Deuteronomy 23 (BOICB)
1 Nwoke ọbụla echipịara mkpụrụ amụ ya, maọbụ nke e bipụrụ mkpụrụ amụ ya, agaghị esonye na mkpọkọta ONYENWE ANYỊ. 2 Nwa ọbụla a mụtara site nʼịkwa iko agakwaghị esonye na mkpọkọta ONYENWE ANYỊ, ụmụ ụmụ ya, ruo nʼọgbọ nke iri, agakwaghị esonye na mkpọkọta ONYENWE ANYỊ. 3 Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta ONYENWE ANYỊ, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke iri ha. 4 Nʼihi na ha e jighị achịcha na mmiri bịa zute unu nʼụzọ mgbe unu si Ijipt pụta, ha goro Belam, nwa Beoa, onye si Petọ nke dị na Aram Naharaim, ka ọ bụọ unu ọnụ. 5 Ma ONYENWE ANYỊ Chineke gị egeghị Belam ntị, kama ONYENWE ANYỊ Chineke gị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọrọ gị ngọzị, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke gị hụrụ gị nʼanya. 6 Achọla udo ndị Amọn na Moab, na ọdịmma ha ụbọchị ndụ gị niile ruo mgbe ebighị ebi. 7 Ma eledala ndị Edọm anya, nʼihi na ndị Edọm bụ ụmụnna unu. Unu eledala ndị Ijipt anya, nʼihi na unu biri dịka ndị ọbịa nʼime ala ha. 8 Ụmụ a ga-amụrụ ha nʼọgbọ nke atọ ha nwere ike ịbata na mkpọkọta nke ONYENWE ANYỊ. 9 Mgbe unu mara ụlọ ikwu unu maka ibu agha megide ndị iro unu, wezuganụ onwe unu site nʼihe ọbụla na-adịghị ọcha. 10 Nwoke ọbụla nʼetiti gị nke na-adịghị ọcha site nʼịnyụ mkpụrụ nwa nʼahụ ya nʼabalị, ga-apụ gaa nọdụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. 11 Ọ ga-anọ nʼebe ahụ ruo uhuruchi, emesịa, ọ ga-asa ahụ ya lọghachi nʼụlọ ikwu nʼanyasị. 12 Ị ga-enwekwa otu ebe ndị gị ga-anọ jee nʼogwe ga-adị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. 13 Onye ọbụla nʼime unu ga-enwe shọvel dịka otu nʼime ngwa agha ya. Mgbe ọbụla kwa o jere nʼogwe, ọ ga-eji ya gwuo ala kpochie nsị ọ nyụrụ. 14 Ụlọ ikwu gị ga-adị nsọ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-ejegharị nʼetiti gị ichebe gị, na ịnapụta gị site nʼaka ndị iro gị. ONYENWE ANYỊ achọghị ihu ihe ọbụla na-adịghị mma nʼanya, ka ọ ghara ịlaghachi azụ iso gị. 15 Ọ bụrụ na ohu esite nʼaka onye nwe ya gbakwute unu, akwagidela ya ka ọ lọghachi, 16 hapụ ya ka o biri nʼetiti gị nʼime obodo ọbụla masịrị ya, emegbukwala ya. 17 Ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị, onye Izrel ga-aghọ akwụna ụlọ arụsị. 18 Ị gaghị ewebata nʼụlọ ONYENWE ANYỊ Chineke gị, onyinye ọbụla site nʼego nwanyị na-agba akwụna kpatara, maọbụ site nʼego nwoke ahụ na-edebe onwe ya dịka akwụna nye ndị ikom ibe ya kpatara, iji mezuo nkwa ọbụla. Nʼihi na ha abụọ bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ONYENWE ANYỊ Chineke gị. 19 A nakwala onye Izrel ibe gị ọmụrụnwa, nʼihe ọbụla i binyere ya, maọbụ ego, maọbụ nri, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ nwere ike ịmụta ọmụrụnwa. 20 Onye mba ọzọ ka ị ga-ana ọmụrụnwa nʼihe i binyere ya, ọ bụghị onye Izrel ibe gị. Ka ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị gọzie gị nʼihe niile i tinyere aka gị ime nʼala ahụ nke ị na-aba inweta. 21 Mgbe i kwere ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị nkwa, alala azụ nʼịkwụghachi ya, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke gị chọrọ ka ị kwụghachi nkwa gị ọsịịsọ. Ọ ga-abụkwara gị mmehie ma i meghị ya. 22 Ma ọ gaghị abụrụ gị mmehie ma ọ bụrụ na i kweghị nkwa ọbụla! 23 Ihe ọbụla nke i kwere na nkwa, jisie ike hụ na i mezuru nke ahụ dịka okwu gị si dị, nʼihi na ọ bụ onyinye afọ ofufu nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị. 24 Ọ bụrụ na ị banye nʼubi vaịnị onye agbataobi gị, i nwere ike ghọrọ mkpụrụ vaịnị ọbụla ị chọrọ rachaa nʼebe ahụ, ma etinyela mkpụrụ ọbụla nʼakpa gị. 25 Otu a kwa, ị banye nʼubi ọka onye agbataobi gị, ghọrọ mkpụrụ ọka ọbụla ị chọrọ nʼaka gị, nọọkwa nʼebe ahụ taa ya, ma ị gaghị etinye mma iwe ihe ubi nʼime ọka ha ndị guzoro eguzo.
In Other Versions
Deuteronomy 23 in the ANGEFD
Deuteronomy 23 in the ANTPNG2D
Deuteronomy 23 in the AS21
Deuteronomy 23 in the BAGH
Deuteronomy 23 in the BBPNG
Deuteronomy 23 in the BBT1E
Deuteronomy 23 in the BDS
Deuteronomy 23 in the BEV
Deuteronomy 23 in the BHAD
Deuteronomy 23 in the BIB
Deuteronomy 23 in the BLPT
Deuteronomy 23 in the BNT
Deuteronomy 23 in the BNTABOOT
Deuteronomy 23 in the BNTLV
Deuteronomy 23 in the BOATCB
Deuteronomy 23 in the BOATCB2
Deuteronomy 23 in the BOBCV
Deuteronomy 23 in the BOCNT
Deuteronomy 23 in the BOECS
Deuteronomy 23 in the BOGWICC
Deuteronomy 23 in the BOHCB
Deuteronomy 23 in the BOHCV
Deuteronomy 23 in the BOHLNT
Deuteronomy 23 in the BOHNTLTAL
Deuteronomy 23 in the BOILNTAP
Deuteronomy 23 in the BOITCV
Deuteronomy 23 in the BOKCV
Deuteronomy 23 in the BOKCV2
Deuteronomy 23 in the BOKHWOG
Deuteronomy 23 in the BOKSSV
Deuteronomy 23 in the BOLCB
Deuteronomy 23 in the BOLCB2
Deuteronomy 23 in the BOMCV
Deuteronomy 23 in the BONAV
Deuteronomy 23 in the BONCB
Deuteronomy 23 in the BONLT
Deuteronomy 23 in the BONUT2
Deuteronomy 23 in the BOPLNT
Deuteronomy 23 in the BOSCB
Deuteronomy 23 in the BOSNC
Deuteronomy 23 in the BOTLNT
Deuteronomy 23 in the BOVCB
Deuteronomy 23 in the BOYCB
Deuteronomy 23 in the BPBB
Deuteronomy 23 in the BPH
Deuteronomy 23 in the BSB
Deuteronomy 23 in the CCB
Deuteronomy 23 in the CUV
Deuteronomy 23 in the CUVS
Deuteronomy 23 in the DBT
Deuteronomy 23 in the DGDNT
Deuteronomy 23 in the DHNT
Deuteronomy 23 in the DNT
Deuteronomy 23 in the ELBE
Deuteronomy 23 in the EMTV
Deuteronomy 23 in the ESV
Deuteronomy 23 in the FBV
Deuteronomy 23 in the FEB
Deuteronomy 23 in the GGMNT
Deuteronomy 23 in the GNT
Deuteronomy 23 in the HARY
Deuteronomy 23 in the HNT
Deuteronomy 23 in the IRVA
Deuteronomy 23 in the IRVB
Deuteronomy 23 in the IRVG
Deuteronomy 23 in the IRVH
Deuteronomy 23 in the IRVK
Deuteronomy 23 in the IRVM
Deuteronomy 23 in the IRVM2
Deuteronomy 23 in the IRVO
Deuteronomy 23 in the IRVP
Deuteronomy 23 in the IRVT
Deuteronomy 23 in the IRVT2
Deuteronomy 23 in the IRVU
Deuteronomy 23 in the ISVN
Deuteronomy 23 in the JSNT
Deuteronomy 23 in the KAPI
Deuteronomy 23 in the KBT1ETNIK
Deuteronomy 23 in the KBV
Deuteronomy 23 in the KJV
Deuteronomy 23 in the KNFD
Deuteronomy 23 in the LBA
Deuteronomy 23 in the LBLA
Deuteronomy 23 in the LNT
Deuteronomy 23 in the LSV
Deuteronomy 23 in the MAAL
Deuteronomy 23 in the MBV
Deuteronomy 23 in the MBV2
Deuteronomy 23 in the MHNT
Deuteronomy 23 in the MKNFD
Deuteronomy 23 in the MNG
Deuteronomy 23 in the MNT
Deuteronomy 23 in the MNT2
Deuteronomy 23 in the MRS1T
Deuteronomy 23 in the NAA
Deuteronomy 23 in the NASB
Deuteronomy 23 in the NBLA
Deuteronomy 23 in the NBS
Deuteronomy 23 in the NBVTP
Deuteronomy 23 in the NET2
Deuteronomy 23 in the NIV11
Deuteronomy 23 in the NNT
Deuteronomy 23 in the NNT2
Deuteronomy 23 in the NNT3
Deuteronomy 23 in the PDDPT
Deuteronomy 23 in the PFNT
Deuteronomy 23 in the RMNT
Deuteronomy 23 in the SBIAS
Deuteronomy 23 in the SBIBS
Deuteronomy 23 in the SBIBS2
Deuteronomy 23 in the SBICS
Deuteronomy 23 in the SBIDS
Deuteronomy 23 in the SBIGS
Deuteronomy 23 in the SBIHS
Deuteronomy 23 in the SBIIS
Deuteronomy 23 in the SBIIS2
Deuteronomy 23 in the SBIIS3
Deuteronomy 23 in the SBIKS
Deuteronomy 23 in the SBIKS2
Deuteronomy 23 in the SBIMS
Deuteronomy 23 in the SBIOS
Deuteronomy 23 in the SBIPS
Deuteronomy 23 in the SBISS
Deuteronomy 23 in the SBITS
Deuteronomy 23 in the SBITS2
Deuteronomy 23 in the SBITS3
Deuteronomy 23 in the SBITS4
Deuteronomy 23 in the SBIUS
Deuteronomy 23 in the SBIVS
Deuteronomy 23 in the SBT
Deuteronomy 23 in the SBT1E
Deuteronomy 23 in the SCHL
Deuteronomy 23 in the SNT
Deuteronomy 23 in the SUSU
Deuteronomy 23 in the SUSU2
Deuteronomy 23 in the SYNO
Deuteronomy 23 in the TBIAOTANT
Deuteronomy 23 in the TBT1E
Deuteronomy 23 in the TBT1E2
Deuteronomy 23 in the TFTIP
Deuteronomy 23 in the TFTU
Deuteronomy 23 in the TGNTATF3T
Deuteronomy 23 in the THAI
Deuteronomy 23 in the TNFD
Deuteronomy 23 in the TNT
Deuteronomy 23 in the TNTIK
Deuteronomy 23 in the TNTIL
Deuteronomy 23 in the TNTIN
Deuteronomy 23 in the TNTIP
Deuteronomy 23 in the TNTIZ
Deuteronomy 23 in the TOMA
Deuteronomy 23 in the TTENT
Deuteronomy 23 in the UBG
Deuteronomy 23 in the UGV
Deuteronomy 23 in the UGV2
Deuteronomy 23 in the UGV3
Deuteronomy 23 in the VBL
Deuteronomy 23 in the VDCC
Deuteronomy 23 in the YALU
Deuteronomy 23 in the YAPE
Deuteronomy 23 in the YBVTP
Deuteronomy 23 in the ZBP