Deuteronomy 30 (BOICB)

1 Mgbe ihe ndị a niile ga-emezu nʼebe unu nọ, ya bụ, ngọzị niile na ọbụbụ ọnụ niile m gụpụtara nʼihu unu, ọ bụrụ na unu ga na-atụgharị uche na ha nʼetiti mba ndị ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu ga-achụba unu, 2 ọ bụrụkwa na unu ekpebie nʼobi unu nʼoge ahụ ịlọghachikwute ONYENWE ANYỊ Chineke unu, ọ bụrụ na unu, na ụmụ unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile mezuo iwu ndị a niile m nyere unu taa. 3 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-anapụta unu. Ọ ga-enwe obi ebere nʼebe unu nọ kpọkọtakwa unu site na mba niile ebe ọ chụsasịrị unu. 4 A sịkwarị na ọ bụ nʼala dị na nsọtụ ụwa nʼokpuru eluigwe ka a chụgara unu, nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị ga-achịkọta unu, kpọghachitekwa unu. 5 ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-akpọlata unu nʼala ahụ bụ nke nna nna unu ha. Unu ga-enwetakwa ya, ọ ga-eme ka ihe gara unu nke ọma, meekwa ka unu baa ụba karịa nna nna unu ha. 6 ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-ebi obi unu, na obi ụmụ unu, na nke ụmụ ụmụ unu ugwu, ka unu were obi unu niile na mmụọ unu niile, hụ ya nʼanya, ma dịkwa ndụ. 7 ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-eme ka ọbụbụ ọnụ ndị a bịakwasị ndị iro unu, ndị kpọrọ unu asị na ndị na-akpagbu unu. 8 Unu ga-emesịakwa rubere ONYENWE ANYỊ isi, gbasookwa iwu ya niile nke m na-enye unu taa. 9 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-eme ka unu babiga ụba oke nʼọrụ niile nke aka unu, nʼime mkpụrụ nke afọ, nʼime mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ala ubi gị. Obi ga-atọkwa ONYENWE ANYỊ ụtọ ọzọ, ime gị ka ị baa ụba dịka ọ tọrọ ya nʼebe nna unu ha nọ. 10 Ma ọ bụrụ na unu erubere ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu. 11 Idebe iwu ndị a m na-enye unu taa abụghị ọrụ sịrị ike, ọ bụkwaghị ihe karịrị unu ike ime. 12 Nʼihi na iwu ndị a adịghị nʼeluigwe nke ị ga-eji sị, “Onye ga-arịgo nʼeluigwe wedatara m ya ka m nụ ihe ọ na-ekwu, ma debekwa ya.” 13 Iwu a adịghịkwa nʼofe ọzọ nke oke osimiri, nke ị ga-eji sị, “Onye ga-agafe ga weta ya, kpọsaa ya nye anyị ka anyị nụ, ma debekwa ihe ọ na-ekwu?” 14 Mba, okwu ahụ dị gị nso, ọ dị gị nʼọnụ, dịrịkwa nʼobi gị, ka i nwee ike idebe ha. 15 Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi. 16 Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta. 17 Ma ọ bụrụ na obi gị e si nʼiso ya tụgharịa, ọ bụrụkwa na ị jụ ige ntị, ọ bụrụ na a dọkpụfuo gị mee ka i fee chi ndị ọzọ ofufe ma ịkpọ isiala nye ha, 18 agwala m gị hoohaa taa, na ị ga-ala nʼiyi, ị gaghị enwe ogologo ndụ nʼala ahụ ị na-agafe osimiri Jọdan inweta. 19 Ana m akpọku eluigwe na ụwa taa ka ha bụrụ ndị akaebe m, na edebela m nʼihu gị ọnwụ na ndụ, debekwa nʼihu gị ngọzị na ọbụbụ ọnụ. Ugbu a, họrọ ndụ, ka gị na ụmụ gị dị ndụ 20 ka ị hụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị nʼanya, ṅaa ntị nʼolu ya, daberekwa na ya. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ ndụ gị, ọ ga-enye gị ụbọchị ndụ gị niile nʼala ahụ o kwere nkwa ị nye nna nna gị ha Ebraham, na Aịzik, na Jekọb.

In Other Versions

Deuteronomy 30 in the ANGEFD

Deuteronomy 30 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 30 in the AS21

Deuteronomy 30 in the BAGH

Deuteronomy 30 in the BBPNG

Deuteronomy 30 in the BBT1E

Deuteronomy 30 in the BDS

Deuteronomy 30 in the BEV

Deuteronomy 30 in the BHAD

Deuteronomy 30 in the BIB

Deuteronomy 30 in the BLPT

Deuteronomy 30 in the BNT

Deuteronomy 30 in the BNTABOOT

Deuteronomy 30 in the BNTLV

Deuteronomy 30 in the BOATCB

Deuteronomy 30 in the BOATCB2

Deuteronomy 30 in the BOBCV

Deuteronomy 30 in the BOCNT

Deuteronomy 30 in the BOECS

Deuteronomy 30 in the BOGWICC

Deuteronomy 30 in the BOHCB

Deuteronomy 30 in the BOHCV

Deuteronomy 30 in the BOHLNT

Deuteronomy 30 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 30 in the BOILNTAP

Deuteronomy 30 in the BOITCV

Deuteronomy 30 in the BOKCV

Deuteronomy 30 in the BOKCV2

Deuteronomy 30 in the BOKHWOG

Deuteronomy 30 in the BOKSSV

Deuteronomy 30 in the BOLCB

Deuteronomy 30 in the BOLCB2

Deuteronomy 30 in the BOMCV

Deuteronomy 30 in the BONAV

Deuteronomy 30 in the BONCB

Deuteronomy 30 in the BONLT

Deuteronomy 30 in the BONUT2

Deuteronomy 30 in the BOPLNT

Deuteronomy 30 in the BOSCB

Deuteronomy 30 in the BOSNC

Deuteronomy 30 in the BOTLNT

Deuteronomy 30 in the BOVCB

Deuteronomy 30 in the BOYCB

Deuteronomy 30 in the BPBB

Deuteronomy 30 in the BPH

Deuteronomy 30 in the BSB

Deuteronomy 30 in the CCB

Deuteronomy 30 in the CUV

Deuteronomy 30 in the CUVS

Deuteronomy 30 in the DBT

Deuteronomy 30 in the DGDNT

Deuteronomy 30 in the DHNT

Deuteronomy 30 in the DNT

Deuteronomy 30 in the ELBE

Deuteronomy 30 in the EMTV

Deuteronomy 30 in the ESV

Deuteronomy 30 in the FBV

Deuteronomy 30 in the FEB

Deuteronomy 30 in the GGMNT

Deuteronomy 30 in the GNT

Deuteronomy 30 in the HARY

Deuteronomy 30 in the HNT

Deuteronomy 30 in the IRVA

Deuteronomy 30 in the IRVB

Deuteronomy 30 in the IRVG

Deuteronomy 30 in the IRVH

Deuteronomy 30 in the IRVK

Deuteronomy 30 in the IRVM

Deuteronomy 30 in the IRVM2

Deuteronomy 30 in the IRVO

Deuteronomy 30 in the IRVP

Deuteronomy 30 in the IRVT

Deuteronomy 30 in the IRVT2

Deuteronomy 30 in the IRVU

Deuteronomy 30 in the ISVN

Deuteronomy 30 in the JSNT

Deuteronomy 30 in the KAPI

Deuteronomy 30 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 30 in the KBV

Deuteronomy 30 in the KJV

Deuteronomy 30 in the KNFD

Deuteronomy 30 in the LBA

Deuteronomy 30 in the LBLA

Deuteronomy 30 in the LNT

Deuteronomy 30 in the LSV

Deuteronomy 30 in the MAAL

Deuteronomy 30 in the MBV

Deuteronomy 30 in the MBV2

Deuteronomy 30 in the MHNT

Deuteronomy 30 in the MKNFD

Deuteronomy 30 in the MNG

Deuteronomy 30 in the MNT

Deuteronomy 30 in the MNT2

Deuteronomy 30 in the MRS1T

Deuteronomy 30 in the NAA

Deuteronomy 30 in the NASB

Deuteronomy 30 in the NBLA

Deuteronomy 30 in the NBS

Deuteronomy 30 in the NBVTP

Deuteronomy 30 in the NET2

Deuteronomy 30 in the NIV11

Deuteronomy 30 in the NNT

Deuteronomy 30 in the NNT2

Deuteronomy 30 in the NNT3

Deuteronomy 30 in the PDDPT

Deuteronomy 30 in the PFNT

Deuteronomy 30 in the RMNT

Deuteronomy 30 in the SBIAS

Deuteronomy 30 in the SBIBS

Deuteronomy 30 in the SBIBS2

Deuteronomy 30 in the SBICS

Deuteronomy 30 in the SBIDS

Deuteronomy 30 in the SBIGS

Deuteronomy 30 in the SBIHS

Deuteronomy 30 in the SBIIS

Deuteronomy 30 in the SBIIS2

Deuteronomy 30 in the SBIIS3

Deuteronomy 30 in the SBIKS

Deuteronomy 30 in the SBIKS2

Deuteronomy 30 in the SBIMS

Deuteronomy 30 in the SBIOS

Deuteronomy 30 in the SBIPS

Deuteronomy 30 in the SBISS

Deuteronomy 30 in the SBITS

Deuteronomy 30 in the SBITS2

Deuteronomy 30 in the SBITS3

Deuteronomy 30 in the SBITS4

Deuteronomy 30 in the SBIUS

Deuteronomy 30 in the SBIVS

Deuteronomy 30 in the SBT

Deuteronomy 30 in the SBT1E

Deuteronomy 30 in the SCHL

Deuteronomy 30 in the SNT

Deuteronomy 30 in the SUSU

Deuteronomy 30 in the SUSU2

Deuteronomy 30 in the SYNO

Deuteronomy 30 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 30 in the TBT1E

Deuteronomy 30 in the TBT1E2

Deuteronomy 30 in the TFTIP

Deuteronomy 30 in the TFTU

Deuteronomy 30 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 30 in the THAI

Deuteronomy 30 in the TNFD

Deuteronomy 30 in the TNT

Deuteronomy 30 in the TNTIK

Deuteronomy 30 in the TNTIL

Deuteronomy 30 in the TNTIN

Deuteronomy 30 in the TNTIP

Deuteronomy 30 in the TNTIZ

Deuteronomy 30 in the TOMA

Deuteronomy 30 in the TTENT

Deuteronomy 30 in the UBG

Deuteronomy 30 in the UGV

Deuteronomy 30 in the UGV2

Deuteronomy 30 in the UGV3

Deuteronomy 30 in the VBL

Deuteronomy 30 in the VDCC

Deuteronomy 30 in the YALU

Deuteronomy 30 in the YAPE

Deuteronomy 30 in the YBVTP

Deuteronomy 30 in the ZBP