Isaiah 49 (BOICB)

1 Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu,nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya. ONYENWE ANYỊ kpọrọ m tupu amụọ m.Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m. 2 O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha.O zobere m nʼaka ya kpuchie m.O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọnke o zoro nʼime akpa àkụ ya. 3 Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel.Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma na ike m.” 4 Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ.Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe.Ma ihe ruru m dị nʼaka ONYENWE ANYỊ,ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.” 5 Ma ugbu a ONYENWE ANYỊ na-asị,Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi;ka ọ kpọghachite Jekọb nye yaka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya,nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya ONYENWE ANYỊ,Chineke m aghọkwaarala m ike m. 6 Ọ sịrị,“Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu,ịkpọghachita ebo niile nke Jekọbna ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere.Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ,ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.” 7 Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru,Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrelna-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ,e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha,“Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe.Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị,nʼihi na ONYENWE ANYỊ, Onye kwesiri ntụkwasị obi,Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.” 8 Otu a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu:“Nʼoge amara m, aga m aza unu,nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka.Aga m echebe unu, mee ka unubụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ,iweghachite ala ahụna ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu; 9 na-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ,’na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’ “Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ,ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile. 10 Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ.Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ.Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo hanʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri. 11 Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ,meekwa ka okporoụzọ niile guzozie. 12 Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya,ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ,ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.” 13 Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile;ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ,nʼihi na ONYENWE ANYỊ akasịela ndị ya obi.Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha. 14 Ma Zayọn sịrị, “ONYENWE ANYỊ agbakụtala m azụ;Onyenwe m echefuola m.” 15 “Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara,hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya?Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ,ma agaghị m echezọ unu. 16 Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m,nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide. 17 Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite,ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ. 18 Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya,ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị.Dịka m na-adị ndụ,” ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.“Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma,ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme. 19 “Ọ bụ ezie na e bibiri gị, mee ka ị tọgbọrọ nʼefu,ala gị abụrụ nkpọnkpọ ebe,ma ugbu a, ị gaghị ezuru ndị gị,otu a kwa, ndị ahụ ripịara gị ga-anọ gị nʼebe dị anya. 20 Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka,ga-asịkwa na ntị gị,‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị,nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’ 21 Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị,‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile?A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara.Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ.Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m.Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a?Onye zụlitere ha?’ ” 22 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru,“Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ,weliere ha ọkọlọtọ m,ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha.Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha. 23 Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị,ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara.Ha ga-akpọ isiala nye gị,rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ.Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ,matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.” 24 A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha,maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri? 25 Ma otu a ka ONYENWE ANYỊ sịrị,“Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha.A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha.Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha.Aga m anapụtakwa ụmụ gị. 26 Aga m eme ka ndị na-akpagbu gị rie anụ ahụ onwe ha;ha ga-aṅụ ọbara onwe ha ṅụbiga ya oke, dịka mmanya.Mgbe ahụ, ihe niile bụ mmadụ nʼụwa ga-amata,na mụ onwe m ONYENWE ANYỊ, bụ Onye na-azọpụta gị,Onye mgbapụta gị, na Onye dị ike nke Jekọb.”

In Other Versions

Isaiah 49 in the ANGEFD

Isaiah 49 in the ANTPNG2D

Isaiah 49 in the AS21

Isaiah 49 in the BAGH

Isaiah 49 in the BBPNG

Isaiah 49 in the BBT1E

Isaiah 49 in the BDS

Isaiah 49 in the BEV

Isaiah 49 in the BHAD

Isaiah 49 in the BIB

Isaiah 49 in the BLPT

Isaiah 49 in the BNT

Isaiah 49 in the BNTABOOT

Isaiah 49 in the BNTLV

Isaiah 49 in the BOATCB

Isaiah 49 in the BOATCB2

Isaiah 49 in the BOBCV

Isaiah 49 in the BOCNT

Isaiah 49 in the BOECS

Isaiah 49 in the BOGWICC

Isaiah 49 in the BOHCB

Isaiah 49 in the BOHCV

Isaiah 49 in the BOHLNT

Isaiah 49 in the BOHNTLTAL

Isaiah 49 in the BOILNTAP

Isaiah 49 in the BOITCV

Isaiah 49 in the BOKCV

Isaiah 49 in the BOKCV2

Isaiah 49 in the BOKHWOG

Isaiah 49 in the BOKSSV

Isaiah 49 in the BOLCB

Isaiah 49 in the BOLCB2

Isaiah 49 in the BOMCV

Isaiah 49 in the BONAV

Isaiah 49 in the BONCB

Isaiah 49 in the BONLT

Isaiah 49 in the BONUT2

Isaiah 49 in the BOPLNT

Isaiah 49 in the BOSCB

Isaiah 49 in the BOSNC

Isaiah 49 in the BOTLNT

Isaiah 49 in the BOVCB

Isaiah 49 in the BOYCB

Isaiah 49 in the BPBB

Isaiah 49 in the BPH

Isaiah 49 in the BSB

Isaiah 49 in the CCB

Isaiah 49 in the CUV

Isaiah 49 in the CUVS

Isaiah 49 in the DBT

Isaiah 49 in the DGDNT

Isaiah 49 in the DHNT

Isaiah 49 in the DNT

Isaiah 49 in the ELBE

Isaiah 49 in the EMTV

Isaiah 49 in the ESV

Isaiah 49 in the FBV

Isaiah 49 in the FEB

Isaiah 49 in the GGMNT

Isaiah 49 in the GNT

Isaiah 49 in the HARY

Isaiah 49 in the HNT

Isaiah 49 in the IRVA

Isaiah 49 in the IRVB

Isaiah 49 in the IRVG

Isaiah 49 in the IRVH

Isaiah 49 in the IRVK

Isaiah 49 in the IRVM

Isaiah 49 in the IRVM2

Isaiah 49 in the IRVO

Isaiah 49 in the IRVP

Isaiah 49 in the IRVT

Isaiah 49 in the IRVT2

Isaiah 49 in the IRVU

Isaiah 49 in the ISVN

Isaiah 49 in the JSNT

Isaiah 49 in the KAPI

Isaiah 49 in the KBT1ETNIK

Isaiah 49 in the KBV

Isaiah 49 in the KJV

Isaiah 49 in the KNFD

Isaiah 49 in the LBA

Isaiah 49 in the LBLA

Isaiah 49 in the LNT

Isaiah 49 in the LSV

Isaiah 49 in the MAAL

Isaiah 49 in the MBV

Isaiah 49 in the MBV2

Isaiah 49 in the MHNT

Isaiah 49 in the MKNFD

Isaiah 49 in the MNG

Isaiah 49 in the MNT

Isaiah 49 in the MNT2

Isaiah 49 in the MRS1T

Isaiah 49 in the NAA

Isaiah 49 in the NASB

Isaiah 49 in the NBLA

Isaiah 49 in the NBS

Isaiah 49 in the NBVTP

Isaiah 49 in the NET2

Isaiah 49 in the NIV11

Isaiah 49 in the NNT

Isaiah 49 in the NNT2

Isaiah 49 in the NNT3

Isaiah 49 in the PDDPT

Isaiah 49 in the PFNT

Isaiah 49 in the RMNT

Isaiah 49 in the SBIAS

Isaiah 49 in the SBIBS

Isaiah 49 in the SBIBS2

Isaiah 49 in the SBICS

Isaiah 49 in the SBIDS

Isaiah 49 in the SBIGS

Isaiah 49 in the SBIHS

Isaiah 49 in the SBIIS

Isaiah 49 in the SBIIS2

Isaiah 49 in the SBIIS3

Isaiah 49 in the SBIKS

Isaiah 49 in the SBIKS2

Isaiah 49 in the SBIMS

Isaiah 49 in the SBIOS

Isaiah 49 in the SBIPS

Isaiah 49 in the SBISS

Isaiah 49 in the SBITS

Isaiah 49 in the SBITS2

Isaiah 49 in the SBITS3

Isaiah 49 in the SBITS4

Isaiah 49 in the SBIUS

Isaiah 49 in the SBIVS

Isaiah 49 in the SBT

Isaiah 49 in the SBT1E

Isaiah 49 in the SCHL

Isaiah 49 in the SNT

Isaiah 49 in the SUSU

Isaiah 49 in the SUSU2

Isaiah 49 in the SYNO

Isaiah 49 in the TBIAOTANT

Isaiah 49 in the TBT1E

Isaiah 49 in the TBT1E2

Isaiah 49 in the TFTIP

Isaiah 49 in the TFTU

Isaiah 49 in the TGNTATF3T

Isaiah 49 in the THAI

Isaiah 49 in the TNFD

Isaiah 49 in the TNT

Isaiah 49 in the TNTIK

Isaiah 49 in the TNTIL

Isaiah 49 in the TNTIN

Isaiah 49 in the TNTIP

Isaiah 49 in the TNTIZ

Isaiah 49 in the TOMA

Isaiah 49 in the TTENT

Isaiah 49 in the UBG

Isaiah 49 in the UGV

Isaiah 49 in the UGV2

Isaiah 49 in the UGV3

Isaiah 49 in the VBL

Isaiah 49 in the VDCC

Isaiah 49 in the YALU

Isaiah 49 in the YAPE

Isaiah 49 in the YBVTP

Isaiah 49 in the ZBP