Isaiah 9 (BOICB)

1 Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan. 2 Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrịahụla ìhè dị ukwuu;ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụka ìhè nwukwasịrị. 3 I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu,mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu,ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị,dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi,dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụmgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha. 4 Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia,i gbajisielaibu arọ niile e bokwasịrị ha,ihe mgbochi nke dị nʼubu ha,nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha. 5 Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi,na uwe agha nke ọbara mechuru,ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ,ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma. 6 Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,e nyekwala anyị otu nwa nwoke.Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị.Ndị a ga-abụ aha ya,Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo. 7 Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udonke na-enweghị ọgwụgwụ.Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị,chịakwa nʼalaeze ya.Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike;ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịasite nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.Ịnụ ọkụ nke ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile,ga-emezukwa nke a. 8 Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọbọ ga-adakwasịkwa Izrel. 9 Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya,Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwabụ ndị na-eji ngangana mpako na-ekwu sị, 10 “Nkume brik ndị ahụ adakpọsịalama anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha;ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị,ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.” 11 Ma ONYENWE ANYỊ a kpaliela ndị iro Rezin ka ha bilie megide ha,ọ kwaliekwala ndị iro ha. 12 Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 13 Ma ọ bụ ezie na ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a,ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya. 14 Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, ONYENWE ANYỊ ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ,ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile. 15 Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha,ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha. 16 Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha;ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo. 17 Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ,ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ,nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume,ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 18 Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ:ọ na-erepịa ogwu na uke,ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ,mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe. 19 Nʼihi iwe ahụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe,ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere;ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya;ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya. 20 Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe,onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri.Ha ga-erima afọ agaghị eju ha;nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha. 21 Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ.Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ.Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

In Other Versions

Isaiah 9 in the ANGEFD

Isaiah 9 in the ANTPNG2D

Isaiah 9 in the AS21

Isaiah 9 in the BAGH

Isaiah 9 in the BBPNG

Isaiah 9 in the BBT1E

Isaiah 9 in the BDS

Isaiah 9 in the BEV

Isaiah 9 in the BHAD

Isaiah 9 in the BIB

Isaiah 9 in the BLPT

Isaiah 9 in the BNT

Isaiah 9 in the BNTABOOT

Isaiah 9 in the BNTLV

Isaiah 9 in the BOATCB

Isaiah 9 in the BOATCB2

Isaiah 9 in the BOBCV

Isaiah 9 in the BOCNT

Isaiah 9 in the BOECS

Isaiah 9 in the BOGWICC

Isaiah 9 in the BOHCB

Isaiah 9 in the BOHCV

Isaiah 9 in the BOHLNT

Isaiah 9 in the BOHNTLTAL

Isaiah 9 in the BOILNTAP

Isaiah 9 in the BOITCV

Isaiah 9 in the BOKCV

Isaiah 9 in the BOKCV2

Isaiah 9 in the BOKHWOG

Isaiah 9 in the BOKSSV

Isaiah 9 in the BOLCB

Isaiah 9 in the BOLCB2

Isaiah 9 in the BOMCV

Isaiah 9 in the BONAV

Isaiah 9 in the BONCB

Isaiah 9 in the BONLT

Isaiah 9 in the BONUT2

Isaiah 9 in the BOPLNT

Isaiah 9 in the BOSCB

Isaiah 9 in the BOSNC

Isaiah 9 in the BOTLNT

Isaiah 9 in the BOVCB

Isaiah 9 in the BOYCB

Isaiah 9 in the BPBB

Isaiah 9 in the BPH

Isaiah 9 in the BSB

Isaiah 9 in the CCB

Isaiah 9 in the CUV

Isaiah 9 in the CUVS

Isaiah 9 in the DBT

Isaiah 9 in the DGDNT

Isaiah 9 in the DHNT

Isaiah 9 in the DNT

Isaiah 9 in the ELBE

Isaiah 9 in the EMTV

Isaiah 9 in the ESV

Isaiah 9 in the FBV

Isaiah 9 in the FEB

Isaiah 9 in the GGMNT

Isaiah 9 in the GNT

Isaiah 9 in the HARY

Isaiah 9 in the HNT

Isaiah 9 in the IRVA

Isaiah 9 in the IRVB

Isaiah 9 in the IRVG

Isaiah 9 in the IRVH

Isaiah 9 in the IRVK

Isaiah 9 in the IRVM

Isaiah 9 in the IRVM2

Isaiah 9 in the IRVO

Isaiah 9 in the IRVP

Isaiah 9 in the IRVT

Isaiah 9 in the IRVT2

Isaiah 9 in the IRVU

Isaiah 9 in the ISVN

Isaiah 9 in the JSNT

Isaiah 9 in the KAPI

Isaiah 9 in the KBT1ETNIK

Isaiah 9 in the KBV

Isaiah 9 in the KJV

Isaiah 9 in the KNFD

Isaiah 9 in the LBA

Isaiah 9 in the LBLA

Isaiah 9 in the LNT

Isaiah 9 in the LSV

Isaiah 9 in the MAAL

Isaiah 9 in the MBV

Isaiah 9 in the MBV2

Isaiah 9 in the MHNT

Isaiah 9 in the MKNFD

Isaiah 9 in the MNG

Isaiah 9 in the MNT

Isaiah 9 in the MNT2

Isaiah 9 in the MRS1T

Isaiah 9 in the NAA

Isaiah 9 in the NASB

Isaiah 9 in the NBLA

Isaiah 9 in the NBS

Isaiah 9 in the NBVTP

Isaiah 9 in the NET2

Isaiah 9 in the NIV11

Isaiah 9 in the NNT

Isaiah 9 in the NNT2

Isaiah 9 in the NNT3

Isaiah 9 in the PDDPT

Isaiah 9 in the PFNT

Isaiah 9 in the RMNT

Isaiah 9 in the SBIAS

Isaiah 9 in the SBIBS

Isaiah 9 in the SBIBS2

Isaiah 9 in the SBICS

Isaiah 9 in the SBIDS

Isaiah 9 in the SBIGS

Isaiah 9 in the SBIHS

Isaiah 9 in the SBIIS

Isaiah 9 in the SBIIS2

Isaiah 9 in the SBIIS3

Isaiah 9 in the SBIKS

Isaiah 9 in the SBIKS2

Isaiah 9 in the SBIMS

Isaiah 9 in the SBIOS

Isaiah 9 in the SBIPS

Isaiah 9 in the SBISS

Isaiah 9 in the SBITS

Isaiah 9 in the SBITS2

Isaiah 9 in the SBITS3

Isaiah 9 in the SBITS4

Isaiah 9 in the SBIUS

Isaiah 9 in the SBIVS

Isaiah 9 in the SBT

Isaiah 9 in the SBT1E

Isaiah 9 in the SCHL

Isaiah 9 in the SNT

Isaiah 9 in the SUSU

Isaiah 9 in the SUSU2

Isaiah 9 in the SYNO

Isaiah 9 in the TBIAOTANT

Isaiah 9 in the TBT1E

Isaiah 9 in the TBT1E2

Isaiah 9 in the TFTIP

Isaiah 9 in the TFTU

Isaiah 9 in the TGNTATF3T

Isaiah 9 in the THAI

Isaiah 9 in the TNFD

Isaiah 9 in the TNT

Isaiah 9 in the TNTIK

Isaiah 9 in the TNTIL

Isaiah 9 in the TNTIN

Isaiah 9 in the TNTIP

Isaiah 9 in the TNTIZ

Isaiah 9 in the TOMA

Isaiah 9 in the TTENT

Isaiah 9 in the UBG

Isaiah 9 in the UGV

Isaiah 9 in the UGV2

Isaiah 9 in the UGV3

Isaiah 9 in the VBL

Isaiah 9 in the VDCC

Isaiah 9 in the YALU

Isaiah 9 in the YAPE

Isaiah 9 in the YBVTP

Isaiah 9 in the ZBP