Job 34 (BOICB)

1 Mgbe ahụ Elihu sịrị: 2 “Nụrụ okwu m, unu ndị amamihe;gee m ntị unu ndị ikom nwere mmụta. 3 Ntị na-anwale okwu dịkaire si anụ ụtọ ihe oriri. 4 Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi;ka anyị nọkọta mụta ihe dị mma. 5 “Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume,ma Chineke na-anapụ m ikpe ziri ezi. 6 Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọchama a na-ahụta m dịka onye ụgha;ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị mma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’ 7 Olee nwoke dịka Job,nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri? 8 Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi,ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe. 9 Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị yana mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’ 10 “Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta.Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume,bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi. 11 Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị,ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri. 12 Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi,na Onye pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi. 13 Onye họpụtara ya ịchị ụwa?Onye mere ya onye nlekọta ụwa niile? 14 Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche yaiweghachi mmụọ ya na nkuume ya, 15 mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi,mmadụ niile ga-alaghachikwa nʼaja. 16 “Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a;gee ntị nʼokwu m. 17 Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị?Ị ga-ama Onye ezi omume na onye dị ike ikpe? 18 Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’ 19 Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide nye ụmụ ndị ikom eze,onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye,nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya. 20 Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị;ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga;a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ. 21 “Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ;ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ha niile. 22 Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị,ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo. 23 Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ,nke mere na ha ga-abịa nʼihu ya maka ikpe ikpe. 24 Na-ajụghị ajụjụ Chineke na-akụtu ndị a maara aha hama were ndị ọzọ dochie nʼọnọdụ ha. 25 Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile,ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa. 26 Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụnʼihi ajọ omume ha, 27 nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha,ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla. 28 Ha mere ka iti mkpu akwa nke ndị ogbenye ruo ya ntị,nke mere na ọ nụrụ akwa ndị nọ na mkpa. 29 Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe?Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, onye pụrụ ịhụ ya?Ma ya onwe ya na-achị isi nʼebe mmadụ na mba nọ, 30 igbochi nwoke na-adịghị atụ egwu Chineke ịchị obodo,ka ọ gharakwa ịbụ ihe ọnya nye ndị mmadụ. 31 “Ọ bụrụ na mmadụ a sị Chineke,‘Abụ m onye ikpe mara ma agaghị m emehie kwa ọzọ. 32 Biko, zi m ihe ndị ahụ m na-apụghị ịhụ;ọ bụrụ na m emehiela, agaghị m emekwa ya ọzọ.’ 33 Chineke ọ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ site na mkpebi gịmgbe ị jụrụ ichegharị?Gị onwe gị ga-ekpebi, ọ bụghị mụ;ya mere gwa m ihe ị mara. 34 “Ndị ikom ndị nwere nghọta na-ekwu si,ndị amamihe nụrụ okwu m na-asị m, 35 ‘Job na-ekwu okwu dịka onye na-amaghị ihe;okwu ya dị ka nke onye na-enweghị uche.’ 36 Ọ ga-adị nnọọ mma ma a sị na a nwaa Job ruo nsọtụmaka ọsịsa ya dịka nke ajọ mmadụ! 37 Ọ na-atụkwasị nnupu isi nʼelu mmehie ya;na-akụ aka nʼetiti anyị nʼụzọ ịkwa emo,ma werekwa okwu nkwulu bara ụba megide Chineke.”

In Other Versions

Job 34 in the ANGEFD

Job 34 in the ANTPNG2D

Job 34 in the AS21

Job 34 in the BAGH

Job 34 in the BBPNG

Job 34 in the BBT1E

Job 34 in the BDS

Job 34 in the BEV

Job 34 in the BHAD

Job 34 in the BIB

Job 34 in the BLPT

Job 34 in the BNT

Job 34 in the BNTABOOT

Job 34 in the BNTLV

Job 34 in the BOATCB

Job 34 in the BOATCB2

Job 34 in the BOBCV

Job 34 in the BOCNT

Job 34 in the BOECS

Job 34 in the BOGWICC

Job 34 in the BOHCB

Job 34 in the BOHCV

Job 34 in the BOHLNT

Job 34 in the BOHNTLTAL

Job 34 in the BOILNTAP

Job 34 in the BOITCV

Job 34 in the BOKCV

Job 34 in the BOKCV2

Job 34 in the BOKHWOG

Job 34 in the BOKSSV

Job 34 in the BOLCB

Job 34 in the BOLCB2

Job 34 in the BOMCV

Job 34 in the BONAV

Job 34 in the BONCB

Job 34 in the BONLT

Job 34 in the BONUT2

Job 34 in the BOPLNT

Job 34 in the BOSCB

Job 34 in the BOSNC

Job 34 in the BOTLNT

Job 34 in the BOVCB

Job 34 in the BOYCB

Job 34 in the BPBB

Job 34 in the BPH

Job 34 in the BSB

Job 34 in the CCB

Job 34 in the CUV

Job 34 in the CUVS

Job 34 in the DBT

Job 34 in the DGDNT

Job 34 in the DHNT

Job 34 in the DNT

Job 34 in the ELBE

Job 34 in the EMTV

Job 34 in the ESV

Job 34 in the FBV

Job 34 in the FEB

Job 34 in the GGMNT

Job 34 in the GNT

Job 34 in the HARY

Job 34 in the HNT

Job 34 in the IRVA

Job 34 in the IRVB

Job 34 in the IRVG

Job 34 in the IRVH

Job 34 in the IRVK

Job 34 in the IRVM

Job 34 in the IRVM2

Job 34 in the IRVO

Job 34 in the IRVP

Job 34 in the IRVT

Job 34 in the IRVT2

Job 34 in the IRVU

Job 34 in the ISVN

Job 34 in the JSNT

Job 34 in the KAPI

Job 34 in the KBT1ETNIK

Job 34 in the KBV

Job 34 in the KJV

Job 34 in the KNFD

Job 34 in the LBA

Job 34 in the LBLA

Job 34 in the LNT

Job 34 in the LSV

Job 34 in the MAAL

Job 34 in the MBV

Job 34 in the MBV2

Job 34 in the MHNT

Job 34 in the MKNFD

Job 34 in the MNG

Job 34 in the MNT

Job 34 in the MNT2

Job 34 in the MRS1T

Job 34 in the NAA

Job 34 in the NASB

Job 34 in the NBLA

Job 34 in the NBS

Job 34 in the NBVTP

Job 34 in the NET2

Job 34 in the NIV11

Job 34 in the NNT

Job 34 in the NNT2

Job 34 in the NNT3

Job 34 in the PDDPT

Job 34 in the PFNT

Job 34 in the RMNT

Job 34 in the SBIAS

Job 34 in the SBIBS

Job 34 in the SBIBS2

Job 34 in the SBICS

Job 34 in the SBIDS

Job 34 in the SBIGS

Job 34 in the SBIHS

Job 34 in the SBIIS

Job 34 in the SBIIS2

Job 34 in the SBIIS3

Job 34 in the SBIKS

Job 34 in the SBIKS2

Job 34 in the SBIMS

Job 34 in the SBIOS

Job 34 in the SBIPS

Job 34 in the SBISS

Job 34 in the SBITS

Job 34 in the SBITS2

Job 34 in the SBITS3

Job 34 in the SBITS4

Job 34 in the SBIUS

Job 34 in the SBIVS

Job 34 in the SBT

Job 34 in the SBT1E

Job 34 in the SCHL

Job 34 in the SNT

Job 34 in the SUSU

Job 34 in the SUSU2

Job 34 in the SYNO

Job 34 in the TBIAOTANT

Job 34 in the TBT1E

Job 34 in the TBT1E2

Job 34 in the TFTIP

Job 34 in the TFTU

Job 34 in the TGNTATF3T

Job 34 in the THAI

Job 34 in the TNFD

Job 34 in the TNT

Job 34 in the TNTIK

Job 34 in the TNTIL

Job 34 in the TNTIN

Job 34 in the TNTIP

Job 34 in the TNTIZ

Job 34 in the TOMA

Job 34 in the TTENT

Job 34 in the UBG

Job 34 in the UGV

Job 34 in the UGV2

Job 34 in the UGV3

Job 34 in the VBL

Job 34 in the VDCC

Job 34 in the YALU

Job 34 in the YAPE

Job 34 in the YBVTP

Job 34 in the ZBP