2 Samuel 16 (BOICB)

1 Mgbe Devid gafechara elu ugwu ahụ na-agbada nʼakụkụ nke ọzọ ya, Ziba, onye na-elekọta akụ Mefiboshet, guzo na-eche ya. Ọ chị ịnyịnya ibu bu narị ogbe achịcha abụọ, na otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị ụyọkọ mkpụrụ osisi ndị ọzọ, na karama akpụkpọ buru ibu mmanya juru nʼime ya. 2 Eze jụrụ Ziba sị, “Gịnị mere i ji bute ihe ndị a?”Ziba zara sị, “Ịnyịnya ibu ndị a bụ nke ndị ụlọeze ga-anọkwasị. Achịcha na mkpụrụ osisi ndị a bụ nke ndị ikom gị ga-eri. Mmanya a bụ nke ndị na-ada mba nʼọzara ga-aṅụ.” 3 Eze jụrụ ya sị, “Ebeekwanụ ka nwa nna gị ukwu nọ?”Ziba zara ya sị, “Ọ nọ na Jerusalem nʼihi na ọ sịrị, ‘Taa ụlọ Izrel ga-enyeghachi m alaeze nna nna m.’ ” 4 Eze gwara Ziba sị ya, “Nʼihi ya, enyela m gị ihe niile Mefiboshet nwere, ha ga-abụkwa nke gị.”Ziba sịrị, “Ka m hụta amara nʼihu eze, bụ onyenwe m.” 5 Dịka eze bụ Devid na-abịaru obodo Bahurim, lee, otu nwoke sitere nʼagbụrụ ụlọ Sọl sitere nʼebe ahụ pụta. Ọ bụ Shimei nwa Gera. Ọ na-akọcha mgbe ọ na-apụta ya. 6 Ọ chịịrị nkume na-atụ Devid na ndị ozi eze niile. Ọ bụ ezie na ndị agha Izrel na ndị na-eche Devid nche gbara ya gburugburu nʼaka nri na aka ekpe. 7 Ma dịka Shimei na-akọcha, ọ sịrị, “Si nʼebe a pụọ, si nʼebe a pụọ, gị ogbu mmadụ, gị onye ọjọọ! 8 ONYENWE ANYỊ akwụghachila gị ụgwọ ọbara niile ị wụsiri nʼezinaụlọ Sọl, onye ị nọchiri ọnọdụ ya dịka eze. ONYENWE ANYỊ anapụla gị alaeze ahụ, were ya nye Absalọm nwa gị! Ugbu a, ihe i metara abịala gị ụgwọ, gị ogbu mmadụ.” 9 Abishai, nwa Zeruaya gwara eze okwu sị, “Nʼihi gịnị ka nkịta a nwụrụ anwụ ga-eji na-akọcha onyenwe m bụ eze? Biko, ka m gafee gaa bipụ ya isi.” 10 Ma eze zara sị, “Gịnị jikọrọ mụ na unu, unu ụmụ ndị ikom Zeruaya. Ọ bụrụ na ọ na-akọcha m nʼihi na ONYENWE ANYỊ sị ya ‘Kọchaa Devid,’ onye pụrụ ịjụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ị ji na-eme ihe dị otu a?’ ” 11 Mgbe ahụ, Devid gwara Abishai na ndị ozi ya okwu sị, “Nwa m nwoke, onye si nʼahụ m na-agbalị ịnapụ m ndụ m. Gịnị ga-eme ka onye Benjamin a ghara ime karịa? Hapụ ya, ya kọchaa, nʼihi na ONYENWE ANYỊ agwala ya ka ọ kọchaa m. 12 Ma eleghị anya, ONYENWE ANYỊ ga-ahụ ọnọdụ ahụhụ m, nyeghachikwa m ngọzị nʼọnọdụ nkọcha ndị a.” 13 Ya mere, Devid na ndị ya gakwara nʼihu ije ha nʼụzọ ahụ ma Shimei sokwara ha na-aga nʼakụkụ ugwu ahụ na-akọcha ha. Ọ nọgidekwara na-atụ Devid nkume, na-ekpolikwa aja elu ka ọ na-awụsa ha nʼahụ. 14 Ya mere, eze na ndị niile so ya gagidere bịaruo nʼakụkụ Jọdan nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ. Nʼihi ya, ha nọdụrụ nʼebe ahụ zuo ike. 15 Ma Absalọm na ndị Izrel abatalarị Jerusalem. Ahitofel sokwa ya. 16 Mgbe Hushaị, enyi Devid, onye Akai bịaruru, ọ gara hụ Absalọm sị ya, “Ka eze dị ogologo ndụ, ka eze dị ndụ.” 17 Absalọm sịrị Hushaị, “Ọ bụ otu a ka i si egosi ịhụnanya i nwere na-ebe enyi gị nọ? Gịnị mere i soghị ya?” 18 Hushaị zara Absalọm sị, “Mba! Onye ahụ ONYENWE ANYỊ na ọha mmadụ na ndị Izrel niile họpụtara, nke onye ahụ ka m ga-abụ. Ọ bụkwa onye ahụ ka m ga-adịnyere. 19 Ma onye kwanụ ka m kwesiri ijere ozi? Ọ bụghị nwa eze? Ejeere m nna gị ozi, ugbu a anọkwa m jikere ijere gị ozi!” 20 Absalọm tụgharịrị gwa Ahitofel okwu sị, “Gịnị ọzọ ka m ga-eme? Nye anyị ndụmọdụ gị. Gịnị ka anyị kwesiri ime?” 21 Ahitofel zara, “Ga dinaa ndị iko nwanyị nna gị ndị ahụ ọ hapụrụ ka ha lekọtaa ụlọ. Mgbe ahụ, Izrel niile ga-anụ na ị meela onwe gị ihe na-asọ oyi nʼebe nna gị nọ, aka ndị niile nọnyere gị ga-akwụkwa chịm.” 22 Ya mere, ha manyeere Absalọm ụlọ ikwu nʼelu ụlọ; ọ kpọkwaara ndị iko nwanyị nna ya dinaa ha nʼotu nʼotu, nʼihu ndị Izrel niile. 23 Nʼoge ahụ, ndụmọdụ ọbụla Ahitofel dụrụ dị ka a ga-asị na ọ bụ ozi si nʼọnụ Chineke nʼonwe ya bịa. Ọ bụladị nʼebe Devid nọ, na nʼebe Absalọm nọkwa, otu a ka esi bulie ndụmọdụ ọbụla Ahitofel nyere elu.

In Other Versions

2 Samuel 16 in the ANGEFD

2 Samuel 16 in the ANTPNG2D

2 Samuel 16 in the AS21

2 Samuel 16 in the BAGH

2 Samuel 16 in the BBPNG

2 Samuel 16 in the BBT1E

2 Samuel 16 in the BDS

2 Samuel 16 in the BEV

2 Samuel 16 in the BHAD

2 Samuel 16 in the BIB

2 Samuel 16 in the BLPT

2 Samuel 16 in the BNT

2 Samuel 16 in the BNTABOOT

2 Samuel 16 in the BNTLV

2 Samuel 16 in the BOATCB

2 Samuel 16 in the BOATCB2

2 Samuel 16 in the BOBCV

2 Samuel 16 in the BOCNT

2 Samuel 16 in the BOECS

2 Samuel 16 in the BOGWICC

2 Samuel 16 in the BOHCB

2 Samuel 16 in the BOHCV

2 Samuel 16 in the BOHLNT

2 Samuel 16 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 16 in the BOILNTAP

2 Samuel 16 in the BOITCV

2 Samuel 16 in the BOKCV

2 Samuel 16 in the BOKCV2

2 Samuel 16 in the BOKHWOG

2 Samuel 16 in the BOKSSV

2 Samuel 16 in the BOLCB

2 Samuel 16 in the BOLCB2

2 Samuel 16 in the BOMCV

2 Samuel 16 in the BONAV

2 Samuel 16 in the BONCB

2 Samuel 16 in the BONLT

2 Samuel 16 in the BONUT2

2 Samuel 16 in the BOPLNT

2 Samuel 16 in the BOSCB

2 Samuel 16 in the BOSNC

2 Samuel 16 in the BOTLNT

2 Samuel 16 in the BOVCB

2 Samuel 16 in the BOYCB

2 Samuel 16 in the BPBB

2 Samuel 16 in the BPH

2 Samuel 16 in the BSB

2 Samuel 16 in the CCB

2 Samuel 16 in the CUV

2 Samuel 16 in the CUVS

2 Samuel 16 in the DBT

2 Samuel 16 in the DGDNT

2 Samuel 16 in the DHNT

2 Samuel 16 in the DNT

2 Samuel 16 in the ELBE

2 Samuel 16 in the EMTV

2 Samuel 16 in the ESV

2 Samuel 16 in the FBV

2 Samuel 16 in the FEB

2 Samuel 16 in the GGMNT

2 Samuel 16 in the GNT

2 Samuel 16 in the HARY

2 Samuel 16 in the HNT

2 Samuel 16 in the IRVA

2 Samuel 16 in the IRVB

2 Samuel 16 in the IRVG

2 Samuel 16 in the IRVH

2 Samuel 16 in the IRVK

2 Samuel 16 in the IRVM

2 Samuel 16 in the IRVM2

2 Samuel 16 in the IRVO

2 Samuel 16 in the IRVP

2 Samuel 16 in the IRVT

2 Samuel 16 in the IRVT2

2 Samuel 16 in the IRVU

2 Samuel 16 in the ISVN

2 Samuel 16 in the JSNT

2 Samuel 16 in the KAPI

2 Samuel 16 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 16 in the KBV

2 Samuel 16 in the KJV

2 Samuel 16 in the KNFD

2 Samuel 16 in the LBA

2 Samuel 16 in the LBLA

2 Samuel 16 in the LNT

2 Samuel 16 in the LSV

2 Samuel 16 in the MAAL

2 Samuel 16 in the MBV

2 Samuel 16 in the MBV2

2 Samuel 16 in the MHNT

2 Samuel 16 in the MKNFD

2 Samuel 16 in the MNG

2 Samuel 16 in the MNT

2 Samuel 16 in the MNT2

2 Samuel 16 in the MRS1T

2 Samuel 16 in the NAA

2 Samuel 16 in the NASB

2 Samuel 16 in the NBLA

2 Samuel 16 in the NBS

2 Samuel 16 in the NBVTP

2 Samuel 16 in the NET2

2 Samuel 16 in the NIV11

2 Samuel 16 in the NNT

2 Samuel 16 in the NNT2

2 Samuel 16 in the NNT3

2 Samuel 16 in the PDDPT

2 Samuel 16 in the PFNT

2 Samuel 16 in the RMNT

2 Samuel 16 in the SBIAS

2 Samuel 16 in the SBIBS

2 Samuel 16 in the SBIBS2

2 Samuel 16 in the SBICS

2 Samuel 16 in the SBIDS

2 Samuel 16 in the SBIGS

2 Samuel 16 in the SBIHS

2 Samuel 16 in the SBIIS

2 Samuel 16 in the SBIIS2

2 Samuel 16 in the SBIIS3

2 Samuel 16 in the SBIKS

2 Samuel 16 in the SBIKS2

2 Samuel 16 in the SBIMS

2 Samuel 16 in the SBIOS

2 Samuel 16 in the SBIPS

2 Samuel 16 in the SBISS

2 Samuel 16 in the SBITS

2 Samuel 16 in the SBITS2

2 Samuel 16 in the SBITS3

2 Samuel 16 in the SBITS4

2 Samuel 16 in the SBIUS

2 Samuel 16 in the SBIVS

2 Samuel 16 in the SBT

2 Samuel 16 in the SBT1E

2 Samuel 16 in the SCHL

2 Samuel 16 in the SNT

2 Samuel 16 in the SUSU

2 Samuel 16 in the SUSU2

2 Samuel 16 in the SYNO

2 Samuel 16 in the TBIAOTANT

2 Samuel 16 in the TBT1E

2 Samuel 16 in the TBT1E2

2 Samuel 16 in the TFTIP

2 Samuel 16 in the TFTU

2 Samuel 16 in the TGNTATF3T

2 Samuel 16 in the THAI

2 Samuel 16 in the TNFD

2 Samuel 16 in the TNT

2 Samuel 16 in the TNTIK

2 Samuel 16 in the TNTIL

2 Samuel 16 in the TNTIN

2 Samuel 16 in the TNTIP

2 Samuel 16 in the TNTIZ

2 Samuel 16 in the TOMA

2 Samuel 16 in the TTENT

2 Samuel 16 in the UBG

2 Samuel 16 in the UGV

2 Samuel 16 in the UGV2

2 Samuel 16 in the UGV3

2 Samuel 16 in the VBL

2 Samuel 16 in the VDCC

2 Samuel 16 in the YALU

2 Samuel 16 in the YAPE

2 Samuel 16 in the YBVTP

2 Samuel 16 in the ZBP