Jeremiah 19 (BOICB)

1 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Jee, zụta otu ite aja site nʼaka ọkpụ ite. Duru ụfọdụ nʼime ndị okenye na ndị nchụaja, 2 jee na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nke dị nso nʼọnụ ụzọ ama Ejuju dị nʼọwụwa anyanwụ. Nọdụ nʼebe ahụ kwupụtara ha okwu ndị m gwara gị. 3 Sị ha, ‘Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ, unu ndị eze Juda, na ndị Jerusalem. Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke Izrel kwuru. Geenụ ntị! Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ala a, ụdị ihe ọjọọ ga-eme ka ntị ọbụla nụrụ ya zụọ wuruwuru. 4 Nʼihi na ha ahapụla m, mee ka ebe a ghọọ nke chi ndị mba ọzọ. Ha achụọla aja nsure ọkụ nʼime ya nye chi ndị ahụ ha na nna nna ha, maọbụ ndị eze Juda, na-amaghị. Ha ejirila ọbara ndị aka ha dị ọcha mejupụta ebe a. 5 Ha ewuola ebe ịchụ aja dị elu nye chi Baal. Nʼelu ya kwa ka ha na-esure ụmụ ha dịka aja nye Baal, bụ nke m na-enyeghị nʼiwu, ekwughịkwa m ya, o nwekwaghị mgbe o ji bata m nʼobi. 6 Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na ụbọchị ahụ na-abịa, ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, mgbe ndị mmadụ agaghị akpọkwa ebe a Tofet ma ọ bụkwanụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom, kama a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Ogbugbu. 7 “ ‘Nʼebe a ka m ga-anọ laa nzube niile nke Juda na Jerusalem nʼiyi. Aga m eme ka ha daa site na mma agha nʼihu ndị iro ha, nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike. Aga m enye ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ozu ha dịka nri. 8 Aga m ebibi obodo a mee ka ọ ghọọ ihe iju anya na ihe ịma ọsụ. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile. 9 Aga m emekwa ka ha rie anụ ahụ nke ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ha ga-erikwa anụ ahụ ibe ha, nʼihi na ndị iro ha ga-agba ha gburugburu nọchibido ha nʼime oke mkpagbu ka ha bibie ndụ ha.’ 10 “Kụwaa ite ahụ mgbe ndị gị na ha so nọ na-ele gị anya. 11 Gwa ha sị, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile sịrị: Aga m etipịa mba a na obodo a, dịka ite aja nke ọkpụ ite a si daa tipịasịa nʼụzọ a na-apụghị imezikwa ya ọzọ. Ha ga-eli ndị nwụrụ anwụ na Tofet tutu ruo mgbe ohere na-agaghị adịkwa ili ozu ọzọ. 12 Ihe dị otu a ka m ga-eme nʼebe a, meekwa ndị bi na ya. Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. Aga m eme obodo a ka ọ dịrị ka Tofet. 13 Ụlọ niile dị na Jerusalem na ụlọ niile nke ndị eze Juda ka a ga-emerụ dịka ebe a, bụ Tofet, otu a ka a ga-esi merụọkwa ụlọ niile a suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ha nye usuu niile nke eluigwe, wụsakwara chi ndị ọzọ ihe ọṅụṅụ dịka onyinye.’ ” 14 Mgbe Jeremaya si na Tofet, ebe ahụ ONYENWE ANYỊ zigara ya ibu amụma lọta, o guzoro nʼogige ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ, gwa ndị mmadụ niile okwu sị ha, 15 “Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke nke Izrel sịrị, ‘Geenụ ntị! Ana m aga ime ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru okwu ya bịakwasị obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, nʼihi na ha bụ ndị isiike, ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m.’ ”

In Other Versions

Jeremiah 19 in the ANGEFD

Jeremiah 19 in the ANTPNG2D

Jeremiah 19 in the AS21

Jeremiah 19 in the BAGH

Jeremiah 19 in the BBPNG

Jeremiah 19 in the BBT1E

Jeremiah 19 in the BDS

Jeremiah 19 in the BEV

Jeremiah 19 in the BHAD

Jeremiah 19 in the BIB

Jeremiah 19 in the BLPT

Jeremiah 19 in the BNT

Jeremiah 19 in the BNTABOOT

Jeremiah 19 in the BNTLV

Jeremiah 19 in the BOATCB

Jeremiah 19 in the BOATCB2

Jeremiah 19 in the BOBCV

Jeremiah 19 in the BOCNT

Jeremiah 19 in the BOECS

Jeremiah 19 in the BOGWICC

Jeremiah 19 in the BOHCB

Jeremiah 19 in the BOHCV

Jeremiah 19 in the BOHLNT

Jeremiah 19 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 19 in the BOILNTAP

Jeremiah 19 in the BOITCV

Jeremiah 19 in the BOKCV

Jeremiah 19 in the BOKCV2

Jeremiah 19 in the BOKHWOG

Jeremiah 19 in the BOKSSV

Jeremiah 19 in the BOLCB

Jeremiah 19 in the BOLCB2

Jeremiah 19 in the BOMCV

Jeremiah 19 in the BONAV

Jeremiah 19 in the BONCB

Jeremiah 19 in the BONLT

Jeremiah 19 in the BONUT2

Jeremiah 19 in the BOPLNT

Jeremiah 19 in the BOSCB

Jeremiah 19 in the BOSNC

Jeremiah 19 in the BOTLNT

Jeremiah 19 in the BOVCB

Jeremiah 19 in the BOYCB

Jeremiah 19 in the BPBB

Jeremiah 19 in the BPH

Jeremiah 19 in the BSB

Jeremiah 19 in the CCB

Jeremiah 19 in the CUV

Jeremiah 19 in the CUVS

Jeremiah 19 in the DBT

Jeremiah 19 in the DGDNT

Jeremiah 19 in the DHNT

Jeremiah 19 in the DNT

Jeremiah 19 in the ELBE

Jeremiah 19 in the EMTV

Jeremiah 19 in the ESV

Jeremiah 19 in the FBV

Jeremiah 19 in the FEB

Jeremiah 19 in the GGMNT

Jeremiah 19 in the GNT

Jeremiah 19 in the HARY

Jeremiah 19 in the HNT

Jeremiah 19 in the IRVA

Jeremiah 19 in the IRVB

Jeremiah 19 in the IRVG

Jeremiah 19 in the IRVH

Jeremiah 19 in the IRVK

Jeremiah 19 in the IRVM

Jeremiah 19 in the IRVM2

Jeremiah 19 in the IRVO

Jeremiah 19 in the IRVP

Jeremiah 19 in the IRVT

Jeremiah 19 in the IRVT2

Jeremiah 19 in the IRVU

Jeremiah 19 in the ISVN

Jeremiah 19 in the JSNT

Jeremiah 19 in the KAPI

Jeremiah 19 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 19 in the KBV

Jeremiah 19 in the KJV

Jeremiah 19 in the KNFD

Jeremiah 19 in the LBA

Jeremiah 19 in the LBLA

Jeremiah 19 in the LNT

Jeremiah 19 in the LSV

Jeremiah 19 in the MAAL

Jeremiah 19 in the MBV

Jeremiah 19 in the MBV2

Jeremiah 19 in the MHNT

Jeremiah 19 in the MKNFD

Jeremiah 19 in the MNG

Jeremiah 19 in the MNT

Jeremiah 19 in the MNT2

Jeremiah 19 in the MRS1T

Jeremiah 19 in the NAA

Jeremiah 19 in the NASB

Jeremiah 19 in the NBLA

Jeremiah 19 in the NBS

Jeremiah 19 in the NBVTP

Jeremiah 19 in the NET2

Jeremiah 19 in the NIV11

Jeremiah 19 in the NNT

Jeremiah 19 in the NNT2

Jeremiah 19 in the NNT3

Jeremiah 19 in the PDDPT

Jeremiah 19 in the PFNT

Jeremiah 19 in the RMNT

Jeremiah 19 in the SBIAS

Jeremiah 19 in the SBIBS

Jeremiah 19 in the SBIBS2

Jeremiah 19 in the SBICS

Jeremiah 19 in the SBIDS

Jeremiah 19 in the SBIGS

Jeremiah 19 in the SBIHS

Jeremiah 19 in the SBIIS

Jeremiah 19 in the SBIIS2

Jeremiah 19 in the SBIIS3

Jeremiah 19 in the SBIKS

Jeremiah 19 in the SBIKS2

Jeremiah 19 in the SBIMS

Jeremiah 19 in the SBIOS

Jeremiah 19 in the SBIPS

Jeremiah 19 in the SBISS

Jeremiah 19 in the SBITS

Jeremiah 19 in the SBITS2

Jeremiah 19 in the SBITS3

Jeremiah 19 in the SBITS4

Jeremiah 19 in the SBIUS

Jeremiah 19 in the SBIVS

Jeremiah 19 in the SBT

Jeremiah 19 in the SBT1E

Jeremiah 19 in the SCHL

Jeremiah 19 in the SNT

Jeremiah 19 in the SUSU

Jeremiah 19 in the SUSU2

Jeremiah 19 in the SYNO

Jeremiah 19 in the TBIAOTANT

Jeremiah 19 in the TBT1E

Jeremiah 19 in the TBT1E2

Jeremiah 19 in the TFTIP

Jeremiah 19 in the TFTU

Jeremiah 19 in the TGNTATF3T

Jeremiah 19 in the THAI

Jeremiah 19 in the TNFD

Jeremiah 19 in the TNT

Jeremiah 19 in the TNTIK

Jeremiah 19 in the TNTIL

Jeremiah 19 in the TNTIN

Jeremiah 19 in the TNTIP

Jeremiah 19 in the TNTIZ

Jeremiah 19 in the TOMA

Jeremiah 19 in the TTENT

Jeremiah 19 in the UBG

Jeremiah 19 in the UGV

Jeremiah 19 in the UGV2

Jeremiah 19 in the UGV3

Jeremiah 19 in the VBL

Jeremiah 19 in the VDCC

Jeremiah 19 in the YALU

Jeremiah 19 in the YAPE

Jeremiah 19 in the YBVTP

Jeremiah 19 in the ZBP