Jeremiah 2 (BOICB)

1 Okwu nke ONYENWE ANYỊ bịakwutere m na-asị, 2 “Gaa, kwupụta na ntị Jerusalem, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“ ‘Echetara m ịnụ ọkụ nʼobi nke okorobịa gị nʼoge gara aga ime ihe ga-atọ m ụtọ,ịhụnanya gị dịka onye a lụrụ ọhụrụ,echetakwara m otu unu si soro m nʼime ọzara,ga nʼala tọgbọrọ nʼefu nke a na-akụghị mkpụrụ. 3 Izrel bụ ihe dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ,mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya.Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara.Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’ ”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 4 Nụrụ okwu nke ONYENWE ANYỊ unu ụlọ Jekọb,na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel. 5 Ihe a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m,mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya?Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzusite nʼịgbaso arụsị? 6 Ha ajụghị ‘Olee ebe ONYENWE ANYỊ ahụ nọ,bụ onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta anyị,duuru anyị gafee ọzara tọgbọrọ nʼefu,nʼala ọzara na ala olulu jupụtara,ala nke akpịrị ịkpọ nkụ na nke oke ọchịchịrị,ala ebe ọ dịghị onye na-esi na ya agafee na nke mmadụ na-ebighị na ya?’ 7 Ọ bụ m kpọbatara unu nʼala na-amị ọtụtụ mkpụrụ,ka unu rie ihe dị ukwuu na ihe dị mma si nʼime ya.Ma unu bara merụọ ala munu mere ihe nketa m ka ọ ghọọ ihe arụ. 8 Ndị nchụaja ajụghị sị,‘Olee ebe ONYENWE ANYỊ nọ?’Ndị ikpe ha amaghị m,ndị na-achị ha mehiere megide m,ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma,ha gbasooro ihe na-enweghị isi. 9 “Nʼihi ya, aga m ebulite ebubo megide unu,”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.“M ga-ebulikwa ebubo megide ụmụ ụmụ unu. 10 Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya,zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma,ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a. 11 O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe?(Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.)Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isigbanwere ebube ha. 12 Ka ibubo nwụọ gị, gị eluigwe nʼihi nke a,maa jijiji, tụọkwa oke ụjọ.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 13 “Nʼihi na ndị m emeela ihe ọjọọ abụọ.Ha agbakụtala m azụ,bụ Isi iyi mmiri ndụ,gwuoro onwe ha ebe ichebe mmirinke tipuru etipu na-enweghị ike ịnagide mmiri ọbụla. 14 Izrel ọ bụ ohu, ka ọ bụ ohu a mụrụ nʼụlọ?Gịnị mere o ji ghọọ ihe nlụta nʼagha? 15 Ọdụm agbọọla ụja,ha ebigbọọla meekwa ka ọ nụ olu ha.Ha ebibiela obodo ya laa ya nʼiyi,suo ya ọkụ, nke mere na o nweghị onye bi na ha. 16 Ọzọkwa, ndị ikom Memfis na Tapanhisa kupuola gị isi. 17 Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu asite na ịhapụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu,mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ? 18 Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijiptsitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl?Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa,sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis? 19 Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ;ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị.Tulee ma matanụ nʼonwe unuotu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unubụ inupu isi na ịgbakụta ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu azụna-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,”nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara. 20 “Nʼoge gara aga, unu gbajiri yoku unudọkapụ agbụ jikọtara mụ na unu,unu sịrị, ‘Agaghị m ejere gị ozi.’Nʼezie, ọ bụ nʼelu ugwu ọbụlanakwa nʼokpuru osisi na-agbasa agbasa,ka ị na-edina dịka onye akwụna. 21 Ma mụ onwe m kụrụ gị dịka osisi vaịnị kachasị mmanke mkpụrụ ya dị ndụ dịkwa mma.Olee otu i siri tụgharịa megide m,ghọọ ihe rụrụ arụ, osisi vaịnị ọhịa? 22 Nʼagbanyeghị na iji ncha sachaa onwe gị,maọbụ jirikwa ọtụtụ ntụ ncha,ntụpọ nke mmehie gị ka dị nʼihu m,”Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 23 “Ị ga-esi aṅaa na-asị, ‘A bụghị m onye e merụrụ emerụ;o nwebeghị oge ọbụla m ji gbaso Baal?’Leruo ụzọ gị anya na ndagwurugwu,tulee ihe ndị i mere.Ị bụ nne ịnyịnya ibu dị nkọ,na-agbagharị ebe a nʼebe nke ọzọ. 24 Nne ịnyịnya ibu ọhịa nke mara ụzọ ya nke ọma nʼọzara,na-esi imi ma ọ ga-esichapụta oke ịnyịnya ibu,onye pụrụ igbochi ya nʼoge mmekọ ya na oke ịnyịnya zuru?Oke ịnyịnya ọbụla chọọrọ ya agaghị atụfu oge nʼịchụgharị ya,nʼihi nʼoge ha chọrọ mmekọ, ha ga-achọta ya. 25 Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu,mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku.Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara.Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya,aghaghị m ịgbaso ha.’ 26 “Dịka a na-eme onye ohi ihe ihere mgbe e jidere ya,otu a ka a ga-eme ụlọ Izrel ihere,ha onwe ha, ma ndị eze ha, ma ndịisi ha,ndị nchụaja ha na ndị amụma ha. 27 Ha na-asị osisi, ‘Nna m ka ị bụ,’na-asịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’Ha agbakụtala m azụ,jụ iche m ihu.Ma mgbe ọbụla nsogbu bịakwasịrị ha, ha na-asị,‘Bịa, zọpụta anyị.’ 28 Olee ebe chi ndị ahụ i meere nye onwe gị nọ?Ka ha bịa, ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta gị,mgbe nsogbu bịakwasịrị unu.Nʼihi na gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chidịka i si nwee ọtụtụ obodo. 29 “Gịnị mere unu ji ekwu okwu ebubo megide m?Unu niile enupula isi megide m,”ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 30 “Nʼefu ka m tiri ụmụ unu ihe;ma nke a emeghị ka ha nabata ịdọ aka na ntị.Dịka ọdụm na-adọgbu anụ,mma agha unu eripịala ndị amụma unu. 31 “Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke ONYENWE ANYỊ:“O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrelma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị?Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị,anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’? 32 Nwaagbọghọ ọ na-echefu ọla ịchọ mma ya,nwanyị a na-alụ ọhụrụ ọ na-echefu ngwa ịchọ mma ya?Ma nʼime ọtụtụ ụbọchị nke a na-apụghị ịgụta ọnụ,ndị m echefuola m. 33 Lee ka unu si bụrụ ndị ọka nʼịgbaso ịhụnanya.Ọ bụladị ụmụ nwanyị dị njọ karịsịa nwere ike ịmụta ihe site nʼụzọ unu. 34 Nʼuwe unu ka achọtara ọbarandị ogbenye na-enweghị ihe ọjọọ ha mere,nʼagbanyeghị na unu ejideghị ha ka ha nʼagbaka ụzọ.Ma unu gara nʼihu 35 na-asịkwa, ‘Emeghị m ihe ọjọọ,ọ dịghị eweso m iwe.’Ma aga m ekpe unu ikpe,nʼihi na unu na-asị, ‘Emeghị m mmehie.’ 36 Gịnị mere unu ji na-akpagharịna-agbanwe ụzọ unu ọtụtụ mgbe?Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ iheredịka ndị Asịrịa mere unu. 37 Unu ga-ebu aka unu nʼisimgbe unu si ebe ahụ na-apụ,nʼihi na ONYENWE ANYỊ ajụla ndị ahụ unu tụkwasịrị obi.Ha agaghị enyere unu aka.

In Other Versions

Jeremiah 2 in the ANGEFD

Jeremiah 2 in the ANTPNG2D

Jeremiah 2 in the AS21

Jeremiah 2 in the BAGH

Jeremiah 2 in the BBPNG

Jeremiah 2 in the BBT1E

Jeremiah 2 in the BDS

Jeremiah 2 in the BEV

Jeremiah 2 in the BHAD

Jeremiah 2 in the BIB

Jeremiah 2 in the BLPT

Jeremiah 2 in the BNT

Jeremiah 2 in the BNTABOOT

Jeremiah 2 in the BNTLV

Jeremiah 2 in the BOATCB

Jeremiah 2 in the BOATCB2

Jeremiah 2 in the BOBCV

Jeremiah 2 in the BOCNT

Jeremiah 2 in the BOECS

Jeremiah 2 in the BOGWICC

Jeremiah 2 in the BOHCB

Jeremiah 2 in the BOHCV

Jeremiah 2 in the BOHLNT

Jeremiah 2 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 2 in the BOILNTAP

Jeremiah 2 in the BOITCV

Jeremiah 2 in the BOKCV

Jeremiah 2 in the BOKCV2

Jeremiah 2 in the BOKHWOG

Jeremiah 2 in the BOKSSV

Jeremiah 2 in the BOLCB

Jeremiah 2 in the BOLCB2

Jeremiah 2 in the BOMCV

Jeremiah 2 in the BONAV

Jeremiah 2 in the BONCB

Jeremiah 2 in the BONLT

Jeremiah 2 in the BONUT2

Jeremiah 2 in the BOPLNT

Jeremiah 2 in the BOSCB

Jeremiah 2 in the BOSNC

Jeremiah 2 in the BOTLNT

Jeremiah 2 in the BOVCB

Jeremiah 2 in the BOYCB

Jeremiah 2 in the BPBB

Jeremiah 2 in the BPH

Jeremiah 2 in the BSB

Jeremiah 2 in the CCB

Jeremiah 2 in the CUV

Jeremiah 2 in the CUVS

Jeremiah 2 in the DBT

Jeremiah 2 in the DGDNT

Jeremiah 2 in the DHNT

Jeremiah 2 in the DNT

Jeremiah 2 in the ELBE

Jeremiah 2 in the EMTV

Jeremiah 2 in the ESV

Jeremiah 2 in the FBV

Jeremiah 2 in the FEB

Jeremiah 2 in the GGMNT

Jeremiah 2 in the GNT

Jeremiah 2 in the HARY

Jeremiah 2 in the HNT

Jeremiah 2 in the IRVA

Jeremiah 2 in the IRVB

Jeremiah 2 in the IRVG

Jeremiah 2 in the IRVH

Jeremiah 2 in the IRVK

Jeremiah 2 in the IRVM

Jeremiah 2 in the IRVM2

Jeremiah 2 in the IRVO

Jeremiah 2 in the IRVP

Jeremiah 2 in the IRVT

Jeremiah 2 in the IRVT2

Jeremiah 2 in the IRVU

Jeremiah 2 in the ISVN

Jeremiah 2 in the JSNT

Jeremiah 2 in the KAPI

Jeremiah 2 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 2 in the KBV

Jeremiah 2 in the KJV

Jeremiah 2 in the KNFD

Jeremiah 2 in the LBA

Jeremiah 2 in the LBLA

Jeremiah 2 in the LNT

Jeremiah 2 in the LSV

Jeremiah 2 in the MAAL

Jeremiah 2 in the MBV

Jeremiah 2 in the MBV2

Jeremiah 2 in the MHNT

Jeremiah 2 in the MKNFD

Jeremiah 2 in the MNG

Jeremiah 2 in the MNT

Jeremiah 2 in the MNT2

Jeremiah 2 in the MRS1T

Jeremiah 2 in the NAA

Jeremiah 2 in the NASB

Jeremiah 2 in the NBLA

Jeremiah 2 in the NBS

Jeremiah 2 in the NBVTP

Jeremiah 2 in the NET2

Jeremiah 2 in the NIV11

Jeremiah 2 in the NNT

Jeremiah 2 in the NNT2

Jeremiah 2 in the NNT3

Jeremiah 2 in the PDDPT

Jeremiah 2 in the PFNT

Jeremiah 2 in the RMNT

Jeremiah 2 in the SBIAS

Jeremiah 2 in the SBIBS

Jeremiah 2 in the SBIBS2

Jeremiah 2 in the SBICS

Jeremiah 2 in the SBIDS

Jeremiah 2 in the SBIGS

Jeremiah 2 in the SBIHS

Jeremiah 2 in the SBIIS

Jeremiah 2 in the SBIIS2

Jeremiah 2 in the SBIIS3

Jeremiah 2 in the SBIKS

Jeremiah 2 in the SBIKS2

Jeremiah 2 in the SBIMS

Jeremiah 2 in the SBIOS

Jeremiah 2 in the SBIPS

Jeremiah 2 in the SBISS

Jeremiah 2 in the SBITS

Jeremiah 2 in the SBITS2

Jeremiah 2 in the SBITS3

Jeremiah 2 in the SBITS4

Jeremiah 2 in the SBIUS

Jeremiah 2 in the SBIVS

Jeremiah 2 in the SBT

Jeremiah 2 in the SBT1E

Jeremiah 2 in the SCHL

Jeremiah 2 in the SNT

Jeremiah 2 in the SUSU

Jeremiah 2 in the SUSU2

Jeremiah 2 in the SYNO

Jeremiah 2 in the TBIAOTANT

Jeremiah 2 in the TBT1E

Jeremiah 2 in the TBT1E2

Jeremiah 2 in the TFTIP

Jeremiah 2 in the TFTU

Jeremiah 2 in the TGNTATF3T

Jeremiah 2 in the THAI

Jeremiah 2 in the TNFD

Jeremiah 2 in the TNT

Jeremiah 2 in the TNTIK

Jeremiah 2 in the TNTIL

Jeremiah 2 in the TNTIN

Jeremiah 2 in the TNTIP

Jeremiah 2 in the TNTIZ

Jeremiah 2 in the TOMA

Jeremiah 2 in the TTENT

Jeremiah 2 in the UBG

Jeremiah 2 in the UGV

Jeremiah 2 in the UGV2

Jeremiah 2 in the UGV3

Jeremiah 2 in the VBL

Jeremiah 2 in the VDCC

Jeremiah 2 in the YALU

Jeremiah 2 in the YAPE

Jeremiah 2 in the YBVTP

Jeremiah 2 in the ZBP