Jeremiah 26 (BOICB)

1 Na mmalite oge ahụ, Jehoiakim nwa Josaya eze Juda bidoro ịchị ndị Juda, ONYENWE ANYỊ mere ka okwu ya rute Jeremaya ntị. 2 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Guzo nʼogige ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. Nọdụ nʼebe ahụ gwa ndị niile si nʼobodo Juda bịa ịkpọ isiala nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ okwu. Gwa ha ihe ahụ niile m nyere gị nʼiwu. Mee ka ihe ndị ahụ niile m nyere gị nʼiwu rute ha ntị, na-afọdụghị otu. 3 Ma eleghị anya ha ga-anụ, si na mmehie ha chegharịa. Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ m na-ezube na ọ ga-abịakwasị ha ghara ịbịakwasị ha. 4 Gwa ha sị, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru: Ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa ịgbaso iwu m, nke m nyere unu. 5 Ọ bụrụkwa na unu ajụ ige ntị nʼokwu ndị ohu m bụ ndị amụma ahụ m ziteere unu site nʼoge ruo nʼoge (ndị unu nọgidekwara jụ ige ntị), 6 mgbe ahụ, aga m eme ka ụlọnsọ a dịrị ka Shaịlo. Aga m emekwa ka obodo a bụrụ obodo a bụrụ ọnụ nʼetiti mba niile dị nʼụwa.’ ” 7 Ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị mmadụ ndị ọzọ nọ nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ nụrụ mgbe Jeremaya kwuru okwu ndị a niile. 8 Mgbe Jeremaya kwusiri okwu ndị ahụ ONYENWE ANYỊ sị ya kwuo, ndị nchụaja ahụ, na ndị mmadụ ndị ọzọ, na ndị amụma ahụ niile, jidere ya sị ya, “Ị ghaghị ịnwụ! 9 Gịnị mere i ji buo amụma na ụlọnsọ a ga-adị ka Shaịlo? Gịnịkwa mere i ji akwado na obodo a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke onye ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya?” Nʼoge ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gbara Jeremaya gburugburu nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. 10 Mgbe ndịisi ọchịchị Juda nụrụ ihe ndị a na-eme, ha sitere nʼụlọeze bilie pụọ, jee nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha weere ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke dị nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. 11 Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ahụ okwu sị ha: “O kwesiri ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ, nʼihi na o buru amụma megide obodo a. Unu onwe unu ji ntị unu nụrụ ihe o kwuru.” 12 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndịisi ọchịchị ahụ na mmadụ niile nọ nʼebe ahụ okwu sị ha, “Ọ bụ ONYENWE ANYỊ zitere m ibu amụma megide ụlọnsọ a na obodo a. Okwu niile m kwuru, nke unu nụrụ, bụ ihe ONYENWE ANYỊ ziri m ikwu. 13 Ma ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu zie ezi, ọ bụrụ na unu erube isi nye ONYENWE ANYỊ Chineke unu, mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ o zubere na ọ ga-abịakwasị unu ghara ịbịakwasị unu. 14 Ma nʼebe mụ onwe m nọ, lee adị m unu nʼaka, jirinụ m mee ihe ọbụla ziri unu ezi nʼanya nke dịkwa mma nʼanya unu. 15 Ma ghọtakwanụ nke ọma, na ọ bụrụ na unu emee ka m nwụọ, unu ga-eweta ikpe ọmụma nke igbu onye aka ya dị ọcha nʼisi unu. Ikpe ọmụma ga-adịkwara obodo a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na eziokwu, ONYENWE ANYỊ zitere m ikwupụta na ntị unu okwu ndị a niile.” 16 Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị na ndị mmadụ ahụ niile gwara ndị nchụaja na ndị amụma okwu sị ha, “O kwesighị ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ nʼihi na ọ gwara anyị okwu site nʼaha ONYENWE ANYỊ Chineke anyị.” 17 Ụfọdụ nʼime ndị okenye nọ nʼebe ahụ pụtara nʼihu ọha mmadụ ahụ gwa ha okwu sị, 18 “Maịka onye Moreshet buru amụma nʼoge Hezekaya, bụ eze Juda. Ọ gwara ndị Juda niile, sị ha, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru:“ ‘A ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi.Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ,ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.’ 19 “Hezekaya bụ eze Juda, na ndị Juda niile, ha mere ya ka ọ nwụọ? Hezekaya ọ tụghị egwu ONYENWE ANYỊ, rịọọ amara na ihuọma ya? Ọ bụ na ONYENWE ANYỊ atụgharịghị uche, mee ka ihe ọjọọ o kwuru megide ya gharakwa imezu? Ma anyị na-achọ iwetara onwe anyị ihe ọjọọ nke oke mbibi.” 20 (Ụraya nwa Shemaya, onye si Kiriat Jearim pụta, bụkwa onye ọzọ buru amụma site nʼaha ONYENWE ANYỊ. Amụma o buru megide obodo a na ala a bụkwa ụdị amụma nke Jeremaya na-ebu. 21 Mgbe Jehoiakim bụ eze na ndịisi ọchịchị nụrụ amụma Ụraya na-ebu, ha gbalịrị ijide ya gbuo ya, ma Ụraya nụrụ ihe ha zubere ime. Ya mere, Ụraya nụrụ ya gbapụ ọsọ gbalaa Ijipt nʼihi egwu. 22 Ma eze bụ Jehoiakim, zipụrụ Elnatan nwa Akboa na ụfọdụ ndị ikom ọzọ ka ha gaa Ijipt jide Ụraya. 23 Ha si nʼIjipt kpọlata Ụraya, duru ya gaa nʼihu Jehoiakim bụ eze, onye nyere iwu ka e jiri mma agha gbuo ya. A tụnyere ozu ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu nʼala ahụ.) 24 Ma otu ọ dị, Ahikam nwa Shefan, dịnyeere Jeremaya, nʼihi ya a raraghị Jeremaya nye nʼaka ndị mmadụ ka ha gbuo ya.

In Other Versions

Jeremiah 26 in the ANGEFD

Jeremiah 26 in the ANTPNG2D

Jeremiah 26 in the AS21

Jeremiah 26 in the BAGH

Jeremiah 26 in the BBPNG

Jeremiah 26 in the BBT1E

Jeremiah 26 in the BDS

Jeremiah 26 in the BEV

Jeremiah 26 in the BHAD

Jeremiah 26 in the BIB

Jeremiah 26 in the BLPT

Jeremiah 26 in the BNT

Jeremiah 26 in the BNTABOOT

Jeremiah 26 in the BNTLV

Jeremiah 26 in the BOATCB

Jeremiah 26 in the BOATCB2

Jeremiah 26 in the BOBCV

Jeremiah 26 in the BOCNT

Jeremiah 26 in the BOECS

Jeremiah 26 in the BOGWICC

Jeremiah 26 in the BOHCB

Jeremiah 26 in the BOHCV

Jeremiah 26 in the BOHLNT

Jeremiah 26 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 26 in the BOILNTAP

Jeremiah 26 in the BOITCV

Jeremiah 26 in the BOKCV

Jeremiah 26 in the BOKCV2

Jeremiah 26 in the BOKHWOG

Jeremiah 26 in the BOKSSV

Jeremiah 26 in the BOLCB

Jeremiah 26 in the BOLCB2

Jeremiah 26 in the BOMCV

Jeremiah 26 in the BONAV

Jeremiah 26 in the BONCB

Jeremiah 26 in the BONLT

Jeremiah 26 in the BONUT2

Jeremiah 26 in the BOPLNT

Jeremiah 26 in the BOSCB

Jeremiah 26 in the BOSNC

Jeremiah 26 in the BOTLNT

Jeremiah 26 in the BOVCB

Jeremiah 26 in the BOYCB

Jeremiah 26 in the BPBB

Jeremiah 26 in the BPH

Jeremiah 26 in the BSB

Jeremiah 26 in the CCB

Jeremiah 26 in the CUV

Jeremiah 26 in the CUVS

Jeremiah 26 in the DBT

Jeremiah 26 in the DGDNT

Jeremiah 26 in the DHNT

Jeremiah 26 in the DNT

Jeremiah 26 in the ELBE

Jeremiah 26 in the EMTV

Jeremiah 26 in the ESV

Jeremiah 26 in the FBV

Jeremiah 26 in the FEB

Jeremiah 26 in the GGMNT

Jeremiah 26 in the GNT

Jeremiah 26 in the HARY

Jeremiah 26 in the HNT

Jeremiah 26 in the IRVA

Jeremiah 26 in the IRVB

Jeremiah 26 in the IRVG

Jeremiah 26 in the IRVH

Jeremiah 26 in the IRVK

Jeremiah 26 in the IRVM

Jeremiah 26 in the IRVM2

Jeremiah 26 in the IRVO

Jeremiah 26 in the IRVP

Jeremiah 26 in the IRVT

Jeremiah 26 in the IRVT2

Jeremiah 26 in the IRVU

Jeremiah 26 in the ISVN

Jeremiah 26 in the JSNT

Jeremiah 26 in the KAPI

Jeremiah 26 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 26 in the KBV

Jeremiah 26 in the KJV

Jeremiah 26 in the KNFD

Jeremiah 26 in the LBA

Jeremiah 26 in the LBLA

Jeremiah 26 in the LNT

Jeremiah 26 in the LSV

Jeremiah 26 in the MAAL

Jeremiah 26 in the MBV

Jeremiah 26 in the MBV2

Jeremiah 26 in the MHNT

Jeremiah 26 in the MKNFD

Jeremiah 26 in the MNG

Jeremiah 26 in the MNT

Jeremiah 26 in the MNT2

Jeremiah 26 in the MRS1T

Jeremiah 26 in the NAA

Jeremiah 26 in the NASB

Jeremiah 26 in the NBLA

Jeremiah 26 in the NBS

Jeremiah 26 in the NBVTP

Jeremiah 26 in the NET2

Jeremiah 26 in the NIV11

Jeremiah 26 in the NNT

Jeremiah 26 in the NNT2

Jeremiah 26 in the NNT3

Jeremiah 26 in the PDDPT

Jeremiah 26 in the PFNT

Jeremiah 26 in the RMNT

Jeremiah 26 in the SBIAS

Jeremiah 26 in the SBIBS

Jeremiah 26 in the SBIBS2

Jeremiah 26 in the SBICS

Jeremiah 26 in the SBIDS

Jeremiah 26 in the SBIGS

Jeremiah 26 in the SBIHS

Jeremiah 26 in the SBIIS

Jeremiah 26 in the SBIIS2

Jeremiah 26 in the SBIIS3

Jeremiah 26 in the SBIKS

Jeremiah 26 in the SBIKS2

Jeremiah 26 in the SBIMS

Jeremiah 26 in the SBIOS

Jeremiah 26 in the SBIPS

Jeremiah 26 in the SBISS

Jeremiah 26 in the SBITS

Jeremiah 26 in the SBITS2

Jeremiah 26 in the SBITS3

Jeremiah 26 in the SBITS4

Jeremiah 26 in the SBIUS

Jeremiah 26 in the SBIVS

Jeremiah 26 in the SBT

Jeremiah 26 in the SBT1E

Jeremiah 26 in the SCHL

Jeremiah 26 in the SNT

Jeremiah 26 in the SUSU

Jeremiah 26 in the SUSU2

Jeremiah 26 in the SYNO

Jeremiah 26 in the TBIAOTANT

Jeremiah 26 in the TBT1E

Jeremiah 26 in the TBT1E2

Jeremiah 26 in the TFTIP

Jeremiah 26 in the TFTU

Jeremiah 26 in the TGNTATF3T

Jeremiah 26 in the THAI

Jeremiah 26 in the TNFD

Jeremiah 26 in the TNT

Jeremiah 26 in the TNTIK

Jeremiah 26 in the TNTIL

Jeremiah 26 in the TNTIN

Jeremiah 26 in the TNTIP

Jeremiah 26 in the TNTIZ

Jeremiah 26 in the TOMA

Jeremiah 26 in the TTENT

Jeremiah 26 in the UBG

Jeremiah 26 in the UGV

Jeremiah 26 in the UGV2

Jeremiah 26 in the UGV3

Jeremiah 26 in the VBL

Jeremiah 26 in the VDCC

Jeremiah 26 in the YALU

Jeremiah 26 in the YAPE

Jeremiah 26 in the YBVTP

Jeremiah 26 in the ZBP