Exodus 7 (BOICB)
1 Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Emeela m gị ka ị dịrị ka Chineke nʼebe Fero nọ. Nwanne gị Erọn ga-abụkwa onye amụma gị. 2 Ị ga-agwa Erọn ihe niile m gwara gị. Ọ ga-ekwukwa ha nʼihu Fero, rịọọ ya ka o kwere ka ụmụ Izrel hapụ ala Ijipt. 3 Ma aga m eme ka obi Fero sie ike. Ọ bụ ezie na m ga-eme ọtụtụ ihe ịrịbama nʼihe ebube nʼala Ijipt, 4 ma Fero agaghị ege unu ntị. Mgbe ahụ aga m eme ka aka m bịakwasị Ijipt. Aga m esite nʼoke ọrụ nke ikpe ọmụma dị oke egwu, mee ka ndị m, Izrel, dịka usuu ha niile si dị, site nʼala Ijipt pụọ. 5 Ndị Ijipt ga-amata nʼezie na m bụ ONYENWE ANYỊ, mgbe m setịpụrụ aka nʼIjipt, ma site nʼetiti ha kpọpụta ụmụ Izrel.” 6 Mosis na Erọn mere dịka ONYENWE ANYỊ nyere ha iwu. 7 Nʼoge a, mgbe ha gwara Fero okwu, Mosis agbaala iri afọ asatọ. Ma Erọn agbaala iri afọ asatọ na atọ. 8 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn sị, 9 “Mgbe Fero ga-agwa unu okwu sị, ‘Meenụ ihe ebube.’ Ị ga-agwa Erọn okwu sị ya, ‘Were mkpanaka gị tụpụ ya nʼala nʼihu Fero.’ Ọ ga-aghọ agwọ.” 10 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero mee dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya nʼala nʼihu Fero na ndị ozi ya. Ọ ghọrọ agwọ. 11 Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha. 12 Onye ọbụla nʼime ha tụpụrụ mkpanaka ya, nke ghọkwara agwọ. Ma mkpanaka ahụ Erọn tụpụrụ, nke ghọrọ agwọ, loro mkpanaka ndị ahụ niile ndị Ijipt tụpụrụ. 13 Fero nyịchiri obi ya, mee ka o sie ike. O geghị Erọn na Mosis ntị dịka Onyenwe anyị kwuru. 14 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Obi Fero siri ike. Ọ bụ nke a mere o ji na-aga nʼihu na-ajụ ka ndị m laa. 15 Ma otu ọ dị; nʼisi ụtụtụ echi, jekwuru Fero tupu ọ gaa nʼosimiri. Guzoro nʼakụkụ osimiri Naịl, jidekwa mkpanaka ahụ ghọrọ agwọ nʼaka gị. 16 Ị ga-agwa Fero sị, ‘ONYENWE ANYỊ, Chineke ndị Hibru, ezitela m ka m gwa gị sị, hapụ ndị m ka ha gaa nʼọzara fee m ofufe. Tutu ruo ugbu a, ị jụrụ ige ntị.’ 17 Ugbu a ONYENWE ANYỊ kwuru nke a sị, ‘Ị ga-amata site na nke a na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. Aga m ewere mkpanaka a nke m ji nʼaka tie nʼosimiri Naịl. Ọ ga-agbanwe ghọọ ọbara. 18 Azụ niile dị nʼime ya ga-anwụ. Osimiri ahụ ga-esikwa isi dịka ihe rere ure. Nke a ga-eme ka ọ bụrụ ihe rara ahụ nye ndị Ijipt ịṅụ mmiri site na ya.’ ” 19 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn ka o setịpụ mkpanaka ya nʼelu mmiri niile dị nʼIjipt. Nke a metụtara osimiri ha niile, mmiri ntakịrị ha niile, ọdọ mmiri ha niile, na ebe niile ha na-echekọta mmiri. Ọbara ga-ejupụta ebe niile nʼIjipt, ite mmiri na ite aja na ite osisi niile.” 20 Mosis na Erọn mere dị ka ONYENWE ANYỊ nyere ha nʼiwu ime. Nʼihu Fero na ndịisi ọrụ ya, Erọn weliri mkpanaka ya tie ya nʼelu mmiri dị nʼosimiri Naịl. Nʼotu ntabi anya, mmiri ahụ gbanwere ghọọ ọbara. 21 Ka azụ dị nʼime mmiri Naịl nwụsịrị, mmiri ahụ malitere na-esi isi ọjọọ, nke mere ka ndị Ijipt hapụ inwe ike ịṅụ mmiri sitere na ya. Ọbara jupụtakwara nʼala Ijipt niile. 22 Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ka mmiri chaa ọbara ọbara. Nke a mere ka Fero nyịchie obi ya. Ọ ṅaghị Mosis na Erọn ntị, dịka ONYENWE ANYỊ gwara ha na ọ ga-eme. 23 Fero tụgharịrị laghachi nʼụlọeze ya, na-echeghị echiche banyere ihe niile ahụ e mere. 24 Ya mere, ndị Ijipt niile gwuru olulu mmiri nʼakụkụ osimiri ahụ ịchọ mmiri ọṅụṅụ ebe ha na-enweghị ike ịṅụ mmiri sitere nʼosimiri Naịl. 25 Ụbọchị asaa gasịrị, site nʼụbọchị ONYENWE ANYỊ tichara ihe otiti ahụ na Naịl.
In Other Versions
Exodus 7 in the ANGEFD
Exodus 7 in the ANTPNG2D
Exodus 7 in the AS21
Exodus 7 in the BAGH
Exodus 7 in the BBPNG
Exodus 7 in the BBT1E
Exodus 7 in the BDS
Exodus 7 in the BEV
Exodus 7 in the BHAD
Exodus 7 in the BIB
Exodus 7 in the BLPT
Exodus 7 in the BNT
Exodus 7 in the BNTABOOT
Exodus 7 in the BNTLV
Exodus 7 in the BOATCB
Exodus 7 in the BOATCB2
Exodus 7 in the BOBCV
Exodus 7 in the BOCNT
Exodus 7 in the BOECS
Exodus 7 in the BOGWICC
Exodus 7 in the BOHCB
Exodus 7 in the BOHCV
Exodus 7 in the BOHLNT
Exodus 7 in the BOHNTLTAL
Exodus 7 in the BOILNTAP
Exodus 7 in the BOITCV
Exodus 7 in the BOKCV
Exodus 7 in the BOKCV2
Exodus 7 in the BOKHWOG
Exodus 7 in the BOKSSV
Exodus 7 in the BOLCB
Exodus 7 in the BOLCB2
Exodus 7 in the BOMCV
Exodus 7 in the BONAV
Exodus 7 in the BONCB
Exodus 7 in the BONLT
Exodus 7 in the BONUT2
Exodus 7 in the BOPLNT
Exodus 7 in the BOSCB
Exodus 7 in the BOSNC
Exodus 7 in the BOTLNT
Exodus 7 in the BOVCB
Exodus 7 in the BOYCB
Exodus 7 in the BPBB
Exodus 7 in the BPH
Exodus 7 in the BSB
Exodus 7 in the CCB
Exodus 7 in the CUV
Exodus 7 in the CUVS
Exodus 7 in the DBT
Exodus 7 in the DGDNT
Exodus 7 in the DHNT
Exodus 7 in the DNT
Exodus 7 in the ELBE
Exodus 7 in the EMTV
Exodus 7 in the ESV
Exodus 7 in the FBV
Exodus 7 in the FEB
Exodus 7 in the GGMNT
Exodus 7 in the GNT
Exodus 7 in the HARY
Exodus 7 in the HNT
Exodus 7 in the IRVA
Exodus 7 in the IRVB
Exodus 7 in the IRVG
Exodus 7 in the IRVH
Exodus 7 in the IRVK
Exodus 7 in the IRVM
Exodus 7 in the IRVM2
Exodus 7 in the IRVO
Exodus 7 in the IRVP
Exodus 7 in the IRVT
Exodus 7 in the IRVT2
Exodus 7 in the IRVU
Exodus 7 in the ISVN
Exodus 7 in the JSNT
Exodus 7 in the KAPI
Exodus 7 in the KBT1ETNIK
Exodus 7 in the KBV
Exodus 7 in the KJV
Exodus 7 in the KNFD
Exodus 7 in the LBA
Exodus 7 in the LBLA
Exodus 7 in the LNT
Exodus 7 in the LSV
Exodus 7 in the MAAL
Exodus 7 in the MBV
Exodus 7 in the MBV2
Exodus 7 in the MHNT
Exodus 7 in the MKNFD
Exodus 7 in the MNG
Exodus 7 in the MNT
Exodus 7 in the MNT2
Exodus 7 in the MRS1T
Exodus 7 in the NAA
Exodus 7 in the NASB
Exodus 7 in the NBLA
Exodus 7 in the NBS
Exodus 7 in the NBVTP
Exodus 7 in the NET2
Exodus 7 in the NIV11
Exodus 7 in the NNT
Exodus 7 in the NNT2
Exodus 7 in the NNT3
Exodus 7 in the PDDPT
Exodus 7 in the PFNT
Exodus 7 in the RMNT
Exodus 7 in the SBIAS
Exodus 7 in the SBIBS
Exodus 7 in the SBIBS2
Exodus 7 in the SBICS
Exodus 7 in the SBIDS
Exodus 7 in the SBIGS
Exodus 7 in the SBIHS
Exodus 7 in the SBIIS
Exodus 7 in the SBIIS2
Exodus 7 in the SBIIS3
Exodus 7 in the SBIKS
Exodus 7 in the SBIKS2
Exodus 7 in the SBIMS
Exodus 7 in the SBIOS
Exodus 7 in the SBIPS
Exodus 7 in the SBISS
Exodus 7 in the SBITS
Exodus 7 in the SBITS2
Exodus 7 in the SBITS3
Exodus 7 in the SBITS4
Exodus 7 in the SBIUS
Exodus 7 in the SBIVS
Exodus 7 in the SBT
Exodus 7 in the SBT1E
Exodus 7 in the SCHL
Exodus 7 in the SNT
Exodus 7 in the SUSU
Exodus 7 in the SUSU2
Exodus 7 in the SYNO
Exodus 7 in the TBIAOTANT
Exodus 7 in the TBT1E
Exodus 7 in the TBT1E2
Exodus 7 in the TFTIP
Exodus 7 in the TFTU
Exodus 7 in the TGNTATF3T
Exodus 7 in the THAI
Exodus 7 in the TNFD
Exodus 7 in the TNT
Exodus 7 in the TNTIK
Exodus 7 in the TNTIL
Exodus 7 in the TNTIN
Exodus 7 in the TNTIP
Exodus 7 in the TNTIZ
Exodus 7 in the TOMA
Exodus 7 in the TTENT
Exodus 7 in the UBG
Exodus 7 in the UGV
Exodus 7 in the UGV2
Exodus 7 in the UGV3
Exodus 7 in the VBL
Exodus 7 in the VDCC
Exodus 7 in the YALU
Exodus 7 in the YAPE
Exodus 7 in the YBVTP
Exodus 7 in the ZBP