1 Timothy 5 in the CCB

1 Timothy 5 in the CUV

1 Timothy 5 in the CUVS

1 Timothy 5 in the DBT

1 Timothy 5 in the DGDNT

1 Timothy 5 in the DHNT

1 Timothy 5 in the DNT

1 Timothy 5 in the ELBE

1 Timothy 5 in the EMTV

1 Timothy 5 in the ESV

1 Timothy 5 in the FBV

1 Timothy 5 in the FEB

1 Timothy 5 in the GGMNT

1 Timothy 5 in the GNT

1 Timothy 5 in the HARY

1 Timothy 5 in the HNT

1 Timothy 5 in the IRVA

1 Timothy 5 in the IRVB

1 Timothy 5 in the IRVG

1 Timothy 5 in the IRVH

1 Timothy 5 in the IRVK

1 Timothy 5 in the IRVM

1 Timothy 5 in the IRVM2

1 Timothy 5 in the IRVO

1 Timothy 5 in the IRVP

1 Timothy 5 in the IRVT

1 Timothy 5 in the IRVT2

1 Timothy 5 in the IRVU

1 Timothy 5 in the ISVN

1 Timothy 5 in the JSNT

1 Timothy 5 in the KAPI

1 Timothy 5 in the KBT1ETNIK

1 Timothy 5 in the KBV

1 Timothy 5 in the KJV

1 Timothy 5 in the KNFD

1 Timothy 5 in the LBA

1 Timothy 5 in the LBLA

1 Timothy 5 in the LNT

1 Timothy 5 in the LSV

1 Timothy 5 in the MAAL

1 Timothy 5 in the MBV

1 Timothy 5 in the MBV2

1 Timothy 5 in the MHNT

1 Timothy 5 in the MKNFD

1 Timothy 5 in the MNG

1 Timothy 5 in the MNT

1 Timothy 5 in the MNT2

1 Timothy 5 in the MRS1T

1 Timothy 5 in the NAA

1 Timothy 5 in the NASB

1 Timothy 5 in the NBLA

1 Timothy 5 in the NBS

1 Timothy 5 in the NBVTP

1 Timothy 5 in the NET2

1 Timothy 5 in the NIV11

1 Timothy 5 in the NNT

1 Timothy 5 in the NNT2

1 Timothy 5 in the NNT3

1 Timothy 5 in the PDDPT

1 Timothy 5 in the PFNT

1 Timothy 5 in the RMNT

1 Timothy 5 in the SBIAS

1 Timothy 5 in the SBIBS

1 Timothy 5 in the SBIBS2

1 Timothy 5 in the SBICS

1 Timothy 5 in the SBIDS

1 Timothy 5 in the SBIGS

1 Timothy 5 in the SBIHS

1 Timothy 5 in the SBIIS

1 Timothy 5 in the SBIIS2

1 Timothy 5 in the SBIIS3

1 Timothy 5 in the SBIKS

1 Timothy 5 in the SBIKS2

1 Timothy 5 in the SBIMS

1 Timothy 5 in the SBIOS

1 Timothy 5 in the SBIPS

1 Timothy 5 in the SBISS

1 Timothy 5 in the SBITS

1 Timothy 5 in the SBITS2

1 Timothy 5 in the SBITS3

1 Timothy 5 in the SBITS4

1 Timothy 5 in the SBIUS

1 Timothy 5 in the SBIVS

1 Timothy 5 in the SBT

1 Timothy 5 in the SBT1E

1 Timothy 5 in the SCHL

1 Timothy 5 in the SNT

1 Timothy 5 in the SUSU

1 Timothy 5 in the SUSU2

1 Timothy 5 in the SYNO

1 Timothy 5 in the TBIAOTANT

1 Timothy 5 in the TBT1E

1 Timothy 5 in the TBT1E2

1 Timothy 5 in the TFTIP

1 Timothy 5 in the TFTU

1 Timothy 5 in the TGNTATF3T

1 Timothy 5 in the THAI

1 Timothy 5 in the TNFD

1 Timothy 5 in the TNT

1 Timothy 5 in the TNTIK

1 Timothy 5 in the TNTIL

1 Timothy 5 in the TNTIN

1 Timothy 5 in the TNTIP

1 Timothy 5 in the TNTIZ

1 Timothy 5 in the TOMA

1 Timothy 5 in the TTENT

1 Timothy 5 in the UBG

1 Timothy 5 in the UGV

1 Timothy 5 in the UGV2

1 Timothy 5 in the UGV3

1 Timothy 5 in the VBL

1 Timothy 5 in the VDCC

1 Timothy 5 in the YALU

1 Timothy 5 in the YAPE

1 Timothy 5 in the YBVTP

1 Timothy 5 in the ZBP