Isaiah 7 (BOICB)
1 Mgbe Ehaz, nwa Jotam, nwa nwa Ụzaya bụ eze na Juda, Rezin eze Aram, na Peka eze Izrel, nwa Remalaya, busoro Jerusalem agha. Ma ha emerighị ya; obodo ahụ guzosiri ike. 2 Ma mgbe e mesịrị, ozi ruru ụlọ Devid ntị sị, “Ndị Aram na Ifrem ejikọọla onwe ha ọnụ”; nke a mere ka ụlọeze, na obi ndị ọ na-achị maa jijiji, dịka osisi dị nʼọhịa si ama jijiji mgbe oke ifufe na-efe. 3 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Aịzaya okwu sị ya, “Jekwuru Ehaz bụ eze. Mgbe ị na-aga, kpọrọ Shịa-Jashub nwa gị nwoke. Unu ga-ahụ Ehaz nʼakụkụ Elu elu olulu ọdọ mmiri nke dị nʼụzọ ahụ gawara nʼAla ọsụ akwa. 4 Gwa ya ka ọ ghara inye ndụ ya nsogbu, ka ọ gharakwa ịtụ egwu. Sị ya, ‘Lezie anya, nọ jụụ, echegbula onwe ya banyere icheku ọkụ abụọ ahụ na-anyụ anyụ. Atụla egwu nʼihi iwe Rezin nwa Aram, na iwe Peka nwa Remalaya. 5 E, Aram, na Ifrem, na nwa nwoke Remalaya, agbaala izu ibuso gị agha ịla gị nʼiyi. Ha ekwuola sị, 6 “Ka anyị wakpo Juda, ka anyị dọwaa ya ma kee ya nʼetiti onwe anyị, mee nwa Tabeel ka ọ bụrụ eze ya.” 7 Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru,“ ‘Ọ gaghị adị ire!Ọ gaghị emezukwa. 8 Nʼihi isi obodo Aram bụ Damaskọs.Onyeisi Damaskọs bụ naanị Rezin.Ma tupu afọ iri isii na ise agafeea ga-etikpọkwa Ifrem. 9 Isi obodo Ifrem bụ Sameria.Onyeisi Sameria bụ naanị nwa Remalaya.Ọ bụrụ na unu eguzosighị ike nʼokwukwe unu,unu agaghị eguzo ma ọlị.’ ” 10 Ọ dịghị anya, ONYENWE ANYỊ ziri Ehaz ozi ndị a sị, 11 “Jụọ m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” 12 Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa ONYENWE ANYỊ m otu a.” 13 Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya? 14 Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị. 15 Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe. 16 Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha. 17 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ọbụbụ ọnụ dị ukwuu bịakwasị gị na obodo gị, na ezinaụlọ gị. Ihe egwu ga-adịkwa, ụdị nke a na-ahụbeghị mbụ, site nʼoge e kewapụrụ Ifrem site na Juda. Eze Asịrịa ga-edu ndị agha ya bịa.” 18 Nʼụbọchị ahụ, ONYENWE ANYỊ ga-akpọku ijiji site na nsọtụ Naịl dị nʼIjipt nakwa aṅụ sitere nʼala Asịrịa. 19 Ha ga-abịa nʼigwe, bichie ndagwurugwu ala gị niile, na nʼọgba nkume niile, na nʼọhịa ogwu ogwu niile, na nʼọzara niile, na nʼezi ala niile. 20 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji agụba e gotara nʼofe osimiri, nke bụ eze Asịrịa, kpụchapụ unu agịrị isi na ajị ụkwụ, kpụchapụkwa afụọnụ unu niile. 21 Nʼụbọchị ahụ, otu onye ga-edebe otu nwa ehi na ewu abụọ ndụ. 22 Onye ọbụla kwa nʼala ahụ ga-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ya na mmanụ aṅụ, nʼihi na mmiri ara ehi ga-aba ụba nke ukwuu nʼala ahụ. 23 Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke. 24 Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ. 25 Ma banyere ugwu eji ọgụ kọọ na mbụ, ị gaghị abakwa nʼebe ahụ ọzọ nʼihi egwu uke na ogwu; ha ga-abụ ebe a na-atọpụ ehi na ebe atụrụ na-agbagharị.
In Other Versions
Isaiah 7 in the ANGEFD
Isaiah 7 in the ANTPNG2D
Isaiah 7 in the AS21
Isaiah 7 in the BAGH
Isaiah 7 in the BBPNG
Isaiah 7 in the BBT1E
Isaiah 7 in the BDS
Isaiah 7 in the BEV
Isaiah 7 in the BHAD
Isaiah 7 in the BIB
Isaiah 7 in the BLPT
Isaiah 7 in the BNT
Isaiah 7 in the BNTABOOT
Isaiah 7 in the BNTLV
Isaiah 7 in the BOATCB
Isaiah 7 in the BOATCB2
Isaiah 7 in the BOBCV
Isaiah 7 in the BOCNT
Isaiah 7 in the BOECS
Isaiah 7 in the BOGWICC
Isaiah 7 in the BOHCB
Isaiah 7 in the BOHCV
Isaiah 7 in the BOHLNT
Isaiah 7 in the BOHNTLTAL
Isaiah 7 in the BOILNTAP
Isaiah 7 in the BOITCV
Isaiah 7 in the BOKCV
Isaiah 7 in the BOKCV2
Isaiah 7 in the BOKHWOG
Isaiah 7 in the BOKSSV
Isaiah 7 in the BOLCB
Isaiah 7 in the BOLCB2
Isaiah 7 in the BOMCV
Isaiah 7 in the BONAV
Isaiah 7 in the BONCB
Isaiah 7 in the BONLT
Isaiah 7 in the BONUT2
Isaiah 7 in the BOPLNT
Isaiah 7 in the BOSCB
Isaiah 7 in the BOSNC
Isaiah 7 in the BOTLNT
Isaiah 7 in the BOVCB
Isaiah 7 in the BOYCB
Isaiah 7 in the BPBB
Isaiah 7 in the BPH
Isaiah 7 in the BSB
Isaiah 7 in the CCB
Isaiah 7 in the CUV
Isaiah 7 in the CUVS
Isaiah 7 in the DBT
Isaiah 7 in the DGDNT
Isaiah 7 in the DHNT
Isaiah 7 in the DNT
Isaiah 7 in the ELBE
Isaiah 7 in the EMTV
Isaiah 7 in the ESV
Isaiah 7 in the FBV
Isaiah 7 in the FEB
Isaiah 7 in the GGMNT
Isaiah 7 in the GNT
Isaiah 7 in the HARY
Isaiah 7 in the HNT
Isaiah 7 in the IRVA
Isaiah 7 in the IRVB
Isaiah 7 in the IRVG
Isaiah 7 in the IRVH
Isaiah 7 in the IRVK
Isaiah 7 in the IRVM
Isaiah 7 in the IRVM2
Isaiah 7 in the IRVO
Isaiah 7 in the IRVP
Isaiah 7 in the IRVT
Isaiah 7 in the IRVT2
Isaiah 7 in the IRVU
Isaiah 7 in the ISVN
Isaiah 7 in the JSNT
Isaiah 7 in the KAPI
Isaiah 7 in the KBT1ETNIK
Isaiah 7 in the KBV
Isaiah 7 in the KJV
Isaiah 7 in the KNFD
Isaiah 7 in the LBA
Isaiah 7 in the LBLA
Isaiah 7 in the LNT
Isaiah 7 in the LSV
Isaiah 7 in the MAAL
Isaiah 7 in the MBV
Isaiah 7 in the MBV2
Isaiah 7 in the MHNT
Isaiah 7 in the MKNFD
Isaiah 7 in the MNG
Isaiah 7 in the MNT
Isaiah 7 in the MNT2
Isaiah 7 in the MRS1T
Isaiah 7 in the NAA
Isaiah 7 in the NASB
Isaiah 7 in the NBLA
Isaiah 7 in the NBS
Isaiah 7 in the NBVTP
Isaiah 7 in the NET2
Isaiah 7 in the NIV11
Isaiah 7 in the NNT
Isaiah 7 in the NNT2
Isaiah 7 in the NNT3
Isaiah 7 in the PDDPT
Isaiah 7 in the PFNT
Isaiah 7 in the RMNT
Isaiah 7 in the SBIAS
Isaiah 7 in the SBIBS
Isaiah 7 in the SBIBS2
Isaiah 7 in the SBICS
Isaiah 7 in the SBIDS
Isaiah 7 in the SBIGS
Isaiah 7 in the SBIHS
Isaiah 7 in the SBIIS
Isaiah 7 in the SBIIS2
Isaiah 7 in the SBIIS3
Isaiah 7 in the SBIKS
Isaiah 7 in the SBIKS2
Isaiah 7 in the SBIMS
Isaiah 7 in the SBIOS
Isaiah 7 in the SBIPS
Isaiah 7 in the SBISS
Isaiah 7 in the SBITS
Isaiah 7 in the SBITS2
Isaiah 7 in the SBITS3
Isaiah 7 in the SBITS4
Isaiah 7 in the SBIUS
Isaiah 7 in the SBIVS
Isaiah 7 in the SBT
Isaiah 7 in the SBT1E
Isaiah 7 in the SCHL
Isaiah 7 in the SNT
Isaiah 7 in the SUSU
Isaiah 7 in the SUSU2
Isaiah 7 in the SYNO
Isaiah 7 in the TBIAOTANT
Isaiah 7 in the TBT1E
Isaiah 7 in the TBT1E2
Isaiah 7 in the TFTIP
Isaiah 7 in the TFTU
Isaiah 7 in the TGNTATF3T
Isaiah 7 in the THAI
Isaiah 7 in the TNFD
Isaiah 7 in the TNT
Isaiah 7 in the TNTIK
Isaiah 7 in the TNTIL
Isaiah 7 in the TNTIN
Isaiah 7 in the TNTIP
Isaiah 7 in the TNTIZ
Isaiah 7 in the TOMA
Isaiah 7 in the TTENT
Isaiah 7 in the UBG
Isaiah 7 in the UGV
Isaiah 7 in the UGV2
Isaiah 7 in the UGV3
Isaiah 7 in the VBL
Isaiah 7 in the VDCC
Isaiah 7 in the YALU
Isaiah 7 in the YAPE
Isaiah 7 in the YBVTP
Isaiah 7 in the ZBP