Hebrews 3 (BOICB)
1 Ya mere, ụmụnna m dị nsọ, ndị so keta oke nʼọkpụkpọ eluigwe ahụ, ka echiche unu dịgide naanị na Jisọs. Onyeisi ozi na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị. 2 O kwesiri ntụkwasị obi nye onye ahụ họpụtara ya dịka Mosis si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ya nʼụlọ Chineke. 3 Ma Jisọs nwere ugwu na nsọpụrụ karịa Mosis, dịka onye na-ewu ụlọ si enwe ugwu na nsọpụrụ karịa ụlọ o wuru. 4 Nʼihi na ụlọ ọbụla nwere onye wuru ya, maọbụ Chineke na-ewu ihe niile. 5 Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile, sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu. 6 Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi. 7 Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị,“Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa, 8 unu emela ka obi unu sie ike,dị ka unu mere nʼoge nnupu isimgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara, 9 ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa.Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a. 10 Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ.Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile.Ha amatabeghị ụzọ m niile.’ 11 Ya mere, aṅụrụ m iyi nʼiwe m, sị,‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ” 12 Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa. 13 Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike. 14 Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ. 15 Dị ka e kwuru ya,“Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya.Unu emela ka obi unu sie ike,dịka unu mere nʼoge nnupu isi.” 16 Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt? 17 Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara? 18 Olee ndị ahụ ọ ṅụụrụ iyi na ha agaghị aba nʼizuike ya? Ọ bụ na ha abụghị ndị ahụ nupuuru ya isi? 19 Ugbu a, anyị maara na ha enweghị ike ịbanye, nʼihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe.
In Other Versions
Hebrews 3 in the ANGEFD
Hebrews 3 in the ANTPNG2D
Hebrews 3 in the AS21
Hebrews 3 in the BAGH
Hebrews 3 in the BBPNG
Hebrews 3 in the BBT1E
Hebrews 3 in the BDS
Hebrews 3 in the BEV
Hebrews 3 in the BHAD
Hebrews 3 in the BIB
Hebrews 3 in the BLPT
Hebrews 3 in the BNT
Hebrews 3 in the BNTABOOT
Hebrews 3 in the BNTLV
Hebrews 3 in the BOATCB
Hebrews 3 in the BOATCB2
Hebrews 3 in the BOBCV
Hebrews 3 in the BOCNT
Hebrews 3 in the BOECS
Hebrews 3 in the BOGWICC
Hebrews 3 in the BOHCB
Hebrews 3 in the BOHCV
Hebrews 3 in the BOHLNT
Hebrews 3 in the BOHNTLTAL
Hebrews 3 in the BOILNTAP
Hebrews 3 in the BOITCV
Hebrews 3 in the BOKCV
Hebrews 3 in the BOKCV2
Hebrews 3 in the BOKHWOG
Hebrews 3 in the BOKSSV
Hebrews 3 in the BOLCB
Hebrews 3 in the BOLCB2
Hebrews 3 in the BOMCV
Hebrews 3 in the BONAV
Hebrews 3 in the BONCB
Hebrews 3 in the BONLT
Hebrews 3 in the BONUT2
Hebrews 3 in the BOPLNT
Hebrews 3 in the BOSCB
Hebrews 3 in the BOSNC
Hebrews 3 in the BOTLNT
Hebrews 3 in the BOVCB
Hebrews 3 in the BOYCB
Hebrews 3 in the BPBB
Hebrews 3 in the BPH
Hebrews 3 in the BSB
Hebrews 3 in the CCB
Hebrews 3 in the CUV
Hebrews 3 in the CUVS
Hebrews 3 in the DBT
Hebrews 3 in the DGDNT
Hebrews 3 in the DHNT
Hebrews 3 in the DNT
Hebrews 3 in the ELBE
Hebrews 3 in the EMTV
Hebrews 3 in the ESV
Hebrews 3 in the FBV
Hebrews 3 in the FEB
Hebrews 3 in the GGMNT
Hebrews 3 in the GNT
Hebrews 3 in the HARY
Hebrews 3 in the HNT
Hebrews 3 in the IRVA
Hebrews 3 in the IRVB
Hebrews 3 in the IRVG
Hebrews 3 in the IRVH
Hebrews 3 in the IRVK
Hebrews 3 in the IRVM
Hebrews 3 in the IRVM2
Hebrews 3 in the IRVO
Hebrews 3 in the IRVP
Hebrews 3 in the IRVT
Hebrews 3 in the IRVT2
Hebrews 3 in the IRVU
Hebrews 3 in the ISVN
Hebrews 3 in the JSNT
Hebrews 3 in the KAPI
Hebrews 3 in the KBT1ETNIK
Hebrews 3 in the KBV
Hebrews 3 in the KJV
Hebrews 3 in the KNFD
Hebrews 3 in the LBA
Hebrews 3 in the LBLA
Hebrews 3 in the LNT
Hebrews 3 in the LSV
Hebrews 3 in the MAAL
Hebrews 3 in the MBV
Hebrews 3 in the MBV2
Hebrews 3 in the MHNT
Hebrews 3 in the MKNFD
Hebrews 3 in the MNG
Hebrews 3 in the MNT
Hebrews 3 in the MNT2
Hebrews 3 in the MRS1T
Hebrews 3 in the NAA
Hebrews 3 in the NASB
Hebrews 3 in the NBLA
Hebrews 3 in the NBS
Hebrews 3 in the NBVTP
Hebrews 3 in the NET2
Hebrews 3 in the NIV11
Hebrews 3 in the NNT
Hebrews 3 in the NNT2
Hebrews 3 in the NNT3
Hebrews 3 in the PDDPT
Hebrews 3 in the PFNT
Hebrews 3 in the RMNT
Hebrews 3 in the SBIAS
Hebrews 3 in the SBIBS
Hebrews 3 in the SBIBS2
Hebrews 3 in the SBICS
Hebrews 3 in the SBIDS
Hebrews 3 in the SBIGS
Hebrews 3 in the SBIHS
Hebrews 3 in the SBIIS
Hebrews 3 in the SBIIS2
Hebrews 3 in the SBIIS3
Hebrews 3 in the SBIKS
Hebrews 3 in the SBIKS2
Hebrews 3 in the SBIMS
Hebrews 3 in the SBIOS
Hebrews 3 in the SBIPS
Hebrews 3 in the SBISS
Hebrews 3 in the SBITS
Hebrews 3 in the SBITS2
Hebrews 3 in the SBITS3
Hebrews 3 in the SBITS4
Hebrews 3 in the SBIUS
Hebrews 3 in the SBIVS
Hebrews 3 in the SBT
Hebrews 3 in the SBT1E
Hebrews 3 in the SCHL
Hebrews 3 in the SNT
Hebrews 3 in the SUSU
Hebrews 3 in the SUSU2
Hebrews 3 in the SYNO
Hebrews 3 in the TBIAOTANT
Hebrews 3 in the TBT1E
Hebrews 3 in the TBT1E2
Hebrews 3 in the TFTIP
Hebrews 3 in the TFTU
Hebrews 3 in the TGNTATF3T
Hebrews 3 in the THAI
Hebrews 3 in the TNFD
Hebrews 3 in the TNT
Hebrews 3 in the TNTIK
Hebrews 3 in the TNTIL
Hebrews 3 in the TNTIN
Hebrews 3 in the TNTIP
Hebrews 3 in the TNTIZ
Hebrews 3 in the TOMA
Hebrews 3 in the TTENT
Hebrews 3 in the UBG
Hebrews 3 in the UGV
Hebrews 3 in the UGV2
Hebrews 3 in the UGV3
Hebrews 3 in the VBL
Hebrews 3 in the VDCC
Hebrews 3 in the YALU
Hebrews 3 in the YAPE
Hebrews 3 in the YBVTP
Hebrews 3 in the ZBP