Isaiah 10 (BOICB)
1 Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi;ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu, 2 iji napụ ndị ogbenye ihe ruru hanakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi,na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri hana izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere. 3 Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu?Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu?Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka?Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile? 4 Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ,maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 5 “Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m.Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma m dị. 6 Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke,m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe,ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike,nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ. 7 Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere,nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya;o zubere ịla ndị m nʼiyi,na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche. 8 Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’ 9 ‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish?Hamat ọ dịghị ka Apad;Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs? 10 Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị,alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria. 11 Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apịdịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’ ” 12 Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya. 13 Nʼihi na ọ na-asị,“ ‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a,ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta.Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche,apụnara m ha akụ ha niile;dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m. 14 Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ,otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche,dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ,otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile;Ọ dịghị onye megharịrị otu nku,maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ ” 15 Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ,ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe?Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu,maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi. 16 Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile,ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti;ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube yadịka ire ọkụ nke na-ere ere. 17 Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ,Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi.Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụogwu niile na uke niile ọkụ. 18 A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụnʼiyi kpamkpam,dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi. 19 Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ,ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ. 20 Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel,na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb,agaghịkwa adabere nʼonye ahụtidara ha,kama ha ga-adabere naanị na ONYENWE ANYỊ,Onye nsọ nke Izrel. 21 Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu. 22 Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri,ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi.A kabiela ịla nʼiyi,nke dị oke ukwuu ya na ezi omume. 23 E, Onyenwe anyị, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebielana ọ ga-ebibi ala ahụ niile. 24 Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị,“Unu ndị m, ndị bi na Zayọn,unu atụkwala ndị Asịrịa egwubụ ndị na-eti unu mkpara igwe,na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere. 25 Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ,ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi.” 26 ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihedịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb.Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri,ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt. 27 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onweunu site nʼebe ndị Asịrịa nọ.Ụdọ igwe ha kenyere unu nʼolu ka m ga-adọbisi,wezuga ibu arọ unu. 28 Ha erutela Ayịat;ugbu a, ha nọ na Migrọn.Ha na-edokọta ngwa agha ha na Mikmash. 29 Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara;ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba!Ndị Rema na-ama jijiji,obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ. 30 Tienụ mkpu akwa unu ada Galim,geenụ ntị unu ndị Laisha!Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot! 31 Lee na Madmena nọ nʼọsọ,ndị Gebim na-ezo onwe ha. 32 Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa;ha na-atụ ugwu Zayọnna Jerusalem aka,na-ekwere ya nʼisi. 33 Lee Onyenwe anyị, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile,ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile.Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu,meekwa ka ndị toro ogologo dị ala. 34 Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa.Lebanọn ga-adakwa nʼihu Onye ahụ dị ike dịka osisi dị nʼoke ọhịa si ada.