Ezekiel 3 (BOICB)

1 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe a m gaje inye gị. Taa akwụkwọ a a fụkọrọ afụkọ; pụọ gaa gwa ụmụ Izrel okwu.” 2 Ya mere, a saghere m ọnụ m, o nyere m akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ ka m rie. 3 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, taa akwụkwọ a niile m nyere gị, tajuo ya afọ gị.” Atara m ya. Ma mgbe m na-ata ya, ọ tọrọ m ụtọ nʼọnụ dịka a ga-asị na ọ bụ mmanụ aṅụ. 4 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie jekwuru ụmụ Izrel gwa ha okwu m niile. 5 Nʼihi na-ezighị m gị ka i jekwuru mba ndị okwu ha edoghị anya na ndị a naghị aghọta asụsụ ha, kama ọ bụ ijekwuru ụlọ Izrel. 6 Ezikwaghị m gị ka i jekwuru mba nwere asụsụ na-edoghị anya, nke ị na-adịghị aghọta okwu ha. Nʼihi na a sị na ọ bụ ndị dị otu a ka m zigara gị ka i jekwuru, ha gaara ege gị ntị. 7 Ma ụlọ Izrel agaghị ekwe gee gị ntị, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị. Nʼihi na ụlọ Izrel bụ ndị obi ha siri ike, na ndị isiike. 8 Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha. 9 Aga m emekwa ka egedege ihu gị dị ka nkume siri ike, sie ike karịa nkume. Nʼihi ya, atụla ha egwu; ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-enupu isi, ma atụla ihu ha egwu.” 10 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gee ntị nke ọma nʼokwu ndị a niile m na-agwa gị, tinyekwa ha nʼuche gị. 11 Jekwuru ndị gị a dọtara nʼagha nọ na mba ọzọ, sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu,’ Gwa ha ya, ma ha gere gị ntị ma ha egeghị gị ntị.” 12 Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ buliri m elu. Anụrụ m olu mere oke ụzụ nʼazụ m, mgbe ebube nke ONYENWE ANYỊ sị nʼọnọdụ ya bilie. 13 Ọ bụ ụzụ nke nku ihe ndị ahụ dị ndụ na-eme mgbe ha na-emetụrịta nku ibe ha; ọ bụkwa ụzụ ụkwụ wịịlu ha nke dị nʼakụkụ ha. 14 Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka ONYENWE ANYỊ dịkwa ike nʼahụ m. 15 A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma. 16 Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu ONYENWE ANYỊ bịakwutere m, 17 “Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị. 18 Mgbe m na-asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma ọ bụrụ na ị dọghị ya aka na ntị, maọbụ ị kwughị okwu ime ka ha chigharịa site nʼụzọ ọjọọ ha niile pụta nʼihi ịzọpụta ndụ ha, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha. 19 Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị, ma ha esighị nʼajọ omume maọbụ nʼụzọ ọjọọ ha niile chigharịa, ha ga-anwụ nʼihi mmehie, ma ndụ gị ka ị zọpụtara. 20 “Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼụzọ ezi omume ya wezuga onwe ya bido ime ihe ọjọọ, m siere ha ọnya, ha ga-anwụ nʼihi na ị dọghị ha aka na ntị, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha. Agaghịkwa echeta ihe ọma niile ndị ha mere, ma ị ga-aza ajụjụ maka ọnwụ ha. 21 Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka na ntị ka ọ ghara ime mmehie, ha gharakwa ime mmehie, ha ga-adị ndụ nʼihi na ha nabatara ịdọ aka na ntị ahụ. Gị onwe gị azọpụtakwala ndụ gị, nʼụzọ dị otu a.” 22 Aka ONYENWE ANYỊ dịgidesịrị ike nʼahụ m nʼebe ahụ. Ma ọ sịrị m, “Bilie gaa nʼebe ahụ obosara ala dị ka m gwa gị okwu nʼebe ahụ,” 23 Ebiliri m gaa nʼebe ahụ ala dị larịị. Ebube Onyenwe anyị guzo nʼebe ahụ dịka ebube nke m hụrụ nʼakụkụ iyi Keba. Adara m kpuo ihu m nʼala. 24 Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ banyere nʼime m mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Ọ gwara m okwu sị m, “Gaa, baa nʼụlọ, mechibido onwe gị ụzọ. 25 Ma gị, nwa nke mmadụ, a ga-eji ụdọ kee gị ka ị ghara inwe ike ịpụ gaa nʼetiti ndị mmadụ. 26 Aga m eme ka ire gị rapara nʼakpo ọnụ gị, ka ị ghọọ onye ogbi, gharakwa ịbụ onye na-adọ ha aka na ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi. 27 Ma mgbe ọbụla m ziri gị ozi, aga m atọghepụ ire gị. Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru.’ Ka onye nwere ntị nụrụ, ka onye nke na-achọghị ịnụ ghara ịnụ, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.

In Other Versions

Ezekiel 3 in the ANGEFD

Ezekiel 3 in the ANTPNG2D

Ezekiel 3 in the AS21

Ezekiel 3 in the BAGH

Ezekiel 3 in the BBPNG

Ezekiel 3 in the BBT1E

Ezekiel 3 in the BDS

Ezekiel 3 in the BEV

Ezekiel 3 in the BHAD

Ezekiel 3 in the BIB

Ezekiel 3 in the BLPT

Ezekiel 3 in the BNT

Ezekiel 3 in the BNTABOOT

Ezekiel 3 in the BNTLV

Ezekiel 3 in the BOATCB

Ezekiel 3 in the BOATCB2

Ezekiel 3 in the BOBCV

Ezekiel 3 in the BOCNT

Ezekiel 3 in the BOECS

Ezekiel 3 in the BOGWICC

Ezekiel 3 in the BOHCB

Ezekiel 3 in the BOHCV

Ezekiel 3 in the BOHLNT

Ezekiel 3 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 3 in the BOILNTAP

Ezekiel 3 in the BOITCV

Ezekiel 3 in the BOKCV

Ezekiel 3 in the BOKCV2

Ezekiel 3 in the BOKHWOG

Ezekiel 3 in the BOKSSV

Ezekiel 3 in the BOLCB

Ezekiel 3 in the BOLCB2

Ezekiel 3 in the BOMCV

Ezekiel 3 in the BONAV

Ezekiel 3 in the BONCB

Ezekiel 3 in the BONLT

Ezekiel 3 in the BONUT2

Ezekiel 3 in the BOPLNT

Ezekiel 3 in the BOSCB

Ezekiel 3 in the BOSNC

Ezekiel 3 in the BOTLNT

Ezekiel 3 in the BOVCB

Ezekiel 3 in the BOYCB

Ezekiel 3 in the BPBB

Ezekiel 3 in the BPH

Ezekiel 3 in the BSB

Ezekiel 3 in the CCB

Ezekiel 3 in the CUV

Ezekiel 3 in the CUVS

Ezekiel 3 in the DBT

Ezekiel 3 in the DGDNT

Ezekiel 3 in the DHNT

Ezekiel 3 in the DNT

Ezekiel 3 in the ELBE

Ezekiel 3 in the EMTV

Ezekiel 3 in the ESV

Ezekiel 3 in the FBV

Ezekiel 3 in the FEB

Ezekiel 3 in the GGMNT

Ezekiel 3 in the GNT

Ezekiel 3 in the HARY

Ezekiel 3 in the HNT

Ezekiel 3 in the IRVA

Ezekiel 3 in the IRVB

Ezekiel 3 in the IRVG

Ezekiel 3 in the IRVH

Ezekiel 3 in the IRVK

Ezekiel 3 in the IRVM

Ezekiel 3 in the IRVM2

Ezekiel 3 in the IRVO

Ezekiel 3 in the IRVP

Ezekiel 3 in the IRVT

Ezekiel 3 in the IRVT2

Ezekiel 3 in the IRVU

Ezekiel 3 in the ISVN

Ezekiel 3 in the JSNT

Ezekiel 3 in the KAPI

Ezekiel 3 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 3 in the KBV

Ezekiel 3 in the KJV

Ezekiel 3 in the KNFD

Ezekiel 3 in the LBA

Ezekiel 3 in the LBLA

Ezekiel 3 in the LNT

Ezekiel 3 in the LSV

Ezekiel 3 in the MAAL

Ezekiel 3 in the MBV

Ezekiel 3 in the MBV2

Ezekiel 3 in the MHNT

Ezekiel 3 in the MKNFD

Ezekiel 3 in the MNG

Ezekiel 3 in the MNT

Ezekiel 3 in the MNT2

Ezekiel 3 in the MRS1T

Ezekiel 3 in the NAA

Ezekiel 3 in the NASB

Ezekiel 3 in the NBLA

Ezekiel 3 in the NBS

Ezekiel 3 in the NBVTP

Ezekiel 3 in the NET2

Ezekiel 3 in the NIV11

Ezekiel 3 in the NNT

Ezekiel 3 in the NNT2

Ezekiel 3 in the NNT3

Ezekiel 3 in the PDDPT

Ezekiel 3 in the PFNT

Ezekiel 3 in the RMNT

Ezekiel 3 in the SBIAS

Ezekiel 3 in the SBIBS

Ezekiel 3 in the SBIBS2

Ezekiel 3 in the SBICS

Ezekiel 3 in the SBIDS

Ezekiel 3 in the SBIGS

Ezekiel 3 in the SBIHS

Ezekiel 3 in the SBIIS

Ezekiel 3 in the SBIIS2

Ezekiel 3 in the SBIIS3

Ezekiel 3 in the SBIKS

Ezekiel 3 in the SBIKS2

Ezekiel 3 in the SBIMS

Ezekiel 3 in the SBIOS

Ezekiel 3 in the SBIPS

Ezekiel 3 in the SBISS

Ezekiel 3 in the SBITS

Ezekiel 3 in the SBITS2

Ezekiel 3 in the SBITS3

Ezekiel 3 in the SBITS4

Ezekiel 3 in the SBIUS

Ezekiel 3 in the SBIVS

Ezekiel 3 in the SBT

Ezekiel 3 in the SBT1E

Ezekiel 3 in the SCHL

Ezekiel 3 in the SNT

Ezekiel 3 in the SUSU

Ezekiel 3 in the SUSU2

Ezekiel 3 in the SYNO

Ezekiel 3 in the TBIAOTANT

Ezekiel 3 in the TBT1E

Ezekiel 3 in the TBT1E2

Ezekiel 3 in the TFTIP

Ezekiel 3 in the TFTU

Ezekiel 3 in the TGNTATF3T

Ezekiel 3 in the THAI

Ezekiel 3 in the TNFD

Ezekiel 3 in the TNT

Ezekiel 3 in the TNTIK

Ezekiel 3 in the TNTIL

Ezekiel 3 in the TNTIN

Ezekiel 3 in the TNTIP

Ezekiel 3 in the TNTIZ

Ezekiel 3 in the TOMA

Ezekiel 3 in the TTENT

Ezekiel 3 in the UBG

Ezekiel 3 in the UGV

Ezekiel 3 in the UGV2

Ezekiel 3 in the UGV3

Ezekiel 3 in the VBL

Ezekiel 3 in the VDCC

Ezekiel 3 in the YALU

Ezekiel 3 in the YAPE

Ezekiel 3 in the YBVTP

Ezekiel 3 in the ZBP