Colossians 2 (BOICB)
1 Ọ bụ ọchịchọ m ka unu ghọta otu m si na-agbasi mgba ike nke ukwuu nʼihi unu, na nʼihi ndị nọ nʼobodo Laodisia, na ndị niile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu. 2 Ebumnobi m bụ ka a gbaa ha ume, jikọọkwa ha nʼotu nʼịhụnanya, ka ha nweta ụba niile nke nghọta zuruoke na amamihe nke ihe omimi Chineke ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya. 3 Ọ bụkwa nʼime ya ka ụlọakụ ihe zoro ezo niile nke amamihe na ihe ọmụma dị. 4 Ana m ekwu nke a ka onye ọbụla ghara iji ire ụtọ duhie unu ụzọ. 5 Ọ bụ ezie na anọghị m nʼetiti unu nʼanụ ahụ, ma anọ m nʼetiti unu nʼime mmụọ. Ana m aṅụrị ọṅụ ịhụ mkpebi unu na iguzosi ike nʼokwukwe unu nʼime Kraịst. 6 Ya mere, dị ka unu si nabata Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, na-ebinụ ndụ unu nʼime ya. 7 Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nʼime ya, ndị a na-ewuli elu nʼime ya, ndị dị ike nʼime okwukwe, dị ka e si kuziere unu, ndị jupụtara na-inye ekele. 8 Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iji ozizi na amamihe efu niile nke na-achị ụwa, na aghụghọ duhie unu nʼokwukwe. Okwu amamihe ahụ nke ihe ozizi ya na ọsịsa ya niile dabeere na mmụọ nke ụwa na ntụpụta mmadụ kama ịdabere nʼihe Kraịst kwuru. 9 Nʼihi na nʼime Kraịst ka izuoke niile nke Chineke bi nʼụdịdị mmadụ. 10 Ya mere, unu nwere ihe niile nʼime ya, onye bụ isi ndị niile na-achị achị, onye bụkwa isi nʼebe ike na ịchị isi niile dị. 11 Nʼime ya, e biri unu ugwu nke ejighị aka bie, site nʼiwepụ ọdịdị anụ ahụ nʼobibi ugwu nke Kraịst biri. 12 Mgbe e likọtara unu na ya na baptizim, e sitere nʼọnwụ kpọlite unu na ya site nʼokwukwe ahụ dị nʼike Chineke onye sitere nʼọnwụ kpọlite ya. 13 Mgbe unu bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime mmehie unu, na nʼime ebighị ugwu nke anụ ahụ mmehie unu, Chineke mere ka unu soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ. Ọ gbaghara anyị mmehie anyị niile, 14 kagbuo iwu niile e dere ede, ya na usoro ya niile nke guzoro imegide anyị. O wezugara ha, kpọgide ha nʼobe. 15 Mgbe ọ napụrụ ike niile, na ịchị isi niile, ngwa agha ha niile, ọ gbara ha ọtọ nʼihu ọha, igosi mmeri o meriri ha nʼobe. 16 Nʼihi ya, unu ekwela ka onye ọbụla kpee unu ikpe banyere ihe ọbụla unu na-eri, maọbụ ihe unu na-aṅụ, maọbụ ihe banyere ido ụbọchị nsọ, maọbụ ime mmemme ọnwa ọhụrụ maọbụ mmemme ụbọchị izuike. 17 Ihe ndị a niile bụ onyinyo nke ihe ga-abịa nʼọdịnihu ma nke pụtara ihe dị nʼime Kraịst. 18 Unu ekwela ka onye ọbụla nke ọ na-amasị ife ndị mmụọ ozi maọbụ ibi ndụ umeala nke aghụghọ dị nʼime ya, onye na-ekwu ọtụtụ okwu banyere ọhụ ọ hụrụ, si otu a na-afụli onwe ya elu nʼefu nʼihi echiche nke onwe ya, maa unu ikpe ma napụ unu ihe nrite unu. 19 Onye na-adịghị ejidesikwa onye bụ isi aka ike, onye a na-esite nʼaka ya na-eme ka ahụ niile, nke nkwonkwo ha na akwara ha niile na-ejikọta nʼotu, too eto dị ka Chineke si chọọ ka ha too. 20 Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche? 21 “Ejidela nke a aka, edetụla nke a ire, ebitụkwala nke a aka”? 22 Iwu ndị a niile na-ekwu banyere ihe ndị ga-ala nʼiyi mgbe a na-etinye ha nʼọrụ, ha sitere nʼiwu na ozizi nke mmadụ. 23 Nʼezie, iwu ndị a yiri ihe e ji amamihe guzobe, nʼihi ụzọ o si akwali mmụọ mmadụ nʼife ofufe dị ka ọ chọrọ, na iweda onwe nʼala, na ịta anụ ahụ ahụhụ. Ma ha abaghị uru o bụla iji ha gbochie agụụ ọjọọ nke anụ ahụ.
In Other Versions
Colossians 2 in the ANGEFD
Colossians 2 in the ANTPNG2D
Colossians 2 in the AS21
Colossians 2 in the BAGH
Colossians 2 in the BBPNG
Colossians 2 in the BBT1E
Colossians 2 in the BDS
Colossians 2 in the BEV
Colossians 2 in the BHAD
Colossians 2 in the BIB
Colossians 2 in the BLPT
Colossians 2 in the BNT
Colossians 2 in the BNTABOOT
Colossians 2 in the BNTLV
Colossians 2 in the BOATCB
Colossians 2 in the BOATCB2
Colossians 2 in the BOBCV
Colossians 2 in the BOCNT
Colossians 2 in the BOECS
Colossians 2 in the BOGWICC
Colossians 2 in the BOHCB
Colossians 2 in the BOHCV
Colossians 2 in the BOHLNT
Colossians 2 in the BOHNTLTAL
Colossians 2 in the BOILNTAP
Colossians 2 in the BOITCV
Colossians 2 in the BOKCV
Colossians 2 in the BOKCV2
Colossians 2 in the BOKHWOG
Colossians 2 in the BOKSSV
Colossians 2 in the BOLCB
Colossians 2 in the BOLCB2
Colossians 2 in the BOMCV
Colossians 2 in the BONAV
Colossians 2 in the BONCB
Colossians 2 in the BONLT
Colossians 2 in the BONUT2
Colossians 2 in the BOPLNT
Colossians 2 in the BOSCB
Colossians 2 in the BOSNC
Colossians 2 in the BOTLNT
Colossians 2 in the BOVCB
Colossians 2 in the BOYCB
Colossians 2 in the BPBB
Colossians 2 in the BPH
Colossians 2 in the BSB
Colossians 2 in the CCB
Colossians 2 in the CUV
Colossians 2 in the CUVS
Colossians 2 in the DBT
Colossians 2 in the DGDNT
Colossians 2 in the DHNT
Colossians 2 in the DNT
Colossians 2 in the ELBE
Colossians 2 in the EMTV
Colossians 2 in the ESV
Colossians 2 in the FBV
Colossians 2 in the FEB
Colossians 2 in the GGMNT
Colossians 2 in the GNT
Colossians 2 in the HARY
Colossians 2 in the HNT
Colossians 2 in the IRVA
Colossians 2 in the IRVB
Colossians 2 in the IRVG
Colossians 2 in the IRVH
Colossians 2 in the IRVK
Colossians 2 in the IRVM
Colossians 2 in the IRVM2
Colossians 2 in the IRVO
Colossians 2 in the IRVP
Colossians 2 in the IRVT
Colossians 2 in the IRVT2
Colossians 2 in the IRVU
Colossians 2 in the ISVN
Colossians 2 in the JSNT
Colossians 2 in the KAPI
Colossians 2 in the KBT1ETNIK
Colossians 2 in the KBV
Colossians 2 in the KJV
Colossians 2 in the KNFD
Colossians 2 in the LBA
Colossians 2 in the LBLA
Colossians 2 in the LNT
Colossians 2 in the LSV
Colossians 2 in the MAAL
Colossians 2 in the MBV
Colossians 2 in the MBV2
Colossians 2 in the MHNT
Colossians 2 in the MKNFD
Colossians 2 in the MNG
Colossians 2 in the MNT
Colossians 2 in the MNT2
Colossians 2 in the MRS1T
Colossians 2 in the NAA
Colossians 2 in the NASB
Colossians 2 in the NBLA
Colossians 2 in the NBS
Colossians 2 in the NBVTP
Colossians 2 in the NET2
Colossians 2 in the NIV11
Colossians 2 in the NNT
Colossians 2 in the NNT2
Colossians 2 in the NNT3
Colossians 2 in the PDDPT
Colossians 2 in the PFNT
Colossians 2 in the RMNT
Colossians 2 in the SBIAS
Colossians 2 in the SBIBS
Colossians 2 in the SBIBS2
Colossians 2 in the SBICS
Colossians 2 in the SBIDS
Colossians 2 in the SBIGS
Colossians 2 in the SBIHS
Colossians 2 in the SBIIS
Colossians 2 in the SBIIS2
Colossians 2 in the SBIIS3
Colossians 2 in the SBIKS
Colossians 2 in the SBIKS2
Colossians 2 in the SBIMS
Colossians 2 in the SBIOS
Colossians 2 in the SBIPS
Colossians 2 in the SBISS
Colossians 2 in the SBITS
Colossians 2 in the SBITS2
Colossians 2 in the SBITS3
Colossians 2 in the SBITS4
Colossians 2 in the SBIUS
Colossians 2 in the SBIVS
Colossians 2 in the SBT
Colossians 2 in the SBT1E
Colossians 2 in the SCHL
Colossians 2 in the SNT
Colossians 2 in the SUSU
Colossians 2 in the SUSU2
Colossians 2 in the SYNO
Colossians 2 in the TBIAOTANT
Colossians 2 in the TBT1E
Colossians 2 in the TBT1E2
Colossians 2 in the TFTIP
Colossians 2 in the TFTU
Colossians 2 in the TGNTATF3T
Colossians 2 in the THAI
Colossians 2 in the TNFD
Colossians 2 in the TNT
Colossians 2 in the TNTIK
Colossians 2 in the TNTIL
Colossians 2 in the TNTIN
Colossians 2 in the TNTIP
Colossians 2 in the TNTIZ
Colossians 2 in the TOMA
Colossians 2 in the TTENT
Colossians 2 in the UBG
Colossians 2 in the UGV
Colossians 2 in the UGV2
Colossians 2 in the UGV3
Colossians 2 in the VBL
Colossians 2 in the VDCC
Colossians 2 in the YALU
Colossians 2 in the YAPE
Colossians 2 in the YBVTP
Colossians 2 in the ZBP