Judges 5 (BOICB)

1 Nʼụbọchị ahụ, Debọra na Barak nwa Abinoam bụrụ abụ sị, 2 “Mgbe ndị ndu na-edu nʼIzrel,mgbe ndị mmadụ jikwa afọ ofufu nye onwe ha,toonu ONYENWE ANYỊ! 3 “Nụrụnụ nke a, unu ndị eze, Geenụ ntị, unu ndịisi!Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-abụku Onyenwe anyị abụ.Aga m abụ abụ otuto nye ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke Izrel. 4 “ONYENWE ANYỊ, mgbe i si Sia pụta,mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga,ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuusikwa na mbara eluigwe zodata. 5 E, ọ bụladị ugwu ukwu niile mara jijiji nʼihu ONYENWE ANYỊ.Ugwu Saịnaị makwara jijiji nʼihu ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel. 6 “Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat,nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị,ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga. 7 Ọ dịkwaghị ihe gara aga nʼobodo Izrel,tutu ruo mgbe m bịara,ee, mgbe m bụ Debọra bịara dịka nne nye Izrel. 8 Mgbe ụmụ Izrel họrọ ife chi ndị ọzọ ofufe,mgbe agha bịara nʼọnụ ụzọ ama niile,ahụghị ọ bụladị otu ụta maọbụ ùbe.E, ọ bụladị nʼetiti iri puku ndị agha anọ, a hụghị otu ngwa agha ọbụla. 9 Ma ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ banyere ndị na-achị ụmụ Izrel.Ndị ji obi ha niile were onwe ha nye nʼetiti ndị Izrel.Toonu ONYENWE ANYỊ! 10 “Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha,unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu,na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ.Tụleenụ 11 olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile.Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke ONYENWE ANYỊ,ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel. “Mgbe ahụ, ndị nke ONYENWE ANYỊridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo. 12 ‘Teta, teta, gị Debọra!Teta, teta, bụọ abụ.Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie!Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’ 13 “Ndị fọdụrụ na ndị a na-asọpụrụ rịdatara,ndị nke ONYENWE ANYỊ bịakwutere m imegide ndị dị ike. 14 Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek,ndị Benjamin sokwa pụta,ndị ndu sikwa Makia bịa,ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta. 15 Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra.E, Isaka sokwara Barakna ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya.Ma nʼetiti ndị Ruben,ha nọ na-atụgharị uche. 16 Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ,ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ?Nʼetiti obodo niile nke Ruben,ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche. 17 Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha.Ndị Asha nọgidere nʼahụ udonʼakụkụ ọnụ mmiri. 18 Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja,pụọ nʼọzara ibu agha ahụ. 19 “Ndị eze ala Kenan bịara ọgụ na Teanak,nʼakụkụ mmiri ala Megido.Ma ha enweghị mmeri ọbụla.Ha akwataghị ọlaọcha maọbụ ihe nkwata ọzọ nʼagha. 20 Ọ bụladị kpakpando niiledị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera. 21 Mmiri na-achị ọkụ nke iyi ukwu Kishọn bupụrụ ha niile.Ya mere, mkpụrụobi m gaa nʼihu,zoo ụkwụ gị nʼala, dị ike dịka ọdụm! 22 Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro.Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ! 23 Ma Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ sịrị,‘Bụọ Meroz ọnụ.’‘Bụọ ndị bi na ya ọnụ ebe ọ dị ukwuu,nʼihi na ha abịaghị nyere ONYENWE ANYỊ aka imeri ndị iro ya.’ 24 “Onye a gọziri karịchasịa ka Jael,nwunye Heba onye Ken bụ,e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu. 25 Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi,o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ. 26 O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ,aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ.Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi,ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. 27 Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala,nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara.Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara,nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ. 28 “Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anyanʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu,‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa?Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’ 29 Ma otu nʼime ndị inyom na-ejere ya ozi, nke makarịsịrị ibe ya nʼihe.E, ya onwe ya kwukwara sị, 30 ‘Ọ bụ na ha adịghị achọta ma na-ekekwa ọtụtụ ihe a kwatara nʼagha:onye agha ọbụla ga-eketa otu nwaagbọghọ, maọbụ abụọ.Sisera ga-enweta uwe nwere ọtụtụ agwa dị iche iche,uwe nwere ọtụtụ agwa ndị a kpara nke ọmauwe ndị akpaziri nke ọma maka ịnya nʼolu m,ihe ndị a niile dịka ihe nkwata nʼagha?’ 31 “ONYENWE ANYỊ, biko, ka ndị iro gị niile si otu a laa nʼiyi.Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nwupụta ihe dịka anyanwụmgbe o biliri nʼike.”E nwere izuike nʼala ahụ iri afọ anọ.

In Other Versions

Judges 5 in the ANGEFD

Judges 5 in the ANTPNG2D

Judges 5 in the AS21

Judges 5 in the BAGH

Judges 5 in the BBPNG

Judges 5 in the BBT1E

Judges 5 in the BDS

Judges 5 in the BEV

Judges 5 in the BHAD

Judges 5 in the BIB

Judges 5 in the BLPT

Judges 5 in the BNT

Judges 5 in the BNTABOOT

Judges 5 in the BNTLV

Judges 5 in the BOATCB

Judges 5 in the BOATCB2

Judges 5 in the BOBCV

Judges 5 in the BOCNT

Judges 5 in the BOECS

Judges 5 in the BOGWICC

Judges 5 in the BOHCB

Judges 5 in the BOHCV

Judges 5 in the BOHLNT

Judges 5 in the BOHNTLTAL

Judges 5 in the BOILNTAP

Judges 5 in the BOITCV

Judges 5 in the BOKCV

Judges 5 in the BOKCV2

Judges 5 in the BOKHWOG

Judges 5 in the BOKSSV

Judges 5 in the BOLCB

Judges 5 in the BOLCB2

Judges 5 in the BOMCV

Judges 5 in the BONAV

Judges 5 in the BONCB

Judges 5 in the BONLT

Judges 5 in the BONUT2

Judges 5 in the BOPLNT

Judges 5 in the BOSCB

Judges 5 in the BOSNC

Judges 5 in the BOTLNT

Judges 5 in the BOVCB

Judges 5 in the BOYCB

Judges 5 in the BPBB

Judges 5 in the BPH

Judges 5 in the BSB

Judges 5 in the CCB

Judges 5 in the CUV

Judges 5 in the CUVS

Judges 5 in the DBT

Judges 5 in the DGDNT

Judges 5 in the DHNT

Judges 5 in the DNT

Judges 5 in the ELBE

Judges 5 in the EMTV

Judges 5 in the ESV

Judges 5 in the FBV

Judges 5 in the FEB

Judges 5 in the GGMNT

Judges 5 in the GNT

Judges 5 in the HARY

Judges 5 in the HNT

Judges 5 in the IRVA

Judges 5 in the IRVB

Judges 5 in the IRVG

Judges 5 in the IRVH

Judges 5 in the IRVK

Judges 5 in the IRVM

Judges 5 in the IRVM2

Judges 5 in the IRVO

Judges 5 in the IRVP

Judges 5 in the IRVT

Judges 5 in the IRVT2

Judges 5 in the IRVU

Judges 5 in the ISVN

Judges 5 in the JSNT

Judges 5 in the KAPI

Judges 5 in the KBT1ETNIK

Judges 5 in the KBV

Judges 5 in the KJV

Judges 5 in the KNFD

Judges 5 in the LBA

Judges 5 in the LBLA

Judges 5 in the LNT

Judges 5 in the LSV

Judges 5 in the MAAL

Judges 5 in the MBV

Judges 5 in the MBV2

Judges 5 in the MHNT

Judges 5 in the MKNFD

Judges 5 in the MNG

Judges 5 in the MNT

Judges 5 in the MNT2

Judges 5 in the MRS1T

Judges 5 in the NAA

Judges 5 in the NASB

Judges 5 in the NBLA

Judges 5 in the NBS

Judges 5 in the NBVTP

Judges 5 in the NET2

Judges 5 in the NIV11

Judges 5 in the NNT

Judges 5 in the NNT2

Judges 5 in the NNT3

Judges 5 in the PDDPT

Judges 5 in the PFNT

Judges 5 in the RMNT

Judges 5 in the SBIAS

Judges 5 in the SBIBS

Judges 5 in the SBIBS2

Judges 5 in the SBICS

Judges 5 in the SBIDS

Judges 5 in the SBIGS

Judges 5 in the SBIHS

Judges 5 in the SBIIS

Judges 5 in the SBIIS2

Judges 5 in the SBIIS3

Judges 5 in the SBIKS

Judges 5 in the SBIKS2

Judges 5 in the SBIMS

Judges 5 in the SBIOS

Judges 5 in the SBIPS

Judges 5 in the SBISS

Judges 5 in the SBITS

Judges 5 in the SBITS2

Judges 5 in the SBITS3

Judges 5 in the SBITS4

Judges 5 in the SBIUS

Judges 5 in the SBIVS

Judges 5 in the SBT

Judges 5 in the SBT1E

Judges 5 in the SCHL

Judges 5 in the SNT

Judges 5 in the SUSU

Judges 5 in the SUSU2

Judges 5 in the SYNO

Judges 5 in the TBIAOTANT

Judges 5 in the TBT1E

Judges 5 in the TBT1E2

Judges 5 in the TFTIP

Judges 5 in the TFTU

Judges 5 in the TGNTATF3T

Judges 5 in the THAI

Judges 5 in the TNFD

Judges 5 in the TNT

Judges 5 in the TNTIK

Judges 5 in the TNTIL

Judges 5 in the TNTIN

Judges 5 in the TNTIP

Judges 5 in the TNTIZ

Judges 5 in the TOMA

Judges 5 in the TTENT

Judges 5 in the UBG

Judges 5 in the UGV

Judges 5 in the UGV2

Judges 5 in the UGV3

Judges 5 in the VBL

Judges 5 in the VDCC

Judges 5 in the YALU

Judges 5 in the YAPE

Judges 5 in the YBVTP

Judges 5 in the ZBP