Isaiah 33 (BOICB)

1 Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi,onye bibiri ihe niile dị gị gburugburu, ma ọ dịbeghị mbibi rutere gị aka.Ahụhụ dịrị gị, onye nrafu,onye na-enwebeghị ndị rafuru gị.Mgbe ị kwụsịrị ibibi iheka a ga-ebibi gị,mgbe ị kwụsịkwara nrafuka a ga-arafu gị. 2 Biko, ONYENWE ANYỊ, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ,nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya.Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile,bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa. 3 Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị.Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga. 4 Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi,otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche. 5 ONYENWE ANYỊ dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu.Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta Zayọn. 6 Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile,ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma;egwu ONYENWE ANYỊ bụ igodo nke akụ a. 7 Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile;ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa. 8 Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla.E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire.A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe hamee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike.Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ. 9 Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu.Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere.Sharọn aghọkwaala ọzara;osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha. 10 Ma ONYENWE ANYỊ na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.”“Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu;ugbu a, ka a ga-ebuli m elu. 11 Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ,unu na-amụpụta ahịhịa,nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu. 12 Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ;ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.” 13 Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya!Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike! 14 Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu,ha na-akwa akwa na-asị,“Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa,ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?” 15 Ndị na-ejegharị nʼezi omumena-ekwu ihe ziri ezi,ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi,ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche,ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara,na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ. 16 Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu,ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu.A ga-enye ha nri,mmiri a gaghị akọkwa ha. 17 Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya;unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya. 18 Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga.“Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a?Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ?Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?” 19 Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ,bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị,nke unu na-adịghị aghọtakwa. 20 Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile;anya unu ga-ahụkwa Jerusalem,ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ;apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya,maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya. 21 Ebe ahụ ka ONYENWE ANYỊ ga-abụrụ anyị Onye dị ike.Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara.Ọ dịghị ụgbọ amaramaọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ. 22 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ onye ikpe anyị. ONYENWE ANYỊ bụ onye na-enye anyị iwu. ONYENWE ANYỊ bụ eze anyị,ọ bụ ya na-azọpụta anyị. 23 A tọsaala ụdọ niile:Ha adịghị ejidesikwa ọkọlọtọ gị ike,a gbasaghịkwa akwa igbochi ifufe.Mgbe ahụ, a ga-ekesa ụba ihe a kwatara nʼaghaọ bụladị ndị ngwụrọ ga-ebute ihe nkwata nʼagha. 24 Ọ dịkwaghị onye bi na Zayọn ga-asị, “Ahụ esighị m ike,”nʼihi na a ga-agbaghara ndị bi nʼime ya mmehie ha niile.

In Other Versions

Isaiah 33 in the ANGEFD

Isaiah 33 in the ANTPNG2D

Isaiah 33 in the AS21

Isaiah 33 in the BAGH

Isaiah 33 in the BBPNG

Isaiah 33 in the BBT1E

Isaiah 33 in the BDS

Isaiah 33 in the BEV

Isaiah 33 in the BHAD

Isaiah 33 in the BIB

Isaiah 33 in the BLPT

Isaiah 33 in the BNT

Isaiah 33 in the BNTABOOT

Isaiah 33 in the BNTLV

Isaiah 33 in the BOATCB

Isaiah 33 in the BOATCB2

Isaiah 33 in the BOBCV

Isaiah 33 in the BOCNT

Isaiah 33 in the BOECS

Isaiah 33 in the BOGWICC

Isaiah 33 in the BOHCB

Isaiah 33 in the BOHCV

Isaiah 33 in the BOHLNT

Isaiah 33 in the BOHNTLTAL

Isaiah 33 in the BOILNTAP

Isaiah 33 in the BOITCV

Isaiah 33 in the BOKCV

Isaiah 33 in the BOKCV2

Isaiah 33 in the BOKHWOG

Isaiah 33 in the BOKSSV

Isaiah 33 in the BOLCB

Isaiah 33 in the BOLCB2

Isaiah 33 in the BOMCV

Isaiah 33 in the BONAV

Isaiah 33 in the BONCB

Isaiah 33 in the BONLT

Isaiah 33 in the BONUT2

Isaiah 33 in the BOPLNT

Isaiah 33 in the BOSCB

Isaiah 33 in the BOSNC

Isaiah 33 in the BOTLNT

Isaiah 33 in the BOVCB

Isaiah 33 in the BOYCB

Isaiah 33 in the BPBB

Isaiah 33 in the BPH

Isaiah 33 in the BSB

Isaiah 33 in the CCB

Isaiah 33 in the CUV

Isaiah 33 in the CUVS

Isaiah 33 in the DBT

Isaiah 33 in the DGDNT

Isaiah 33 in the DHNT

Isaiah 33 in the DNT

Isaiah 33 in the ELBE

Isaiah 33 in the EMTV

Isaiah 33 in the ESV

Isaiah 33 in the FBV

Isaiah 33 in the FEB

Isaiah 33 in the GGMNT

Isaiah 33 in the GNT

Isaiah 33 in the HARY

Isaiah 33 in the HNT

Isaiah 33 in the IRVA

Isaiah 33 in the IRVB

Isaiah 33 in the IRVG

Isaiah 33 in the IRVH

Isaiah 33 in the IRVK

Isaiah 33 in the IRVM

Isaiah 33 in the IRVM2

Isaiah 33 in the IRVO

Isaiah 33 in the IRVP

Isaiah 33 in the IRVT

Isaiah 33 in the IRVT2

Isaiah 33 in the IRVU

Isaiah 33 in the ISVN

Isaiah 33 in the JSNT

Isaiah 33 in the KAPI

Isaiah 33 in the KBT1ETNIK

Isaiah 33 in the KBV

Isaiah 33 in the KJV

Isaiah 33 in the KNFD

Isaiah 33 in the LBA

Isaiah 33 in the LBLA

Isaiah 33 in the LNT

Isaiah 33 in the LSV

Isaiah 33 in the MAAL

Isaiah 33 in the MBV

Isaiah 33 in the MBV2

Isaiah 33 in the MHNT

Isaiah 33 in the MKNFD

Isaiah 33 in the MNG

Isaiah 33 in the MNT

Isaiah 33 in the MNT2

Isaiah 33 in the MRS1T

Isaiah 33 in the NAA

Isaiah 33 in the NASB

Isaiah 33 in the NBLA

Isaiah 33 in the NBS

Isaiah 33 in the NBVTP

Isaiah 33 in the NET2

Isaiah 33 in the NIV11

Isaiah 33 in the NNT

Isaiah 33 in the NNT2

Isaiah 33 in the NNT3

Isaiah 33 in the PDDPT

Isaiah 33 in the PFNT

Isaiah 33 in the RMNT

Isaiah 33 in the SBIAS

Isaiah 33 in the SBIBS

Isaiah 33 in the SBIBS2

Isaiah 33 in the SBICS

Isaiah 33 in the SBIDS

Isaiah 33 in the SBIGS

Isaiah 33 in the SBIHS

Isaiah 33 in the SBIIS

Isaiah 33 in the SBIIS2

Isaiah 33 in the SBIIS3

Isaiah 33 in the SBIKS

Isaiah 33 in the SBIKS2

Isaiah 33 in the SBIMS

Isaiah 33 in the SBIOS

Isaiah 33 in the SBIPS

Isaiah 33 in the SBISS

Isaiah 33 in the SBITS

Isaiah 33 in the SBITS2

Isaiah 33 in the SBITS3

Isaiah 33 in the SBITS4

Isaiah 33 in the SBIUS

Isaiah 33 in the SBIVS

Isaiah 33 in the SBT

Isaiah 33 in the SBT1E

Isaiah 33 in the SCHL

Isaiah 33 in the SNT

Isaiah 33 in the SUSU

Isaiah 33 in the SUSU2

Isaiah 33 in the SYNO

Isaiah 33 in the TBIAOTANT

Isaiah 33 in the TBT1E

Isaiah 33 in the TBT1E2

Isaiah 33 in the TFTIP

Isaiah 33 in the TFTU

Isaiah 33 in the TGNTATF3T

Isaiah 33 in the THAI

Isaiah 33 in the TNFD

Isaiah 33 in the TNT

Isaiah 33 in the TNTIK

Isaiah 33 in the TNTIL

Isaiah 33 in the TNTIN

Isaiah 33 in the TNTIP

Isaiah 33 in the TNTIZ

Isaiah 33 in the TOMA

Isaiah 33 in the TTENT

Isaiah 33 in the UBG

Isaiah 33 in the UGV

Isaiah 33 in the UGV2

Isaiah 33 in the UGV3

Isaiah 33 in the VBL

Isaiah 33 in the VDCC

Isaiah 33 in the YALU

Isaiah 33 in the YAPE

Isaiah 33 in the YBVTP

Isaiah 33 in the ZBP