Exodus 38 (BOICB)

1 Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Nke ịla elu ya dị otu mita na iri sentimita atọ. Ogologo ya na obosara ya ha nʼotu. Ha dị mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ. 2 Ha rụnyekwara mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ ghọọ nke e jikọtara nʼotu. Ha jikwa bronz machie ebe ịchụ aja a. 3 Ha ji bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ. 4 Ha mere ngịga mbadamba maka ebe ịchụ aja ahụ, ihe ọkpụkpa bronz, nke ga-adị nʼokpuru oghere ọnụ ọnụ ya. 5 Ha kpụrụ mgbaka bronz ndị a ga-eji jide mkpara ndị ahụ maka akụkụ anọ nke ngịga bronz ahụ. 6 Ha mere mkpara osisi akashia ndị a, were bronz machie ha. 7 Ha mere ka mkpara ndị ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ime ka ha dịrị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ maka iji nʼebu ya. Ha ji obodobo osisi rụọ ya dịka igbe. 8 Ha ji bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya. Ọ bụ enyo nke ndị inyom ahụ ndị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka e ji kpụọ ha. 9 Ọzọ, ha mere ogige ahụ. Ịdị ogologo nke nʼakụkụ ndịda dị iri mita anọ na ise. O nwere akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee. 10 Iri ogidi abụọ ga-adị na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ. Anya nko ogidi ndị ahụ ha na ihe ikegide ha ga-abụ ọlaọcha. 11 Otu a kwa, akụkụ ugwu dịkwa iri mita anọ na ise. O nwere iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ. 12 Akụkụ ọdịda anyanwụ dị iri mita abụọ na atọ. Nwekwaa akwa mgbochi, nwere ogidi iri na ebe ndọkwasị iri, tinyere anya nko ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ. 13 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite dịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara. 14 Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ bụ ihe dị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ. 15 Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa bụ ihe dị nʼakụkụ nke ọzọ nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ 16 Akwa mgbochi niile nke ogige ahụ gburugburu bụ ezi akwa ọcha a kpara nke ọma. 17 Ogidi ọbụla nwere ihe ndọkwasị bronz. Nko niile na ihe njikọta niile ka e jikwa ọlaọcha machie. Ọ bụkwa naanị ọlaọcha ka e ji mee okporo osisi ndị ahụ. 18 Akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ bụ ihe e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee; akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ dị mita itoolu nʼogologo, yikwaa akwa mgbochi nke ebe ogige ahụ, dị mita abụọ na iri sentimita atọ nʼịdị elu. 19 Ọ bụ ogidi anọ ka e ji jidesie ha ike na ihe ndọkwasị bronz anọ, nko na okporo osisi ha niile bụ ọlaọcha. E jikwa ọlaọcha machie isi ogidi ndị ahụ. 20 Ǹtu niile nke ụlọ nzute ahụ nakwa nʼogige ya gburugburu bụ bronz ka e ji kpụọ ha. 21 Ndị a bụ ngwongwo niile e ji wuo ụlọ nzute ahụ; ebe a ga-edebe Ihe Ama ahụ. Ọ bụ ndị Livayị depụtara ihe niile ndị a nʼusoro dịka Mosis si nye ha nʼiwu. Ọ bụkwa Itama, nwa Erọn onye nchụaja, lekọtara ndị niile rụrụ ọrụ idekọta ya. 22 Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, rụzuru ihe niile dịka ONYENWE ANYỊ si nye ya Mosis nʼiwu. 23 Onye na-enyere ya aka bụ Oholiab nwa Ahisamak, onye ebo Dan, bụ onye ọka a maara aha ya, ọ bụ onye ọka ihe ọtụtụ, na onye ọka ịdụnye ihe ịchọ mma dị iche iche nʼakwa na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha. 24 Ịdị arọ nke onyinye ọlaedo niile sitere nʼaja mfufe ahụ nke ndị mmadụ wetara maka ịrụ ebe nsọ ahụ, bụ otu puku na narị kilogram ise. 25 Ịdị arọ nke ọlaọcha enwetara nʼaka ọgbakọ ahụ, bụ puku kilogram anọ, na narị kilogram isii na iri ise dịka shekel ebe nsọ si dị. 26 Ha niile tụrụ otu beka, otu isi, dịka ụtụ mgbe e kere ụtụ ọkara shekel dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị, e nyere nʼisi onye ọbụla nke gabigara nʼebe ndị a gụrụ ọnụ nọ, bụ ndị gbara iri afọ abụọ rigoo. Ọnụọgụgụ ha dị narị isii, na puku atọ, na narị ise, na iri ise. 27 Ịdị arọ nke ọlaọcha niile e ji rụọ ụkwụ ibo niile nke ebe nsọ ahụ, na ụkwụ ogidi niile e ji jidesie akwa mgbochi ndị ahụ ike bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram isii. Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji wuo ụkwụ ọbụla bụ iri kilogram atọ na isii. 28 Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji menye nko nʼibo osisi niile, na nke e ji machie okporo osisi niile, na nke e ji techie isi ogidi osisi niile, bụ iri kilogram abụọ. 29 Ịdị arọ nke bronz niile ndị mmadụ wetara dịka onyinye aja mfufe bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram atọ, na iri isii. 30 E ji bronz ndị a wuo ụkwụ ogidi niile a manyere nʼihu ụzọ e si abata ogige ụlọ nzute ahụ. E jikwa ya wuo ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpụ bronz ahụ, na ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja, 31 na ụkwụ ogidi a manyere nʼihu ụlọ nzute, na ǹtu niile e ji wuo ụlọ nzute ahụ, na ogige gbara ya gburugburu.

In Other Versions

Exodus 38 in the ANGEFD

Exodus 38 in the ANTPNG2D

Exodus 38 in the AS21

Exodus 38 in the BAGH

Exodus 38 in the BBPNG

Exodus 38 in the BBT1E

Exodus 38 in the BDS

Exodus 38 in the BEV

Exodus 38 in the BHAD

Exodus 38 in the BIB

Exodus 38 in the BLPT

Exodus 38 in the BNT

Exodus 38 in the BNTABOOT

Exodus 38 in the BNTLV

Exodus 38 in the BOATCB

Exodus 38 in the BOATCB2

Exodus 38 in the BOBCV

Exodus 38 in the BOCNT

Exodus 38 in the BOECS

Exodus 38 in the BOGWICC

Exodus 38 in the BOHCB

Exodus 38 in the BOHCV

Exodus 38 in the BOHLNT

Exodus 38 in the BOHNTLTAL

Exodus 38 in the BOILNTAP

Exodus 38 in the BOITCV

Exodus 38 in the BOKCV

Exodus 38 in the BOKCV2

Exodus 38 in the BOKHWOG

Exodus 38 in the BOKSSV

Exodus 38 in the BOLCB

Exodus 38 in the BOLCB2

Exodus 38 in the BOMCV

Exodus 38 in the BONAV

Exodus 38 in the BONCB

Exodus 38 in the BONLT

Exodus 38 in the BONUT2

Exodus 38 in the BOPLNT

Exodus 38 in the BOSCB

Exodus 38 in the BOSNC

Exodus 38 in the BOTLNT

Exodus 38 in the BOVCB

Exodus 38 in the BOYCB

Exodus 38 in the BPBB

Exodus 38 in the BPH

Exodus 38 in the BSB

Exodus 38 in the CCB

Exodus 38 in the CUV

Exodus 38 in the CUVS

Exodus 38 in the DBT

Exodus 38 in the DGDNT

Exodus 38 in the DHNT

Exodus 38 in the DNT

Exodus 38 in the ELBE

Exodus 38 in the EMTV

Exodus 38 in the ESV

Exodus 38 in the FBV

Exodus 38 in the FEB

Exodus 38 in the GGMNT

Exodus 38 in the GNT

Exodus 38 in the HARY

Exodus 38 in the HNT

Exodus 38 in the IRVA

Exodus 38 in the IRVB

Exodus 38 in the IRVG

Exodus 38 in the IRVH

Exodus 38 in the IRVK

Exodus 38 in the IRVM

Exodus 38 in the IRVM2

Exodus 38 in the IRVO

Exodus 38 in the IRVP

Exodus 38 in the IRVT

Exodus 38 in the IRVT2

Exodus 38 in the IRVU

Exodus 38 in the ISVN

Exodus 38 in the JSNT

Exodus 38 in the KAPI

Exodus 38 in the KBT1ETNIK

Exodus 38 in the KBV

Exodus 38 in the KJV

Exodus 38 in the KNFD

Exodus 38 in the LBA

Exodus 38 in the LBLA

Exodus 38 in the LNT

Exodus 38 in the LSV

Exodus 38 in the MAAL

Exodus 38 in the MBV

Exodus 38 in the MBV2

Exodus 38 in the MHNT

Exodus 38 in the MKNFD

Exodus 38 in the MNG

Exodus 38 in the MNT

Exodus 38 in the MNT2

Exodus 38 in the MRS1T

Exodus 38 in the NAA

Exodus 38 in the NASB

Exodus 38 in the NBLA

Exodus 38 in the NBS

Exodus 38 in the NBVTP

Exodus 38 in the NET2

Exodus 38 in the NIV11

Exodus 38 in the NNT

Exodus 38 in the NNT2

Exodus 38 in the NNT3

Exodus 38 in the PDDPT

Exodus 38 in the PFNT

Exodus 38 in the RMNT

Exodus 38 in the SBIAS

Exodus 38 in the SBIBS

Exodus 38 in the SBIBS2

Exodus 38 in the SBICS

Exodus 38 in the SBIDS

Exodus 38 in the SBIGS

Exodus 38 in the SBIHS

Exodus 38 in the SBIIS

Exodus 38 in the SBIIS2

Exodus 38 in the SBIIS3

Exodus 38 in the SBIKS

Exodus 38 in the SBIKS2

Exodus 38 in the SBIMS

Exodus 38 in the SBIOS

Exodus 38 in the SBIPS

Exodus 38 in the SBISS

Exodus 38 in the SBITS

Exodus 38 in the SBITS2

Exodus 38 in the SBITS3

Exodus 38 in the SBITS4

Exodus 38 in the SBIUS

Exodus 38 in the SBIVS

Exodus 38 in the SBT

Exodus 38 in the SBT1E

Exodus 38 in the SCHL

Exodus 38 in the SNT

Exodus 38 in the SUSU

Exodus 38 in the SUSU2

Exodus 38 in the SYNO

Exodus 38 in the TBIAOTANT

Exodus 38 in the TBT1E

Exodus 38 in the TBT1E2

Exodus 38 in the TFTIP

Exodus 38 in the TFTU

Exodus 38 in the TGNTATF3T

Exodus 38 in the THAI

Exodus 38 in the TNFD

Exodus 38 in the TNT

Exodus 38 in the TNTIK

Exodus 38 in the TNTIL

Exodus 38 in the TNTIN

Exodus 38 in the TNTIP

Exodus 38 in the TNTIZ

Exodus 38 in the TOMA

Exodus 38 in the TTENT

Exodus 38 in the UBG

Exodus 38 in the UGV

Exodus 38 in the UGV2

Exodus 38 in the UGV3

Exodus 38 in the VBL

Exodus 38 in the VDCC

Exodus 38 in the YALU

Exodus 38 in the YAPE

Exodus 38 in the YBVTP

Exodus 38 in the ZBP