Judges 13 (BOICB)

1 Ndị Izrel mehiekwara ọzọ nʼihu ONYENWE ANYỊ. Nʼihi nke a, ONYENWE ANYỊ kwenyere ka ndị Filistia merie ha. Ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ha iri afọ anọ. 2 Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa. 3 Otu ụbọchị, mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa. 4 Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ. 5 Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya, nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye Chineke site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta Izrel site nʼaka ndị Filistia.” 6 Nwanyị ahụ gbara ọsọ gbalaa gaa gwa di ya sị ya, “Otu onye nke Chineke egosila m onwe ya. O dokwara m anya na ọ bụ mmụọ ozi Chineke, nʼihi na ọ dị oke ebube nʼile anya. Ma ajụghị m ya ebe o siri bịa, ọ gwakwaghị m aha ya. 7 Kama ọ sịrị m, ‘Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke. Ma ugbu a, ị gaghị aṅụ mmanya vaịnị maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe ọbụla rụrụ arụ, nʼihi na nwantakịrị ahụ ga-abụ onye e doro nsọ nye Chineke, site nʼime akpanwa ruo nʼọnwụ ya.’ ” 8 Mgbe ahụ, Manoa kpere ekpere rịọọ ONYENWE ANYỊ arịrịọ sị, “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke Chineke ahụ i ziteere anyị bịaghachikwa ọzọ, kuziere anyị otu anyị ga-esi zụlite nwa nwoke a ga-amụta.” 9 Chineke zara ekpere ya. Mmụọ ozi ahụ bịakwutekwara nwunye Manoa mgbe ọ nọ nʼubi; maọbụ naanị ya nọ, di ya anọghị ya. 10 Ya mere, nwanyị ahụ gbara ọsọ gaa gwa di ya sị, “Lee, nwoke ahụ bịakwutere m ụbọchị a, abịala ọzọ!” 11 Manoa biliri, soro nwunye ya. Mgbe o bịarutere ebe nwoke ahụ nọ, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ gwara nwunye m okwu nʼoge gara aga?”Ọ zara sị ya, “E, ọ bụ m.” 12 Manoa gwara ya okwu sị, “Mgbe okwu gị mezuru, gịnị bụ iwu banyere ndụ na ọrụ nwa nwoke a?” 13 Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ zaghachiri, “Nwunye gị aghaghị imezu ihe niile m nke m gwara ya. 14 Ka ọ ghara iri ihe ọbụla si nʼosisi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmanya ọbụla maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe rụrụ arụ ọbụla.” 15 Manoa rịọrọ Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ si ya, “Ọ ga-amasị anyị ma ị nọdụ chere ka anyị kwadoro gị nwa ewu.” 16 Ma Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja.” Ma Manoa aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ. 17 Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?” 18 Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.” 19 Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, ONYENWE ANYỊ mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe Manoa na nwunye ya guzo na-ele anya: 20 Mgbe ire ọkụ ahụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ na-arịgo na-aga elu, Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ wụliri elu soro ire ọkụ ahụ rigoro gawa nʼeluigwe! Mgbe Manoa na nwunye ya hụrụ ka nke a na-eme, ha kpuru ihu ha nʼala. 21 Mgbe Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ na-egosighị onwe ya ọzọ nye Manoa na nwunye ya, ka Manoa ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ ka ha hụrụ. 22 Manoa gwara nwunye ya sị, “Anyị abụrụla ndị nwụrụ anwụ, nʼihi na anyị ahụla Chineke!” 23 Ma nwunye ya zara sị ya, “Ọ bụrụ na ONYENWE ANYỊ chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka anyị chụrụ nye ya. Ọzọkwa, ọ garaghị egosi anyị ihe ndị a niile maọbụ gwa anyị ihe ndị a.” 24 Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ Samsin. ONYENWE ANYỊ gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite. 25 Mmụọ ONYENWE ANYỊ bidokwara na-agba ya ume nʼoge niile, mgbe ọ nọ Mahane Dan, nke dị nʼetiti Zora na Eshtaol.

In Other Versions

Judges 13 in the ANGEFD

Judges 13 in the ANTPNG2D

Judges 13 in the AS21

Judges 13 in the BAGH

Judges 13 in the BBPNG

Judges 13 in the BBT1E

Judges 13 in the BDS

Judges 13 in the BEV

Judges 13 in the BHAD

Judges 13 in the BIB

Judges 13 in the BLPT

Judges 13 in the BNT

Judges 13 in the BNTABOOT

Judges 13 in the BNTLV

Judges 13 in the BOATCB

Judges 13 in the BOATCB2

Judges 13 in the BOBCV

Judges 13 in the BOCNT

Judges 13 in the BOECS

Judges 13 in the BOGWICC

Judges 13 in the BOHCB

Judges 13 in the BOHCV

Judges 13 in the BOHLNT

Judges 13 in the BOHNTLTAL

Judges 13 in the BOILNTAP

Judges 13 in the BOITCV

Judges 13 in the BOKCV

Judges 13 in the BOKCV2

Judges 13 in the BOKHWOG

Judges 13 in the BOKSSV

Judges 13 in the BOLCB

Judges 13 in the BOLCB2

Judges 13 in the BOMCV

Judges 13 in the BONAV

Judges 13 in the BONCB

Judges 13 in the BONLT

Judges 13 in the BONUT2

Judges 13 in the BOPLNT

Judges 13 in the BOSCB

Judges 13 in the BOSNC

Judges 13 in the BOTLNT

Judges 13 in the BOVCB

Judges 13 in the BOYCB

Judges 13 in the BPBB

Judges 13 in the BPH

Judges 13 in the BSB

Judges 13 in the CCB

Judges 13 in the CUV

Judges 13 in the CUVS

Judges 13 in the DBT

Judges 13 in the DGDNT

Judges 13 in the DHNT

Judges 13 in the DNT

Judges 13 in the ELBE

Judges 13 in the EMTV

Judges 13 in the ESV

Judges 13 in the FBV

Judges 13 in the FEB

Judges 13 in the GGMNT

Judges 13 in the GNT

Judges 13 in the HARY

Judges 13 in the HNT

Judges 13 in the IRVA

Judges 13 in the IRVB

Judges 13 in the IRVG

Judges 13 in the IRVH

Judges 13 in the IRVK

Judges 13 in the IRVM

Judges 13 in the IRVM2

Judges 13 in the IRVO

Judges 13 in the IRVP

Judges 13 in the IRVT

Judges 13 in the IRVT2

Judges 13 in the IRVU

Judges 13 in the ISVN

Judges 13 in the JSNT

Judges 13 in the KAPI

Judges 13 in the KBT1ETNIK

Judges 13 in the KBV

Judges 13 in the KJV

Judges 13 in the KNFD

Judges 13 in the LBA

Judges 13 in the LBLA

Judges 13 in the LNT

Judges 13 in the LSV

Judges 13 in the MAAL

Judges 13 in the MBV

Judges 13 in the MBV2

Judges 13 in the MHNT

Judges 13 in the MKNFD

Judges 13 in the MNG

Judges 13 in the MNT

Judges 13 in the MNT2

Judges 13 in the MRS1T

Judges 13 in the NAA

Judges 13 in the NASB

Judges 13 in the NBLA

Judges 13 in the NBS

Judges 13 in the NBVTP

Judges 13 in the NET2

Judges 13 in the NIV11

Judges 13 in the NNT

Judges 13 in the NNT2

Judges 13 in the NNT3

Judges 13 in the PDDPT

Judges 13 in the PFNT

Judges 13 in the RMNT

Judges 13 in the SBIAS

Judges 13 in the SBIBS

Judges 13 in the SBIBS2

Judges 13 in the SBICS

Judges 13 in the SBIDS

Judges 13 in the SBIGS

Judges 13 in the SBIHS

Judges 13 in the SBIIS

Judges 13 in the SBIIS2

Judges 13 in the SBIIS3

Judges 13 in the SBIKS

Judges 13 in the SBIKS2

Judges 13 in the SBIMS

Judges 13 in the SBIOS

Judges 13 in the SBIPS

Judges 13 in the SBISS

Judges 13 in the SBITS

Judges 13 in the SBITS2

Judges 13 in the SBITS3

Judges 13 in the SBITS4

Judges 13 in the SBIUS

Judges 13 in the SBIVS

Judges 13 in the SBT

Judges 13 in the SBT1E

Judges 13 in the SCHL

Judges 13 in the SNT

Judges 13 in the SUSU

Judges 13 in the SUSU2

Judges 13 in the SYNO

Judges 13 in the TBIAOTANT

Judges 13 in the TBT1E

Judges 13 in the TBT1E2

Judges 13 in the TFTIP

Judges 13 in the TFTU

Judges 13 in the TGNTATF3T

Judges 13 in the THAI

Judges 13 in the TNFD

Judges 13 in the TNT

Judges 13 in the TNTIK

Judges 13 in the TNTIL

Judges 13 in the TNTIN

Judges 13 in the TNTIP

Judges 13 in the TNTIZ

Judges 13 in the TOMA

Judges 13 in the TTENT

Judges 13 in the UBG

Judges 13 in the UGV

Judges 13 in the UGV2

Judges 13 in the UGV3

Judges 13 in the VBL

Judges 13 in the VDCC

Judges 13 in the YALU

Judges 13 in the YAPE

Judges 13 in the YBVTP

Judges 13 in the ZBP