Deuteronomy 16 (BOICB)

1 Debe ọnwa Abib iche maka ime Mmemme Ngabiga ONYENWE ANYỊ Chineke gị, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa Abib ka ONYENWE ANYỊ Chineke gị mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼabalị. 2 Ị ga-eji anụ si nʼigwe atụrụ na ehi gị chụọrọ ONYENWE ANYỊ Chineke gị aja ngabiga nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ ga-ahọpụta dịka ebe obibi nye aha ya. 3 Erila ya na achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee, kama ụbọchị asaa ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, ya bụ, achịcha ahụhụ, iji cheta na i si nʼala Ijipt pụta ngwangwa. Nke a ga-eme ka i nwee ike na-echeta mgbe i sitere nʼala Ijipt pụta, ụbọchị niile nke ndụ. 4 Ka ihe ọbụla na-eko achịcha ghara ịbata nʼezinaụlọ gị abalị asaa ndị ahụ. Unu ahapụkwala anụ ọbụla unu chụrụ nʼaja nʼoge uhuruchi nke ụbọchị mbụ, nọọ ruo ụtụtụ. 5 Ị gaghị achụ aja ngabiga nʼobodo ọbụla ONYENWE ANYỊ Chineke gị nyere gị, 6 karịakwa nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị họpụtara dịka ebe obibi nye ya ka i ga-anọ chụọ ya. Nʼebe ahụ ka ị ga-achụ aja ngabiga gị nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dachara, nʼoge mgbe dịka oge ụbọchị ahụ i sitere nʼIjipt pụta. 7 Ị ga-ahụ ya nʼọkụ riekwa ya nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ga-ahọpụta. Nʼụtụtụ, ị ga-alaghachikwa nʼụlọ ikwu gị. 8 Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, nʼụbọchị nke asaa, nweenụ mkpọkọta nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị, arụkwala ọrụ ọbụla. 9 Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị. 10 Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị ji gọzie gị. 11 Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ nye gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, ndị ohu gị nwoke na nwanyị, ndị Livayị bi nʼobodo gị, ndị ọbịa, ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ bi nʼetiti gị. Meenụ nke a nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke gị, nʼebe ahụ ọ họpụtara dịka ebe obibi nye aha ya. 12 Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt, nʼihi nke a, unu echefula iwu ndị a. 13 Mmenụ mmemme ụlọ Ikwu. Unu aghaghị ime ya ụbọchị asaa mgbe unu wechara ihe ubi, ya bụ, mgbe unu chịkọtachara ọka site nʼebe ịzọcha ọka, nakwa ebe ịzọcha mmanya unu niile 14 Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ, nye gị onwe gị, ụmụ ndị ikom na ndị inyom gị, ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, ndị Livayị, ndị ọbịa, ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ ndị bi nʼobodo gị niile. 15 A ga-eme mmemme a nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị ụbọchị asaa nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ nʼonwe ya họpụtara. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-agọzi ihe ubi gị niile, gọziekwa akaọrụ gị niile, ime ka ọṅụ gị zuo oke. 16 Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile aghaghị ịbịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ unu, nʼebe ọ ga-ahọpụta: nʼoge mmemme ndị a: Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, Mmemme Izu Ụka asaa na Mmemme Ụlọ Ikwu. Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu ONYENWE ANYỊ. 17 Onye ọbụla ga-eweta onyinye dịka o nwere ike na dịka ONYENWE ANYỊ Chineke gị sị gọzie ya. 18 Ị ga-ahọpụta ndị ikpe, na ndịisi ozi nʼebo niile, na nʼobodo ọbụla ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị. Ha ga-eme ka ezi ikpe dịrị ndị mmadụ niile. 19 Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ. 20 Gbasoo ikpe ziri ezi, mee ka ikpe ziri ezi dịgide, ka ị dịrị ndụ, nweta ala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị. 21 Amanyela oyiyi osisi chi Ashera ọbụla gị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ị wuru nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị. 22 Eguzokwala ogidi nkume ọbụla nʼihi na ha bụ ihe ONYENWE ANYỊ Chineke gị kpọrọ asị.

In Other Versions

Deuteronomy 16 in the ANGEFD

Deuteronomy 16 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 16 in the AS21

Deuteronomy 16 in the BAGH

Deuteronomy 16 in the BBPNG

Deuteronomy 16 in the BBT1E

Deuteronomy 16 in the BDS

Deuteronomy 16 in the BEV

Deuteronomy 16 in the BHAD

Deuteronomy 16 in the BIB

Deuteronomy 16 in the BLPT

Deuteronomy 16 in the BNT

Deuteronomy 16 in the BNTABOOT

Deuteronomy 16 in the BNTLV

Deuteronomy 16 in the BOATCB

Deuteronomy 16 in the BOATCB2

Deuteronomy 16 in the BOBCV

Deuteronomy 16 in the BOCNT

Deuteronomy 16 in the BOECS

Deuteronomy 16 in the BOGWICC

Deuteronomy 16 in the BOHCB

Deuteronomy 16 in the BOHCV

Deuteronomy 16 in the BOHLNT

Deuteronomy 16 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 16 in the BOILNTAP

Deuteronomy 16 in the BOITCV

Deuteronomy 16 in the BOKCV

Deuteronomy 16 in the BOKCV2

Deuteronomy 16 in the BOKHWOG

Deuteronomy 16 in the BOKSSV

Deuteronomy 16 in the BOLCB

Deuteronomy 16 in the BOLCB2

Deuteronomy 16 in the BOMCV

Deuteronomy 16 in the BONAV

Deuteronomy 16 in the BONCB

Deuteronomy 16 in the BONLT

Deuteronomy 16 in the BONUT2

Deuteronomy 16 in the BOPLNT

Deuteronomy 16 in the BOSCB

Deuteronomy 16 in the BOSNC

Deuteronomy 16 in the BOTLNT

Deuteronomy 16 in the BOVCB

Deuteronomy 16 in the BOYCB

Deuteronomy 16 in the BPBB

Deuteronomy 16 in the BPH

Deuteronomy 16 in the BSB

Deuteronomy 16 in the CCB

Deuteronomy 16 in the CUV

Deuteronomy 16 in the CUVS

Deuteronomy 16 in the DBT

Deuteronomy 16 in the DGDNT

Deuteronomy 16 in the DHNT

Deuteronomy 16 in the DNT

Deuteronomy 16 in the ELBE

Deuteronomy 16 in the EMTV

Deuteronomy 16 in the ESV

Deuteronomy 16 in the FBV

Deuteronomy 16 in the FEB

Deuteronomy 16 in the GGMNT

Deuteronomy 16 in the GNT

Deuteronomy 16 in the HARY

Deuteronomy 16 in the HNT

Deuteronomy 16 in the IRVA

Deuteronomy 16 in the IRVB

Deuteronomy 16 in the IRVG

Deuteronomy 16 in the IRVH

Deuteronomy 16 in the IRVK

Deuteronomy 16 in the IRVM

Deuteronomy 16 in the IRVM2

Deuteronomy 16 in the IRVO

Deuteronomy 16 in the IRVP

Deuteronomy 16 in the IRVT

Deuteronomy 16 in the IRVT2

Deuteronomy 16 in the IRVU

Deuteronomy 16 in the ISVN

Deuteronomy 16 in the JSNT

Deuteronomy 16 in the KAPI

Deuteronomy 16 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 16 in the KBV

Deuteronomy 16 in the KJV

Deuteronomy 16 in the KNFD

Deuteronomy 16 in the LBA

Deuteronomy 16 in the LBLA

Deuteronomy 16 in the LNT

Deuteronomy 16 in the LSV

Deuteronomy 16 in the MAAL

Deuteronomy 16 in the MBV

Deuteronomy 16 in the MBV2

Deuteronomy 16 in the MHNT

Deuteronomy 16 in the MKNFD

Deuteronomy 16 in the MNG

Deuteronomy 16 in the MNT

Deuteronomy 16 in the MNT2

Deuteronomy 16 in the MRS1T

Deuteronomy 16 in the NAA

Deuteronomy 16 in the NASB

Deuteronomy 16 in the NBLA

Deuteronomy 16 in the NBS

Deuteronomy 16 in the NBVTP

Deuteronomy 16 in the NET2

Deuteronomy 16 in the NIV11

Deuteronomy 16 in the NNT

Deuteronomy 16 in the NNT2

Deuteronomy 16 in the NNT3

Deuteronomy 16 in the PDDPT

Deuteronomy 16 in the PFNT

Deuteronomy 16 in the RMNT

Deuteronomy 16 in the SBIAS

Deuteronomy 16 in the SBIBS

Deuteronomy 16 in the SBIBS2

Deuteronomy 16 in the SBICS

Deuteronomy 16 in the SBIDS

Deuteronomy 16 in the SBIGS

Deuteronomy 16 in the SBIHS

Deuteronomy 16 in the SBIIS

Deuteronomy 16 in the SBIIS2

Deuteronomy 16 in the SBIIS3

Deuteronomy 16 in the SBIKS

Deuteronomy 16 in the SBIKS2

Deuteronomy 16 in the SBIMS

Deuteronomy 16 in the SBIOS

Deuteronomy 16 in the SBIPS

Deuteronomy 16 in the SBISS

Deuteronomy 16 in the SBITS

Deuteronomy 16 in the SBITS2

Deuteronomy 16 in the SBITS3

Deuteronomy 16 in the SBITS4

Deuteronomy 16 in the SBIUS

Deuteronomy 16 in the SBIVS

Deuteronomy 16 in the SBT

Deuteronomy 16 in the SBT1E

Deuteronomy 16 in the SCHL

Deuteronomy 16 in the SNT

Deuteronomy 16 in the SUSU

Deuteronomy 16 in the SUSU2

Deuteronomy 16 in the SYNO

Deuteronomy 16 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 16 in the TBT1E

Deuteronomy 16 in the TBT1E2

Deuteronomy 16 in the TFTIP

Deuteronomy 16 in the TFTU

Deuteronomy 16 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 16 in the THAI

Deuteronomy 16 in the TNFD

Deuteronomy 16 in the TNT

Deuteronomy 16 in the TNTIK

Deuteronomy 16 in the TNTIL

Deuteronomy 16 in the TNTIN

Deuteronomy 16 in the TNTIP

Deuteronomy 16 in the TNTIZ

Deuteronomy 16 in the TOMA

Deuteronomy 16 in the TTENT

Deuteronomy 16 in the UBG

Deuteronomy 16 in the UGV

Deuteronomy 16 in the UGV2

Deuteronomy 16 in the UGV3

Deuteronomy 16 in the VBL

Deuteronomy 16 in the VDCC

Deuteronomy 16 in the YALU

Deuteronomy 16 in the YAPE

Deuteronomy 16 in the YBVTP

Deuteronomy 16 in the ZBP