Deuteronomy 27 (BOICB)
1 Mosis na ndị okenye Izrel nyere ndị Izrel iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa. 2 Mgbe ị gabigara osimiri Jọdan ruo nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị, bukọtaanụ nkume buru ibu nʼotu ebe, jirikwa ụrọ ọcha techie ha. 3 Depụta nʼelu nkume ndị ahụ iwu na ụkpụrụ ndị a mgbe ị batara nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, nke ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna gị kwere nkwa inye gị. 4 Mgbe ị nọkwa nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, doo nkume ukwu ndị a nʼugwu Ebal, dịka m na-enye gị nʼiwu taa. Jirikwa ụrọ ọcha techie ha. 5 Wuokwara ONYENWE ANYỊ Chineke gị ebe ịchụ aja ya nʼebe ahụ. Ebe ịchụ aja eji naanị nkume wuo, nke ejighị ihe ngwa ọrụ igwe rụọ ihe bụla na ya. 6 Jiri nkume a na-awaghị awa wuore ONYENWE ANYỊ Chineke gị ebe ịchụ aja ahụ, chụọkwa aja nʼelu ya nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị. 7 Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke gị. 8 Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.” 9 Mgbe ahụ, Mosis na ndị nchụaja, bụ ndị Livayị, gwakwara ndị Izrel niile okwu sị, “Nọọnụ jii, gị Izrel, gekwaa ntị! Taa, ị ghọọla ndị nke ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 10 Nʼihi ya debe iwu niile ONYENWE ANYỊ Chineke gị na ụkpụrụ niile ndị m nyere gị taa.” 11 Nʼotu ụbọchị ahụ ka Mosis nyere ha iwu sị, 12 Mgbe unu gafere Jọdan, ebo ndị a: Simiọn, na Livayị na Juda na Isaka na Josef na Benjamin, ga-eguzo nʼelu ugwu Gerizim gọzie ụmụ Izrel 13 Agbụrụ Ruben, Gad, Asha, Zebụlọn, Dan na Naftalị ga-eguzo nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ. 14 Ndị Livayị ga-eji olu dị elu gụpụta ya nye ụmụ Izrel niile, 15 “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-apị arụsị maọbụ oyiyi ọbụla, akaọrụ onye ǹka, nke bụ ihe arụ nʼanya ONYENWE ANYỊ, ma na-eguzobe ya na nzuzo.”Ndị mmadụ niile ga-aza sị, “Amen.” 16 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.”Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 17 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.”Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 18 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.”Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 19 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.”Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 20 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.”Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 21 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.”Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 22 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.”Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 23 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.”Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 24 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo.”Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 25 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 26 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-adịghị eme ka iwu ndị a guzosie ike site na-edebeghị ha.”Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
In Other Versions
Deuteronomy 27 in the ANGEFD
Deuteronomy 27 in the ANTPNG2D
Deuteronomy 27 in the AS21
Deuteronomy 27 in the BAGH
Deuteronomy 27 in the BBPNG
Deuteronomy 27 in the BBT1E
Deuteronomy 27 in the BDS
Deuteronomy 27 in the BEV
Deuteronomy 27 in the BHAD
Deuteronomy 27 in the BIB
Deuteronomy 27 in the BLPT
Deuteronomy 27 in the BNT
Deuteronomy 27 in the BNTABOOT
Deuteronomy 27 in the BNTLV
Deuteronomy 27 in the BOATCB
Deuteronomy 27 in the BOATCB2
Deuteronomy 27 in the BOBCV
Deuteronomy 27 in the BOCNT
Deuteronomy 27 in the BOECS
Deuteronomy 27 in the BOGWICC
Deuteronomy 27 in the BOHCB
Deuteronomy 27 in the BOHCV
Deuteronomy 27 in the BOHLNT
Deuteronomy 27 in the BOHNTLTAL
Deuteronomy 27 in the BOILNTAP
Deuteronomy 27 in the BOITCV
Deuteronomy 27 in the BOKCV
Deuteronomy 27 in the BOKCV2
Deuteronomy 27 in the BOKHWOG
Deuteronomy 27 in the BOKSSV
Deuteronomy 27 in the BOLCB
Deuteronomy 27 in the BOLCB2
Deuteronomy 27 in the BOMCV
Deuteronomy 27 in the BONAV
Deuteronomy 27 in the BONCB
Deuteronomy 27 in the BONLT
Deuteronomy 27 in the BONUT2
Deuteronomy 27 in the BOPLNT
Deuteronomy 27 in the BOSCB
Deuteronomy 27 in the BOSNC
Deuteronomy 27 in the BOTLNT
Deuteronomy 27 in the BOVCB
Deuteronomy 27 in the BOYCB
Deuteronomy 27 in the BPBB
Deuteronomy 27 in the BPH
Deuteronomy 27 in the BSB
Deuteronomy 27 in the CCB
Deuteronomy 27 in the CUV
Deuteronomy 27 in the CUVS
Deuteronomy 27 in the DBT
Deuteronomy 27 in the DGDNT
Deuteronomy 27 in the DHNT
Deuteronomy 27 in the DNT
Deuteronomy 27 in the ELBE
Deuteronomy 27 in the EMTV
Deuteronomy 27 in the ESV
Deuteronomy 27 in the FBV
Deuteronomy 27 in the FEB
Deuteronomy 27 in the GGMNT
Deuteronomy 27 in the GNT
Deuteronomy 27 in the HARY
Deuteronomy 27 in the HNT
Deuteronomy 27 in the IRVA
Deuteronomy 27 in the IRVB
Deuteronomy 27 in the IRVG
Deuteronomy 27 in the IRVH
Deuteronomy 27 in the IRVK
Deuteronomy 27 in the IRVM
Deuteronomy 27 in the IRVM2
Deuteronomy 27 in the IRVO
Deuteronomy 27 in the IRVP
Deuteronomy 27 in the IRVT
Deuteronomy 27 in the IRVT2
Deuteronomy 27 in the IRVU
Deuteronomy 27 in the ISVN
Deuteronomy 27 in the JSNT
Deuteronomy 27 in the KAPI
Deuteronomy 27 in the KBT1ETNIK
Deuteronomy 27 in the KBV
Deuteronomy 27 in the KJV
Deuteronomy 27 in the KNFD
Deuteronomy 27 in the LBA
Deuteronomy 27 in the LBLA
Deuteronomy 27 in the LNT
Deuteronomy 27 in the LSV
Deuteronomy 27 in the MAAL
Deuteronomy 27 in the MBV
Deuteronomy 27 in the MBV2
Deuteronomy 27 in the MHNT
Deuteronomy 27 in the MKNFD
Deuteronomy 27 in the MNG
Deuteronomy 27 in the MNT
Deuteronomy 27 in the MNT2
Deuteronomy 27 in the MRS1T
Deuteronomy 27 in the NAA
Deuteronomy 27 in the NASB
Deuteronomy 27 in the NBLA
Deuteronomy 27 in the NBS
Deuteronomy 27 in the NBVTP
Deuteronomy 27 in the NET2
Deuteronomy 27 in the NIV11
Deuteronomy 27 in the NNT
Deuteronomy 27 in the NNT2
Deuteronomy 27 in the NNT3
Deuteronomy 27 in the PDDPT
Deuteronomy 27 in the PFNT
Deuteronomy 27 in the RMNT
Deuteronomy 27 in the SBIAS
Deuteronomy 27 in the SBIBS
Deuteronomy 27 in the SBIBS2
Deuteronomy 27 in the SBICS
Deuteronomy 27 in the SBIDS
Deuteronomy 27 in the SBIGS
Deuteronomy 27 in the SBIHS
Deuteronomy 27 in the SBIIS
Deuteronomy 27 in the SBIIS2
Deuteronomy 27 in the SBIIS3
Deuteronomy 27 in the SBIKS
Deuteronomy 27 in the SBIKS2
Deuteronomy 27 in the SBIMS
Deuteronomy 27 in the SBIOS
Deuteronomy 27 in the SBIPS
Deuteronomy 27 in the SBISS
Deuteronomy 27 in the SBITS
Deuteronomy 27 in the SBITS2
Deuteronomy 27 in the SBITS3
Deuteronomy 27 in the SBITS4
Deuteronomy 27 in the SBIUS
Deuteronomy 27 in the SBIVS
Deuteronomy 27 in the SBT
Deuteronomy 27 in the SBT1E
Deuteronomy 27 in the SCHL
Deuteronomy 27 in the SNT
Deuteronomy 27 in the SUSU
Deuteronomy 27 in the SUSU2
Deuteronomy 27 in the SYNO
Deuteronomy 27 in the TBIAOTANT
Deuteronomy 27 in the TBT1E
Deuteronomy 27 in the TBT1E2
Deuteronomy 27 in the TFTIP
Deuteronomy 27 in the TFTU
Deuteronomy 27 in the TGNTATF3T
Deuteronomy 27 in the THAI
Deuteronomy 27 in the TNFD
Deuteronomy 27 in the TNT
Deuteronomy 27 in the TNTIK
Deuteronomy 27 in the TNTIL
Deuteronomy 27 in the TNTIN
Deuteronomy 27 in the TNTIP
Deuteronomy 27 in the TNTIZ
Deuteronomy 27 in the TOMA
Deuteronomy 27 in the TTENT
Deuteronomy 27 in the UBG
Deuteronomy 27 in the UGV
Deuteronomy 27 in the UGV2
Deuteronomy 27 in the UGV3
Deuteronomy 27 in the VBL
Deuteronomy 27 in the VDCC
Deuteronomy 27 in the YALU
Deuteronomy 27 in the YAPE
Deuteronomy 27 in the YBVTP
Deuteronomy 27 in the ZBP