Genesis 14 (BOICB)

1 Nʼoge ahụ kwa, Amrafel, eze Shaịna, na Ariok, eze ndị Elasa, na Kedoloma eze Elam, na Tidal eze Goiim, 2 buru agha megide Bera eze Sọdọm, na Biasha eze Gọmọra, na Shịnab, eze Adma, na Shemeba eze Zeboiim, na eze obodo Bela (ya bụ Zoa). 3 Ndị eze obodo ndị a: Sọdọm, Gọmọra, Adma, Zeboiim na Bela, jikọtara ndị agha ha ọnụ na Ndagwurugwu Sidim (ya bụ, ndagwurugwu osimiri nnu ahụ). 4 Ha fere ofufe nʼokpuru ọchịchị eze Kedoloma afọ iri na abụọ, ma nʼafọ nke iri na atọ, ha nupuru isi. 5 Nʼafọ nke iri na anọ, eze Kedoloma na ndị eze ya na ha jikọrọ ọnụ buru agha megide ma merie ndị Refaim bi nʼAshterọt Kenaim na ndị Zuzim bi na Ham na ndị Emim bi Kiriatem na Shave, 6 na ndị Hor nʼobodo ugwu Sia, ruo obodo El Paran, nke dị nʼakụkụ ọzara. 7 Mgbe ahụ, ha chigharịrị azụ gaa En Mishpat (ya bụ Kadesh). Ha meriri ala niile nke ndị Amalek nakwa ndị Amọrait bi na Hazezọn Tama. 8 Mgbe ahụ kwa, ndị agha ndị eze obodo Sọdọm na eze Gọmọra, na eze Adma, na eze Zeboiim, na eze Bela (ya bụ Zoa) pụrụ doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Sidim, 9 imegide Kedoloma eze Elam, Tidal eze Goiim, Amrafel eze Shaịna na Ariok eze Elasa. Ya bụ eze ise buru agha megide eze anọ. 10 Ma Ndagwurugwu Sidim jupụtara nʼolulu apịtị. Mgbe ndị agha eze Sọdọm na Gọmọra bidoro ịgba ọsọ. Ụfọdụ nʼime ha dabanyere nʼime olulu ndị a, ma ndị fọdụrụ gbapụrụ ọsọ gbaga nʼugwu. 11 Ma eze anọ ndị a banyere nʼime obodo Sọdọm na Gọmọra bukọrọ akụ ha, na ihe oriri ha niile laa. 12 Ha buuru Lọt, nwa nwanne Ebram, onye bi na Sọdọm na ihe niile o nwere, buru ha na-ala ebe ha si bịa. 13 Ma otu onye gbara ọsọ ndụ site nʼebe ahụ gara kọọrọ Ebram onye Hibru ihe mere. Nʼoge a, Ebram bi nʼebe dị nso nʼosisi ukwu nke Mamre, onye Amọrị, nwanne Eshkọl na Anea, ndị ha na Ebram gbara ndụ. 14 Mgbe Ebram nụrụ na adọrọla Lọt nwa nwanne ya nʼagha, ọ kpọkọtara ndị ikom a zụrụ azụ na-ejere ya ozi, ndị a mụrụ nʼụlọ ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom atọ na iri na asatọ, ha chụrụ ndị agha ahụ ọsọ tutu ha erute Dan. 15 Nʼabalị, Ebram kere ndị agha ya ibuso ndị ahụ agha. O meriri ha, chụọ ha ọsọ, chụruo ha Hoba, nke dị nʼakụkụ ugwu Damaskọs. 16 Ebram nwetaghachiri ihe niile ahụ ha dọtara nʼagha, dulata nwanne ya Lọt, na ihe onwunwe ya niile, tinyere ndị inyom, na ndị ọzọ niile a dọtara nʼagha. 17 Mgbe Ebram si na mmeri ahụ o meriri Kedoloma na eze ndị ọzọ ahụ na-alọta, eze Sọdọm bịara zute ya na Ndagwurugwu Shave (nke a na-akpọ Ndagwurugwu Eze). 18 Melkizedek, eze Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya, 19 ọ gọziri Ebram sị ya,“Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu,Onye kere eluigwe na ụwa. 20 Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu,onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.”Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. 21 Eze Sọdọm gwara Ebram sị, “Nyeghachi m naanị ndị mmadụ, ma debere onwe gị ihe ndị ọzọ.” 22 Ma Ebram zara eze Sọdọm sị, “Eweliri m aka m elu ṅụọ iyi nye ONYENWE ANYỊ Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa, sị 23 na agaghị m esi nʼaka gị were ihe ọbụla bụ nke gị, ọ bụladị eriri maọbụ eriri akpụkpọụkwụ. Ka ị ghara ị sị, ‘Ọ bụ m mere ka Ebram baa ọgaranya.’ 24 Naanị ihe m ga-anara bụ ihe ụmụ okorobịa m ndị a riri, ya na oke ruuru Anea, na Eshkọl, na Mamre so m gaa. Nye ha oke ruuru ha.”

In Other Versions

Genesis 14 in the ANGEFD

Genesis 14 in the ANTPNG2D

Genesis 14 in the AS21

Genesis 14 in the BAGH

Genesis 14 in the BBPNG

Genesis 14 in the BBT1E

Genesis 14 in the BDS

Genesis 14 in the BEV

Genesis 14 in the BHAD

Genesis 14 in the BIB

Genesis 14 in the BLPT

Genesis 14 in the BNT

Genesis 14 in the BNTABOOT

Genesis 14 in the BNTLV

Genesis 14 in the BOATCB

Genesis 14 in the BOATCB2

Genesis 14 in the BOBCV

Genesis 14 in the BOCNT

Genesis 14 in the BOECS

Genesis 14 in the BOGWICC

Genesis 14 in the BOHCB

Genesis 14 in the BOHCV

Genesis 14 in the BOHLNT

Genesis 14 in the BOHNTLTAL

Genesis 14 in the BOILNTAP

Genesis 14 in the BOITCV

Genesis 14 in the BOKCV

Genesis 14 in the BOKCV2

Genesis 14 in the BOKHWOG

Genesis 14 in the BOKSSV

Genesis 14 in the BOLCB

Genesis 14 in the BOLCB2

Genesis 14 in the BOMCV

Genesis 14 in the BONAV

Genesis 14 in the BONCB

Genesis 14 in the BONLT

Genesis 14 in the BONUT2

Genesis 14 in the BOPLNT

Genesis 14 in the BOSCB

Genesis 14 in the BOSNC

Genesis 14 in the BOTLNT

Genesis 14 in the BOVCB

Genesis 14 in the BOYCB

Genesis 14 in the BPBB

Genesis 14 in the BPH

Genesis 14 in the BSB

Genesis 14 in the CCB

Genesis 14 in the CUV

Genesis 14 in the CUVS

Genesis 14 in the DBT

Genesis 14 in the DGDNT

Genesis 14 in the DHNT

Genesis 14 in the DNT

Genesis 14 in the ELBE

Genesis 14 in the EMTV

Genesis 14 in the ESV

Genesis 14 in the FBV

Genesis 14 in the FEB

Genesis 14 in the GGMNT

Genesis 14 in the GNT

Genesis 14 in the HARY

Genesis 14 in the HNT

Genesis 14 in the IRVA

Genesis 14 in the IRVB

Genesis 14 in the IRVG

Genesis 14 in the IRVH

Genesis 14 in the IRVK

Genesis 14 in the IRVM

Genesis 14 in the IRVM2

Genesis 14 in the IRVO

Genesis 14 in the IRVP

Genesis 14 in the IRVT

Genesis 14 in the IRVT2

Genesis 14 in the IRVU

Genesis 14 in the ISVN

Genesis 14 in the JSNT

Genesis 14 in the KAPI

Genesis 14 in the KBT1ETNIK

Genesis 14 in the KBV

Genesis 14 in the KJV

Genesis 14 in the KNFD

Genesis 14 in the LBA

Genesis 14 in the LBLA

Genesis 14 in the LNT

Genesis 14 in the LSV

Genesis 14 in the MAAL

Genesis 14 in the MBV

Genesis 14 in the MBV2

Genesis 14 in the MHNT

Genesis 14 in the MKNFD

Genesis 14 in the MNG

Genesis 14 in the MNT

Genesis 14 in the MNT2

Genesis 14 in the MRS1T

Genesis 14 in the NAA

Genesis 14 in the NASB

Genesis 14 in the NBLA

Genesis 14 in the NBS

Genesis 14 in the NBVTP

Genesis 14 in the NET2

Genesis 14 in the NIV11

Genesis 14 in the NNT

Genesis 14 in the NNT2

Genesis 14 in the NNT3

Genesis 14 in the PDDPT

Genesis 14 in the PFNT

Genesis 14 in the RMNT

Genesis 14 in the SBIAS

Genesis 14 in the SBIBS

Genesis 14 in the SBIBS2

Genesis 14 in the SBICS

Genesis 14 in the SBIDS

Genesis 14 in the SBIGS

Genesis 14 in the SBIHS

Genesis 14 in the SBIIS

Genesis 14 in the SBIIS2

Genesis 14 in the SBIIS3

Genesis 14 in the SBIKS

Genesis 14 in the SBIKS2

Genesis 14 in the SBIMS

Genesis 14 in the SBIOS

Genesis 14 in the SBIPS

Genesis 14 in the SBISS

Genesis 14 in the SBITS

Genesis 14 in the SBITS2

Genesis 14 in the SBITS3

Genesis 14 in the SBITS4

Genesis 14 in the SBIUS

Genesis 14 in the SBIVS

Genesis 14 in the SBT

Genesis 14 in the SBT1E

Genesis 14 in the SCHL

Genesis 14 in the SNT

Genesis 14 in the SUSU

Genesis 14 in the SUSU2

Genesis 14 in the SYNO

Genesis 14 in the TBIAOTANT

Genesis 14 in the TBT1E

Genesis 14 in the TBT1E2

Genesis 14 in the TFTIP

Genesis 14 in the TFTU

Genesis 14 in the TGNTATF3T

Genesis 14 in the THAI

Genesis 14 in the TNFD

Genesis 14 in the TNT

Genesis 14 in the TNTIK

Genesis 14 in the TNTIL

Genesis 14 in the TNTIN

Genesis 14 in the TNTIP

Genesis 14 in the TNTIZ

Genesis 14 in the TOMA

Genesis 14 in the TTENT

Genesis 14 in the UBG

Genesis 14 in the UGV

Genesis 14 in the UGV2

Genesis 14 in the UGV3

Genesis 14 in the VBL

Genesis 14 in the VDCC

Genesis 14 in the YALU

Genesis 14 in the YAPE

Genesis 14 in the YBVTP

Genesis 14 in the ZBP