Isaiah 43 (BOICB)

1 Ma ugbu a, nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru,bụ onye kere gị, Jekọb,na onye kpụrụ gị Izrel,“Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị.Akpọọla m gị aha, ị bụkwa nke m. 2 Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe,aga m anọnyere gị.Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo,agaghị m ekwe ka o bufuo gị.Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ,ọ gaghị eregbu gị.Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị. 3 Nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị,Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel.Ewerela m Ijiptna Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị. 4 Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m,ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya,aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị.Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ. 5 Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị.Aga m esite nʼọwụwa anyanwụna nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị. 6 Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha,‘Hapụnụ ha ka ha laa,unu egbochikwala ha.’Hapụnụ ndị m ka ha site nʼala niile dị anya nke nsọtụ ụwa lọghachi, 7 onye ọbụla nke a na-akpọ aha m,onye m kere nʼihi otuto m,onye m kpụrụ, ma meekwa.” 8 Kpọpụtanụ ha, bụ ndị ahụ nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ,ndị nwere ntị ma ha adịghịkwa anụ ihe. 9 Mba niile dị iche iche ezukọtala,mmadụ niile agbakọtakwala.Onye nʼime chi ha kwuru na ihe dị otu a ga-eme,onye kwa kwuru ihe ndị a mere nʼoge gara aga?Ka ha kpọbata ndị akaebe ha izipụta na ihe ha kwuru ziri ezi,ka ndị ọzọ nụ ya ma sị na, “Ọ bụ eziokwu.” 10 “Unu bụ ndị akaebe m,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara,“bụrụkwa ndị ohu m họpụtara,ka unu mara m, ma kwerekwa na m,ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ.Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị,ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ. 11 Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ ONYENWE ANYỊ,ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m. 12 Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya,mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu.Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 13 “E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke.Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka.Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?” 14 Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru,Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel.“Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọnbudata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ,nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi. 15 Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, Onye nsọ gị,onye kere Izrel, Eze unu.” 16 Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,bụ onye ahụ kwara ụzọ nʼime osimiri,nke mere ka okporoụzọ dịrị nʼime oke osimiri. 17 Nke na-eme ka ụgbọ ndị agha dị ukwuu, na ịnyịnya pụta,ndị agha na ụsụ ha achịkọtara ọnụ,mee ha ka ha dinaa nʼebe ahụ, ghara ibilitekwa ọzọ,dịka ha bụ ọkụ ogho oriọna e menyụrụ emenyụ. 18 “Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga;unu atụgharịkwala uche unu na ha. 19 Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime.Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya?Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara,na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu. 20 Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m,nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m,nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara,meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu,nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara. 21 Ndị m kpụrụ nye onwe m,ka ha kọsaa akụkọ otuto m. 22 “Ma unu akpọkughị m, Jekọb,kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel. 23 I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ,maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m.O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka,maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ. 24 Unu ewetabereghị m ụda kalamus na-esi isi ụtọ,maọbụ were abụba anụ nke aja unu niile mee ka obi tọọ m ụtọ.Kama ọ bụ naanị mmehie unu ka unu na-ebokwasị m,unu ejirila ajọ omume unu mee ka ike gwụsịa m. 25 “Mụ onwe m, ọ bụ naanị mụ onwe m, bụ onye na-ehichapụ mmehie unu.Ana m emekwa ya nʼihi na ọ dị m mma nʼobi ime ya.Agakwaghị m echeta mmehie unu ọzọ. 26 Chetara m ihe gara aga,ka anyị rụrịta ụka nʼetiti onwe anyị,doo okwu gị nʼusoro igosi na ị bụ onye ikpe na-amaghị. 27 Site na mmalite, nna nna unu ha mehiere megide m.Ndị m dunyere ka ha kuziere unu ihe nupukwara isi megide m. 28 Ya mere, m ji menye ndị a maara aha ha nʼụlọnsọ ihere.Enyefere m Jekọb ka ọ bụrụ onye ewezugara nye mbibi,nyekwa Izrel ka ọ bụrụ ihe mkparị.

In Other Versions

Isaiah 43 in the ANGEFD

Isaiah 43 in the ANTPNG2D

Isaiah 43 in the AS21

Isaiah 43 in the BAGH

Isaiah 43 in the BBPNG

Isaiah 43 in the BBT1E

Isaiah 43 in the BDS

Isaiah 43 in the BEV

Isaiah 43 in the BHAD

Isaiah 43 in the BIB

Isaiah 43 in the BLPT

Isaiah 43 in the BNT

Isaiah 43 in the BNTABOOT

Isaiah 43 in the BNTLV

Isaiah 43 in the BOATCB

Isaiah 43 in the BOATCB2

Isaiah 43 in the BOBCV

Isaiah 43 in the BOCNT

Isaiah 43 in the BOECS

Isaiah 43 in the BOGWICC

Isaiah 43 in the BOHCB

Isaiah 43 in the BOHCV

Isaiah 43 in the BOHLNT

Isaiah 43 in the BOHNTLTAL

Isaiah 43 in the BOILNTAP

Isaiah 43 in the BOITCV

Isaiah 43 in the BOKCV

Isaiah 43 in the BOKCV2

Isaiah 43 in the BOKHWOG

Isaiah 43 in the BOKSSV

Isaiah 43 in the BOLCB

Isaiah 43 in the BOLCB2

Isaiah 43 in the BOMCV

Isaiah 43 in the BONAV

Isaiah 43 in the BONCB

Isaiah 43 in the BONLT

Isaiah 43 in the BONUT2

Isaiah 43 in the BOPLNT

Isaiah 43 in the BOSCB

Isaiah 43 in the BOSNC

Isaiah 43 in the BOTLNT

Isaiah 43 in the BOVCB

Isaiah 43 in the BOYCB

Isaiah 43 in the BPBB

Isaiah 43 in the BPH

Isaiah 43 in the BSB

Isaiah 43 in the CCB

Isaiah 43 in the CUV

Isaiah 43 in the CUVS

Isaiah 43 in the DBT

Isaiah 43 in the DGDNT

Isaiah 43 in the DHNT

Isaiah 43 in the DNT

Isaiah 43 in the ELBE

Isaiah 43 in the EMTV

Isaiah 43 in the ESV

Isaiah 43 in the FBV

Isaiah 43 in the FEB

Isaiah 43 in the GGMNT

Isaiah 43 in the GNT

Isaiah 43 in the HARY

Isaiah 43 in the HNT

Isaiah 43 in the IRVA

Isaiah 43 in the IRVB

Isaiah 43 in the IRVG

Isaiah 43 in the IRVH

Isaiah 43 in the IRVK

Isaiah 43 in the IRVM

Isaiah 43 in the IRVM2

Isaiah 43 in the IRVO

Isaiah 43 in the IRVP

Isaiah 43 in the IRVT

Isaiah 43 in the IRVT2

Isaiah 43 in the IRVU

Isaiah 43 in the ISVN

Isaiah 43 in the JSNT

Isaiah 43 in the KAPI

Isaiah 43 in the KBT1ETNIK

Isaiah 43 in the KBV

Isaiah 43 in the KJV

Isaiah 43 in the KNFD

Isaiah 43 in the LBA

Isaiah 43 in the LBLA

Isaiah 43 in the LNT

Isaiah 43 in the LSV

Isaiah 43 in the MAAL

Isaiah 43 in the MBV

Isaiah 43 in the MBV2

Isaiah 43 in the MHNT

Isaiah 43 in the MKNFD

Isaiah 43 in the MNG

Isaiah 43 in the MNT

Isaiah 43 in the MNT2

Isaiah 43 in the MRS1T

Isaiah 43 in the NAA

Isaiah 43 in the NASB

Isaiah 43 in the NBLA

Isaiah 43 in the NBS

Isaiah 43 in the NBVTP

Isaiah 43 in the NET2

Isaiah 43 in the NIV11

Isaiah 43 in the NNT

Isaiah 43 in the NNT2

Isaiah 43 in the NNT3

Isaiah 43 in the PDDPT

Isaiah 43 in the PFNT

Isaiah 43 in the RMNT

Isaiah 43 in the SBIAS

Isaiah 43 in the SBIBS

Isaiah 43 in the SBIBS2

Isaiah 43 in the SBICS

Isaiah 43 in the SBIDS

Isaiah 43 in the SBIGS

Isaiah 43 in the SBIHS

Isaiah 43 in the SBIIS

Isaiah 43 in the SBIIS2

Isaiah 43 in the SBIIS3

Isaiah 43 in the SBIKS

Isaiah 43 in the SBIKS2

Isaiah 43 in the SBIMS

Isaiah 43 in the SBIOS

Isaiah 43 in the SBIPS

Isaiah 43 in the SBISS

Isaiah 43 in the SBITS

Isaiah 43 in the SBITS2

Isaiah 43 in the SBITS3

Isaiah 43 in the SBITS4

Isaiah 43 in the SBIUS

Isaiah 43 in the SBIVS

Isaiah 43 in the SBT

Isaiah 43 in the SBT1E

Isaiah 43 in the SCHL

Isaiah 43 in the SNT

Isaiah 43 in the SUSU

Isaiah 43 in the SUSU2

Isaiah 43 in the SYNO

Isaiah 43 in the TBIAOTANT

Isaiah 43 in the TBT1E

Isaiah 43 in the TBT1E2

Isaiah 43 in the TFTIP

Isaiah 43 in the TFTU

Isaiah 43 in the TGNTATF3T

Isaiah 43 in the THAI

Isaiah 43 in the TNFD

Isaiah 43 in the TNT

Isaiah 43 in the TNTIK

Isaiah 43 in the TNTIL

Isaiah 43 in the TNTIN

Isaiah 43 in the TNTIP

Isaiah 43 in the TNTIZ

Isaiah 43 in the TOMA

Isaiah 43 in the TTENT

Isaiah 43 in the UBG

Isaiah 43 in the UGV

Isaiah 43 in the UGV2

Isaiah 43 in the UGV3

Isaiah 43 in the VBL

Isaiah 43 in the VDCC

Isaiah 43 in the YALU

Isaiah 43 in the YAPE

Isaiah 43 in the YBVTP

Isaiah 43 in the ZBP