Deuteronomy 11 (BOICB)

1 Hụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị nʼanya, na-edebezukwa ikpe ya na ụkpụrụ ya na ihe niile o nyere nʼiwu. 2 Chetanụ taa na ọ bụghị ụmụ unu, kama ọ bụ unu onwe unu jiri anya unu hụ ịdọ aka na ntị ONYENWE ANYỊ Chineke unu. Ọ bụ unu hụrụ ịdị ukwuu ya, ịdị ike ya, ịrụsị ọrụ ike nke ike ya, 3 ihe ịrịbama ya niile na ihe niile o mere nʼIjipt, otu o si megide Fero eze Ijipt na ndị ala Ijipt niile. 4 Unu hụrụ ihe o mere ndị agha Ijipt na ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha. Otu o si mee ka ha laa nʼiyi nʼime Osimiri Uhie, mgbe ha na-achụ unu ọsọ, na otu ONYENWE ANYỊ si wetara ha ịla nʼiyi ebighị ebi. 5 Ọ bụghị ụmụ unu hụrụ ihe o meere unu nʼoge ahụ niile unu nọ nʼọzara tutu unu erute nʼebe a, 6 na ihe o mere Datan na Abiram, ụmụ Eliab, ndị si nʼebo Ruben, otu ala si meghee ọnụ ya loda ha, ha na ezinaụlọ ha, ụlọ ikwu ha na ihe ọbụla nke dị ndụ ha nwere nʼetiti Izrel niile. 7 Ma ọ bụ anya unu hụrụ oke ihe ịtụnanya ndị a niile ONYENWE ANYỊ mere. 8 Lezienụ anya debe iwu ndị a m na-enye unu taa, ka unu nwee ike, baa bichikwaa ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta, 9 ka unu bie ogologo ndụ nʼime ala ahụ ONYENWE ANYỊ ṅụrụ nʼiyi inye nna nna unu ha, na ụmụ ụmụ ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. 10 Nʼihi na ala a unu na-aga ịbanye nʼime ya inweta adịghị ka ala Ijipt, ebe unu si pụta, ebe ị na-agha mkpụrụ gị, were ụkwụ tụwara mmiri ụzọ, dịka a na-eme nʼubi akwụkwọ nri. 11 Ma ala unu na-agafe Jọdan inweta bụ ala nwere ugwu na ndagwurugwu, nke na-aṅụ mmiri ozuzo si nʼeluigwe. 12 Ọ bụ ala nke ONYENWE ANYỊ Chineke unu nʼonwe ya na-elekọta! Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, sitekwa na mbido afọ ruo nʼọgwụgwụ afọ, anya ya adịghị apụ na ya. 13 Ya mere, ọ bụrụ na unu ga-eji ntụkwasị obi rube isi nʼiwu ya niile, nke m na-enye unu taa, ọ bụrụkwa na unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile hụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu nʼanya, ọ bụrụkwa na unu ga-efe ya ofufe, 14 ọ ga na-ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ, nke ga-eme ka ọka unu mịa mkpụrụ hiri nne, ka unu nwee ọtụtụ vaịnị, nweekwa mmanụ oliv. 15 Ọ ga-eme ka anụ ụlọ gị nwee ahịhịa ha ga-ata, gị onwe gị ga-enwekwa ihe oriri dị ukwuu. Afọ ga-ejukwa gị nʼihe i nwere. 16 Ma lezienụ anya, ka ahapụ ịrafu obi unu mee ka unu wezuga onwe unu, bido ife chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha. 17 Mgbe ahụ, iwe ONYENWE ANYỊ ga-adị ọkụ nʼebe unu nọ, ọ ga-agbachi eluigwe, mmiri agaghị ezo, ala agaghị epupụtakwa ihe ubi, unu ga-alakwa nʼiyi nʼotu ntabi anya, nʼezi ala ahụ ONYENWE ANYỊ na-enye unu. 18 Meenụ ka okwu m ndị a dịgide nʼobi unu na nʼime mmụọ unu. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu. 19 Kuzierenụ ha ụmụ unu, na-ekwu ihe banyere ha mgbe ị na-anọdụ nʼụlọ gị, na mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie. 20 Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị. 21 Ka ụbọchị ndụ unu na nke ụmụ unu dị ogologo nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya, nke ONYENWE ANYỊ kwere nna unu na nkwa. Dịka ogologo ụbọchị niile ha nke eluigwe dị nʼelu, ụwa dịkwa nʼokpuru ya. 22 Ọ bụrụ na unu elezie anya debe iwu niile m na-enye unu taa, na-ahụkwa ONYENWE ANYỊ Chineke unu nʼanya, na-eso ụzọ ya, na-adaberekwa na ya, 23 ONYENWE ANYỊ ga-achụpụ mba niile bi nʼala ahụ unu na-aga inweta, unu ga-anapụkwa ha ala ahụ, ọ bụladị na ha buru ibu, siekwa ike karịa unu. 24 Ebe ọbụla unu zọnyere ụkwụ unu nʼala ahụ aghọọla nke unu, site na ndịda Negeb ruo Lebanọn, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo Osimiri Mediterenịa. Ha ga-abụ nke unu. 25 Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ imegide unu nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke unu ga-emenye ha egwu na ụjọ nʼafọ nʼụzọ ọbụla unu na-aga, dịka o kwere na nkwa. 26 Lee, taa, ana m eche nʼihu unu ngọzị ONYENWE ANYỊ na ọbụbụ ọnụ. 27 Ngọzị ga-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu edebe iwu ONYENWE ANYỊ Chineke unu, nke m na-enye unu taa. 28 Nkọcha ahụ ga-adị ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu niile nke ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke unu, wezuga onwe unu nʼụzọ ahụ nke m nyere unu nʼiwu taa site nʼịgbaso chi ndị ọzọ, nke unu na-amaghị. 29 Mgbe ONYENWE ANYỊ Chineke unu mere ka unu nweta ala ahụ, a ga-esite nʼelu ugwu Gerizim kwupụta ngọzị ga-adịrị unu, a ga-esitekwa nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ ga-adakwasị unu. 30 Gerizim na Ebal bụ ugwu dị nʼofe Jọdan, nʼakụkụ okporoụzọ dị nʼọdịda anyanwụ. Ọ dị nso nʼebe osisi ukwu ndị ahụ toro na More, nʼala ndị Kenan ahụ bi nʼAraba, nʼakụkụ Gilgal. 31 Nʼihi na unu na-aga ịgafe osimiri Jọdan, ịbanye nweta ala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu na-enye unu. Mgbe unu nwetara ya biri nʼime ya, 32 hụnụ na unu rubere isi debe iwu niile na ụkpụrụ niile m na-eche nʼihu unu taa.

In Other Versions

Deuteronomy 11 in the ANGEFD

Deuteronomy 11 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 11 in the AS21

Deuteronomy 11 in the BAGH

Deuteronomy 11 in the BBPNG

Deuteronomy 11 in the BBT1E

Deuteronomy 11 in the BDS

Deuteronomy 11 in the BEV

Deuteronomy 11 in the BHAD

Deuteronomy 11 in the BIB

Deuteronomy 11 in the BLPT

Deuteronomy 11 in the BNT

Deuteronomy 11 in the BNTABOOT

Deuteronomy 11 in the BNTLV

Deuteronomy 11 in the BOATCB

Deuteronomy 11 in the BOATCB2

Deuteronomy 11 in the BOBCV

Deuteronomy 11 in the BOCNT

Deuteronomy 11 in the BOECS

Deuteronomy 11 in the BOGWICC

Deuteronomy 11 in the BOHCB

Deuteronomy 11 in the BOHCV

Deuteronomy 11 in the BOHLNT

Deuteronomy 11 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 11 in the BOILNTAP

Deuteronomy 11 in the BOITCV

Deuteronomy 11 in the BOKCV

Deuteronomy 11 in the BOKCV2

Deuteronomy 11 in the BOKHWOG

Deuteronomy 11 in the BOKSSV

Deuteronomy 11 in the BOLCB

Deuteronomy 11 in the BOLCB2

Deuteronomy 11 in the BOMCV

Deuteronomy 11 in the BONAV

Deuteronomy 11 in the BONCB

Deuteronomy 11 in the BONLT

Deuteronomy 11 in the BONUT2

Deuteronomy 11 in the BOPLNT

Deuteronomy 11 in the BOSCB

Deuteronomy 11 in the BOSNC

Deuteronomy 11 in the BOTLNT

Deuteronomy 11 in the BOVCB

Deuteronomy 11 in the BOYCB

Deuteronomy 11 in the BPBB

Deuteronomy 11 in the BPH

Deuteronomy 11 in the BSB

Deuteronomy 11 in the CCB

Deuteronomy 11 in the CUV

Deuteronomy 11 in the CUVS

Deuteronomy 11 in the DBT

Deuteronomy 11 in the DGDNT

Deuteronomy 11 in the DHNT

Deuteronomy 11 in the DNT

Deuteronomy 11 in the ELBE

Deuteronomy 11 in the EMTV

Deuteronomy 11 in the ESV

Deuteronomy 11 in the FBV

Deuteronomy 11 in the FEB

Deuteronomy 11 in the GGMNT

Deuteronomy 11 in the GNT

Deuteronomy 11 in the HARY

Deuteronomy 11 in the HNT

Deuteronomy 11 in the IRVA

Deuteronomy 11 in the IRVB

Deuteronomy 11 in the IRVG

Deuteronomy 11 in the IRVH

Deuteronomy 11 in the IRVK

Deuteronomy 11 in the IRVM

Deuteronomy 11 in the IRVM2

Deuteronomy 11 in the IRVO

Deuteronomy 11 in the IRVP

Deuteronomy 11 in the IRVT

Deuteronomy 11 in the IRVT2

Deuteronomy 11 in the IRVU

Deuteronomy 11 in the ISVN

Deuteronomy 11 in the JSNT

Deuteronomy 11 in the KAPI

Deuteronomy 11 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 11 in the KBV

Deuteronomy 11 in the KJV

Deuteronomy 11 in the KNFD

Deuteronomy 11 in the LBA

Deuteronomy 11 in the LBLA

Deuteronomy 11 in the LNT

Deuteronomy 11 in the LSV

Deuteronomy 11 in the MAAL

Deuteronomy 11 in the MBV

Deuteronomy 11 in the MBV2

Deuteronomy 11 in the MHNT

Deuteronomy 11 in the MKNFD

Deuteronomy 11 in the MNG

Deuteronomy 11 in the MNT

Deuteronomy 11 in the MNT2

Deuteronomy 11 in the MRS1T

Deuteronomy 11 in the NAA

Deuteronomy 11 in the NASB

Deuteronomy 11 in the NBLA

Deuteronomy 11 in the NBS

Deuteronomy 11 in the NBVTP

Deuteronomy 11 in the NET2

Deuteronomy 11 in the NIV11

Deuteronomy 11 in the NNT

Deuteronomy 11 in the NNT2

Deuteronomy 11 in the NNT3

Deuteronomy 11 in the PDDPT

Deuteronomy 11 in the PFNT

Deuteronomy 11 in the RMNT

Deuteronomy 11 in the SBIAS

Deuteronomy 11 in the SBIBS

Deuteronomy 11 in the SBIBS2

Deuteronomy 11 in the SBICS

Deuteronomy 11 in the SBIDS

Deuteronomy 11 in the SBIGS

Deuteronomy 11 in the SBIHS

Deuteronomy 11 in the SBIIS

Deuteronomy 11 in the SBIIS2

Deuteronomy 11 in the SBIIS3

Deuteronomy 11 in the SBIKS

Deuteronomy 11 in the SBIKS2

Deuteronomy 11 in the SBIMS

Deuteronomy 11 in the SBIOS

Deuteronomy 11 in the SBIPS

Deuteronomy 11 in the SBISS

Deuteronomy 11 in the SBITS

Deuteronomy 11 in the SBITS2

Deuteronomy 11 in the SBITS3

Deuteronomy 11 in the SBITS4

Deuteronomy 11 in the SBIUS

Deuteronomy 11 in the SBIVS

Deuteronomy 11 in the SBT

Deuteronomy 11 in the SBT1E

Deuteronomy 11 in the SCHL

Deuteronomy 11 in the SNT

Deuteronomy 11 in the SUSU

Deuteronomy 11 in the SUSU2

Deuteronomy 11 in the SYNO

Deuteronomy 11 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 11 in the TBT1E

Deuteronomy 11 in the TBT1E2

Deuteronomy 11 in the TFTIP

Deuteronomy 11 in the TFTU

Deuteronomy 11 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 11 in the THAI

Deuteronomy 11 in the TNFD

Deuteronomy 11 in the TNT

Deuteronomy 11 in the TNTIK

Deuteronomy 11 in the TNTIL

Deuteronomy 11 in the TNTIN

Deuteronomy 11 in the TNTIP

Deuteronomy 11 in the TNTIZ

Deuteronomy 11 in the TOMA

Deuteronomy 11 in the TTENT

Deuteronomy 11 in the UBG

Deuteronomy 11 in the UGV

Deuteronomy 11 in the UGV2

Deuteronomy 11 in the UGV3

Deuteronomy 11 in the VBL

Deuteronomy 11 in the VDCC

Deuteronomy 11 in the YALU

Deuteronomy 11 in the YAPE

Deuteronomy 11 in the YBVTP

Deuteronomy 11 in the ZBP