Genesis 11 (BOICB)

1 Nʼoge ahụ, ụwa niile nwere naanị otu asụsụ, okwu niile bụkwa otu. 2 Mgbe ndị mmadụ gbasara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ha chọtara ala dị larịị na Shaịna biri nʼebe ahụ. 3 Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Bịanụ ka anyị kpụọ brik, kpọọ ha ọkụ nke ọma.” Ya mere, ha kpụrụ brik kama nkume, jirikwa bitumen kama ụrọ. 4 Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị wuore onwe anyị obodo na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru nʼeluigwe, ka anyị si otu a meere onwe anyị aha, ka anyị ghara ịbụ ndị a ga-agbasa nʼụwa niile.” 5 ONYENWE ANYỊ rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu. 6 ONYENWE ANYỊ sịrị, “Lee! Ọ bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime. 7 Ngwa, ka anyị rịda gaa gbarụọ asụsụ ha, ka onye o bụla ghara ịghọta asụsụ ibe ya.” 8 ONYENWE ANYỊ mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ. 9 Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka ONYENWE ANYỊ wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka ONYENWE ANYỊ si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum. 10 Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Shem. Mgbe afọ abụọ gafechara site nʼoge uju mmiri ahụ, nʼoge Shem gbara narị afọ, ọ mụtara Apakshad. 11 Shem dịrị ndụ, mgbe ọ mụsịrị Apakshad, narị afọ ise ọzọ, mụtakwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 12 Mgbe Apakshad gbara iri afọ atọ na ise, ọ mụtara Shela. 13 Mgbe ọ mụchara Shela, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 14 Shela gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ nwa ya nwoke Eba. 15 Mgbe ọ ghọrọ nna Eba, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 16 Eba gbara iri afọ atọ na anọ mgbe ọ mụrụ Peleg. 17 Mgbe ọ ghọrọ nna Peleg, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na iri atọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 18 Peleg gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Reu. 19 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Reu, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na itoolu ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 20 Reu gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ mụrụ Serug. 21 Emesịa, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na asaa ọzọ, mgbe ọ mụsịrị Serug, ọ mụtakwara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 22 Serug gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Nahọ. 23 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Nahọ, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 24 Nahọ gbara iri afọ abụọ na itoolu mgbe ọ mụrụ Tera. 25 Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Tera, ọ dịrị ndụ narị afọ na afọ iri na itoolu ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 26 Mgbe Tera gbara iri afọ asaa, ọ ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. 27 Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera. Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt. 28 Haran nwụrụ nʼihu nna ya Tera nʼala ebe a nọ mụọ ya, nke bụ na Ụọ, obodo ndị Kaldịa. 29 Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska. 30 Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla. 31 Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran, na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ. 32 Ọ bụ nʼobodo Haran ka Tera nọ nwụọ, mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise.

In Other Versions

Genesis 11 in the ANGEFD

Genesis 11 in the ANTPNG2D

Genesis 11 in the AS21

Genesis 11 in the BAGH

Genesis 11 in the BBPNG

Genesis 11 in the BBT1E

Genesis 11 in the BDS

Genesis 11 in the BEV

Genesis 11 in the BHAD

Genesis 11 in the BIB

Genesis 11 in the BLPT

Genesis 11 in the BNT

Genesis 11 in the BNTABOOT

Genesis 11 in the BNTLV

Genesis 11 in the BOATCB

Genesis 11 in the BOATCB2

Genesis 11 in the BOBCV

Genesis 11 in the BOCNT

Genesis 11 in the BOECS

Genesis 11 in the BOGWICC

Genesis 11 in the BOHCB

Genesis 11 in the BOHCV

Genesis 11 in the BOHLNT

Genesis 11 in the BOHNTLTAL

Genesis 11 in the BOILNTAP

Genesis 11 in the BOITCV

Genesis 11 in the BOKCV

Genesis 11 in the BOKCV2

Genesis 11 in the BOKHWOG

Genesis 11 in the BOKSSV

Genesis 11 in the BOLCB

Genesis 11 in the BOLCB2

Genesis 11 in the BOMCV

Genesis 11 in the BONAV

Genesis 11 in the BONCB

Genesis 11 in the BONLT

Genesis 11 in the BONUT2

Genesis 11 in the BOPLNT

Genesis 11 in the BOSCB

Genesis 11 in the BOSNC

Genesis 11 in the BOTLNT

Genesis 11 in the BOVCB

Genesis 11 in the BOYCB

Genesis 11 in the BPBB

Genesis 11 in the BPH

Genesis 11 in the BSB

Genesis 11 in the CCB

Genesis 11 in the CUV

Genesis 11 in the CUVS

Genesis 11 in the DBT

Genesis 11 in the DGDNT

Genesis 11 in the DHNT

Genesis 11 in the DNT

Genesis 11 in the ELBE

Genesis 11 in the EMTV

Genesis 11 in the ESV

Genesis 11 in the FBV

Genesis 11 in the FEB

Genesis 11 in the GGMNT

Genesis 11 in the GNT

Genesis 11 in the HARY

Genesis 11 in the HNT

Genesis 11 in the IRVA

Genesis 11 in the IRVB

Genesis 11 in the IRVG

Genesis 11 in the IRVH

Genesis 11 in the IRVK

Genesis 11 in the IRVM

Genesis 11 in the IRVM2

Genesis 11 in the IRVO

Genesis 11 in the IRVP

Genesis 11 in the IRVT

Genesis 11 in the IRVT2

Genesis 11 in the IRVU

Genesis 11 in the ISVN

Genesis 11 in the JSNT

Genesis 11 in the KAPI

Genesis 11 in the KBT1ETNIK

Genesis 11 in the KBV

Genesis 11 in the KJV

Genesis 11 in the KNFD

Genesis 11 in the LBA

Genesis 11 in the LBLA

Genesis 11 in the LNT

Genesis 11 in the LSV

Genesis 11 in the MAAL

Genesis 11 in the MBV

Genesis 11 in the MBV2

Genesis 11 in the MHNT

Genesis 11 in the MKNFD

Genesis 11 in the MNG

Genesis 11 in the MNT

Genesis 11 in the MNT2

Genesis 11 in the MRS1T

Genesis 11 in the NAA

Genesis 11 in the NASB

Genesis 11 in the NBLA

Genesis 11 in the NBS

Genesis 11 in the NBVTP

Genesis 11 in the NET2

Genesis 11 in the NIV11

Genesis 11 in the NNT

Genesis 11 in the NNT2

Genesis 11 in the NNT3

Genesis 11 in the PDDPT

Genesis 11 in the PFNT

Genesis 11 in the RMNT

Genesis 11 in the SBIAS

Genesis 11 in the SBIBS

Genesis 11 in the SBIBS2

Genesis 11 in the SBICS

Genesis 11 in the SBIDS

Genesis 11 in the SBIGS

Genesis 11 in the SBIHS

Genesis 11 in the SBIIS

Genesis 11 in the SBIIS2

Genesis 11 in the SBIIS3

Genesis 11 in the SBIKS

Genesis 11 in the SBIKS2

Genesis 11 in the SBIMS

Genesis 11 in the SBIOS

Genesis 11 in the SBIPS

Genesis 11 in the SBISS

Genesis 11 in the SBITS

Genesis 11 in the SBITS2

Genesis 11 in the SBITS3

Genesis 11 in the SBITS4

Genesis 11 in the SBIUS

Genesis 11 in the SBIVS

Genesis 11 in the SBT

Genesis 11 in the SBT1E

Genesis 11 in the SCHL

Genesis 11 in the SNT

Genesis 11 in the SUSU

Genesis 11 in the SUSU2

Genesis 11 in the SYNO

Genesis 11 in the TBIAOTANT

Genesis 11 in the TBT1E

Genesis 11 in the TBT1E2

Genesis 11 in the TFTIP

Genesis 11 in the TFTU

Genesis 11 in the TGNTATF3T

Genesis 11 in the THAI

Genesis 11 in the TNFD

Genesis 11 in the TNT

Genesis 11 in the TNTIK

Genesis 11 in the TNTIL

Genesis 11 in the TNTIN

Genesis 11 in the TNTIP

Genesis 11 in the TNTIZ

Genesis 11 in the TOMA

Genesis 11 in the TTENT

Genesis 11 in the UBG

Genesis 11 in the UGV

Genesis 11 in the UGV2

Genesis 11 in the UGV3

Genesis 11 in the VBL

Genesis 11 in the VDCC

Genesis 11 in the YALU

Genesis 11 in the YAPE

Genesis 11 in the YBVTP

Genesis 11 in the ZBP