Job 41 (BOICB)

1 “Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatanmaọbụ jiri ụdọ kegide ire ya bịada ya? 2 Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi yamaọbụ were ngu igwe mapuo agba ya? 3 Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere?Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu? 4 Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile? 5 Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ?Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị? 6 Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa?Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa? 7 Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ yamaọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya? 8 Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka,ị gaghị echefu ọgụ ọ ga-alụso gị. Ị gakwaghị anwa ya ọzọ. 9 Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya.Naanị ilekwasị ya anya na-eyi egwu. 10 Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe.Ọ bụ onye pụrụ iguzogide m? 11 Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ?Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m. 12 “Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan,na ike ya, na ụdịdị ya mara mma. 13 Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ?Onye nwekwara ike ịbanye nʼagba ya apịajiri okpukpu abụọ? 14 Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya,nke eze dị oke egwu gbara gburugburu? 15 Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoronke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha, 16 nke ọbụla dị ibe ya nso,na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha. 17 E jikọtara ha ọnụ nke ọma,ha na-ejisi onwe ha ike, enweghị ike ikewa ha. 18 Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere;anya ya abụọ na-achakwa dịka anwụ ụtụtụ. 19 Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya,icheku ọkụ na-ekepụtakwa nʼọnụ ya. 20 Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta,dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara. 21 Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku.Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ. 22 Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya,obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu. 23 Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma,ha siri ike na-apụghị inugharị ha. 24 Obi ya dị ike dịka nkume,dịka nkume e ji akwọ ihe. 25 Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ;ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya. 26 O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya,o nwekwaghị ùbe igwe, maọbụ àkụ maọbụ ihe ọbụla a pịrị ọnụ ya apị nke pụrụ igbochi ya. 27 Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa;bronz dịkwa ka osisi rere ure nʼebe ọ nọ. 28 Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga,ịtụ ya nkume dị ka ịtụ ya igbugbo ọka. 29 Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka,ọ na-achị ọchị na mkpọtụ arụa na-eme. 30 Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ,nke na-ahapụ ụzọ nʼapịtị dịka igwe eji azọcha mkpụrụ ọka site nʼogbe ya. 31 Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite;ọ na-akpagharị oke osimiri ka ọ dị ka mmanụ otite dị nʼite. 32 Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga;mmadụ ga-eche na ọ osimiri nwere isi awọ. 33 O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya,o nweghị ihe na-emenye ya ụjọ. 34 Ọ na-eleda ndị mpako niile anya.Ọ bụkwa eze nʼebe ndị na-anya isi nọ.”

In Other Versions

Job 41 in the ANGEFD

Job 41 in the ANTPNG2D

Job 41 in the AS21

Job 41 in the BAGH

Job 41 in the BBPNG

Job 41 in the BBT1E

Job 41 in the BDS

Job 41 in the BEV

Job 41 in the BHAD

Job 41 in the BIB

Job 41 in the BLPT

Job 41 in the BNT

Job 41 in the BNTABOOT

Job 41 in the BNTLV

Job 41 in the BOATCB

Job 41 in the BOATCB2

Job 41 in the BOBCV

Job 41 in the BOCNT

Job 41 in the BOECS

Job 41 in the BOGWICC

Job 41 in the BOHCB

Job 41 in the BOHCV

Job 41 in the BOHLNT

Job 41 in the BOHNTLTAL

Job 41 in the BOILNTAP

Job 41 in the BOITCV

Job 41 in the BOKCV

Job 41 in the BOKCV2

Job 41 in the BOKHWOG

Job 41 in the BOKSSV

Job 41 in the BOLCB

Job 41 in the BOLCB2

Job 41 in the BOMCV

Job 41 in the BONAV

Job 41 in the BONCB

Job 41 in the BONLT

Job 41 in the BONUT2

Job 41 in the BOPLNT

Job 41 in the BOSCB

Job 41 in the BOSNC

Job 41 in the BOTLNT

Job 41 in the BOVCB

Job 41 in the BOYCB

Job 41 in the BPBB

Job 41 in the BPH

Job 41 in the BSB

Job 41 in the CCB

Job 41 in the CUV

Job 41 in the CUVS

Job 41 in the DBT

Job 41 in the DGDNT

Job 41 in the DHNT

Job 41 in the DNT

Job 41 in the ELBE

Job 41 in the EMTV

Job 41 in the ESV

Job 41 in the FBV

Job 41 in the FEB

Job 41 in the GGMNT

Job 41 in the GNT

Job 41 in the HARY

Job 41 in the HNT

Job 41 in the IRVA

Job 41 in the IRVB

Job 41 in the IRVG

Job 41 in the IRVH

Job 41 in the IRVK

Job 41 in the IRVM

Job 41 in the IRVM2

Job 41 in the IRVO

Job 41 in the IRVP

Job 41 in the IRVT

Job 41 in the IRVT2

Job 41 in the IRVU

Job 41 in the ISVN

Job 41 in the JSNT

Job 41 in the KAPI

Job 41 in the KBT1ETNIK

Job 41 in the KBV

Job 41 in the KJV

Job 41 in the KNFD

Job 41 in the LBA

Job 41 in the LBLA

Job 41 in the LNT

Job 41 in the LSV

Job 41 in the MAAL

Job 41 in the MBV

Job 41 in the MBV2

Job 41 in the MHNT

Job 41 in the MKNFD

Job 41 in the MNG

Job 41 in the MNT

Job 41 in the MNT2

Job 41 in the MRS1T

Job 41 in the NAA

Job 41 in the NASB

Job 41 in the NBLA

Job 41 in the NBS

Job 41 in the NBVTP

Job 41 in the NET2

Job 41 in the NIV11

Job 41 in the NNT

Job 41 in the NNT2

Job 41 in the NNT3

Job 41 in the PDDPT

Job 41 in the PFNT

Job 41 in the RMNT

Job 41 in the SBIAS

Job 41 in the SBIBS

Job 41 in the SBIBS2

Job 41 in the SBICS

Job 41 in the SBIDS

Job 41 in the SBIGS

Job 41 in the SBIHS

Job 41 in the SBIIS

Job 41 in the SBIIS2

Job 41 in the SBIIS3

Job 41 in the SBIKS

Job 41 in the SBIKS2

Job 41 in the SBIMS

Job 41 in the SBIOS

Job 41 in the SBIPS

Job 41 in the SBISS

Job 41 in the SBITS

Job 41 in the SBITS2

Job 41 in the SBITS3

Job 41 in the SBITS4

Job 41 in the SBIUS

Job 41 in the SBIVS

Job 41 in the SBT

Job 41 in the SBT1E

Job 41 in the SCHL

Job 41 in the SNT

Job 41 in the SUSU

Job 41 in the SUSU2

Job 41 in the SYNO

Job 41 in the TBIAOTANT

Job 41 in the TBT1E

Job 41 in the TBT1E2

Job 41 in the TFTIP

Job 41 in the TFTU

Job 41 in the TGNTATF3T

Job 41 in the THAI

Job 41 in the TNFD

Job 41 in the TNT

Job 41 in the TNTIK

Job 41 in the TNTIL

Job 41 in the TNTIN

Job 41 in the TNTIP

Job 41 in the TNTIZ

Job 41 in the TOMA

Job 41 in the TTENT

Job 41 in the UBG

Job 41 in the UGV

Job 41 in the UGV2

Job 41 in the UGV3

Job 41 in the VBL

Job 41 in the VDCC

Job 41 in the YALU

Job 41 in the YAPE

Job 41 in the YBVTP

Job 41 in the ZBP