Job 21 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Job zara sị: 2 “Gee ntị nke ọma nʼokwu m;ka nke a bụrụ nkasiobi ị ga-enye m. 3 Nwee ndidi ka m kwuchaa okwu m,mgbe m kwuchara, gaa nʼihu ịkwa m emo. 4 “Ọ bụ mmadụ ka m na-ekpesara?Gịnị ka m ga-eji ghara ịbụ onye na-enweghị ndidi? 5 Lee m anya ka ahụ maa gị jijiji;were aka gị kpuchie ọnụ gị. 6 Mgbe m chere echiche maka nke a, egwu tụrụ mmeekwa ka ahụ m maa jijiji. 7 Gịnị mere ndị ajọ omume ji enwe ndụ ogologo,ghọọ okenye, baakwa ụba nʼịdị ike? 8 Ha na-ahụ ụmụ ka ha na-akwụsike ike gburugburu ha,ụmụ ha ka ha ji anya ha ahụ. 9 Ha na-ebi ndụ udo nʼezinaụlọ ha na-atụghị egwu na ihe ọjọọ ọbụla ga-adakwasị ha;mkpara Chineke adịghịkwa adakwasị ha. 10 Oke ehi ha na-agba nne ehi ha na-esepụghị aka;nne ehi ha na-amụ ụmụ, ha adịghị ekwo ime. 11 Ha na-ezipụ ụmụ ha dịka igwe atụrụ;ụmụntakịrị ha na-etegharị egwu. 12 Ha na-abụ abụ nʼụda egwu otiti na ụbọ akwara;ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼụda nke ọja. 13 Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu,ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo. 14 Ma ndị a na-asị Chineke, ‘Hapụ anyị aka,ọ dịghị anyị mkpa ịmata ụzọ gị. 15 Onye ka Onye pụrụ ime ihe niile bụ, anyị ga-eji jeere ya ozi?Uru gịnị ka ịrịọ ya arịrịọ ga-abara anyị?’ 16 Ma ọganihu ha adịghị nʼaka haya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu. 17 “Ma ugboro ole ka a na-emenyụ ọkụ oriọna nke ndị na-emebi iwu?Ugboro ole ka nhụju anya na-adakwasị ha,bụ nke Chineke kenyere ha nʼiwe ya? 18 Ugboro ole ka ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ nʼihu ikuku,maọbụ dịka igbugbo ọka nke ikuku siri ike na-efesasị? 19 A na-asị, ‘Chineke na-akpakọtara ụmụ ha ntaramahụhụ nke njehie ha.’Ka a kwụghachi ha ya, ka ha nwee ike mata ya. 20 Ka anya ha hụ mbibi nke onwe ya,ka ha ṅụọ ọnụma nke Onye pụrụ ime ihe niile dịka mmiri. 21 Gịnị gbasara ha banyere ezinaụlọ ha hapụrụmgbe ọnwa ndị e kenyere ya bịara na ngwụcha? 22 “Ọ dị onye pụrụ izi Chineke ihe ọmụma,ebe ọ bụ ya na-ekpe ndị kachasị elu ikpe? 23 Otu onye na-anwụ mgbe o jupụtara nʼike na ume,mgbe ọ nọ na nchekwa na udo, 24 mgbe ahụ ya bụ nke eji ezi nri zụọ nke ọma,ọkpụkpụ ya jupụtakwara nʼụmị. 25 Onye ọzọ na-anwụ nʼihe ilu nke mkpụrụobi,nʼihi na o nweghị mgbe o riri ezi ihe ọbụla. 26 Nke ọbụla nʼime ha dina nʼakụkụ ibe ya nʼime aja,ikpuru kpuchikwara ha abụọ. 27 “Amaara m nke ọma ihe bụ echiche ununa nzube unu ji emegide m. 28 Unu ga-ajụ m ajụjụ sị, ‘Ugbu a, ole ụlọ oke mmadụ ahụ.Ụlọ ikwu ndị ahụ ebe ndị na-emebi iwu biiri?’ 29 Ọ bụ na unu ajụbeghị ndị njem ajụjụ?Ọ bụ na unu ejighị ihe ha kọrọ mere ihe, 30 na a na-echebe ndị ọjọọ pụọ nʼụbọchị nhụju anya,na a na-anapụta ha site nʼụbọchị oke iwe? 31 Onye na-atụ ha mmehie ha nʼihu?Onye kwa na-akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere? 32 A na-eburu ha gaa nʼili,a na-echekwa ili ha nche. 33 Aja dị na ndagwurugwu na-atọ ha ụtọ;Mmadụ niile na-eso ha nʼazụ,na ọtụtụ a na-apụghị ịgụta ọnụ na-ebu ha ụzọ nʼaga. 34 “Ya mere, olee otu unu ga-esi were okwu na-enweghị isi kasịe m obi?Ọ dịghị ihe fọdụrụ nʼọsịịsa unu ma ọ bụghị naanị okwu ụgha.”

In Other Versions

Job 21 in the ANGEFD

Job 21 in the ANTPNG2D

Job 21 in the AS21

Job 21 in the BAGH

Job 21 in the BBPNG

Job 21 in the BBT1E

Job 21 in the BDS

Job 21 in the BEV

Job 21 in the BHAD

Job 21 in the BIB

Job 21 in the BLPT

Job 21 in the BNT

Job 21 in the BNTABOOT

Job 21 in the BNTLV

Job 21 in the BOATCB

Job 21 in the BOATCB2

Job 21 in the BOBCV

Job 21 in the BOCNT

Job 21 in the BOECS

Job 21 in the BOGWICC

Job 21 in the BOHCB

Job 21 in the BOHCV

Job 21 in the BOHLNT

Job 21 in the BOHNTLTAL

Job 21 in the BOILNTAP

Job 21 in the BOITCV

Job 21 in the BOKCV

Job 21 in the BOKCV2

Job 21 in the BOKHWOG

Job 21 in the BOKSSV

Job 21 in the BOLCB

Job 21 in the BOLCB2

Job 21 in the BOMCV

Job 21 in the BONAV

Job 21 in the BONCB

Job 21 in the BONLT

Job 21 in the BONUT2

Job 21 in the BOPLNT

Job 21 in the BOSCB

Job 21 in the BOSNC

Job 21 in the BOTLNT

Job 21 in the BOVCB

Job 21 in the BOYCB

Job 21 in the BPBB

Job 21 in the BPH

Job 21 in the BSB

Job 21 in the CCB

Job 21 in the CUV

Job 21 in the CUVS

Job 21 in the DBT

Job 21 in the DGDNT

Job 21 in the DHNT

Job 21 in the DNT

Job 21 in the ELBE

Job 21 in the EMTV

Job 21 in the ESV

Job 21 in the FBV

Job 21 in the FEB

Job 21 in the GGMNT

Job 21 in the GNT

Job 21 in the HARY

Job 21 in the HNT

Job 21 in the IRVA

Job 21 in the IRVB

Job 21 in the IRVG

Job 21 in the IRVH

Job 21 in the IRVK

Job 21 in the IRVM

Job 21 in the IRVM2

Job 21 in the IRVO

Job 21 in the IRVP

Job 21 in the IRVT

Job 21 in the IRVT2

Job 21 in the IRVU

Job 21 in the ISVN

Job 21 in the JSNT

Job 21 in the KAPI

Job 21 in the KBT1ETNIK

Job 21 in the KBV

Job 21 in the KJV

Job 21 in the KNFD

Job 21 in the LBA

Job 21 in the LBLA

Job 21 in the LNT

Job 21 in the LSV

Job 21 in the MAAL

Job 21 in the MBV

Job 21 in the MBV2

Job 21 in the MHNT

Job 21 in the MKNFD

Job 21 in the MNG

Job 21 in the MNT

Job 21 in the MNT2

Job 21 in the MRS1T

Job 21 in the NAA

Job 21 in the NASB

Job 21 in the NBLA

Job 21 in the NBS

Job 21 in the NBVTP

Job 21 in the NET2

Job 21 in the NIV11

Job 21 in the NNT

Job 21 in the NNT2

Job 21 in the NNT3

Job 21 in the PDDPT

Job 21 in the PFNT

Job 21 in the RMNT

Job 21 in the SBIAS

Job 21 in the SBIBS

Job 21 in the SBIBS2

Job 21 in the SBICS

Job 21 in the SBIDS

Job 21 in the SBIGS

Job 21 in the SBIHS

Job 21 in the SBIIS

Job 21 in the SBIIS2

Job 21 in the SBIIS3

Job 21 in the SBIKS

Job 21 in the SBIKS2

Job 21 in the SBIMS

Job 21 in the SBIOS

Job 21 in the SBIPS

Job 21 in the SBISS

Job 21 in the SBITS

Job 21 in the SBITS2

Job 21 in the SBITS3

Job 21 in the SBITS4

Job 21 in the SBIUS

Job 21 in the SBIVS

Job 21 in the SBT

Job 21 in the SBT1E

Job 21 in the SCHL

Job 21 in the SNT

Job 21 in the SUSU

Job 21 in the SUSU2

Job 21 in the SYNO

Job 21 in the TBIAOTANT

Job 21 in the TBT1E

Job 21 in the TBT1E2

Job 21 in the TFTIP

Job 21 in the TFTU

Job 21 in the TGNTATF3T

Job 21 in the THAI

Job 21 in the TNFD

Job 21 in the TNT

Job 21 in the TNTIK

Job 21 in the TNTIL

Job 21 in the TNTIN

Job 21 in the TNTIP

Job 21 in the TNTIZ

Job 21 in the TOMA

Job 21 in the TTENT

Job 21 in the UBG

Job 21 in the UGV

Job 21 in the UGV2

Job 21 in the UGV3

Job 21 in the VBL

Job 21 in the VDCC

Job 21 in the YALU

Job 21 in the YAPE

Job 21 in the YBVTP

Job 21 in the ZBP