Isaiah 19 (BOICB)
1 Nke a bụ amụma megide Ijipt:Lee, ONYENWE ANYỊ na-abịa imegide Ijipt,ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ.Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya.Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha. 2 “Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha.Nwanne ga-emegide nwanne ya,onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya;obodo ga-emegide isi obodo;otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze. 3 Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha,aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu,ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase,jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa. 4 Onyenwe anyị, bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị,Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri,nke na-adịghị eme ebere,ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.” 5 Mmiri dị nʼosimiri ga-atada;ọ ga-atakwa takọrọkwa. 6 Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharịga-atalata bido nʼisi isi.Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa. 7 Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ,ifufe ga-efesakwa ha.Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi,ihe niile ga-anwụ. 8 Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa,na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl,ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiriga-ata ahụ. 9 Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ,na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ. 10 Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego,ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ. 11 Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ,ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye.Ị ga-esi aṅaa gwa Fero,“Abụ m otu nʼime ndị maara ihe,onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”? 12 Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a?Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara,ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niilezubere megide Ijipt. 13 Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu,ndịisi obodo Memfis aghọkwaala ndị e duhiere eduhie;ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niileeduhiela ndị Ijipt ụzọ. 14 ONYENWE ANYỊ awụnyela nʼime hammụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke;nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-emedịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ. 15 Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime,isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara. 16 Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha. 17 Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha. 18 Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ. 19 Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ ONYENWE ANYỊ aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt. A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye ONYENWE ANYỊ nʼoke ala ha. 20 Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru ONYENWE ANYỊ maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha. 21 Ya mere, ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata ONYENWE ANYỊ, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe ONYENWE ANYỊ nkwa debekwa ya. 22 ONYENWE ANYỊ ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute ONYENWE ANYỊ, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha. 23 Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe. 24 Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa. 25 ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, “Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m.”