Acts 16 (BOICB)

1 Pọl bịaruru Debi na Listra, ebe otu onye na-eso ụzọ Jisọs a na-akpọ Timoti bi. Nne ya bụ onye Juu bụrụkwa onye kwere ekwe, ma nna ya bụ onye Griik. 2 Ụmụnna ndị bi na Listra na Aikoniọm gbara ezi ama banyere ya. 3 Pọl chọrọ ka Timoti soro ya nʼije ya. Ma nʼihi ndị Juu bi nʼakụkụ ebe ahụ, o biri ya ugwu nʼihi na mmadụ niile maara na nna ya bụ onye Griik. 4 Dịka ha na-eme njem site nʼobodo ruo nʼobodo, ha na-akọwara ha ihe banyere mkpebi ndị ozi na ndị okenye kpebiri na Jerusalem ka ha nwe ike idebe ha. 5 Ihe ndị a niile mere ka nzukọ sie ike nʼokwukwe ma baakwa ụba nʼọnụọgụgụ kwa ụbọchị. 6 Ha gara mpaghara Frigia na Galeshịa. Ma Mmụọ Nsọ ekweghị ka ha kwusaa oziọma nʼakụkụ Eshịa nʼoge ahụ. 7 Mgbe ha ruru nʼakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nʼakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ nke Jisọs akwagideghị ka ha gaa. 8 Ka ha si nʼakụkụ Misia gafee, ha batara Troas. 9 Nʼabalị ahụ, Pọl hụrụ ọhụ ebe ọ hụrụ otu nwoke onye Masidonia ka o guzo na-arịọ ya sị, “Bịa na Masidonia nyere anyị aka.” 10 Mgbe ọ hụchara nke a, anyị jikeere ngwangwa ịga Masidonia ebe anyị mara na Chineke akpọọla anyị ịgbasara ha oziọma. 11 Anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas sị ya gafee Samotres. Nʼechi ya, anyị bịaruru Niapolis. 12 Site nʼebe ahụ anyị jeruru Filipai nke bụ isi obodo dị nʼakụkụ mpaghara Masidonia bụrụkwa otu akụkụ nʼebe ndị Rom na-achị. Anyị nọdụrụ nʼime obodo a ọtụtụ ụbọchị. 13 Nʼụbọchị izuike, anyị sitere nʼobodo ahụ gaa nʼakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụlọ ekpere dị. Nʼebe a ka anyị nọ gwa ụmụ nwanyị ndị gbakọrọnụ okwu. 14 Aha otu nʼime ndị inyom nụrụ okwu anyị bụ Lidia, onye obodo Tiatira, onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Onyenwe anyị meghere obi ya, ige ntị nʼihe Pọl na-ekwu. 15 Ka e mesịrị ya na ezinaụlọ ya baptizim, ọ rịọrọ anyị na-asị, “Ọ bụrụ nʼezie na unu gụrụ m dịka onye kwesiri ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, batanụ nʼụlọ m nọrọ.” Mgbe ọ kwagidesịrị anyị ike, anyị sooro ya. 16 Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga nʼụlọ ekpere, anyị zutere otu nwaagbọghọ bụ ohu, onye nwere mmụọ ịgba afa. Ọ na-ewetara ndị nwe ya ezigbo ego site nʼịgba afa. 17 Ma o sogidere anyị na Pọl ebe ọbụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-asị, “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ha bịara ikwupụtara unu ihe banyere ụzọ nzọpụta.” 18 O mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nʼoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nʼime ya pụta!” Otu mgbe ahụ o siri nʼime ya pụta. 19 Mgbe ndị nwe ya hụrụ nʼolileanya ha iji inweta ego akwụsịla, ha jidere Pọl na Saịlas dọkpụrụ ha jekwuru ndịisi obodo nʼọma ahịa. 20 Mgbe ha dutara ha nʼihu ndị na-ekpe ikpe ha sịrị, “Ndị ikom a bụ ndị Juu ma ha etinyela ọgbaaghara nʼobodo anyị, 21 site nʼikuzi omenaala megidere iwu anyị, nke anyị bụ ndị Rom na-enweghị ike ịnabata maọbụ mee.” 22 Igwe mmadụ sonyere imegide ha. Ndị ikpe nyere iwu ka a dọwaa uwe, pịakwa ha ihe. 23 Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma. 24 Nʼihi nke a, o tinyere ha nʼime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri ọtọsị kegide ha nʼụkwụ. 25 Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị. 26 Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara. 27 Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya. 28 Ma Pọl tiri mkpu nʼoke olu, sị, “Emerula onwe gị ahụ. Anyị niile nọ nʼebe a!” 29 Onyeisi nche ahụ kpọrọ ka eweta ọkụ, ọ gbabara nʼime, daa nʼụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji. 30 Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?” 31 Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.” 32 Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị. 33 Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim. 34 Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke. 35 Nʼechi ya, ndị ikpe ahụ zitere ndị uweojii sị, “Hapụnụ ụmụ nwoke ahụ ka ha laa.” 36 Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl, sị, “na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ugbu a pụtanụ. Unu laanụ nʼudo.” 37 Ma Pọl sịrị ha, “Ha tiri anyị ihe nʼihu mmadụ niile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nʼụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nʼobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesiri ka ha bịa nʼonwe ha kpọpụta anyị.” 38 Ndị uweojii ahụ gara gwa ndị ikpe ahụ ihe ha kwuru. Mgbe ha nụrụ na ha bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu. 39 Ha bịakwutere ha rịọsie ha arịrịọ ike. Ha kpọpụtakwara ha, rịọ ha ka ha hapụ obodo ahụ. 40 Mgbe ha sitere nʼụlọ mkpọrọ pụta, ha gara nʼụlọ Lidia. Nʼebe ahụ ka ha zutere ụmụnna, gwa ha okwu mgbamume, emesịa ha si nʼobodo ahụ pụọ.

In Other Versions

Acts 16 in the ANGEFD

Acts 16 in the ANTPNG2D

Acts 16 in the AS21

Acts 16 in the BAGH

Acts 16 in the BBPNG

Acts 16 in the BBT1E

Acts 16 in the BDS

Acts 16 in the BEV

Acts 16 in the BHAD

Acts 16 in the BIB

Acts 16 in the BLPT

Acts 16 in the BNT

Acts 16 in the BNTABOOT

Acts 16 in the BNTLV

Acts 16 in the BOATCB

Acts 16 in the BOATCB2

Acts 16 in the BOBCV

Acts 16 in the BOCNT

Acts 16 in the BOECS

Acts 16 in the BOGWICC

Acts 16 in the BOHCB

Acts 16 in the BOHCV

Acts 16 in the BOHLNT

Acts 16 in the BOHNTLTAL

Acts 16 in the BOILNTAP

Acts 16 in the BOITCV

Acts 16 in the BOKCV

Acts 16 in the BOKCV2

Acts 16 in the BOKHWOG

Acts 16 in the BOKSSV

Acts 16 in the BOLCB

Acts 16 in the BOLCB2

Acts 16 in the BOMCV

Acts 16 in the BONAV

Acts 16 in the BONCB

Acts 16 in the BONLT

Acts 16 in the BONUT2

Acts 16 in the BOPLNT

Acts 16 in the BOSCB

Acts 16 in the BOSNC

Acts 16 in the BOTLNT

Acts 16 in the BOVCB

Acts 16 in the BOYCB

Acts 16 in the BPBB

Acts 16 in the BPH

Acts 16 in the BSB

Acts 16 in the CCB

Acts 16 in the CUV

Acts 16 in the CUVS

Acts 16 in the DBT

Acts 16 in the DGDNT

Acts 16 in the DHNT

Acts 16 in the DNT

Acts 16 in the ELBE

Acts 16 in the EMTV

Acts 16 in the ESV

Acts 16 in the FBV

Acts 16 in the FEB

Acts 16 in the GGMNT

Acts 16 in the GNT

Acts 16 in the HARY

Acts 16 in the HNT

Acts 16 in the IRVA

Acts 16 in the IRVB

Acts 16 in the IRVG

Acts 16 in the IRVH

Acts 16 in the IRVK

Acts 16 in the IRVM

Acts 16 in the IRVM2

Acts 16 in the IRVO

Acts 16 in the IRVP

Acts 16 in the IRVT

Acts 16 in the IRVT2

Acts 16 in the IRVU

Acts 16 in the ISVN

Acts 16 in the JSNT

Acts 16 in the KAPI

Acts 16 in the KBT1ETNIK

Acts 16 in the KBV

Acts 16 in the KJV

Acts 16 in the KNFD

Acts 16 in the LBA

Acts 16 in the LBLA

Acts 16 in the LNT

Acts 16 in the LSV

Acts 16 in the MAAL

Acts 16 in the MBV

Acts 16 in the MBV2

Acts 16 in the MHNT

Acts 16 in the MKNFD

Acts 16 in the MNG

Acts 16 in the MNT

Acts 16 in the MNT2

Acts 16 in the MRS1T

Acts 16 in the NAA

Acts 16 in the NASB

Acts 16 in the NBLA

Acts 16 in the NBS

Acts 16 in the NBVTP

Acts 16 in the NET2

Acts 16 in the NIV11

Acts 16 in the NNT

Acts 16 in the NNT2

Acts 16 in the NNT3

Acts 16 in the PDDPT

Acts 16 in the PFNT

Acts 16 in the RMNT

Acts 16 in the SBIAS

Acts 16 in the SBIBS

Acts 16 in the SBIBS2

Acts 16 in the SBICS

Acts 16 in the SBIDS

Acts 16 in the SBIGS

Acts 16 in the SBIHS

Acts 16 in the SBIIS

Acts 16 in the SBIIS2

Acts 16 in the SBIIS3

Acts 16 in the SBIKS

Acts 16 in the SBIKS2

Acts 16 in the SBIMS

Acts 16 in the SBIOS

Acts 16 in the SBIPS

Acts 16 in the SBISS

Acts 16 in the SBITS

Acts 16 in the SBITS2

Acts 16 in the SBITS3

Acts 16 in the SBITS4

Acts 16 in the SBIUS

Acts 16 in the SBIVS

Acts 16 in the SBT

Acts 16 in the SBT1E

Acts 16 in the SCHL

Acts 16 in the SNT

Acts 16 in the SUSU

Acts 16 in the SUSU2

Acts 16 in the SYNO

Acts 16 in the TBIAOTANT

Acts 16 in the TBT1E

Acts 16 in the TBT1E2

Acts 16 in the TFTIP

Acts 16 in the TFTU

Acts 16 in the TGNTATF3T

Acts 16 in the THAI

Acts 16 in the TNFD

Acts 16 in the TNT

Acts 16 in the TNTIK

Acts 16 in the TNTIL

Acts 16 in the TNTIN

Acts 16 in the TNTIP

Acts 16 in the TNTIZ

Acts 16 in the TOMA

Acts 16 in the TTENT

Acts 16 in the UBG

Acts 16 in the UGV

Acts 16 in the UGV2

Acts 16 in the UGV3

Acts 16 in the VBL

Acts 16 in the VDCC

Acts 16 in the YALU

Acts 16 in the YAPE

Acts 16 in the YBVTP

Acts 16 in the ZBP