Ezekiel 32 (BOICB)

1 Nʼafọ nke iri na abụọ, nʼọnwa nke iri na abụọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke ONYENWE ANYỊ rutere m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, buliere Fero bụ eze Ijipt, abụ akwa sị ya,“ ‘Ị dị ka ọdụm nʼetiti mba niile.Ị dịkwa ka ogologo anụ ọjọọ na-anọ nʼosimiri.I na-akpụgharị onwe gị nʼime mmiri.I ji ụkwụ abụọ na-agbarụ mmiri,na-emekwa ka mmiri iyi niile gbarụọ. 3 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị,“ ‘Aga m eji ọtụtụ ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụgbasaa ụgbụ m nʼelu gị.Ha ga-adọkpụkwara gị nʼime ụgbụ m. 4 Aga m atụsa gị nʼala,nʼọhịa ka m ga-atụfukwa gị,meekwa ka ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe bekwasị gị.Aga m emekwa ka anụ ọhịa nke ụwa niile rijuo afọ nʼanụ ahụ gị. 5 Aga m tụsasịkwa anụ ahụ gị nʼugwu niile,werekwa ihe ọbụla fọdụrụ nʼime gị mejuo ndagwurugwu niile. 6 M ga-eji ọbara gị na-asọ asọ dee ala niile dịka mmiriọ bụladị ruo nʼugwu niile,ebe niile mmiri si erufe ga-ejupụtakwa nʼanụ ahụ gị. 7 Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe,meekwa ka kpakpando niile jie nji.Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ,ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. 8 Ihe niile nke na-enye ìhè nʼeluigweka m ga-eme ka ha jie nji nʼelu gị,mee ka ọchịchịrị gbachie nʼala gị niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 9 Aga m eweta obi mgbawa nʼetiti ndị mmadụ dị iche ichemgbe m ga-eme ka mbibi gị bịa nʼetiti mba niilenʼime ala dị iche iche nke ị na-amaghị. 10 Aga m eme ka i ju ọtụtụ ndị mmadụ anya,ndị eze ha ga-ama jijiji nʼụjọ maka gịmgbe m ga-efegharị mma agha m nʼihu ha.Onye ọbụla nʼime ha ga-ama jijijina ntabi anya ọbụla nʼihi ndụ yanʼụbọchị ahụ, ị ga-ada. 11 “ ‘Nʼihi na nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru,“ ‘Mma agha nke eze Babilọnga-abịakwasị gị. 12 Usuu ndị agha gị ga-adakwa nʼihu mma aghanke ndị dị ike,bụ ndị mba ahụ kachasị mba niile njọ.Nganga niile nke Ijipt na ndị ya, ka ha ga-egwepịa.Ha ga-akwatu usuu ndị agha ha niile. 13 Aga m emekwa ka anụmanụ ya niile,nke na-ata ahịhịa nʼakụkụ mmiri laa nʼiyi.Ụkwụ mmadụ, na ụkwụ anụmanụagakwaghị agbarụ mmiri ahụ ọzọ. 14 Nʼihi ya, mmiri niile nke ya ga-adị ọcha,na-asọkwa dịka mmanụ.Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru. 15 Mgbe m bibiri Ijipt,kpochapụkwa ihe niile dị nʼime ya,mgbe m tidara ndị niile bi nʼime ya,ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’ 16 “Nke a bụ abụ akwa ha ga-abụrụ ya. Ndị inyom mba dị iche iche ga-abụ ya. Ha ga-abụ ya nʼihi Ijipt na usuu ndị agha ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.” 17 Nʼafọ nke iri na abụọ ahụ, nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa ahụ, okwu nke ONYENWE ANYỊ rutere m ntị sị, 18 “Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa nʼihi usuu ndị agha Ijipt niile, wezuga ha baa nʼokpuru ụwa ma ndị inyom mba dị iche iche dị ukwuu, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. 19 Gwa ha okwu sị ha, ‘Unu o nwere ihuọma karịa ndị ọzọ? Lee, ihe na-eche gị bụ olulu. Ọ bụkwa ndị a na-ebighị ugwu ka ị ga-edinakwuru.’ 20 Nʼetiti ndị e ji mma agha gbuo ka ha ga-ada. Amịpụtala mma agha maka ya, ka a dọkpụrụ ya na igwe ndị ya niile pụọ. 21 Ndị dike nke ndị ndu dike ga-esite nʼala mmụọ kwuo banyere Ijipt na ndị niile ha na ya dị na mma, ‘Ha arịdatala, ha na-edina ala ha na ndị a na-ebighị ugwu, nakwa ndị niile ahụ e ji mma agha gbuo.’ 22 “Nʼebe ahụ ka Asịrịa na ndị agha ya niile nọ; ili ndị niile o gburu egbu gbara ya gburugburu, bụ ndị niile nwụrụ site na mma agha. 23 Ili ha dị na nsọtụ niile nke olulu, ndị agha ya niile gbakwara ili ya gburugburu. E gbudala ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. Ndị a nwụrụ site na mma agha. 24 “Nʼebe ahụ ka Elam na usuu ndị agha ya nọ gbaa ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị e gburu egbu, ndị nwụrụ site na mma agha. Ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ arịdaruola nʼolulu ahụ dịka ndị a na-ebighị ugwu. Ha esorola ndị ahụ rịdaruru nʼala mmụọ keta oke nʼihere dịrị ha. 25 E meere ya ebe ndina nʼetiti ndị nwụrụ anwụ. Igwe mmadụ ya nwụrụ anwụ gbakwara ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na-emere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ, ma ha na-eburu ihere ha, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ha bụ ndị e debere nʼetiti ndị nwụrụ anwụ. 26 “Meshek na Tubal nọkwa nʼebe ahụ, ha na usuu ndị agha ha niile, gburugburu ili ha. Ha niile bụkwa ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na ha mere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ. 27 Ugbu a, e likọọla ha na ndị a na-ebighị ugwu, bụ ndị dike nʼagha, ndị nwụrụ anwụ, ndị ji ngwa agha ha gbadaa nʼime ili ha, ndị e hinyere ngwa agha ha nʼokpuru isi ha, ebe ọta ha dịkwasịrị nʼọkpụkpụ mgbe e tinyere ha nʼili. Ma nʼezie, ndị a bụ dike nʼagha mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. 28 “Ma gị onwe gị, bụ Fero, otu a ka a ga-esi gbajie gị, ị ga-edinakwa nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị e ji mma agha gbuo. 29 “Nʼebe ahụ ka Edọm na ndị eze ya, na ndịisi ya niile nọ. Nʼagbanyeghị ịdị ike ha, ha na ndị e ji mma agha gbuo tọgbọrọ nʼebe ahụ. Ha na ndị a na-ebighị ugwu so dinaa, bụ ndị na-arịdaru nʼolulu. 30 “Ndịisi nke mba ndị ugwu, na ndị Saịdọn niile nọ nʼebe ahụ. Ụjọ niile nke ha sitere nʼisiike ha menye ndị mmadụ egbochighị ha iketa oke nʼihere nke iso ndị e gburu egbu nwụọ. Ha soro ndị eji mma agha gbuo dinaa na-ebighị ugwu, buru ihere ha, ha na-arịdaru nʼolulu. 31 “Fero na ndị agha ya niile ga-ahụ ndị a, ọ ga-enwe nkasiobi maka ndị ya niile, na usuu ndị agha ya niile ndị eji mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 32 Nʼagbanyeghị na emeela m ka ọ gbasaa ụjọ nʼala ndị dị ndụ, Fero na igwe mmadụ a niile ka a ga-eli nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, ya na ndị ejiri mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.”

In Other Versions

Ezekiel 32 in the ANGEFD

Ezekiel 32 in the ANTPNG2D

Ezekiel 32 in the AS21

Ezekiel 32 in the BAGH

Ezekiel 32 in the BBPNG

Ezekiel 32 in the BBT1E

Ezekiel 32 in the BDS

Ezekiel 32 in the BEV

Ezekiel 32 in the BHAD

Ezekiel 32 in the BIB

Ezekiel 32 in the BLPT

Ezekiel 32 in the BNT

Ezekiel 32 in the BNTABOOT

Ezekiel 32 in the BNTLV

Ezekiel 32 in the BOATCB

Ezekiel 32 in the BOATCB2

Ezekiel 32 in the BOBCV

Ezekiel 32 in the BOCNT

Ezekiel 32 in the BOECS

Ezekiel 32 in the BOGWICC

Ezekiel 32 in the BOHCB

Ezekiel 32 in the BOHCV

Ezekiel 32 in the BOHLNT

Ezekiel 32 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 32 in the BOILNTAP

Ezekiel 32 in the BOITCV

Ezekiel 32 in the BOKCV

Ezekiel 32 in the BOKCV2

Ezekiel 32 in the BOKHWOG

Ezekiel 32 in the BOKSSV

Ezekiel 32 in the BOLCB

Ezekiel 32 in the BOLCB2

Ezekiel 32 in the BOMCV

Ezekiel 32 in the BONAV

Ezekiel 32 in the BONCB

Ezekiel 32 in the BONLT

Ezekiel 32 in the BONUT2

Ezekiel 32 in the BOPLNT

Ezekiel 32 in the BOSCB

Ezekiel 32 in the BOSNC

Ezekiel 32 in the BOTLNT

Ezekiel 32 in the BOVCB

Ezekiel 32 in the BOYCB

Ezekiel 32 in the BPBB

Ezekiel 32 in the BPH

Ezekiel 32 in the BSB

Ezekiel 32 in the CCB

Ezekiel 32 in the CUV

Ezekiel 32 in the CUVS

Ezekiel 32 in the DBT

Ezekiel 32 in the DGDNT

Ezekiel 32 in the DHNT

Ezekiel 32 in the DNT

Ezekiel 32 in the ELBE

Ezekiel 32 in the EMTV

Ezekiel 32 in the ESV

Ezekiel 32 in the FBV

Ezekiel 32 in the FEB

Ezekiel 32 in the GGMNT

Ezekiel 32 in the GNT

Ezekiel 32 in the HARY

Ezekiel 32 in the HNT

Ezekiel 32 in the IRVA

Ezekiel 32 in the IRVB

Ezekiel 32 in the IRVG

Ezekiel 32 in the IRVH

Ezekiel 32 in the IRVK

Ezekiel 32 in the IRVM

Ezekiel 32 in the IRVM2

Ezekiel 32 in the IRVO

Ezekiel 32 in the IRVP

Ezekiel 32 in the IRVT

Ezekiel 32 in the IRVT2

Ezekiel 32 in the IRVU

Ezekiel 32 in the ISVN

Ezekiel 32 in the JSNT

Ezekiel 32 in the KAPI

Ezekiel 32 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 32 in the KBV

Ezekiel 32 in the KJV

Ezekiel 32 in the KNFD

Ezekiel 32 in the LBA

Ezekiel 32 in the LBLA

Ezekiel 32 in the LNT

Ezekiel 32 in the LSV

Ezekiel 32 in the MAAL

Ezekiel 32 in the MBV

Ezekiel 32 in the MBV2

Ezekiel 32 in the MHNT

Ezekiel 32 in the MKNFD

Ezekiel 32 in the MNG

Ezekiel 32 in the MNT

Ezekiel 32 in the MNT2

Ezekiel 32 in the MRS1T

Ezekiel 32 in the NAA

Ezekiel 32 in the NASB

Ezekiel 32 in the NBLA

Ezekiel 32 in the NBS

Ezekiel 32 in the NBVTP

Ezekiel 32 in the NET2

Ezekiel 32 in the NIV11

Ezekiel 32 in the NNT

Ezekiel 32 in the NNT2

Ezekiel 32 in the NNT3

Ezekiel 32 in the PDDPT

Ezekiel 32 in the PFNT

Ezekiel 32 in the RMNT

Ezekiel 32 in the SBIAS

Ezekiel 32 in the SBIBS

Ezekiel 32 in the SBIBS2

Ezekiel 32 in the SBICS

Ezekiel 32 in the SBIDS

Ezekiel 32 in the SBIGS

Ezekiel 32 in the SBIHS

Ezekiel 32 in the SBIIS

Ezekiel 32 in the SBIIS2

Ezekiel 32 in the SBIIS3

Ezekiel 32 in the SBIKS

Ezekiel 32 in the SBIKS2

Ezekiel 32 in the SBIMS

Ezekiel 32 in the SBIOS

Ezekiel 32 in the SBIPS

Ezekiel 32 in the SBISS

Ezekiel 32 in the SBITS

Ezekiel 32 in the SBITS2

Ezekiel 32 in the SBITS3

Ezekiel 32 in the SBITS4

Ezekiel 32 in the SBIUS

Ezekiel 32 in the SBIVS

Ezekiel 32 in the SBT

Ezekiel 32 in the SBT1E

Ezekiel 32 in the SCHL

Ezekiel 32 in the SNT

Ezekiel 32 in the SUSU

Ezekiel 32 in the SUSU2

Ezekiel 32 in the SYNO

Ezekiel 32 in the TBIAOTANT

Ezekiel 32 in the TBT1E

Ezekiel 32 in the TBT1E2

Ezekiel 32 in the TFTIP

Ezekiel 32 in the TFTU

Ezekiel 32 in the TGNTATF3T

Ezekiel 32 in the THAI

Ezekiel 32 in the TNFD

Ezekiel 32 in the TNT

Ezekiel 32 in the TNTIK

Ezekiel 32 in the TNTIL

Ezekiel 32 in the TNTIN

Ezekiel 32 in the TNTIP

Ezekiel 32 in the TNTIZ

Ezekiel 32 in the TOMA

Ezekiel 32 in the TTENT

Ezekiel 32 in the UBG

Ezekiel 32 in the UGV

Ezekiel 32 in the UGV2

Ezekiel 32 in the UGV3

Ezekiel 32 in the VBL

Ezekiel 32 in the VDCC

Ezekiel 32 in the YALU

Ezekiel 32 in the YAPE

Ezekiel 32 in the YBVTP

Ezekiel 32 in the ZBP