Jeremiah 15 (BOICB)
1 Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ gwara m okwu sị m, “Ọ bụrụ na Mosis na Samuel apụta bịa guzo nʼihu m, ụdịdị obi m agaghị agbanwe nʼebe ndị a nọ. Chụpụ ha nʼihu m. Mee ka ha si nʼebe a pụọ. 2 Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ,ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu;ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu,otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’ 3 “Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 4 Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem. 5 “Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem?Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị?Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị? 6 Gị onwe gị ajụla m,”ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara.“Ị nọgidela na-adaghachi azụ.Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị.Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m. 7 Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa hanʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ.Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa. 8 Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba.Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri.Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibibịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha;na mberede ka m ga-eme ka nhụju anyana ihe oke egwu bịakwasị ha. 9 Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba,kubie ume.Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị,ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala.Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọsite na mma agha ndị iro ha.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 10 Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m,onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu.O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego,ma mmadụ niile na-akọcha m. 11 ONYENWE ANYỊ kwuru sị,“Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe,aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọnʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu. 12 “Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe,ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz? 13 “Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị,nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla.Nʼihi na mmehie gị niileejupụtala nʼala a niile. 14 Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị.Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị.Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụnke ga-eregbu gị.” 15 Ị maara O ONYENWE ANYỊ,ya mere cheta m, lekọtaakwa m.Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m.Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi.Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị. 16 Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri.Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ,nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị, ONYENWE ANYỊ Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. 17 O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ.Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ.A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m.I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha. 18 Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị?Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya?Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ,dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi. 19 Ya mere, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị,ime ka i guzokwa nʼihu m.Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzuị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m.Ndị a ga-alaghachikwute gịma i gaghị alaghachikwuru ha. 20 Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ.Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo.Ha ga-ebuso gị agha,ma ha agaghị emeri gịnʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị,nakwa ịzọpụta gị,”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 21 “Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ.Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”
In Other Versions
Jeremiah 15 in the ANGEFD
Jeremiah 15 in the ANTPNG2D
Jeremiah 15 in the AS21
Jeremiah 15 in the BAGH
Jeremiah 15 in the BBPNG
Jeremiah 15 in the BBT1E
Jeremiah 15 in the BDS
Jeremiah 15 in the BEV
Jeremiah 15 in the BHAD
Jeremiah 15 in the BIB
Jeremiah 15 in the BLPT
Jeremiah 15 in the BNT
Jeremiah 15 in the BNTABOOT
Jeremiah 15 in the BNTLV
Jeremiah 15 in the BOATCB
Jeremiah 15 in the BOATCB2
Jeremiah 15 in the BOBCV
Jeremiah 15 in the BOCNT
Jeremiah 15 in the BOECS
Jeremiah 15 in the BOGWICC
Jeremiah 15 in the BOHCB
Jeremiah 15 in the BOHCV
Jeremiah 15 in the BOHLNT
Jeremiah 15 in the BOHNTLTAL
Jeremiah 15 in the BOILNTAP
Jeremiah 15 in the BOITCV
Jeremiah 15 in the BOKCV
Jeremiah 15 in the BOKCV2
Jeremiah 15 in the BOKHWOG
Jeremiah 15 in the BOKSSV
Jeremiah 15 in the BOLCB
Jeremiah 15 in the BOLCB2
Jeremiah 15 in the BOMCV
Jeremiah 15 in the BONAV
Jeremiah 15 in the BONCB
Jeremiah 15 in the BONLT
Jeremiah 15 in the BONUT2
Jeremiah 15 in the BOPLNT
Jeremiah 15 in the BOSCB
Jeremiah 15 in the BOSNC
Jeremiah 15 in the BOTLNT
Jeremiah 15 in the BOVCB
Jeremiah 15 in the BOYCB
Jeremiah 15 in the BPBB
Jeremiah 15 in the BPH
Jeremiah 15 in the BSB
Jeremiah 15 in the CCB
Jeremiah 15 in the CUV
Jeremiah 15 in the CUVS
Jeremiah 15 in the DBT
Jeremiah 15 in the DGDNT
Jeremiah 15 in the DHNT
Jeremiah 15 in the DNT
Jeremiah 15 in the ELBE
Jeremiah 15 in the EMTV
Jeremiah 15 in the ESV
Jeremiah 15 in the FBV
Jeremiah 15 in the FEB
Jeremiah 15 in the GGMNT
Jeremiah 15 in the GNT
Jeremiah 15 in the HARY
Jeremiah 15 in the HNT
Jeremiah 15 in the IRVA
Jeremiah 15 in the IRVB
Jeremiah 15 in the IRVG
Jeremiah 15 in the IRVH
Jeremiah 15 in the IRVK
Jeremiah 15 in the IRVM
Jeremiah 15 in the IRVM2
Jeremiah 15 in the IRVO
Jeremiah 15 in the IRVP
Jeremiah 15 in the IRVT
Jeremiah 15 in the IRVT2
Jeremiah 15 in the IRVU
Jeremiah 15 in the ISVN
Jeremiah 15 in the JSNT
Jeremiah 15 in the KAPI
Jeremiah 15 in the KBT1ETNIK
Jeremiah 15 in the KBV
Jeremiah 15 in the KJV
Jeremiah 15 in the KNFD
Jeremiah 15 in the LBA
Jeremiah 15 in the LBLA
Jeremiah 15 in the LNT
Jeremiah 15 in the LSV
Jeremiah 15 in the MAAL
Jeremiah 15 in the MBV
Jeremiah 15 in the MBV2
Jeremiah 15 in the MHNT
Jeremiah 15 in the MKNFD
Jeremiah 15 in the MNG
Jeremiah 15 in the MNT
Jeremiah 15 in the MNT2
Jeremiah 15 in the MRS1T
Jeremiah 15 in the NAA
Jeremiah 15 in the NASB
Jeremiah 15 in the NBLA
Jeremiah 15 in the NBS
Jeremiah 15 in the NBVTP
Jeremiah 15 in the NET2
Jeremiah 15 in the NIV11
Jeremiah 15 in the NNT
Jeremiah 15 in the NNT2
Jeremiah 15 in the NNT3
Jeremiah 15 in the PDDPT
Jeremiah 15 in the PFNT
Jeremiah 15 in the RMNT
Jeremiah 15 in the SBIAS
Jeremiah 15 in the SBIBS
Jeremiah 15 in the SBIBS2
Jeremiah 15 in the SBICS
Jeremiah 15 in the SBIDS
Jeremiah 15 in the SBIGS
Jeremiah 15 in the SBIHS
Jeremiah 15 in the SBIIS
Jeremiah 15 in the SBIIS2
Jeremiah 15 in the SBIIS3
Jeremiah 15 in the SBIKS
Jeremiah 15 in the SBIKS2
Jeremiah 15 in the SBIMS
Jeremiah 15 in the SBIOS
Jeremiah 15 in the SBIPS
Jeremiah 15 in the SBISS
Jeremiah 15 in the SBITS
Jeremiah 15 in the SBITS2
Jeremiah 15 in the SBITS3
Jeremiah 15 in the SBITS4
Jeremiah 15 in the SBIUS
Jeremiah 15 in the SBIVS
Jeremiah 15 in the SBT
Jeremiah 15 in the SBT1E
Jeremiah 15 in the SCHL
Jeremiah 15 in the SNT
Jeremiah 15 in the SUSU
Jeremiah 15 in the SUSU2
Jeremiah 15 in the SYNO
Jeremiah 15 in the TBIAOTANT
Jeremiah 15 in the TBT1E
Jeremiah 15 in the TBT1E2
Jeremiah 15 in the TFTIP
Jeremiah 15 in the TFTU
Jeremiah 15 in the TGNTATF3T
Jeremiah 15 in the THAI
Jeremiah 15 in the TNFD
Jeremiah 15 in the TNT
Jeremiah 15 in the TNTIK
Jeremiah 15 in the TNTIL
Jeremiah 15 in the TNTIN
Jeremiah 15 in the TNTIP
Jeremiah 15 in the TNTIZ
Jeremiah 15 in the TOMA
Jeremiah 15 in the TTENT
Jeremiah 15 in the UBG
Jeremiah 15 in the UGV
Jeremiah 15 in the UGV2
Jeremiah 15 in the UGV3
Jeremiah 15 in the VBL
Jeremiah 15 in the VDCC
Jeremiah 15 in the YALU
Jeremiah 15 in the YAPE
Jeremiah 15 in the YBVTP
Jeremiah 15 in the ZBP